Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe e si n’eluigwe chụdata Setan n’ụwa?—Mkpu. 12:1-9.

Ọ bụ ezie na akwụkwọ Mkpughe ekwughị kpọmkwem mgbe a chụdatara Setan n’ụwa, ma, o kwuru ọtụtụ ihe ndị merenụ, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata mgbe a chụdatara ya. Nke mbụ n’ime ihe ndị ahụ mere bụ ọmụmụ a mụrụ Alaeze Mesaya. Mgbe nke ahụ gachara, ‘agha dara n’eluigwe,’ bụ́ nke e ji merie Setan wee si n’eluigwe chụdata ya n’ụwa.

Akwụkwọ Nsọ mere ka o doo anya na ọ bụ n’afọ 1914 ka oge a kara aka nke “ndị mba ọzọ” gwụrụ, e wee guzobe Alaeze Chineke. * (Luk 21:24) Mgbe nke ahụ gachara, ọnwa ole gafere tupu agha ahụ adaa n’eluigwe, bụ́ nke e ji chụpụ Setan n’eluigwe?

Mkpughe 12:4 kwuru, sị: “Dragọn ahụ [ya bụ, Setan] guzokwa n’ihu nwaanyị ahụ nke na-aga ịmụ nwa, ka o wee ripịa nwa ya mgbe ọ mụrụ ya.” Nke a na-egosi na Setan chọrọ ịla Alaeze ahụ a mụrụ ọhụrụ n’iyi ozugbo e guzobere ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe ya mee. N’agbanyeghị na ihe Jehova mere mere ka Setan ghara imezu nzube ọjọọ ya, o kpebisiri ike ịla Alaeze ahụ Chineke guzobere ọhụrụ n’iyi. Ọ bụ ya mere “Maịkel na ndị mmụọ ozi ya” ji mee ngwa ngwa chụpụ “dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya” n’eluigwe ka ha ghara ịla Alaeze ahụ n’iyi. Nke a na-egosi na n’oge na-adịghị anya mgbe e guzobechara Alaeze ahụ n’afọ 1914, e meriri Setan ma chụdata ya n’ụwa.

Ihe ọzọ anyị ga-atụle bụ mbilite n’ọnwụ nke Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ nke Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọ malitere ka obere oge gafere mgbe e guzobechara Alaeze ahụ. * (Mkpu. 20:6) Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla n’ime ụmụnna Jizọs, bụ́ ndị e tere mmanụ, e kwuru na o so Jizọs lụso dragọn ahụ na ndị mmụọ ozi ya agha, ọ ghaghị ịbụ na a lụchaala agha ahụ n’eluigwe ma chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya tupu a kpọlitewe ụmụnna Kraịst n’ọnwụ.

Ya mere, Baịbụl ekwughị kpọmkwem mgbe e si n’eluigwe chụdata Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ụwa. Ma, o doro anya na a chụdatara ha ka obere oge gafere mgbe e mechara Jizọs Kraịst eze n’eluigwe n’afọ 1914.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]