Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Ọganihu Unu Pụta Ìhè

Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Ọganihu Unu Pụta Ìhè

Ndị Na-eto Eto, Meenụ Ka Ọganihu Unu Pụta Ìhè

“Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.”—1 TIM. 4:15.

1. Gịnị ka Chineke chọrọ ka ndị na-eto eto nwee?

EZE Sọlọmọn maara ihe, onye chịrị Izrel oge ochie, dere, sị: “Ṅụrịa ọṅụ, nwa okorobịa, mgbe ị bụ okorobịa, ka obi na-atọkwa gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 11:9) Ọ bụ Jehova Chineke, bụ́ onye chọrọ ka ndị na-eto eto na-enwe obi ụtọ, mere ka Sọlọmọn kwuo ihe a. Ọ bụghị naanị mgbe ị na-eto eto ka Jehova chọrọ ka ị na-enwe ọṅụ, ọ chọkwara ka ị na-enwe ọṅụ ruo n’agadi. Ma, ndị na-eto eto na-emehiekarị ihe, bụ́ ihe nwere ike ime ka ha ghara inwe obi ụtọ n’ọdịnihu. Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Job nwere mgbe ọ kwara arịrị maka “ihe [o] metara n’oge okorobịa.” (Job 13:26) Onye Kraịst ọ bụla na-eto eto nwere mkpebi ndị dị ezigbo mkpa ọ na-aghaghị ime ná ndụ ya. Ọ bụrụ na o mee mkpebi na-adịghị mma, o nwere ike ịna-enye ya nsogbu n’obi, kpatakwara ya nsogbu ndị ọ na-agaghị esili na ha pụta ná ndụ ya niile.—Ekli. 11:10.

2. Olee ndụmọdụ Baịbụl nyere nke ndị na-eto eto ga-aṅa ntị na ya ka ha wee ghara ime ihe ndị nwere ike ịkpatara ha nsogbu?

2 Ndị na-eto eto kwesịrị ime mkpebi ndị ziri ezi. Lee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere ndị Kọrịnt. O dere, sị: “Unu abụla ụmụaka n’ike ịghọta ihe . . . Bụrụnụ dimkpa n’ike ịghọta ihe.” (1 Kọr. 14:20) Ọ bụrụ na ndị na-eto eto anara ndụmọdụ a Pọl nyere, ya bụ, ka anyị gbalịa na-eche echiche ka dimkpa, ọ ga-eme ka ha ghara ime ihe ndị ga-akpatara ha nsogbu.

3. Olee ihe i nwere ike ime ka i wee tozuo okè?

3 Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, mara na ị ghaghị ịna-agbasi mbọ ike ka i wee tozuo okè. Pọl gwara Timoti, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya n’ihi na ị bụ okorobịa. Kama nke ahụ, bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe nlereanya, n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha. . . . Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. . . . Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha, ka ọganihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ.” (1 Tim. 4:12-15) Ndị Kraịst na-eto eto kwesịrị ime ka ọganihu ha pụta ìhè n’ebe ndị ọzọ nọ.

Gịnị Bụ Ọganihu?

4. Gịnị ka inwe ọganihu ime mmụọ gụnyere?

4 Inwe ọganihu pụtara ịnọgide na-eme nke ọma. Pọl gbara Timoti ume ka ọ na-etinye mgbalị ka o wee nwee ọganihu n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha, nakwa n’ikwusa ozi ọma. Ọ ga-agbalịsi ike bụrụ ezigbo ihe nlereanya. N’ezie, Timoti kwesịrị ịnọgide na-enwe ọganihu ime mmụọ.

5, 6. (a) Olee mgbe ọganihu Timoti malitere ịpụta ìhè? (b) Olee otú ndị na-eto eto n’oge a nwere ike isi ṅomie Timoti n’ime ka ọganihu ha pụta ìhè?

