Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eso “Kraịst”?
Olee Ihe Mere Anyị Ga-eji Na-eso “Kraịst”?
“Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya . . . nọgidekwa na-eso m.”—LUK 9:23.
1, 2. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị tụlee ihe mere anyị ji kwesị ịna-eso “Kraịst”?
OBI dị Jehova ụtọ nke ukwuu ịhụ ndị ọhụrụ nwere mmasị na ndị na-eto eto n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ na-efe ya ofufe. Ọ bụrụ na ị nọgide na-amụ Baịbụl, na-aga ọmụmụ ihe mgbe niile, ma matakwuo eziokwu na-echebe ndụ, nke dị n’Okwu Chineke, ị ga-eme ihe ahụ Jizọs gwara anyị ka anyị mee. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya ma bulie osisi ịta ahụhụ ya kwa ụbọchị, nọgidekwa na-eso m.” (Luk 9:23) Ihe Jizọs na-ekwu bụ na i kwesịrị ịjụ onwe gị ma ghọọ onye na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị tụlee ihe mere anyị ji kwesị ịna-eso “Kraịst.”—Mat. 16:13-16.
2 Oleekwanụ maka anyịnwa ndị maliterela na-eso nzọụkwụ Jizọs Kraịst? A gbara anyị ume ka anyị “na-eme ya n’ụzọ zuru ezu karị.” (1 Tesa. 4:1, 2) Ma ànyị malitere ife Jehova na nso nso a ma ọ̀ dịla anya anyị malitere, ịtụgharị uche n’ihe mere anyị ji na-eso Kraịst ga-eme ka anyị mee ihe ahụ Pọl gbara anyị ume ka anyị na-eme, ọ ga-emekwa ka anyị nọgide na-eso Jizọs kwa ụbọchị n’ụzọ zuru ezu karị. Ka anyị tụlee ihe ise mere anyị kwesịrị iji na-eso Kraịst.
Ka Anyị na Jehova Wee Dịkwuo ná Mma
3. Olee ụzọ abụọ anyị nwere ike isi mụta banyere Jehova?
3 Mgbe Pọl onyeozi nọ na-agwa ndị Atens Ọrụ 17:22, 26, 27) Anyị nwere ike ịchọ Chineke wee mata ya n’ezie. Dị ka ihe atụ, ihe ndị e kere eke na-eme ka anyị mata àgwà na ikike Chineke nke ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi ekele na-atụgharị uche n’ihe ndị Onye Okike kere, ọ ga-eme ka anyị mụta ihe dị ukwuu banyere ya. (Rom 1:20) Jehova mere ka a mara onye ọ bụ n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl. (2 Tim. 3:16, 17) Ọ bụrụ na anyị ‘na-atụgharịkwu uche n’ọrụ’ Jehova ma ‘na-echebara ihe ndị o mere echiche,’ anyị ga-amụtakwu banyere Jehova.—Ọma 77:12.
okwu, o “guzoro ọtọ n’etiti Ariopagọs,” wee sị: “[Chineke] kpebikwara oge dị iche iche a kara aka, kpaakwara ebe obibi nke ụmụ mmadụ ókè. ka ha wee chọọ Chineke, ka ha wee sọọ ìsì ma chọta ya n’ezie, ọ bụ ezie na ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (4. Olee otú iso Kraịst ga-esi mee ka anyị na Jehova nwee ike ịdịkwu ná mma?
