Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịmata Onye Bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu

Ịmata Onye Bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu

Ịmata Onye Bụ́ Mozis ahụ Ka Ukwuu

‘Jehova bụ́ Chineke ga-esi n’etiti ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka mụ onwe m. Geenụ ya ntị.’—ỌRỤ 3:22.

1. Olee otú Jizọs Kraịst sirila nyere ụmụ mmadụ aka?

ỌMỤMỤ a mụrụ otu nwa nwoke na puku afọ abụọ gara aga, mere ka ìgwè ndị mmụọ ozi nọ n’eluigwe nye Chineke otuto. Ụfọdụ ndị ọzụzụ atụrụ nụkwara mgbe ha na-eto ya. (Luk 2:8-14) Mgbe afọ iri atọ gara, nwa ahụ, bụ́ onye torola eto, malitere ikwusa ozi ọma. Ozi ọma o kwusara naanị afọ atọ na ọkara gbanwere ọtụtụ ihe n’ụwa. Otu ọkọ akụkọ ihe mere eme a ma ama, aha ya bụ Philip Schaff, onye dịrị ndụ n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, kwuru banyere nwa okorobịa ahụ, sị: “N’agbanyeghị na o nweghị ihe ọ bụla o ji aka ya dee, ihe o kwuru na ihe o mere enyerela ọtụtụ ndị na-ede akwụkwọ, ndị na-ede egwú, ndị na-ekwu okwuchukwu, na ndị omenkà, aka dị ukwuu karịa ka ndị ukwu niile dịrị ndụ n’oge ochie nakwa n’oge a nyeere ndị mmadụ.” Nwa okorobịa ahụ pụrụ iche o kwuru okwu ya bụ Jizọs Kraịst.

2. Olee ihe Jọn onyeozi kwuru banyere Jizọs na ozi ya?

2 Jọn onyeozi dere banyere ozi Jizọs jere. Ná ngwụcha ihe o dere, ọ sịrị: “N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ihe ndị ọzọ Jizọs mere, bụ́ ndị, ọ bụrụ na e dee ha edee n’ụzọ zuru ezu, m chere na ụwa apụghị ịba akwụkwọ mpịakọta ndị e dere ha.” (Jọn 21:25) Jọn ma na ọ bụ naanị obere ihe ka ya dere n’ime ihe niile Jizọs kwuru nakwa ihe niile o mere n’afọ atọ na ọkara ahụ o ji jee ozi n’ụwa. N’agbanyeghị nke ahụ, obere ihe ahụ Jọn dere n’Oziọma ya banyere ozi Jizọs bara uru nke ukwuu.

3. Olee otú anyị ga-esi ghọtakwuo ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke?

3 E wezụga Oziọma anọ ahụ dị mkpa, ya bụ, Matiu, Mak, Luk na Jọn, ihe akwụkwọ ndị ọzọ dị na Baịbụl kwuru banyere ndụ Jizọs dịrị n’ụwa na-eme ka okwukwe anyị sie ike. Dị ka ihe atụ, ihe ndị e dere na Baịbụl banyere ndị ikom ụfọdụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu Jizọs abịa n’ụwa, na-eme ka anyị ghọtakwuo ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke. Ka anyị tụlee ihe banyere ụfọdụ n’ime ndị ikom a.

Ndị Ikom Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Ndị Sere Onyinyo Kraịst

4, 5. Olee ndị sere onyinyo Jizọs, oleekwa otú ha si see onyinyo ya?

4 Jọn na mmadụ atọ ọzọ so dee Oziọma ndị ahụ dị na Baịbụl gosiri na Mozis, Devid, na Sọlọmọn sere onyinyo Jizọs, bụ́ Onye Chineke Tere Mmanụ, nke ga-abụ Eze n’ọdịnihu. Olee otú ndị ohu Chineke ndị a, bụ́ ndị dịrị ndụ n’oge ochie, si see onyinyo Jizọs, oleekwa ihe anyị ga-amụta n’ihe ndị e kwuru banyere ha?

