Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ị Na-alụbeghị Di ma Ọ Bụ Nwunye
Ihe Ga-eme Ka Ị Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ị Na-alụbeghị Di ma Ọ Bụ Nwunye
“HA EWEE lụọ onwe ha, wee na-enwe obi ụtọ.” Otú a ka ndị na-ede akwụkwọ ụmụaka na-esikarị emechi akụkọ ha na-akọrọ ụmụaka. Fim ụfọdụ na akwụkwọ ọgụgụ ụfọdụ na-egosikwa na ọ bụrụ na nwoke ma ọ bụ nwaanyị chọrọ inwe obi ụtọ, o kwesịrị ịlụ nwunye ma ọ bụ di. E wezụga nke ahụ, n’ọtụtụ ebe, a na-akwanyekarị ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ịga lụọ nwunye ma ọ bụ di. Debby kwuru mgbe ọ dị afọ iri abụọ na ụma, sị: “Ndị mmadụ na-eme ka ọ dị ka o nweghị ihe nwa agbọghọ bụ ma ọ bụrụ na ọ lụbeghị di. Ha na-ekwu na mgbe nwa agbọghọ na-amalite inwe obi ụtọ bụ mgbe ọ lụrụ di.”
Ma, onye na-ele ihe anya otú Jehova si ele ihe anya anaghị eche otú ahụ. Ọ bụ ezie na ndị Izrel ji ịlụ di na nwunye kpọrọ ihe, ma, Baịbụl kwuru okwu banyere ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-alụghị nwunye ma ọ bụ di, bụ́ ndị nwere obi ụtọ ná ndụ ha. Taa, e nwere ụfọdụ Ndị Kraịst kpebiri na ha agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, nweekwa ọtụtụ ndị ọzọ na-alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi otú ihe si kwụrụ. N’agbanyeghị ihe mere mmadụ ji ghara ịlụ di ma ọ bụ nwunye, o nwere otu ajụjụ dị mkpa, ya bụ: Olee otú Onye Kraịst na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike isi na-enwe obi ụtọ?
Jizọs alụghị nwaanyị, nke a bụ n’ihi ọrụ ọ bịara ịrụ n’ụwa. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya na ụfọdụ n’ime ha “ga-emeli” ihe ahụ o mere. (Mat. 19:10-12) Jizọs si otú a gosi na tupu mmadụ enwee ike ịnọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ọ ga-ebu ụzọ kpebie n’obi ya na ya ga-emeli ya.
Ndụmọdụ a Jizọs nyere, ọ̀ bụ naanị maka onye kpebiri na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye ka o wee nwee ike iji oge ya niile jeere Chineke ozi? (1 Kọr. 7:34, 35) Ọ bụchaghị otú ahụ. Tụlee banyere Onye Kraịst chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye ma ọ hụbeghị onye dị ya mma ọ ga-alụ. Ana, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, nke dị afọ iri atọ na ụma kwuru, sị: “Na nso nso a, otu onye ọrụ anyị na-abụghị Onyeàmà gwara m na ya chọrọ ịlụ m. Obi tọrọ m ụtọ ná mmalite, ma ekpebiri m ozugbo na m gaghị alụ ya n’ihi na m chọrọ ịlụ onye ga-eme ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma.”
Ọchịchọ ọtụtụ ụmụnna nwaanyị chọrọ ịlụ di “n’ime Onyenwe anyị” emeela ka ha ghara ịlụ ndị na-ekweghị ekwe. * (1 Kọr. 7:39; 2 Kọr. 6:14) N’ihi ndụmọdụ a Chineke nyere, ha na-ekpebi na ha agabeghị alụ di. Olee otú ha ga-esi nwee ike ime nke a?
