Ndị Bụ́ Di, Nweenụ Ịhụnanya Ka Kraịst!
Ndị Bụ́ Di, Nweenụ Ịhụnanya Ka Kraịst!
N’ABALỊ bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi, sị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.” (Jọn 13:34, 35) N’ezie, ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị ịhụ ibe ha n’anya.
N’akwụkwọ ozi Pọl onyeozi dere, ọ gwara Ndị Kraịst bụ́ di ihe ha kwesịrị ime. O dere sị: “Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:25) Olee otú Onye Kraịst bụ́ di nwere ike isi mee ihe a e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ, karịchaa ma ọ bụrụ na nwunye ya bụ onye raara onwe ya nye Jehova?
Kraịst Na-elekọta Ọgbakọ Ya
Baịbụl kwuru, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya, dị ka Kraịst na-emekwara ọgbakọ ya.” (Efe. 5:28, 29) Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya, o jighịkwa ha egwu egwu. Ọ na-elekọtakwa ha. N’agbanyeghị na ha ezughị okè, o ji obi umeala na obiọma meso ha ihe. O lekwasịrị anya n’àgwà ọma ndị na-eso ụzọ ya nwere ka o wee nwee ike “chee ọgbakọ ahụ n’ihu onwe ya n’ịma mma ya.”—Efe. 5:27.
Di kwesịrị ikwu ihe ndị na-egosi na ọ hụrụ nwunye ya n’anya dị ka Kraịst si hụ ọgbakọ ya n’anya. O kwesịkwara igosi nke a n’omume. Obi na-adị nwaanyị ọ bụla di ya na-egosikarị na ya hụrụ ya n’anya mma, nwaanyị ahụ na-enwekwa obi ụtọ. Ma, nwaanyị nke bi n’ọmarịcha ụlọ nke nwere ihe niile e ji ebi n’ụlọ nwere ike ghara inwe obi ụtọ n’ihi na di ya leghaara ya anya.
Olee otú di ga-esi na-egosi na ya hụrụ nwunye ya n’anya? O kwesịrị ikwu okwu n’ụzọ na-egosi na ọ na-akwanyere nwunye ya ùgwù mgbe ọ na-egosi ndị ọzọ nwunye ya, o kwesịkwara ịna-aja nwunye ya mma n’ezoghị ọnụ maka otú o si enyere ya aka. Ọ bụrụ na nwunye ya mere ihe ga-eme ka ihe na-aga nke ọma n’ezinụlọ ha, o kwesịrị ịgwa ya ndị ọzọ. Mgbe naanị ha nọ, o kwesịrị ịna-eme ihe ndị na-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya. Imetụ ya aka, ịchị ọchị, ịmakụ ya, na ịja ya mma, nwere ike iyi obere ihe n’anya, ma, ha na-atọ ụmụ nwaanyị ụtọ.
“Ihere Adịghị Eme Ya Ịkpọ Ha ‘Ụmụnna’”
‘Ihere emeghị Jizọs Kraịst ịkpọ ụmụazụ ya e tere mmanụ ụmụnna ya.’ (Hib. 2:11, 12, 17) Ọ bụrụ na ị bụ di bụ́ Onye Kraịst, cheta na nwunye gị bụ nwanna gị nwaanyị. Nrara ọ raara onwe ya nye Jehova ka nkwa ahụ o kwere mgbe unu gbara akwụkwọ mkpa, n’agbanyeghị ma è mere ya baptizim tupu unu alụọ ma ọ̀ bụ mgbe unu lụchara. Mgbe nwanna nke na-eduzi ọmụmụ ihe chọrọ ịkpọ nwunye gị ka ọ zaa ajụjụ, ọ na-akpọ ya “Nwanna Nwaanyị,” dị ka o kwesịrị. Ọ bụkwa nwanna gị nwaanyị, ma mgbe unu nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ma mgbe unu nọ n’ụlọ unu. Otú ahụ o si dị mkpa ka i jiri obiọma na-emeso ya ihe ma na-akwanyere ya ùgwù n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka ọ dịkwa mkpa ka ị na-eme n’ụlọ unu.