5 Baịbụl kwuru na Mozis bụ onye amụma, onye ogbugbo, na onye nnapụta. Jizọs bụkwa onye amụma, onye ogbugbo, na onye nnapụta. Devid bụ onye ọzụzụ atụrụ na eze nke meriri ndị iro ụmụ Izrel. Jizọs bụkwa onye ọzụzụ atụrụ na eze na-emeri ndị iro ya. (Ezik. 37:24, 25) Mgbe Sọlọmọn kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụ eze maara ihe, udo dịkwa n’Izrel n’oge ahụ. (1 Eze 4:25, 29) Jizọs nwekwara amamihe dị ukwuu, Baịbụl kpọkwara ya “Onyeisi Udo.” (Aịza. 9:6) O doro anya na ọrụ Kraịst Jizọs yiri ọrụ ndị ohu Chineke rụrụ n’oge ochie, ma, ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke karịrị nke ha. Ka anyị buru ụzọ jiri ọrụ Mozis rụrụ tụnyere ọrụ Jizọs ma hụ otú ịtụle nke a ga-esi enyere anyị aka ịmatakwu ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Chineke.

Mozis—Onye Sere Onyinyo Jizọs

6. Olee otú Pita onyeozi si gosi na ige Jizọs ntị dị mkpa?

6 Obere oge ka Pentikọst nke afọ 33 O.A. gafere, Pita onyeozi kwughachiri otu amụma Mozis buru, bụ́ nke mezuru n’isi Jizọs Kraịst. Pita guzo n’ihu ìgwè ndị Juu nọ n’ụlọ nsọ na-agwa ha okwu. ‘Ọ tụrụ ha n’anya nke ukwuu’ mgbe Pita na Jọn gwọrọ otu onye arịrịọ dara ngwọrọ site n’afọ nne ya, ìgwè mmadụ ahụ niile wee gbara gaa ka ha mara ihe merenụ. Pita kwuru na ọ bụ mmụọ nsọ Jehova nke na-arụ ọrụ n’ahụ́ Jizọs Kraịst mere ha ji nwee ike ịrụ ọrụ ebube ahụ. Ya ewee kwughachi ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, sị: “N’eziokwu, Mozis sịrị, ‘Jehova bụ́ Chineke ga-esi n’etiti ụmụnne unu họpụtara unu onye amụma nke dị ka mụ onwe m. Geenụ ntị n’ihe niile ọ ga-agwa unu.’”—Ọrụ 3:11, 22, 23; gụọ Diuterọnọmi 18:15, 18, 19.

7. Olee otú anyị si mara na ndị nọ na-ege Pita ntị ghọtara ihe o kwuru banyere onye amụma ka Mozis ukwuu?

7 Ọ ga-abụ na ndị ahụ nọ na-ege Pita ntị ma ihe ahụ Mozis kwuru. Ebe ha bụ ndị Juu, ha na-akwanyere Mozis ùgwù nke ukwuu. (Diut. 34:10) Ha nọ na-atụsi anya ọbịbịa nke onye amụma ahụ ka Mozis ukwuu ike. Onye amụma ahụ agaghị abụ naanị onye Chineke tere mmanụ dị ka o tere Mozis, kama ọ bụ Mesaya ahụ a na-atụ anya ya, ya bụ, “Kraịst nke Chineke, Onye [Jehova] Họọrọ.”—Luk 23:35; Hib. 11:26.

