Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Oge Ịgbachi Nkịtị”

“Oge Ịgbachi Nkịtị”

“Oge Ịgbachi Nkịtị”

OTU ilu a na-atụ n’Eshia kemgbe ụwa sịrị: “Ikwu okwu dị ka ọlaọcha, ịgbachi nkịtị dị ka ọlaedo.” Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na ilu ndị Hibru nke yiri ilu a bụ: “Ọ bụrụ na a ga-ere otu mkpụrụ okwu otu shekel, a ga-ere ịgbachi nkịtị shekel abụọ.” Eze Sọlọmọn, bụ́ eze ma ihe, nke chịrị Izrel n’oge ochie dere, sị: “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, ihe ọ bụla a na-eme n’okpuru eluigwe nwekwara oge . . . oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.”—Ekli. 3:1, 7.

Olee mgbe anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị kama ikwu okwu? Okwu bụ́ “ịgbachi nkịtị,” “gbachi nkịtị,” “gba nkịtị,” “ịgba nkịtị,” na “gbara nkịtị” hiri nne na Baịbụl. Ihe a na-ekwu n’ebe ndị e dere ha na-egosi na ịgbachi nkịtị dị mma, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, n’ụzọ ebe atọ ná ndụ. Ka anyị hụ otú mmadụ ịgbachi nkịtị si egosi na onye ahụ na-asọpụrụ ndị ọzọ, nakwa na o nwere amamihe na nghọta. Anyị ga-ahụkwa otú ịgbachi nkịtị si enyere mmadụ aka ịtụgharị uche.

Ihe Na-egosi na Mmadụ Na-asọpụrụ Ndị Ọzọ

Mmadụ ịgbachi nkịtị na-egosi na onye ahụ na-asọpụrụ ndị ọzọ, nakwa na ọ na-akwanyere ha ùgwù. Habakọk onye amụma kwuru, sị: “Jehova nọ n’ụlọ nsọ ya. Derenụ duu n’ihu ya, unu ụwa dum!” (Hab. 2:20) Ezigbo ndị na-efe Jehova kwesịrị ‘ịgba nkịtị chere nzọpụta ya.’ (Ákwá 3:26) Otu ọbụ abụ bụrụ abụ, sị: “Gbachie nkịtị n’ihu Jehova, cheresie ya ike. Ewesola onye ọ bụla nke na-eme ka ụzọ ya gaa nke ọma iwe.”—Ọma 37:7.

Ànyị nwere ike ito Jehova n’ekwughị okwu? Mgbe ụfọdụ, ọ bụrụ na anyị ahụ otú ihe Chineke kere si maa mma ọ̀ bụ na ọ naghị eri anyị ọnụ nke na anyị anaghị enwe ike ikwu ihe ọ bụla? Iche banyere otú ihe ahụ si maa mma ọ́ bụghị otu ụzọ anyị si eto Onye Kere anyị n’obi anyị? Ọbụ abụ bụ́ Devid malitere otu n’ime abụ ndị ọ bụrụ site n’ịsị: “Chineke, ọ bụ gị nwe otuto na ịgba nkịtị n’ime Zayọn; a ga-emezukwa nkwa e kwere gị.”—Ọma 65:1.

Anyị kwesịrị ịsọpụrụ Jehova, kwanyekwara ihe niile o kwuru ùgwù. Dị ka ihe atụ, mgbe onye amụma Chineke, bụ́ Mozis, gwara mba Izrel okwu ikpeazụ, ya na ndị nchụàjà dụrụ ndị niile nọ ebe ahụ ọdụ, sị: “Nọrọ jụụ . . . , gee ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị.” Ọbụna ụmụaka ndị Izrel kwesịrị ịnọrọ jụụ na-ege ntị mgbe ụmụ Izrel gbakọtara maka ịgụ Iwu Chineke. Mozis sịrị: ‘Kpọkọta ụmụ Izrel, ndị ikom na ndị inyom na ụmụntakịrị ka ha wee mụta ihe.’—Diut. 27:9, 10; 31:11, 12.