4 Ụzọ kacha mma anyị na Jehova ga-esi dịkwuo ná mma bụ iso Kraịst. Chegodị banyere ebube Jizọs nwere n’akụkụ Nna ya “mgbe ụwa na-adịbeghị.” (Jọn 17:5) Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere.” (Mkpu. 3:14) Ebe ọ bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke,” ya na Nna ya, bụ́ Jehova, ebiela ogologo oge n’eluigwe. Tupu Jizọs abịa n’ụwa, o mere ihe karịrị naanị ịnọ n’akụkụ Nna ya. Ya na Chineke na-anọ mgbe niile, o jikwa obi ụtọ soro ya rụkọọ ọrụ. Ya na Chineke dị n’ezigbo mma karịa onye ọ bụla ọzọ. Jizọs hụrụ otú Nna ya si eme ihe, mara otú ihe si emetụ ya n’obi, marakwa àgwà ya dị iche iche. Ọ mụtakwara ihe ndị ahụ niile Nna ya na-eme ma mee ha. Ọ bụ ihe ndị a mere Ọkpara ahụ na-erube isi ji dị ka Nna ya nke na Baịbụl kpọrọ ya “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Kọl. 1:15) Ọ bụrụ na anyị ana-esochi Kraịst anya, anyị na Jehova ga-adịkwu ná mma.
Ka Anyị Wee Ṅomikwuo Jehova
5. Olee ihe ga-eme ka anyị nwee ike iṅomi Jehova nke ọma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
5 E kere anyị ‘n’onyinyo Chineke, dị ka oyiyi ya si dị,’ n’ihi ya, anyị ga-akpali àgwà ka ya. (Jen. 1:26) Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.’ (Efe. 5:1) Iso Kraịst ga-eme ka anyị nwee ike iṅomi Nna anyị nke eluigwe. Nke a bụ eziokwu n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ ṅomiri otú Chineke si eche echiche na otú o si eme ihe karịa Jizọs, ọ bụkwa naanị ya ga-akụziri anyị banyere Jehova nke ọma. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ihe karịrị naanị ime ka ndị mmadụ mara aha Jehova. O mere ka ndị mmadụ mara ụdị onye Jehova bụ. (Gụọ Matiu 11:27.) Jizọs mere nke a site n’okwu ọnụ na n’omume, kụzikwaara ndị mmadụ banyere ya.
6. Olee ihe ndị anyị mụtara banyere Jehova site n’ihe ndị Jizọs kụziri?
6 Jizọs kụziiri anyị ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme nakwa otú Chineke si ele ndị na-efe ya anya. (Mat. 22:36-40; Luk 12:6, 7; ) Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs kwuru banyere otu n’ime Iwu Iri ahụ, nke bụ́, “akwala iko,” o mere ka a mara otú Chineke si ele ihe mmadụ na-eche n’echiche tupu ya akwaa iko anya. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” ( 15:4-7Ọpụ. 20:14; Mat. 5:27, 28) Mgbe Jizọs kwuchara otú ndị Farisii si kọwahie otu n’ime Iwu Mozis, bụ́ nke ha sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya ma kpọọ onye iro gị asị,” o kwuziri ihe bụ́ echiche Jehova wee, sị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akpagbu unu.” (Mat. 5:43, 44; Ọpụ. 23:4; Lev. 19:18) Ịmata echiche Chineke na ihe ndị ọ na-eme nakwa ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme ga-eme ka anyị nwee ike iṅomi ya nke ọma.
7, 8. Olee ihe anyị na-amụta banyere Jehova site n’ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ?
7 Ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ mere ka anyị mata ụdị onye Nna ya bụ. Ọ bụrụ na anyị agụọ Oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn ma hụ otú Jizọs si nwee ọmịiko n’ahụ́ ndị nọ ná mkpa na ndị na-ata ahụhụ, na otú o si wesa ndị na-eso ụzọ ya iwe mgbe ha baara ụmụaka chọrọ ịbịakwute ya mba, ọ̀ bụ na ihe ndị a anaghị egosi anyị na ọ bụ otú a ka Nna ya si eme? (Mak 1:40-42; 10:13, 14; Jọn 11:32-35) Chegodị otú ihe ndị Jizọs mere si mee ka anyị mara àgwà Chineke. Ọrụ ebube ndị Kraịst rụrụ, ọ̀ naghị egosi na Jizọs nwere ike dị ukwuu ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ime? N’agbanyeghị nke ahụ, ọ dịghị mgbe o ji ike ya mee ihe ga-abara onwe ya uru ma ọ bụkwanụ jiri ya merụọ ndị ọzọ ahụ́. (Luk 4:1-4) Otú Jizọs si chụpụ ndị anyaukwu nọ n’ụlọ nsọ na-ere ahịa gosiri na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. (Mak 11:15-17; Jọn 2:13-16) Ihe ndị ọ kụziri na okwu ọma ndị o kwuru, bụ́ ndị ruru ndị mmadụ n’obi, gosiri na ọ “ka Sọlọmọn” nwee amamihe. (Mat. 12:42) Baịbụl kọwara nke ọma ụdị ịhụnanya Jizọs gosiri site n’ịtọgbọ mkpụrụ obi ya maka ndị ọzọ. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a.”—Jọn 15:13.
