Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ebee Ka I Kwesịrị Ịnọ Mgbe A Ga-ebibi Ụwa?

Ebee Ka I Kwesịrị Ịnọ Mgbe A Ga-ebibi Ụwa?

Ebee Ka I Kwesịrị Ịnọ Mgbe A Ga-ebibi Ụwa?

GỊNỊ ga-eme ndị ziri ezi mgbe Jehova ga-ebibi ụwa ọjọọ a n’Amagedọn? Ilu 2:21, 22 zara ajụjụ a. Ọ sịrị: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ọ bụkwa ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta ka a ga-ahapụ n’ime ya. Ma a ga-ebipụ ndị ajọ omume n’ụwa; a ga-efopụkwa ndị na-aghọ aghụghọ na ya.”

Ma, olee ihe ịhapụ ndị na-enweghị ihe a ga-eji taa ha ụta n’ụwa pụtara? È nwere ebe ha ga-agbaba? Ebee ka ndị ziri ezi ga-anọ mgbe a ga-ebibi ụwa? Akụkọ anọ dị n’Akwụkwọ Nsọ na-eme ka anyị mara ebe ha ga-anọ.

Mgbe E Nwere Ebe Ndị Mmadụ Gbabara

Pita nke abụọ isi abụọ amaokwu nke ise ruo asaa kwuru otú Chineke si napụta nna ochie bụ́ Noa na Lọt. Ọ sịrị: “Ọ hapụghịkwa inye ụwa oge ochie ahụhụ, kama o chebere Noa, onye na-ekwusa ezi omume, ya na mmadụ asaa ndị ọzọ, mgbe o ji iju mmiri bibie ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke. Sitekwa n’ime ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, ọ mara ha ikpe, mee ka ha ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ. Ma, ọ napụtara onye ezi omume bụ́ Lọt, onye nwere oké mwute n’ihi mmikpu nke ndị na-eleda iwu anya mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ.”

Olee otú Noa si lanahụ Iju Mmiri ahụ? Chineke gwara Noa, sị: “Ahụla m na ọgwụgwụ nke anụ ahụ́ niile eruwo, n’ihi na ụwa jupụtara n’ime ihe ike n’ihi ha; lee, m na-ebibikọta ha na ụwa. Jiri osisi gofa rụọrọ onwe gị ụgbọ.” (Jen. 6:13, 14) Noa rụrụ ụgbọ ahụ kpọmkwem otú Jehova gwara ya ka o si rụọ ya. Ụbọchị asaa tupu Iju Mmiri ahụ amalite, Jehova gwara ya ka ọ chịba ụmụ anụmanụ n’ụgbọ ahụ, gwakwa ya ka ya na ezinụlọ ya banye na ya. N’ụbọchị nke asaa, e mechiri ụgbọ ahụ, “oké mmiri ozuzo wee zoo n’elu ụwa ruo ụbọchị iri anọ, ehihie na abalị.” (Jen. 7:1-4, 11, 12, 16) ‘E buuru Noa na ezinụlọ ya gafee mmiri ahụ n’enweghị ihe mere ha.’ (1 Pita 3:20) Ha kwesịrị ịnọ n’ụgbọ ahụ ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka a zọpụta ha. E nweghị ebe ọzọ ha ga-anọ n’ụwa dị ndụ.—Jen. 7:19, 20.

Ihe a gwara Lọt ka o mee dịtụ iche n’ihe a gwara Noa. Ndị mmụọ ozi abụọ gwara ya ebe ọ na-agaghị anọ. Ndị mmụọ ozi abụọ ahụ gwara Lọt, sị: “Ndị niile bụ́ ndị gị n’obodo a [ya bụ, Sọdọm], kpọrọ ha pụọ n’ebe a! N’ihi na anyị ga-ebibi ebe a.” A gwara ha ka ha “gbaga n’ógbè bụ́ ugwu ugwu.”—Jen. 19:12, 13, 17.

Akụkọ banyere Noa na Lọt gosiri na “Jehova maara otú o si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke n’ọnwụnwa, ma ọ ga-edebe ndị ajọ omume maka ụbọchị ikpe ka e wee bipụ ha.” (2 Pita 2:9) Ihe mere Jehova ji napụta ndị ya n’oge abụọ a bụ n’ihi ebe ha nọ. Noa banyere n’ụgbọ; Lọt gbapụrụ na Sọdọm. Ma, ọ̀ bụ otú a ka ọ na-adị mgbe niile? Jehova ọ̀ ga-azọpụta ndị ezi omume n’agbanyeghị ebe ọ bụla ha nọ, n’agwaghị ha ka ha gaa n’ebe ọzọ? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị tụlee akụkọ abụọ ọzọ banyere otú Jehova si zọpụta ndị mmadụ.

