Na-eguzosi Ike n’Ihe Ka Ịtaị
Na-eguzosi Ike n’Ihe Ka Ịtaị
“ỌRỤ gị dị ukwuu ma dị ebube, Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. Ụzọ gị ziri ezi, bụrụkwa eziokwu, Eze mgbe ebighị ebi. Olee onye na-agaghị atụ egwu gị, Jehova, ma too aha gị, n’ihi na ọ bụ naanị gị na-eguzosi ike n’ihe?” Abụ a, bụ́ nke “ndị meriri anụ ọhịa ahụ na onyinyo ya” bụrụ n’eluigwe, gosiri na Chineke na-eguzosi ike n’ihe. (Mkpu. 15:2-4) Jehova chọkwara ka ndị na-efe ya na-eguzosi ike n’ihe ka ya, nke bụ́ àgwà magburu onwe ya.—Efe. 4:24.
Ma, Setan bụ́ Ekwensu na-eme ihe niile o nwere ike ime iji kewapụ ndị ohu Chineke nọ n’ụwa n’ịhụnanya nke Chineke ha na-efe. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị eguzosiela ike n’ihe ọbụnadị mgbe ha na-enwe ihe isi ike. Obi dị anyị ụtọ na omume nke ndị a na-eguzosi ike n’ezi ihe na-amasị Jehova! N’ezie, a gwara anyị, sị: “Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.” (Ọma 37:28) Jehova mere ka e dee akụkọ banyere ọtụtụ ndị guzosiri ike n’ihe na Baịbụl iji nyere anyị aka iguzosi ike. Otu n’ime akụkọ ndị ahụ bụ akụkọ banyere Ịtaị onye Gat.
‘Onye Mba Ọzọ na Onye E Si n’Obodo Ọzọ Dọta n’Agha’
Eleghị anya, Ịtaị bụ onye Gat, bụ́ obodo a ma ama na Filistia. Gat bụ obodo nke dike ahụ bụ́ Golayat, bụrụkwa obodo nke ndị ọzọ, bụ́ ndị iro ndị Izrel. Mgbe mbụ anyị nụrụ banyere Ịtaị, onye bụ́ dike n’ịlụ agha, bụ mgbe Absalọm naara Eze Devid ọchịchị. Ịtaị na narị ndị ikom Filistia isii ya na ha so, bụ́ ndị a dọtara n’agha, bi nso ná Jeruselem.
O nwere ike ịbụ na ọnọdụ Ịtaị na ndị so ya mere ka Devid cheta mgbe ya onwe ya nọ na-agba ọsọ ndụ, bụ́ mgbe ya na ndị agha Izrel dị narị isii gara biri n’obodo ndị Filistia ma banye n’obodo Ekish, bụ́ eze Gat. (1 Sam. 27:2, 3) Gịnị ka Ịtaị na ndị ikom ya ga-eme ugbu a Absalọm naara Devid ọchịchị? Hà ga-adụnyere Absalọm úkwù, ka hà ga-anọpụrụ onwe ha iche n’ihi na ọ gbasaghị ha, ka hà ga-akwado Devid na ndị ohu ya?
Weregodị anya nke uche gị hụ ebe Devid, bụ́ onye si na Jeruselem na-agbapụ, kwụsịrị n’ebe a na-akpọ Bet-mehak, nke pụtara “Ụlọ Dị Anya.” Ikekwe ụlọ a bụ ụlọ ikpeazụ mmadụ ga-ahụ na Jeruselem ma ya si Jeruselem na-aga Ugwu Oliv, tupu ya agafee Ndagwurugwu Kidrọn. (2 Sam. 15:17) Mgbe Devid ruru ebe ahụ, o leruru ndị agha ya anya. Mgbe o mere nke a, ọ chọpụtara na ọ bụghị naanị ndị Izrel ka so ya, kamakwa, ndị Keretaịt niile na ndị Peletaịt niile so ya. Ọ chọpụtakwara na ndị Gat niile, ya bụ, Ịtaị na ndị agha ya dị narị isii, so ya.—2 Sam. 15:18.
Devid meteere ha ebere. Ọ gwara Ịtaị, sị: “Gịnị mere gị onwe gị kwa ji na-eso anyị? Laghachi ka gị na eze [ya bụ, Absalọm] biri; n’ihi na ị bụ onye mba ọzọ, e wezụgakwa nke ahụ, ị bụ onye e si n’obodo ya dọta n’agha. Ụnyaahụ ka ị bịara, m̀ ga-emekwa ka i soro anyị na-awagharị taa, ka i soro m na-aga ebe ọ bụla m na-aga? Laghachi, kpọrọkwa ụmụnne gị laghachi, ka Jehova gosikwa gị obiọma na ikwesị ntụkwasị obi!”—2 Sam. 15:19, 20.