8 Ọkpara Chineke kwuru nnọọ okwu ka Nna ya, meekwa ka Nna ya mgbe ọ nọ n’ụwa nke na ọ sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Gụọ Jọn 14:9-11.) Onye na-eso Kraịst na-esokwa Jehova.
Jizọs Bụ Onye Jehova Tere Mmanụ
9. Ole mgbe Jizọs ghọrọ Onye Chineke Tere Mmanụ, oleekwa otú o si ghọọ ya?
9 Chegodị echiche banyere otu ihe mere n’oge osisi na-agbụsị akwụkwọ n’afọ 29 O.A. N’oge ahụ, Jizọs, onye dị afọ iri atọ, gakwuuru Jọn Onye Na-eme Baptizim ka o mee ya baptizim. “Mgbe e mesịrị Jizọs baptizim, o si na mmiri ahụ bilie ozugbo; ma, lee! eluigwe meghere, o wee hụ ka mmụọ Chineke na-efedata dị ka nduru wee bekwasị ya.” Mgbe ahụ ka ọ ghọrọ Kraịst, ma ọ bụ Mesaya. Jehova ji ọnụ ya kwuo na Jizọs bụ Onye ya Tere Mmanụ. Ọ sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:13-17) Nke a bụ nnọọ ihe kwesịrị ime ka anyị na-eso Kraịst.
10, 11. (a) Olee ụzọ dị iche iche e si kpọọ Jizọs utu aha ahụ bụ́ “Kraịst”? (b) Olee ihe mere anyị ji kwesị iso Jizọs Kraịst?
10 Na Baịbụl, e nwere ụzọ dị iche iche e si kpọọ Jizọs utu aha ahụ bụ́ “Kraịst,” dị ka, Jizọs Kraịst, Kraịst Jizọs, na Kraịst. Jizọs bụ onye mbụ kpọrọ onwe ya “Jizọs Kraịst,” ya bụ, o bu ụzọ kpọọ aha ya Jọn 17:3) Otú a e si akpọ aha a na-eme ka anyị cheta onye Chineke zitere, bụ́ onye ghọrọ Onye o Tere Mmanụ. Ọ bụrụ na e buru ụzọ kpọọ utu aha ya tupu aha ya, ya bụ, “Kraịst Jizọs,” ihe a na-akọwa bụ ọkwá ya, ma ọ bụ ọrụ ọ na-arụ, ọ bụghị ya onwe ya. (2 Kọr. 4:5) Utu aha ahụ bụ́ “Kraịst,” bụ ụzọ ọzọ e si akọwa ọrụ Jizọs dị ka Mesaya.—Ọrụ 5:42.
tupu utu aha ya. Mgbe o kpekuru Nna ya ekpere, ọ sịrị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (11 N’agbanyeghị otú ọ bụla e si kpọọ Jizọs utu aha ahụ́ bụ́ “Kraịst,” otu eziokwu dị mkpa nke pụtara ìhè bụ: N’agbanyeghị na Ọkpara Chineke bịara n’ụwa wee mee ka ụmụ mmadụ mara uche Nna ya, ọ bụghị mmadụ nkịtị ma ọ bụkwanụ onye amụma nkịtị; kama, ọ bụ Onye Jehova Tere Mmanụ. Anyị ga na-eso ya mgbe niile.