Lekwasị Anya n’Uru Dị na Ya
Ọ bụ anyịnwa ga-ama ma anyị ga-edili ihe ọ bụla bịaara anyị, a sịgodị na ọ bụghị ihe anyị chọrọ. Carmen, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụghị di, nke dị afọ iri anọ na ụma kwuru, sị: “Ihe m nwere juru m afọ, ihe na-erughị m aka anaghị echu m ụra.” Nke bụ́ 1 Pita 5:9, 10.
eziokwu bụ na o nwere mgbe owu na-ama ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, nweekwa mgbe obi na-ajọ ha njọ. Ma, ịmara na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile na-enwekwa nsogbu ndị dị otú ahụ na-eme ka ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye jiri obi ike na-edi ya. Jehova enyerela ọtụtụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye aka inwe obi ụtọ, o nyekwarala ha aka imeri nsogbu ndị ọzọ na-abịara ha.—Ọtụtụ Ndị Kraịst achọpụtala na o nwere uru dị n’alụghị di ma ọ bụ nwunye. Ester, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, onye dị ihe dị ka afọ iri atọ na ọkara kwuru, sị: M chere na ihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ ịchọpụta uru dị n’ọnọdụ ọ bụla ọ hụrụ onwe ya. Carmen kwukwara, sị: “M kwetara na ọ bụrụ na m bute ihe banyere Alaeze Chineke ụzọ ná ndụ m, na Jehova ga-agọzi m, ma m̀ lụrụ di ma ọ bụ na mụ alụghị. (Ọma 84:11) E nwere ike ihe agaghị adị otú m si tụọ anya ya, ma, enwere m obi ụtọ, m ga-anọgidekwa na-enwe obi ụtọ.”
Ndị Na-alụghị Di na Nwunye, Bụ́ Ndị E Kwuru Okwu Ha na Baịbụl
Ada Jefta ekpebighị na ya agaghị alụ di. Ma, nkwa nna ya kwere Jehova mere ka o biri n’ụlọ nsọ na-eje ozi malite n’oge ọ bụ agbọghọ gawa. O doro anya na ọrụ a ọ na-atụghị anya ya meghasịrị ihe ndị ọ chọrọ ime ná ndụ, o nwekwara ike ịbụ na ọ bụchaghị obi ya ịrụ ọrụ ahụ. O ruru uju ọnwa abụọ mgbe ọ matara na ya agaghị alụ di mụọ ụmụ nke ya. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ nabatara ọnọdụ ọ banyere na ya ma jiri obi ya dum jeere Jehova ozi ná ndụ ya niile. Ụmụ nwaanyị Izrel ndị ọzọ na-aga n’ụlọ nsọ kwa afọ iji jaa ya mma maka otú o si wepụta onwe ya na-ejere Jehova ozi.—Ikpe 11:36-40.
O nwere ike ịbụ na ụfọdụ ndị bụ́ ndị ọnaozi n’oge Aịzaya nọ ndụ enwechaghị mmasị n’ọnọdụ ha. Baịbụl ekwughị ihe mere ha ji bụrụ ndị ọnaozi. Ọ bụ ya mere ha esoghị n’ọgbakọ ụmụ Izrel, ha enweghịkwa ike ịlụ nwaanyị ma mụta ụmụ. (Diut. 23:1) Ma, Jehova ghọtara otú ọ dị ha, ọ jakwara ha mma n’ihi otú ha si jiri obi ha dum na-eme ihe ha na ya gbara ná ndụ. Ọ gwara ha na ha ga-enwe “ihe ncheta” na “aha ga-adịru mgbe ebighị ebi” n’ụlọ ya. Ya bụ na ndị ọnaozi a kwesịrị ntụkwasị obi nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi mgbe Jizọs, bụ́ Mesaya, ga-amalite ịchị ụwa. Jehova agaghị echefu ha.—Aịza. 56:3-5.