Ọ̀ Dị Mkpa Mgbe Niile na A Ga-enwe Ebe A Ga-anọ?

Tupu Jehova akpaa Ijipt aka ọjọọ site n’iti ha ihe otiti iri n’oge Mozis, ọ gwara ụmụ Izrel ka ha tee ọbara si n’anụmanụ e ji eme Ememme Ngabiga n’awara ọnụ ụzọ ha. Gịnị mere ha ga-eji mee nke a? Ka ọ ga-abụ ‘mgbe Jehova ga-agabiga ịga tie ndị Ijipt ihe otiti wee hụ ọbara ahụ n’elu ọnụ ụzọ nakwa n’awara ya abụọ, Jehova ga-agabiga ọnụ ụzọ ahụ, ọ gaghị ekwe ka mbibi ahụ rute n’ụlọ ha wee tie ha ihe otiti.’ N’abalị ahụ, “Jehova gburu nwa ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ala Ijipt, malite n’ọkpara Fero bụ́ onye nọ ọdụ n’ocheeze ruo n’ọkpara onye a dọtara n’agha nke nọ n’ụlọ mkpọrọ, nakwa nwa anụ ụlọ ọ bụla e bu ụzọ mụọ.” E nweghị ihe mere ụmụ mbụ niile a mụrụ n’Izrel, n’agbanyeghị na ha agaghị n’ebe ọzọ.—Ọpụ. 12:22, 23, 29.

Tụleekwa banyere Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna nke bi na Jeriko. Ndị Izrel achọwala inweta Ala Nkwa ahụ. Mgbe Rehab chọpụtara na ha na-aga ibibi Jeriko, ọ gwara ndị Izrel abụọ bịara iledo ala ahụ na ụjọ ji ndị obodo ha n’ihi ndị Izrel. O zoro ndị nledo ahụ ma gwa ha ka ha ṅụọrọ ya iyi na a ga-echebe ya na ezinụlọ ya mgbe a ga-ebibi Jeriko. Ndị nledo ahụ gwara Rehab ka ọ kpọkọta ndị ezinụlọ ya n’ime ụlọ ya, bụ́ nke dị ná mgbidi obodo ahụ. A ga-ebibi onye ọ bụla si n’ụlọ ahụ pụọ ma e bibiwe obodo ahụ. (Jọsh. 2:8-13, 15, 18, 19) Ma, Jehova mechara gwa Jọshụa na “mgbidi obodo ahụ ga-adaru ala.” (Jọsh. 6:5) Nke a yiri ka a ga-akwatu ebe ahụ ndị nledo ahụ gwara Rehab ka ya na ezinụlọ ya nọrọ ka e wee ghara ibibi ha. Olee otú a ga-esi zọpụta ha?

Mgbe oge ruru ka e bibie Jeriko, ndị Izrel malitere iti mkpu na ịfụ opi. Jọshụa 6:20 sịrị: “O wee ruo na ozugbo ha [ya bụ, ndị Izrel] nụrụ ụda opi, ndị mmadụ malitekwa iti oké mkpu agha, mgbidi ahụ daruru ala.” Ọ dịghị mmadụ nwere ike ime ka mgbidi ahụ ghara ịda. Ma, ihe dị ebube mere. Mgbidi niile dị n’obodo ahụ dara ma e wezụga ebe ahụ ụlọ Rehab dị. Jọshụa gwara ndị nledo abụọ ahụ, sị: “Banyenụ n’ụlọ nwaanyị ahụ, bụ́ nwaanyị akwụna, kpọpụta nwaanyị ahụ na ndị niile bụ́ nke ya n’ebe ahụ, dị nnọọ ka unu ṅụụrụ ya iyi.” (Jọsh. 6:22) A zọpụtara ndị niile nọ n’ụlọ Rehab.

Olee Ihe Kacha Mkpa?

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú e si napụta Noa, Lọt, ụmụ Izrel n’oge Mozis, na Rehab? Olee otú akụkọ ndị a si enyere anyị aka ịma ebe anyị kwesịrị ịnọ mgbe a ga-ebibi ajọ ụwa a?

Ọ bụ eziokwu na a zọpụtara Noa n’ihi na ọ nọ n’ime ụgbọ ahụ, ma, olee ihe mere o ji nọrọ na ya? Ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe na Chineke, rubekwara ya isi. Baịbụl sịrị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22; Hib. 11:7) Gịnị ka e nwere ike ikwu banyere anyị? Ànyị na-eme ihe niile Chineke nyere anyị n’iwu? Noa bụkwa “onye na-ekwusa ezi omume.” (2 Pita 2:5) Ànyị na-eme ka ya, ya bụ, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ọbụna ma a sị na ndị mmadụ anaghị ege anyị ntị?