Ọ Bụ Naanị n’Aka Jizọs Ka A Ga-esi Zọpụta Anyị
12. Olee ihe Jizọs gwara Tọmọs onyeozi, bụ́ nke bakwaara anyị uru?
12 Ihe ọzọ dị mkpa mere anyị ga-eji na-eso Mesaya ahụ bụ ihe ọ gwara ndịozi ya kwesịrị ntụkwasị obi obere oge tupu e gbuo ya. Mgbe Jizọs na-aza Tọmọs ajụjụ ọ jụrụ ya maka na ọ gwara ha na ya na-aga ịkwadebere ha ebe, ọ sịrị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:1-6) Ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi ka Jizọs gwara okwu ahụ. O kwere nkwa na ya ga-enye ha ebe n’eluigwe, nkwa ahụ bakwaara ndị nwere olileanya idi ndụ ebighị ebi n’ụwa uru. (Mkpu. 7:9, 10; 21:1-4) Olee otú o si baara ha uru?
13. Olee otú Jizọs si bụrụ “ụzọ”?
13 Jizọs Kraịst bụ “ụzọ.” Ya bụ, ọ bụ naanị site na ya ka anyị ga-enwe ike ịgakwuru Chineke. Nke a bụ eziokwu mgbe a bịara n’ihe banyere ekpere, n’ihi na ọ bụ naanị mgbe anyị kpere ekpere n’aha Jizọs ka anyị ga-enwe olileanya na Nna anyị ga-emere anyị ihe anyị rịọrọ ya ma ọ bụrụ na o kwekọrọ n’uche Ya. (Jọn 15:16) Ma, o nwekwara ihe ọzọ mere Jizọs ji bụrụ “ụzọ.” Mmehie mere ka ụmụ mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. (Aịza. 59:2) Jizọs nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Mat. 20:28) Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ọbara Jizọs . . . na-asachapụ anyị mmehie niile.” (1 Jọn 1:7) Ọkpara ahụ si otú a megheere anyị ụzọ ka anyị na Chineke wee dị ná mma. (Rom 5:8-10) Ọ bụ mgbe anyị nwere okwukwe na Jizọs ma na-erubere ya isi ka anyị na Chineke ga-adị ná mma.—Jọn 3:36.
14. Olee otú Jizọs si bụrụ “eziokwu”?
14 Jizọs bụ “eziokwu,” ọ bụghị naanị n’ihi na ọ kụziri eziokwu ma bie ndụ kwekọrọ n’ihe ọ kụziri, kamakwa, amụma niile e buru banyere Mesaya mezuru n’ahụ́ ya. Pọl onyeozi dere, sị: “N’agbanyeghị ole nkwa Chineke dị, ha abụrụwo Ee site na ya.” (2 Kọr. 1:20) Ọbụna “onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa,” bụ́ ndị e dere n’Iwu Mozis, ghọrọ ihe e ji n’aka na ha ga-emezu site n’aka Kraịst Jizọs. (Hib. 10:1; Kọl. 2:17) Amụma niile dị na Baịbụl hiwere isi n’ebe Jizọs nọ, ha na-emekwa ka anyị ghọta ọrụ Jizọs na-arụ iji mezuo nzube Jehova. (Mkpu. 19:10) Ọ bụrụ na anyị chọrọ irite uru mgbe Chineke ga-emezu ihe o zubeere anyị, anyị kwesịrị iso Mesaya ahụ.
15. Olee otú Jizọs si bụrụ “ndụ”?
Rom 6:23) Jizọs bụkwaara ndị nwụrụ anwụ “ndụ.” (Jọn 5:28, 29) Chetụgodị ihe ọ ga-eme n’oge Ọchịchị Otu Puku Afọ ya, mgbe ọ ga-arụ ọrụ o ji bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà. N’eziokwu, ọ ga-anapụta ndị ọ ga-achị, bụ́ ndị nọ n’ụwa, n’aka mmehie na ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi.—Hib. 9:11, 12, 28.