Otú Jizọs na Mozis Si Yie

8. Olee ihe ụfọdụ mere ná ndụ Mozis, bụ́ ndị ụdị ha mekwara ná ndụ Jizọs?

8 Ihe ụfọdụ mere ná ndụ Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa yiri ihe ndị mere ná ndụ Mozis. Dị ka ihe atụ, ọ fọrọ ntakịrị ka ndị eze obi tara mmiri gbuo ma Mozis ma Jizọs mgbe ha bụ ụmụaka. (Ọpụ. 1:22–2:10; Mat. 2:7-14) E sikwa ‘n’Ijipt kpọpụta’ ha abụọ. Hosea onye amụma kwuru, sị: “Mgbe Izrel bụ nwata, m hụrụ ya n’anya, n’Ijipt ka m si kpọpụta nwa m.” (Hos. 11:1) Ihe Hosea kwuru na-echetara anyị mgbe Chineke họpụtara Mozis ya eduru mba Izrel si n’Ijipt pụta. (Ọpụ. 4:22, 23; 12:29-37) Ma, ihe Hosea kwuru bụ banyere ihe merela eme nakwa ihe ka ga-eme n’ọdịnihu, malite mgbe o kwuru ihe ahụ. Ihe a o kwuru mezuru mgbe Josef na Meri si n’Ijipt kpọrọ Jizọs lọta mgbe Eze Herọd nwụrụ.—Mat. 2:15, 19-23.

9. (a) Olee ọrụ ebube ndị Mozis na Jizọs rụrụ? (b) Kwuo ebe ndị ọzọ Jizọs na Mozis yiri. (Gụọ igbe bụ́ “Ụzọ Ndị Ọzọ Jizọs na Mozis Si Yie,” nke dị na peeji nke 26.)

9 Ma Mozis ma Jizọs rụrụ ọrụ ebube, nke na-egosi na Jehova kwadoro ha. N’ezie, Mozis bụ mmadụ mbụ rụrụ ọrụ ebube. (Ọpụ. 4:1-9) Dị ka ihe atụ, Mozis rụrụ ọrụ ebube ndị metụtara mmiri. O nyere iwu, osimiri Naịl na iyi dị iche iche dị n’akụkụ ya aghọọ ọbara, nye iwu Oké Osimiri Uhie ekewaa abụọ, nyekwa iwu mmiri esi n’oké nkume dị n’ọzara gbapụta. (Ọpụ. 7:19-21; 14:21; 17:5-7) Jizọs rụkwara ọrụ ebube ndị metụtara mmiri. Ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya n’ebe e nwere oriri alụmdi na nwunye. (Jọn 2:1-11) N’oge ọzọ, o mere ka ebili mmiri nọ na-eme n’Oké Osimiri Galili kwụsị. O nwekwara mgbe o jere ije n’elu mmiri! (Mat. 8:23-27; 14:23-25) Ụzọ ndị ọzọ Mozis na Mozis Ka Ukwuu, bụ́ Jizọs, si yie dị  n’igbe dị na peeji nke 26.

Mata na Kraịst Bụ Onye Amụma

10. Gịnị ka ezigbo onye amụma na-arụ, olee ihe gosiri na Mozis bụ ezigbo onye amụma?

10 Ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na naanị ihe onye amụma na-arụ bụ ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ma, nke ahụ bụ otu n’ime ihe ọ na-arụ. Ezigbo onye amụma bụ ọnụ na-ekwuchitere Jehova, ya bụ, onye na-ekwu “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:11, 16, 17) Ihe ndị ọ na-ebu n’amụma nwere ike ịgụnye ikwu ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, ime ka a mara nzube Jehova, ma ọ bụkwanụ ịkpọsa ikpe Chineke mara ndị iro ya. Mozis rụchara ihe ndị a. Tupu Jehova etie ndị Ijipt nke ọ bụla n’ime Ihe Otiti Iri ahụ, Mozis bu ụzọ gwa ha ihe gaje ime. Ọ nọ na Saịnaị mee ka ụmụ Izrel mara Iwu ahụ. Ọ gwakwara ha ihe bụ́ uche Chineke. Ma, onye amụma ka Mozis ukwuu ga-emecha bịa.