E nwere ihe dị nnọọ iche nke mere na Jeremaya alụghị nwaanyị. Mgbe Chineke họpụtara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma, ọ gwara ya ka ọ ghara ịlụ nwaanyị n’ihi oge dị oké egwu o bi na ya nakwa n’ihi ụdị ozi ọ ga-ejere ya. Jehova sịrị: “Alụla nwaanyị, amụkwala ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom n’ebe a.” (Jer. 16:1-4) Baịbụl agwaghị anyị ihe bụ́ echiche Jeremaya n’ihe ahụ Jehova gwara ya, ma, ọ gwara anyị na okwu Jehova tọrọ ya ụtọ. (Jer. 15:16) Mgbe afọ ole na ole gafere, ya bụ, mgbe a nọchibidoro Jeruselem ruo ọnwa iri na asatọ, o doro anya na Jeremaya hụrụ na isi o rubeere Jehova baara ya uru.—Ákwá 4:4, 10.
Ụzọ Dị Iche Iche Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ
Ndị ahụ e kwuru okwu ha na Baịbụl alụghị di ma ọ bụ nwunye, ma, Jehova nọnyeere ha, ha jikwa ndụ ha niile jeere ya ozi. Ọ bụrụkwa na anyị ejiri obi anyị dum na-ejere Jehova ozi taa, ọ ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. Baịbụl kwuru na ndị inyom na-ekwusa ozi ọma ga-abụ Ọma 68:11) Ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di so n’ìgwè a dị ukwuu. Ebe ọ bụ na ozi ọma ha na-ekwusa na-amị mkpụrụ, ọtụtụ n’ime ha enwetala ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom n’ọgbakọ Ndị Kraịst.—Mak 10:29, 30; 1 Tesa. 2:7, 8.
ìgwè dị ukwuu. (Loli, bụ́ onye jerela ozi ịsụ ụzọ afọ iri na anọ, sịrị: “Ozi ịsụ ụzọ na-eme ka ndụ m nwee isi. Anaghị m anọ nkịtị, bụ́ ihe na-eme ka owu ghara ịma m, n’agbanyeghị na alụbeghị m di. Obi na-adị m ụtọ kwa ụbọchị n’ihi na ozi m na-eje na-enyere ndị mmadụ aka. Nke a na-eme ka m nwee ọṅụ dị ukwuu.”
Ọtụtụ ụmụnna nwaanyị amụtala asụsụ ọzọ, mụbaakwa ozi ha site n’ikwusara ndị na-asụ asụsụ ọzọ ozi ọma. Ana, bụ́ onye e kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “E nwere ọtụtụ ndị mba ọzọ bi n’ebe m bi.” Ọ na-atọ ya ụtọ ikwusara ndị na-asụ French ozi ọma. O kwukwara, sị: “Asụsụ ha m mụtara emeela ka m nwetakwuo ndị m na-ezi ozi ọma, meekwa ka ozi m na-atọ m ụtọ nke ukwuu.”
Ebe ọ bụ na onye na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye anaghị enwe ọrụ dị ukwuu n’ezinụlọ, nke a emeela ka ụfọdụ ndị na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Lidiana, bụ́ nwanna nwaanyị na-alụbeghị di, nke dị afọ iri atọ na ụma, onye jerela ozi n’ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu ná mba ọzọ, kwuru, sị: “Obi siri m ike na ọ bụrụ na ị na-amụba ozi gị, ọ ga-eme ka ọ dịkwuoro gị mfe inweta ezigbo ndị enyi, meekwa ka ndị ọzọ hụ gị n’anya. Enwetala m ọtụtụ ezigbo ndị enyi si ná mba dị iche iche, nke a emekwaala ka m nwee obi ụtọ dị ukwuu.”
Baịbụl kwuru na Filip onye na-ezisa ozi ọma mụrụ ụmụ nwaanyị anọ na-alụghị di, bụ́ ndị amụma. (Ọrụ 21:8, 9) Ọ ghaghị ịbụ na ha ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi dị ka nna ha. Ọ̀ ga-abụ na ha ji onyinye ibu amụma ha nwere nyere Ndị Kraịst ibe ha bi na Sesaria aka? (1 Kọr. 14:1, 3) Taa, ọtụtụ ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di na-agbakwa ndị ọzọ ume site n’ịgachi ọmụmụ ihe anya nakwa n’ikere òkè na ya.