15 Jizọs bụ “ndụ” n’ihi na o ji ọbara ya zụta mmadụ niile, ndụ ebighị ebi bụkwa onyinye Chineke na-enye “site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.” (16. Olee ihe mere anyị ga-eji na-eso Jizọs?
16 Ihe Jizọs zara Tọmọs baara anyị ezigbo uru. Jizọs bụ ụzọ, eziokwu na ndụ. Chineke zitere ya n’ụwa ka ọ zọpụta ụwa. (Jọn 3:17) Ọ dịghịkwa onye na-abịakwute Nna ya ma ọ́ bụghị site na ya. Baịbụl kwuru hoo haa, sị: “Nzọpụta adịghịkwa n’onye ọ bụla ọzọ, n’ihi na aha ọzọ adịghị n’okpuru eluigwe nke e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta anyị.” (Ọrụ 4:12) N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe anyị kweere na mbụ, ọ dị mkpa ka anyị kwere na Jizọs, ma soro ya, iji wee nweta ndụ.—Jọn 20:31.
E Nyere Anyị Iwu Ka Anyị Na-ege Kraịst Ntị
17. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị na-erubere Ọkpara Chineke isi?
17 Pita, Jọn, na Jems hụrụ mgbe Jizọs nwoghara. N’oge ahụ, ha nụrụ olu si n’eluigwe, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m họpụtara. Geenụ ya ntị.” (Luk 9:28, 29, 35) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị rube isi n’iwu ahụ Chineke nyere anyị ka anyị gee Mesaya ahụ ntị.—Gụọ Ọrụ 3:22, 23.
18. Olee otú anyị ga-esi gee Jizọs Kraịst ntị?
18 Ige Jizọs ntị gụnyere ‘ilegide anya n’ebe ọ nọ, na ichesi echiche ike banyere ihe nlereanya ya.’ (Hib. 12:2, 3) N’ihi ya, anyị kwesịrị ‘ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị’ anyị na-agụ na Baịbụl nakwa n’ihe ndị anyị na-agụ n’akwụkwọ anyị dị iche iche banyere Jizọs, bụ́ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” bipụtara. Anyị kwesịkwara ‘ime ka uche anyị dịrị n’ihe ndị’ anyị na-anụ banyere Jizọs mgbe anyị gara ọmụmụ ihe. (Hib. 2:1; Mat. 24:45) Ka anyị kpebisie ike ige onye na-azụ anyị dị ka atụrụ, bụ́ Jizọs, ntị ma na-eso ya.—Jọn 10:27.
19. Olee ihe ga-eme ka anyị na-eso Kraịst mgbe niile?
19 Ànyị nwere ike iso Kraịst mgbe niile, n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị? Ee, anyị nwere ike, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ ike” site n’iji “okwukwe na ịhụnanya ndị dị n’ime Kraịst Jizọs” na-eme ihe ndị anyị na-amụta.—2 Tim. 1:13.
Olee Ihe Ị Mụtara?
• Olee otú iso “Kraịst” ga-esi mee ka anyị na Jehova dịkwuo ná mma?
• Gịnị mere iso Jizọs na iso Jehova ji bụrụ otu ihe?
• Olee otú Jizọs si bụrụ “ụzọ na eziokwu na ndụ”?
• Olee ihe mere anyị ga-eji gee Onye Jehova Tere Mmanụ ntị?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 29]
Ihe ndị Jizọs ziri gosiri na echiche Jehova karịrị nke mmadụ
[Foto dị na peeji nke 30]
Anyị aghaghị iji ikwesị ntụkwasị obi na-eso Onye Jehova Tere Mmanụ
[Foto dị na peeji nke 32]
Jehova sịrị: “Onye a bụ Ọkpara m . . . geenụ ya ntị”