11. Olee otú Jizọs si rụọ ọrụ na-egosi na ọ bụ onye amụma ka Mozis ukwuu?

11 Ka oge na-aga, Zekaraya buru amụma na narị afọ mbụ T. O. A. banyere ihe Jọn nwa ya ga-arụrụ Chineke. (Luk 1:76) Nwa ya ahụ bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim, bụ́ onye mere ka ndị mmadụ mara banyere ọbịbịa nke onye amụma ka Mozis ukwuu, bụ́ Jizọs Kraịst, onye a nọ na-atụ anya ya kemgbe ọtụtụ afọ. (Jọn 1:23-36) Jizọs buru ọtụtụ ihe n’amụma. Dị ka ihe atụ, o kwuru otú ọ ga-esi nwụọ, ebe ọ ga-anwụ, nakwa ndị ga-egbu ya. (Mat. 20:17-19) Ọ tụrụ ndị na-ege Jizọs ntị n’anya mgbe o buru amụma na a ga-ebibi Jeruselem na ụlọ nsọ ya. (Mak 13:1, 2) O bukwara amụma banyere ihe ndị ga-eme n’oge anyị a.—Mat. 24:3-41.

12. (a) Olee otú Jizọs si hiwe ọrụ ikwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa dum? (b) Gịnị mere anyị ji eso ihe nlereanya Jizọs taa?

12 Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ bụ onye amụma, onye na-ekwusa ozi ọma, na onye ozizi. O kwusara ozi ọma Alaeze Chineke, ọ dịghịkwa onye kwusara ozi ọma n’atụghị egwu ka ya. (Luk 4:16-21, 43) Ọ dịghị onye ziri ihe otú o si zie ihe. Ụfọdụ ndị gere ya ntị kwuru, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.” (Jọn 7:46) Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ kụzikwaara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-anụ ọkụ n’obi ka ya. O si otú a hiwe ọrụ ikwusa ozi ọma na izi ndị mmadụ ihe, bụ́ nke a ka na-arụ n’ụwa dum ruo taa. (Mat. 28:18-20; Ọrụ 5:42) N’afọ gara aga, ihe dị ka nde mmadụ asaa, bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ji ihe dị ka otu ijeri awa na narị nde awa ise kwusaa ozi ọma Alaeze, kụziekwaara ndị nwere mmasị eziokwu dị na Baịbụl. Ì ji ike gị niile na-arụ ọrụ ahụ?

13. Gịnị ga-enyere anyị aka ‘ịmụrụ anya’?

13 O doro anya na Jehova họpụtara onye amụma dị ka Mozis iji mezuo ihe o buru n’amụma. Olee otú ịmara nke a dị gị? Ọ̀ na-eme ka obi sikwuo gị ike na ihe ndị e buru n’amụma na ha ga-eme n’oge na-adịghị anya, ga-emezu? N’ezie, ịtụgharị uche n’ihe nlereanya Mozis ahụ Ka Ukwuu setịpụụrụ anyị ga-enyere anyị aka ‘ịmụrụ anya ma nwee uche ziri ezi’ iji mara ihe Chineke ga-eme n’oge na-adịghị anya.—1 Tesa. 5:2, 6.

Sọpụrụ Kraịst Maka na Ọ Bụ Onye Ogbugbo

14. Olee otú Mozis si bụrụ onye ogbugbo n’etiti ụmụ Izrel na Chineke?

14 Jizọs bụ onye ogbugbo dị ka Mozis. Mozis bụ onye ogbugbo n’etiti Jehova na ụmụ Izrel mgbe Jehova nyere ha Iwu ahụ. Ọ bụrụ na ụmụ Jekọb erube isi n’iwu Chineke, ha ga-anọgide na-abụ ihe onwunwe ya pụrụ iche, ya bụ, ọgbakọ Chineke. (Ọpụ. 19:3-8) Ọgbụgba ndụ ahụ dịgidere malite n’afọ 1513 T.O.A. ruo na narị afọ mbụ O.A.