5 Mgbe Pọl dere ndụmọdụ ahụ n’ihe dị ka n’agbata afọ 61 na afọ 64 O.A., Timoti abụrụla okenye ọtụtụ afọ. Ọ bụghị n’oge ahụ ka ọ malitere inwe ọganihu ime mmụọ. N’afọ 49 ma ọ bụ n’afọ 50 O.A., bụ́ mgbe Timoti dị ihe dị ka afọ iri abụọ, “ụmụnna nọ na Listra na Aịkoniọm,” bụ́ ndị hụrụ otú o si na-enwe ọganihu, kọrọ “akụkọ ọma banyere ya.” (Ọrụ 16:1-5) N’oge ahụ, Pọl kpọọrọ Timoti na-eje ozi ala ọzọ. Mgbe ọnwa ole na ole gara, mgbe Pọl hụrụ na Timoti enwekwuola ọganihu, o zigara ya Tesalonaịka ka ọ gaa kasie Ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ obi ma mee ka ha sie ike. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 3:1-3, 6.) O doro anya na ọ bụ mgbe Timoti bụ okorobịa ka ọ malitere ime ka ọganihu ya pụta ìhè n’ebe ndị ọzọ nọ.

6 Unu ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ, gbalịanụ ka unu nwee àgwà dị mma ugbu a, ka e wee hụ ọganihu unu n’otú unu si ebi ndụ Ndị Kraịst nakwa n’otú unu si akụzi eziokwu dị na Baịbụl. Jizọs malitere mgbe ọ dị afọ iri na abụọ “na-enwekwu amamihe.” (Luk 2:52) Ka anyị tụlee otú ị ga-esi mee ka ọganihu gị pụta ìhè n’ụzọ ebe atọ ná ndụ gị: (1) mgbe nsogbu bịaara gị, (2) mgbe ị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye, na (3) ka ị na-agbalị ịbụ “ezi onye ozi.”—1 Tim. 4:6.

Nwee “Uche Zuru Okè” Mgbe Nsogbu Bịaara Gị

7. Olee ihe nsogbu na-abịara ndị na-eto eto nwere ike ime ha?

7 Otu nwanna nwaanyị nke dị afọ iri na asaa aha ya bụ Carol kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, obi anaghị adị m mma, ike ụwa na-agwụkwa m nke na ọ na-adị m ka m ghara iteta ụra n’ụtụtụ.” * Gịnị mere ike ụwa ji na-agwụ ya? Mgbe Carol dị afọ iri, papa ya na mama ya gbara alụkwaghịm, nke a mekwara ka ya na mama ya, bụ́ onye na-anaghị eme ihe Baịbụl kwuru, biri. Dị ka Carol, o nwere ike ịbụ na i nwere nsogbu ụfọdụ ndị na-eyighị ka hà ga-akwụsị akwụsị.

8. Olee nsogbu ndị Timoti nwere?

8 Mgbe Timoti nọ na-enwe ọganihu ime mmụọ, o nwekwara nsogbu ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ “na-arịakarị” ọrịa n’ihi nsogbu afọ. (1 Tim. 5:23) Mgbe Pọl zigara ya Kọrịnt ka ọ gaa lebara nsogbu nke ụfọdụ ndị na-enupụrụ Pọl isi kpatara anya, Pọl gbara ụmụnna ndị nọ ebe ahụ ume ka ha kwanyere Timoti ùgwù ka ‘egwu ọ bụla ghara ịtụ ya’ n’etiti ha. (1 Kọr. 4:17; 16:10, 11) O nwere ike ịbụ na Timoti bụ onye ihere.

9. Gịnị bụ uche zuru okè, oleekwa otú o si dị iche na mmụọ nke ụjọ?

9 Iji nyere Timoti aka, Pọl nwere mgbe o chetaara ya, sị: “Chineke nyere anyị, ọ bụghị mmụọ nke ụjọ, kama nke ike na nke ịhụnanya na nke uche zuru okè.” (2 Tim. 1:7) Inwe “uche zuru okè” pụtara iche echiche nke ọma. Ọ pụtakwara anyị inwe ike idi ihe ndị bịaara anyị, a sịgodị na ha abụghị ihe ndị anyị tụrụ anya ha. Ụfọdụ ndị na-eto eto, bụ́ ndị na-esighị ike n’ọgbakọ, na-egosi na ha nwere mmụọ nke ụjọ site n’ime ihe ndị ga-eme ka ha chefuo nsogbu ndị bịaara ha. Ha na-ehi oké ụra ma ọ bụ na-ekiri televishọn mgbe niile, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, na-aṅụbiga mmanya okè, na-agakarị nnọkọ oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ na-akwa iko. A dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha “jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka [ha] na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.”—Taị. 2:12.