N’oge anyị a, ndị na-efe Jehova kwesịkwara iji nkwanye ùgwù na-ege ntị ma ha gaa ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbakọ Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị na ibe anyị na-ekwu ihe ọzọ mgbe a nọ n’ikpo okwu na-akọwa eziokwu dị mkpa dị na Baịbụl, ọ́ gaghị egosi na anyị anaghị akwanyere Okwu Chineke na ọgbakọ ya ùgwù? Anyị kwesịrị ịgbachi nkịtị ma gewe ntị mgbe ihe omume na-aga n’ihu.

Mmadụ ige ntị mgbe ya na onye ọzọ na-akparịta ụka na-egosikwa na ọ na-asọpụrụ onye ahụ. Dị ka ihe atụ, nna ochie bụ́ Job gwara ndị ahụ nọ na-ebo ya ebubo, sị: “Zienụ m ihe, mụ onwe m ga-agbakwa nkịtị.” Job dị njikere ịgbachi nkịtị ma gewe ha ntị mgbe ha na-ekwu okwu. Mgbe ha kwuchara, ya achọọ ikwu, ọ gwara ha, sị: “Derenụ duu n’ihu m, ka m kwuo okwu.”—Job 6:24; 13:13.

Ihe Na-egosi na Mmadụ Nwere Amamihe na Nghọta

Baịbụl sịrị: “Onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.” “Onye nghọta ya dị ukwuu na-agbachi nkịtị.” (Ilu 10:19; 11:12) Tụlee ụzọ mara mma Jizọs si jiri amamihe na nghọta mee ihe site n’ịgbachi nkịtị mgbe ụfọdụ. Mgbe o doro ya anya na ịgwa ndị iro ya obi na-adịghị mma okwu abaghị uru, ọ “gbachiri nkịtị.” (Mat. 26:63) E mechaa, mgbe Paịlet na-ekpe ya ikpe “ọ zaghị ihe ọ bụla.” O ji akọ gba nkịtị ka ọrụ niile ọ rụrụ n’ihu ọha gbaara ya àmà.—Mat. 27:11-14.

Anyị kwesịkwara iji amamihe na-agba nkịtị, karịchaa, mgbe a kpasuru anyị iwe. Otu ilu sịrị: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ jupụtara ná nghọta, ma onye na-adịghị enwe ndidi na-ebuli nzuzu elu.” (Ilu 14:29) Mmadụ nwere ike ikwu ihe ga-emecha wute ya ma ọ bụrụ na ọ zaghachi mmadụ okwu ozugbo onye ahụ gwara ya ihe were ya iwe. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ, anyị nwere ike ikwu ihe na-adịghị mma nke nwere ike ime ka obi ghara ịdị anyị mma.

Anyị na-egosi na anyị ma ihe ma ọ bụrụ na anyị na-akpachara anya n’ihe anyị na-ekwu mgbe anyị bịara n’ihu ndị iro anyị. Ọ bụrụ na ndị na-akwa emo amalite ịkwa anyị emo mgbe anyị na-eje ozi ọma, ịgbachi ha nkịtị nwere ike ịbụ ihe kacha mma anyị ga-eme. Ọ̀ bụ na ọ kaghị mma ịgbachi nkịtị mgbe ụfọdụ iji gosi na okwu rere ure ụmụ akwụkwọ ibe anyị ma ọ bụ ndị ọrụ ibe anyị na-ekwu adịghị anyị mma? (Efe. 5:3) Otu ọbụ abụ dere, sị: “M ga-eji ihe kechie ọnụ m iji chee ya nche, mgbe onye ọ bụla bụ́ onye ajọ omume nọ n’ihu m.”—Ọma 39:1.

“Onye nghọta ya dị ukwuu” anaghị akọrọ onye ọzọ ihe ọ na-ekwesịghị ịkọrọ ya. (Ilu 11:12) Ezigbo Onye Kraịst anaghị eghewe ọnụ ya oghe na-akọrọ ndị ọzọ ihe a na-ezo ezo. Ndị okenye ọgbakọ aghaghị ịkpachara anya na nke a ka ndị nọ n’ọgbakọ ha wee na-atụkwasị ha obi.