15. Olee otú Jizọs si bụrụ onye ogbugbo ka mma?

15 N’afọ 33 O.A., Jehova na Izrel ọhụrụ gbara ọgbụgba ndụ ka mma. Izrel ahụ bụ “Izrel nke Chineke,” nke ghọrọ ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, nke Ndị Kraịst e tere mmanụ mejupụtara. (Gal. 6:16) Ọ bụ ezie na ọgbụgba ndụ ahụ Mozis bụ onye ogbugbo ya nwere iwu Chineke dere n’elu nkume, ma ọgbụgba ndụ nke Jizọs bụ onye ogbugbo ya ka nke ahụ mma. Chineke dere iwu ya n’ime obi ndị mmadụ. (Gụọ 1 Timoti 2:5; Ndị Hibru 8:10.) N’ihi ya, “Izrel nke Chineke” bụzi ihe onwunwe pụrụ iche Chineke nwere, ya bụ, “mba nke na-amị mkpụrụ” nke Alaeze, bụ́ nke Jizọs na-achị. (Mat. 21:43) Ndị bụ́ mba ime mmụọ ahụ so n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. Ma, ọ bụghị naanị ha ga-erite uru na ya. Imeriime mmadụ, ọbụna ọtụtụ ndị nọ n’ụra ọnwụ ugbu a, ga-enweta ngọzi ebighị ebi n’ihi ọgbụgba ndụ ahụ ka mma.

Sọpụrụ Kraịst Maka na Ọ Bụ Onye Nzọpụta

16. (a) Olee ụzọ dị iche iche Jehova si jiri Mozis napụta ụmụ Izrel? (b) Dị ka Ọpụpụ 14:13 kwuru, ònye bụ Onye Nzọpụta anyị?

16 Ụfọdụ ụmụ Izrel nọ n’ezigbo ihe ize ndụ n’abalị ahụ bọtara ụbọchị ha kwapụrụ n’Ijipt. N’abalị ahụ, mmụọ ozi Chineke ga-agagharị n’ala Ijipt wee gbuo ihe niile e bu ụzọ mụọ n’ala ahụ. Jehova gwara Mozis na a gaghị egbu ndị e bu ụzọ mụọ n’Izrel ma ọ bụrụ na ụmụ Izrel ga-efesa ọbara nwa atụrụ Ememme Ngabiga n’elu ọnụ ụzọ ha nakwa n’awara ya abụọ. (Ọpụ. 12:1-13, 21-23) Jehova mere ihe o kwuru. Ka e mechara, Izrel dum chere ezigbo ihe ize ndụ ọzọ ihu. Ha tọrọ n’agbata Oké Osimiri Uhie na ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya ndị agha Ijipt ji chụrụ ha na-abịa. Jehova si n’aka Mozis napụta ha ọzọ mgbe o ji ọrụ ebube mee ka oké osimiri ahụ kewaa abụọ.—Ọpụ. 14:13, 21.

17, 18. Olee otú Jizọs si bụrụ onye nnapụta ka Mozis ukwuu?

17 N’agbanyeghị na nnapụta ahụ a napụtara ụmụ Izrel bụ nnukwu ọrụ ebube, otú Jehova si jiri Jizọs napụta ụmụ mmadụ karịrị ya. Ọ bụ n’aka Jizọs ka e si mee ka ndị na-erubere Chineke isi ghara ịbụkwa ohu mmehie. (Rom 5:12, 18) Nnapụta a napụtara ha “na-adịru mgbe ebighị ebi.” (Hib. 9:11, 12) Aha ahụ bụ́ Jizọs pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.” Ọ bụghị naanị na Jizọs, bụ́ Onye Nzọpụta anyị, na-anapụta anyị na mmehie ndị anyị mere n’oge gara aga, kamakwa, ọ na-eme ka anyị nwee ohere ịdị ndụ ka mma n’ọdịnihu. Mgbe Jizọs napụtara ndị na-eso ụzọ ya n’aka mmehie, o mere ka Chineke ghara iwesa ha iwe, meekwa ka ha na Jehova dịrị ná mma.—Mat. 1:21.