Ọ bụrụ na i nwere ọrụ ndị ị na-arụ n’ọgbakọ, mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri gị ike ịrụzu ọrụ ndị i kwesịrị ịrụ ma n’ezinụlọ gị ma n’ọgbakọ. Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ndị ọzọ nwere ike inyere gị aka ná nke a, i nwekwara ike ikenye ndị ọzọ ọrụ ụfọdụ ka i wee nwee ike inwekwu ohere lekọta nwanna nwaanyị ị dị ezigbo mkpa, ya bụ, nwunye gị. Cheta na ụmụnna nwoke ndị ọzọ ga-arụli ọrụ ndị ị na-arụ n’ọgbakọ, ma, ọ bụ naanị gị na nwunye gị ka e jikọtara ọnụ.
Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụ gị bụ isi nwunye gị. Baịbụl kwuru, sị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla; nwoke bụkwa isi nke nwaanyị.” (1 Kọr. 11:3) Olee otú i kwesịrị isi na-arụ ọrụ gị ka onye bụ́ isi? Ị ga-eji ịhụnanya na-arụ ya, ọ bụghị ichetara nwunye gị amaokwu a mgbe niile ma na-agwa ya na o kwesịrị ịna-akwanyere gị ùgwù. Ihe ga-eme ka ị bụrụ ezigbo onyeisi bụ iṅomi Jizọs Kraịst n’otú i si emeso nwunye gị ihe.—1 Pita 2:21.
“Unu Bụ Ndị Enyi M”
Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ndị enyi ya. Ọ gwara ha, sị: “Adịkwaghị m akpọ unu ndị ohu, n’ihi na ohu adịghị ama ihe nna ya ukwu na-eme. Kama ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.” (Jọn 15:14, 15) Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-akparịta ụka nke ọma. Ha na-emekọkwa ihe ọnụ. A kpọrọ “Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya” oriri alụmdi na nwunye na Kena. (Jọn 2:2) E nwere ebe ndị na-amasịkarị ha ịnọ, dị ka n’ogige Getsemeni. Baịbụl kwuru na “Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya zukọrọ n’ebe ahụ ọtụtụ mgbe.”—Jọn 18:2.
Ọ na-amasị nwaanyị ịma na ya na di ya bụ ezigbo enyi. Di na nwunye imekọ ihe ndị ga na-enye ha obi ụtọ ọnụ dị ezigbo mkpa. Na-efekọnụ Chineke ọnụ. Na-amụkọnụ Baịbụl ọnụ. Na-anọkọnụ. Na-akparịtanụ nkata, na-erikọkwanụ nri. Bụrụnụ di na nwunye, bụrụkwanụ ezigbo enyi.
“Ọ Hụrụ Ha n’Anya Ruo Ọgwụgwụ”
Jizọs ‘hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya ruo ọgwụgwụ.’ (Jọn 13:1) Ụfọdụ ndị di anaghị eṅomi Kraịst na nke a. Ha na-ahapụ ‘nwunye ha lụrụ n’okorobịa,’ ikekwe gaa lụrụ ụmụ agbọghọ.—Mal. 2:14, 15.
Ndị ọzọ, dị ka Willi, na-eṅomi Kraịst. Willi lekọtara nwunye ya ọtụtụ afọ n’ihi ọrịa ọ na-arịa. Olee otú nke a dị Willi? Ọ sịrị: “M na-ewere nwunye m ka onyinye Chineke nyere m, ejighị m ya egwu egwu. E wezụga nke ahụ, afọ iri isii gara aga, ekwere m ya nkwa na m ga na-elekọta ya ma mgbe ihe dị mma ma mgbe ihe na-adịghị mma. Agaghị m echefu nkwa ahụ.”
Ndị Kraịst bụ́ di, nweenụ ịhụnanya ka Kraịst. Na-elekọtanụ ndị nwunye unu, bụ́ ndị na-efe Chineke, ndị bụ́kwa ụmụnna unu nwaanyị na ndị enyi unu.
[Foto dị na peeji nke 20]
Nwunye gị ọ̀ bụ ezigbo enyi gị?
[Foto dị na peeji nke 20]
‘Na-ahụ nwunye gị n’anya’