Lọt anwụghị mgbe e bibiri Sọdọm n’ihi na ọ gbapụrụ n’obodo ahụ. Ihe mere e ji zọpụta ya bụ na ọ bụ onye ezi omume n’anya Chineke nakwa n’ihi na omume rụrụ arụ nke ndị Sọdọm na Gọmọra na-anaghị asọpụrụ Chineke na-ewute ya nke ukwuu. Omume rụrụ arụ nke juru n’ụwa taa, ọ̀ na-ewute anyị n’ezie? Ka ọ̀ bụ na ihe ndị a amarala anyị ahụ́ nke na ha anaghịzi enye anyị nsogbu? Ànyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime iji bụrụ ndị “na-enweghị ntụpọ na ndị na-enweghị mmerụ na ndị nọ n’udo”?—2 Pita 3:14.

Ihe mere e ji napụta ndị Izrel nọ n’Ijipt nakwa Rehab nọ na Jeriko bụ maka na ha apụghị n’ụlọ ha. Ha mere nke a n’ihi na ha nwere okwukwe na Chineke, rubekwara ya isi. (Hib. 11:28, 30, 31) Cheedị otú ezinụlọ ọ bụla n’Izrel ga-esi na-ele nwa mbụ ha ka ‘oké mkpu ákwá malitere ịda’ n’ụlọ ndị Ijipt niile. (Ọpụ. 12:30) Cheekwa otú Rehab na ezinụlọ ya si kpụkọta isi n’otu ebe ka ha na-anụ ka mgbidi Jeriko daara na-erute na nke ha. Ọ bụ okwukwe siri ike o nwere mere o ji rube isi ma nọrọ n’ụlọ ahụ.

A ga-ebibi ajọ ụwa Setan n’oge na-adịghị anya. Anyị amabeghị otú Jehova ga-esi chebe ndị ya ‘n’ụbọchị iwe ya’ nke ga-adị egwu. (Zef. 2:3) Ma, n’agbanyeghị ebe anyị nọ na ihe bụ́ ọnọdụ anyị n’oge ahụ, ka obi sie anyị ike na a ga-azọpụta anyị ma ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe na Jehova, na-erubekwara ya isi. Ka ọ dịgodị, anyị kwesịrị iji ihe amụma Aịzaya kpọrọ ‘ọnụ ụlọ dị n’ime’ kpọrọ ihe.

“Banye n’Ọnụ Ụlọ Unu Dị n’Ime”

Aịzaya 26:20 kwuru, sị: “Ndị m, gaanụ banye n’ọnụ ụlọ unu dị n’ime, mechiekwanụ ọnụ ụzọ mgbe unu banyesịrị. Zoonụ ruo nwa mgbe nta, ruo mgbe oké iwe gafere.” Ọ ga-abụ na mgbe mbụ amụma a mezuru bụ n’afọ 539 T.O.A., mgbe ndị Midia na Peshia bibiri Babịlọn. Ozugbo Saịrọs onye Peshia banyere na Babịlọn, ọ gwara mmadụ niile ka ha nọrọ n’ime ụlọ ha n’ihi na e nyere ndị agha ya iwu ka ha gbuo onye ọ bụla ha hụrụ n’èzí.

N’oge a, ‘ọnụ ụlọ dị n’ime’ nke e kwuru okwu ya n’amụma a nwere ike ịbụ ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile, bụ́ ndị karịrị otu narị puku. Ọgbakọ ndị a dị oké mkpa ná ndụ anyị. Ha ga-anọgide na-abara anyị uru ruo mgbe anyị gafere ‘oké mkpagbu ahụ.’ (Mkpu. 7:14) E nyere ndị Chineke iwu ka ha banye “n’ọnụ ụlọ [ha] dị n’ime” ma zoo “ruo mgbe oké iwe gafere.” Anyị kwesịrị iji ọgbakọ kpọrọ ihe ma kpebisie ike ịnọsi ike na ya. Anyị kwesịrị ime ihe Pọl dụrụ anyị n’ọdụ. Ọ sịrị: “Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị, dị ka ụfọdụ ndị na-emekarị, kama ka anyị na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka [anyị] na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.”—Hib. 10:24, 25.

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Chineke si zọpụta ndị mmadụ n’oge gara aga?

[Foto dị na peeji nke 8]

N’oge a, gịnị nwere ike ịbụ ‘ọnụ ụlọ dị n’ime’?