18 N’oge na-adịghị anya, nnapụta ahụ Jizọs napụtara anyị n’aka mmehie ga-agụnye ịnapụta anyị n’aka ihe ọjọọ mmehie kpatara, ya bụ, ọrịa na ọnwụ. Jiri anya nke uche gị hụ ihe nke a pụtara site n’ịtụle ihe mere mgbe Jizọs gara n’ụlọ otu nwoke a na-akpọ Jeirọs, bụ́ onye nwa ya nwaanyị dị afọ iri na abụọ nwụrụ. Jizọs mesiri Jeirọs obi ike, sị: “Atụla egwu, naanị nwee okwukwe, a ga-azọpụta ya.” (Luk 8:41, 42, 49, 50) Ihe ahụ Jizọs kwuru mere, nwa ahụ sikwa n’ọnwụ bilie! Ndị mụrụ ya ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu. Nke a ga-enyere gị aka ịmata ụdị ọṅụ anyị ga-enwe mgbe “ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu [Jizọs] wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) N’ezie, Jizọs bụ Onye Nzọpụta, ya bụ, Onye Nnapụta anyị!—Gụọ Ọrụ 5:31; Taị. 1:4; Mkpu. 7:10.

19, 20. (a) Olee otú ịtụgharị uche n’ọrụ Jizọs, bụ́ Mozis Ka Ukwuu, ga-esi nyere anyị aka? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

19 Ịmata na anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ka ha rite uru na nnapụta Jizọs napụtara ndị mmadụ n’aka mmehie ga-eme ka anyị soro na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. (Aịza. 61:1-3) Ihe ọzọ bụ na ịtụgharị uche n’ọrụ Jizọs, bụ́ Mozis Ka Ukwuu, na-emekwu ka obi sie anyị ike na ọ ga-azọpụta ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ ga-abịa ibibi ndị ajọ omume.—Mat. 25:31-34, 41, 46; Mkp. 7:9, 14.

20 N’ezie, Jizọs bụ Mozis Ka Ukwuu. Ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube Mozis na-arụlighị. Amụma ndị Jizọs buru nakwa ihe ndị o mere maka na ọ bụ onye ogbugbo metụtara mmadụ niile. Nnapụta Jizọs napụtara ụmụ mmadụ agaghị abụ maka nwa oge, kama ọ ga-adịru mgbe ebighị ebi. Ma, a ka nwere ihe ndị ọzọ anyị ga-esi ná ndụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge ochie mata banyere Jizọs. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle otú Jizọs si bụrụ Devid Ka Ukwuu nakwa Sọlọmọn Ka Ukwuu.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

Olee otú Jizọs si kara Mozis ukwuu n’ịrụ ọrụ

• onye amụma?

• onye ogbugbo?

• onye nzọpụta?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Igbe/Foto dị na peeji nke 26]

 Ụzọ Ndị Ọzọ Jizọs na Mozis Si Yie

□ Ha abụọ hapụrụ ọkwá dị elu ka ha wee nwee ike ijere Jehova na ndị ya ozi.—2 Kọr. 8:9; Fil. 2:5-8; Hib. 11:24-26.

□ E tere ha abụọ mmanụ, ọ bụkwa Jehova họpụtara ha.—Mak 14:61, 62; Jọn 4:25, 26; Hib. 11:26.

□ Ha abụọ jere ozi n’aha Jehova.—Ọpụ. 3:13-16; Jọn 5:43; 17:4, 6, 26.

□ Ha abụọ dịcha umeala n’obi.—Ọnụ Ọgụ. 12:3; Mat. 11:28-30.

□ Mozis nyere ìgwè mmadụ nri; Jizọs bụ achịcha na-enye ndụ e ji azụ ìgwè mmadụ.—Ọpụ. 16:12; Jọn 6:48-51.

□ Ha abụọ bụcha ndị ikpe na ndị na-enye iwu.—Ọpụ. 18:13; Mal. 4:4; Jọn 5:22, 23; 15:10.

□ Ha abụọ bụcha ndị isi n’ụlọ Chineke.—Ọnụ Ọgụ. 12:7; Hib. 3:2-6.

□ A kpọrọ ha abụọ ndị àmà Jehova kwesịrị ntụkwasị obi.—Hib. 11:24-29; 12:1; Mkpu. 1:5.

□ Mgbe Mozis na Jizọs nwụrụ, Chineke bupụrụ ozu ha.—Diut. 34:5, 6; Luk 24:1-3; Ọrụ 2:31; 1 Kọr. 15:50; Jud 9.