10, 11. Olee otú inwe uche zuru okè si enyere anyị aka ịbụ Ndị Kraịst kwụsiri ike?

10 Baịbụl dụsiri “ụmụ okorobịa ọdụ ike ka ha nwee uche zuru okè.” (Taị. 2:6) Ihe ga-egosi na ị na-eme nke a bụ ma ọ bụrụ na ị na-ekpeku Chineke ekpere mgbe nsogbu bịaara gị ma nwee obi ike na ọ ga-enye gị ume idi ya. (Gụọ 1 Pita 4:7.) Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, obi ga-esi gị nnọọ ike na ị ga-enweta ‘ike nke Chineke na-enye.’—1 Pita 4:11.

11 Ọ bụ uche zuru okè na ekpere nyeere Carol aka. O kwuru, sị: “Otu n’ime ihe kacha siere m ike omume bụ igosi mama m na akwadoghị m omume rụrụ arụ ọ na-eme. Ma, ekpere nyeere m nnọọ aka. Ama m na Jehova nọnyeere m, n’ihi ya, anaghịzi m atụ onye ọ bụla egwu.” Cheta na nsogbu nwere ike ime ka ị bụrụ ezigbo mmadụ, meekwa ka obi sikwuo gị ike. (Ọma 105:17-19; Ákwá 3:27) N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị, Chineke agaghị ahapụ gị. Ọ “ga-enyere gị aka.”—Aịza. 41:10.

Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Ga-aga nke Ọma

12. Olee ihe mere Onye Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ga-eji mee ihe e dere n’Ilu 20:25?

12 Ụfọdụ ndị na-eto eto ejirila ọsọ gaa lụọ di ma ọ bụ nwunye n’ihi na ha chere na ọ ga-eme ka obi kwụsị ịna-ajọ ha njọ, ka owu kwụsị ịna-ama ha, ka ike ụwa ghara ịna-agwụ ha, meekwa ka ha kwụsị ịna-enwe nsogbu ndị ha na-enwe n’ụlọ ha. Ma, nkwa di na nwunye kwere onwe ha n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ abụghị ihe e ji egwu egwu. N’oge ochie, e nwere ụfọdụ ndị ji ọsọ kwe Chineke nkwa n’ebughị ụzọ chee echiche. (Gụọ Ilu 20:25.) Mgbe ụfọdụ, ndị na-eto eto anaghị ebu ụzọ chebara ihe dị n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye echiche. Ha na-emecha chọpụta na ọ bụghị ihe e ji egwu egwu.

13. Olee ụfọdụ ajụjụ ndị chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịjụ onwe ha, oleekwa ndụmọdụ ga-enyere ha aka?

13 N’ihi ya, tupu gị na nwoke ma ọ bụ nwaanyị ekwuwe okwu ọlụlụ, jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere m ji chọọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye? Olee ihe ndị m na-atụ anya ha? Ihe ọ̀ ga-adabara mụ na onye a ma anyị lụọ? M̀ ga-arụli ọrụ di ma ọ bụ nwunye kwesịrị ịrụ?’ Iji nyere gị aka ka i nyochaa onwe gị nke ọma, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ebipụtala isiokwu dị iche iche banyere okwu a. * (Mat. 24:45-47) Were isiokwu ndị ahụ ka ndụmọdụ si n’aka Jehova. Chebara ihe ndị e kwuru na ha echiche nke ọma ma mee ihe ndị ha kwuru. Adịla ka “ịnyịnya ma ọ bụ ịnyịnya ibu na-enweghị uche.” (Ọma 32:8, 9) Bụrụ dimkpa n’ịghọta ihe dị n’ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ọ bụrụ na obi gị agwa gị na i toruola ịlụ di ma ọ bụ nwunye, cheta na i kwesịrị ịbụ ‘ihe nlereanya n’ịdị ọcha.’—1 Tim. 4:12.