Ịtaị kwuru ihe gosiri na ya ga-eguzosi ike n’akụkụ Devid. Ọ sịrị: “Dị nnọọ ka Jehova dị ndụ, dịkwa nnọọ ka onyenwe m eze dị ndụ, n’ebe onyenwe m eze nọ, ma ọ bụ n’ọnwụ ma ọ bụ ná ndụ, n’ebe ahụ ka ohu gị ga-anọ!” (2 Sam. 15:21) Ọ ga-abụ na ihe a Ịtaị kwuru chetaara Devid ihe nne nne ya bụ́ Rut kwuru. (Rut 1:16, 17) Ihe a Ịtaị kwuru metụrụ Devid n’obi. O wee gwa ya, sị: “Gawa, gafere” Ndagwurugwu Kidrọn. “Ịtaị onye Gat wee gafere, tinyere ndị ikom ya niile na ụmụntakịrị niile so ya.”—2 Sam. 15:22.
“Iji Nye Anyị Ntụziaka”
Ndị Rom 15:4 sịrị: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka.” Ya mere, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe a Ịtaị mere? Chegodị ihe ọ ga-abụ ya mere o ji guzosie ike n’akụkụ Devid. Ọ bụ ezie na ọ bụ onye mba ọzọ na onye e si Filistia dọta n’agha, Ịtaị kweere na Jehova bụ Chineke dị ndụ, kwerekwa na Devid bụ onye Jehova tere mmanụ. Ịtaị ekweghị ka iro ahụ dị n’etiti ndị Izrel na ndị Filistia mee ka o buwere Devid iro. O kweghị ka ogbugbu Devid gburu dike ndị Filistia bụ́ Golayat na ọtụtụ ndị agha ndị Filistia mee ka ọ kpọọ Devid asị. (1 Sam. 18:6, 7) Ọ ma na Devid hụrụ Jehova n’anya, makwara na Devid nwere àgwà ọma. Nke a mekwara ka Devid na-akwanyere Ịtaị ùgwù. Devid mere “Ịtaị . . . onyeisi nke otu ụzọ n’ụzọ atọ” nke ndị agha ya, mgbe ya na Absalọm na-alụ agha.—2 Sam. 18:2.
Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ebe mmadụ si, ma ọ bụ agbụrụ ya, ma ọ bụkwanụ nsogbu anyị na onye ahụ nwere n’oge gara aga, mee ka anyị ghara ịhụ àgwà ọma ndị onye ahụ nwere. Otú Devid na Ịtaị si bụrụ enyi na-egosi na ọ bụrụ na anyị amara Jehova ma hụ ya n’anya, anyị agaghị na-akpa okè.
Mat. 24:14; 28:19, 20) ‘Olee ókè m dịruru njikere iguzosi ike n’akụkụ Kraịst?’
Ka anyị na-eche banyere ihe a Ịtaị mere, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eme ka Ịtaị wee na-eguzosi ike n’akụkụ Devid ahụ Ka Ukwuu, bụ́ Kraịst Jizọs? M̀ na-egosi na m na-eguzosi ike n’akụkụ ya site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke ma na-enyere ndị ọzọ aka ịghọ ndị na-eso ụzọ Jizọs?’ (Ọ ga-adị mma ka ndị isi ezinụlọ na-echebara otú Ịtaị si guzosie ike n’akụkụ Devid echiche. Otú o si guzosie ike n’akụkụ Devid na otú o si dị njikere iso eze Chineke tere mmanụ, mere ka ndị agha ya ṅomie ya. N’otú aka ahụ, mkpebi ndị isi ezinụlọ mere ịkwado ofufe Jehova nwere ike imetụta ezinụlọ ha, o nwekwara ike ime ka ihe sitụrụ ha ike. Ma, obi siri anyị ike na “onye na-eguzosi ike n’ihe ka [Jehova] ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe.”—Ọma 18:25.
O nweghị ihe ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere Ịtaị mgbe Devid na Absalọm lụchara agha. Ma, ihe Okwu Chineke kọtụụrụ anyị banyere ya na-eme ka anyị ghọta otú o si kpaa àgwà mgbe ihe na-esiri Devid ike. Odide e dere akụkọ banyere Ịtaị na Baịbụl na-egosi na Jehova na-ahụ ndị na-eguzosi ike n’ihe, ọ na-akwụkwa ha ụgwọ.—Hib. 6:10.