Ọ bụ ezie na onye gbara nkịtị enweghị ihe o kwuru, ma, ezigbo ihe nwere ike isi na ya pụta. Sydney Smith, bụ́ onye na-ede akwụkwọ n’ihe karịrị otu narị afọ gara aga, dere banyere otu n’ime ndị ya na ha dịkọrọ ndụ, sị: “Otú o si agbachi nkịtị mgbe ụfọdụ na-eme ka ndị mmadụ nwee mmasị ige ntị n’ihe ọ na-ekwu mgbe ọ bụla o tinyere ọnụ n’okwu.” N’ezie, mkparịta ụka enyi na enyi na-enwe kwa ụbọchị kwesịrị ịbụ onye kwuo nwanne ya ekwuo. Ihe e ji ama onye ma ka e si akparịta ụka bụ na ọ na-ege ntị nke ọma.

Sọlọmọn dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị, ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.” (Ilu 10:19) Ya mere, ọ bụrụ na anyị na-ekwu ihe ole na ole, ọ ga-adịrị anyị mfe ijite onwe anyị ka anyị ghara ikwu ihe ezi uche na-adịghị na ya. N’ezie, “mgbe onye ọ bụla nke dị nzuzu gbachiri nkịtị, a ga-ewere ya dị ka onye maara ihe; a ga-ewerekwa onye mechiri ọnụ ya dị ka onye nwere nghọta.” (Ilu 17:28) Ya mere, ka anyị rịọ Jehova n’ekpere ka o ‘chee egbugbere ọnụ anyị nche.’—Ọma 141:3.

Ihe Ga-enyere Anyị Aka Ịna-atụgharị Uche

Akwụkwọ Nsọ gwara anyị na onye na-achụso ụzọ ezi omume ‘na-agụ iwu Chineke n’olu dị ala ehihie na abalị.’ (Ọma 1:2) Nsụgharị Bible Nsọ nke Union Version sịrị: ‘Ọ bụ n’iwu Ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abalị.’ Olee mgbe ga-akachara anyị mma ịtụgharị uche n’iwu Chineke?

Aịzik, nwa Ebreham, bụ́ nna ochie, “pụtara n’ihe dị ka oge mgbede na-ejegharị n’ọhịa ka o wee tụgharịa uche.” (Jen. 24:63) Ọ họọrọ oge ọ ga-anọ naanị ya nakwa ebe ụzụ na-adịghị ka o wee tụgharịa uche. Eze Devid na-atụgharị uche n’oge nche abalị, mgbe ebe niile dara jụụ. (Ọma 63:6) Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè mgbe ọ nọ n’ụwa, na-agbasi mbọ ike inwe oge ọ ga-anọ naanị ya n’ugwu, n’ọzara, nakwa n’ebe ndị ọzọ ndị mmadụ na-anaghị anọ, iji tụgharịa uche.—Mat. 14:23; Luk 4:42; 5:16.

Ịgbachi nkịtị na-abara anyị uru. Oge anyị gbachiri nkịtị nwere ike ime ka anyị nwee ohere inyocha onwe anyị, bụ́ ihe na-enyere mmadụ ezigbo aka ịma ebe ọ ga-edozi ná ndụ ya. Nkịtị mmadụ gbachiri nwere ike ime ka obi ruo ya ala. Ịtụgharị uche mgbe ebe niile dara jụụ nwere ike ime ka anyị dị obi umeala, meekwa ka anyị na-echebara ihe ndị dị mkpa ná ndụ echiche.

O bụ eziokwu na ịgbachi nkịtị dị mma, ma, e nwere “oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Taa, ndị na-efe Chineke ofufe na-ezisa ozi ọma n’esepụghị aka “n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Ihe ha na-arụpụta bụ ụzụ na-adasi ike nke ndị na-enubata ife Chineke na-eme n’ihi ọṅụ ha na-enwe. (Maị. 2:12) Ka anyị soro ná ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, na-agwakwa ndị mmadụ ọrụ dị iche iche dị ebube Chineke rụrụ. Ka anyị na-arụ ọrụ a dị mkpa, ka otú anyị si ebi ndụ na-egosi na anyị ma na e nwere mgbe e kwesịrị ịgbachi nkịtị.

[Foto dị na peeji nke 3]

Mgbe anyị gara ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị ịṅa ntị n’ihe a na-amụ

[Foto dị na peeji nke 4]

Ọ bụrụ na ndị mmadụ akparịa anyị mgbe anyị nọ ozi ọma, ịgbachi ha nkịtị nwere ike ịbụ ihe kacha mma anyị ga-eme

[Foto dị na peeji nke 5]

Ịgbachi nkịtị na-enyere anyị aka ịtụgharị uche