14. Olee otú inwe ọganihu ime mmụọ nwere ike isi nyere gị aka ma ị lụọ di ma ọ bụ nwunye?

14 Onye tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ ga-enwe ihe ịga nke ọma ma ọ lụchaa di ma ọ bụ nwunye. Onye Kraịst tozuru okè na-agbalịsi ike ‘itoru otú Kraịst toruru.’ (Efe. 4:11-14) Ọ na-arụsi ọrụ ike ka o wee nwee ike ịna-akpa àgwà ka Kraịst. Kraịst, bụ́ Onye Anyị Kwesịrị Iṅomi, “emeghị ihe masịrị onwe ya.” (Rom 15:3) Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ, udo na obi ụtọ ga-adị n’ezinụlọ ha. (1 Kọr. 10:24) Di ga-ahụ nwunye ya n’anya nke ukwuu, nwaanyị kwesịkwara ịna-edo onwe ya n’okpuru di ya, dị ka Jizọs doro onwe ya n’okpuru onye bụ́ Isi ya.—1 Kọr. 11:3; Efe. 5:25.

“Jezuo Ozi Gị”

15, 16. Olee otú i nwere ike isi mee ka ọganihu gị pụta ìhè n’ozi ọma?

15 Mgbe Pọl gwara Timoti ọrụ dị mkpa Timoti ga-arụ, o dere, sị: “Ana m enyesi gị iwu ike n’ihu Chineke na Kraịst Jizọs, . . . kwusaa okwu Chineke, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya.” O dekwara, sị: “Rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma, jezuo ozi gị.” (2 Tim. 4:1, 2, 5) Timoti ‘ga-eji okwu okwukwe zụọ’ onwe ya ka o wee nwee ike ịrụ ọrụ a e nyere ya.—Gụọ 1 Timoti 4:6.

16 Olee otú ị ga-esi ‘jiri okwu okwukwe zụọ’ onwe gị? Pọl dere, sị: “Na-etinyesi mgbalị ike n’ịgụ ihe n’ihu ọha, n’inye ndụmọdụ, n’izi ihe. Na-echebara ihe ndị a echiche; na-etinye obi gị dum na ha.” (1 Tim. 4:13, 15) Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ inwe ọganihu, ọ ga na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya. Okwu ahụ bụ́ “na-etinye obi gị dum na ha” pụtara mmadụ imikpu onwe ya n’ihe. Olee otú i si amụ ihe? Ị̀ na-etinye obi gị dum ‘n’ihe ndị miri emi nke Chineke’? (1 Kọr. 2:10) Ka ị̀ na-amụ ha elu elu? Ichebara ihe ị na-amụ echiche ga-eme ka ị na-eme ihe ị na-amụta.—Gụọ Ilu 2:1-5.

17, 18. (a) Olee àgwà ndị i kwesịrị ịgbalị ka i nwee? (b) Olee otú inwe ụdị obi Timoti nwere ga-esi nyere gị aka n’ozi ọma?

17 Otu nwa agbọghọ bụ́ ọsụ ụzọ aha ya bụ Michelle kwuru, sị: “M na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya ka m wee na-ezi ozi ọma nke ọma. Nke a emeela ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.” Ịsụ ụzọ ga-eme ka ị mara otú e si eji Baịbụl ezi ozi ọma nke ọma, ọ ga-emekwa ka i nwee ọganihu ime mmụọ. Gbalịa ka ị na-agụ ihe nke ọma, na-azakwa ajụjụ nke ọma n’ọmụmụ ihe. Iji gosi na ị bụ nwa okoro ma ọ bụ nwa agbọghọ na-enwe ọganihu, i kwesịrị ịna-akwadebe ihe omume e nyere gị n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, jirikwa ebe ihe omume gị si na-akwadebe ya.

18 Mmadụ ‘ịrụ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma’ pụtara onye ahụ izisa ozi ọma nke ọma nakwa inyere ndị ọzọ aka ka ha nweta nzọpụta. Ị ga-enwe “nkà izi ihe” ka i wee mee nke a. (2 Tim. 4:2) Ọ bụrụ na ịna-eso ndị bụ́ aka ochie na-aga ozi ọma, ị ga-amụta otú ha si ekwusa ozi ọma, otú ahụ Timoti mụtara n’aka Pọl. (1 Kọr. 4:17) Mgbe Pọl na-ekwu okwu banyere ndị o nyeere aka, ọ sịrị na e wezụga ikwusara ha ozi ọma, na ya nyere ha ‘mkpụrụ obi ya,’ ma ọ bụ na ya ji ndụ ya nyere ha aka, n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. (1 Tesa. 2:8) Ọ bụrụ na ị chọrọ iṅomi otú Pọl si kwusaa ozi ọma, ị ghaghị inwe ụdị obi Timoti nwere, bụ́ onye hụrụ ndị ọzọ n’anya ma “bụrụ ohu n’ime ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Gụọ Ndị Filipaị 2:19-23.) Ị̀ na-eme ihe niile i nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma ahụ dị ka Timoti mere?

Inwe Ọganihu Na-enye Obi Ụtọ

19, 20. Gịnị mere inwe ọganihu n’ọgbakọ ji eweta ọṅụ?

19 Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ inwe ọganihu ime mmụọ, ọ ghaghị ịrụsi ọrụ ike. Ma, ọ bụrụ na i jiri ndidi na-eme ka nkà i ji ezi ihe na-aka mma, ka oge na-aga, ị ga-enwe ihe ùgwù nke ime ka “ọtụtụ ndị baa ọgaranya” n’ụzọ ime mmụọ, ha ga-aghọkwa “ọṅụ [gị] ma ọ bụ okpueze aṅụrị” gị. (2 Kọr. 6:10; 1 Tesa. 2:19) Fred, bụ́ onye ọsụ ụzọ oge niile, kwuru, sị: “M na-eji oge dị ukwuu ugbu a enyere ndị ọzọ aka karịa mgbe ọ bụla ọzọ. O doola m anya na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”

20 Otu nwa agbọghọ bụ́ onye ọsụ ụzọ oge niile aha ya bụ Daphne kwuru banyere ọṅụ na obi ụtọ ọ na-enwe n’ihi ọganihu ọ na-enwe n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Mụ na Jehova adịkwuola ná mma ka m na-amatakwu ụdị onye ọ bụ. Ọ bụrụ na i jiri obi gị dum na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ, ị ga-enwe nnọọ obi ụtọ!” Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ agaghị achọpụtacha mgbe anyị na-enwe ọganihu ime mmụọ, Jehova na-ahụ ya, ọ na-amasịkwa ya. (Hib. 4:13) Obi abụọ ọ bụla adịghị ya na unu, bụ́ Ndị Kraịst na-eto eto, nwere ike ito Nna anyị nke eluigwe. Na-emenụ ka obi ya na-aṅụrị ka unu ji obi unu dum na-eme ka ọganihu unu na-apụta ìhè.—Ilu 27:11.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha.

^ par. 13 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ọ̀ Ga-adabara Mụ na Onye a ma Anyị Lụọ?” nke dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Abụọ; na “Nduzi Chineke Maka Ịhọrọ Onye Òtù Ọlụlụ,” nke dị n’Ụlọ Nche nke May 15, 2001; nakwa “Àdị M Njikere Maka Alụmdi na Nwunye?” nke dị n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke Mbụ.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Gịnị ka inwe ọganihu n’ọgbakọ pụtara?

• Olee otú i nwere ike isi mee ka ọganihu gị pụta ìhè . . .

mgbe nsogbu bịaara gị?

mgbe ị na-achọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye?

n’ozi ọma?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 15]

Ekpere nwere ike inyere gị aka idi ihe isi ike

[Foto dị na peeji nke 16]

Olee otú ndị nkwusa na-eto eto nwere ike isi mụta otú e si akụzi ihe nke ọma?