Baịbụl jara Lidia, bụ́ Onye Kraịst oge ochie bi na Filipaị, mma n’ihi otú o si ele ọbịa. (Ọrụ 16:14, 15, 40) Lydia, bụ́ onye o nwere ike ịbụ na ọ lụghị di, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na di ya nwụrụ anwụ, na-emesapụ aka, nke mere ka ya na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, dị ka Pọl, Saịlas na Luk mara. Anyị ga-enwetakwa ngọzi taa ma ọ bụrụ na anyị na-emesapụ aka.
Otú Ị Ga-esi Bụrụ Onye A Hụrụ n’Anya
E wezụga na ọ na-amasị anyị ịrụ ọrụ na-enye obi ụtọ, ọ na-amasịkwa anyị ka ndị ọzọ hụ anyị n’anya. Olee otú ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-esi nwee ndị hụrụ ha n’anya? Nke mbụ, Jehova hụrụ anyị n’anya mgbe niile, na-eme ka okwukwe anyị sie ike ma na-ege anyị ntị. O nwere mgbe ọ dị Eze Devid ka ‘ọ̀ nọ naanị ya, nọrọkwa n’ahụhụ,’ ma, ọ ma na Jehova ga-enyere ya aka ma ya kpekuo ya ekpere. (Ọma 25:16; 55:22) O dere, sị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” (Ọma 27:10) Chineke na-agwa ndị ohu ya niile ka ha bịaruo ya nso, ya bụ, ka ha bụrụ ezigbo ndị enyi ya.—Ọma 25:14; Jems 2:23; 4:8.
N’etiti ụmụnna anyị zuru ụwa ọnụ, anyị nwekwara ike inweta ndị nna, ndị nne, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwaanyị, bụ́ ndị hụrụ anyị n’anya ma na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Mat. 19:29; 1 Pita 2:17) Ọtụtụ Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe obi ụtọ site n’iṅomi Dọkas, bụ́ onye “jupụtara n’ezi ọrụ na onyinye ebere.” (Ọrụ 9:36, 39) Loli kwuru, sị: “Ebe ọ bụla m gara, m na-achọ ezigbo enyi n’ọgbakọ, bụ́ ndị ga-ahụ m n’anya ma na-agba m ume mgbe ọ bụla obi na-adịghị m mma. M na-agbalị ịhụ ndị ọzọ n’anya iji mee ka enyi mụ na ha sie ike. Ejeela m ozi n’ọgbakọ asatọ, m metechara ezigbo ndị enyi na ha. Ụfọdụ n’ime ha abụghị ndị ọgbọ m, e nwere ndị bụ ndị nne nne n’ime ha, nweekwa ndị dị afọ iri na ụma.” N’ọgbakọ nke ọ bụla, e nwere ndị e kwesịrị igosi na a hụrụ ha n’anya, bụ́ ndị e kwesịrị imete enyi. Inwe ezigbo mmasị n’ebe ndị dị otú a nọ ga-enyere ha aka nke ukwuu. Ọ ga-eme ka anyị mezuo ọchịchọ anyị nwere ịhụ ndị ọzọ n’anya, meekwa ka a hụ anyị n’anya.—Luk 6:38.
Chineke Agaghị Echefu Gị
Baịbụl kwuru na Ndị Kraịst niile ga-achụrịrị ihe ụfọdụ n’àjà n’ihi oge ọjọọ anyị bi na ya. (1 Kọr. 7:29-31) E kwesịrị ịkwanyere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ùgwù n’ihi na ha kpebiri irube isi n’iwu Chineke nyere ka anyị lụọ di ma ọ bụ nwunye naanị n’ime Onyenwe anyị. Anyị kwesịkwara ịhụ ha n’anya. (Mat. 19:12) Ma, àjà pụrụ iche ha chụrụ apụtaghị na ha agaghị enwe ezigbo obi ụtọ ná ndụ ha.
Lidiana kwuru, sị: “M nwere obi ụtọ n’ihi na mụ na Jehova dị ná mma, nakwa n’ihi na m na-ejere ya ozi. Ahụla m ndị lụrụ di na nwunye na-enwe obi ụtọ, hụkwa ndị nke na-anaghị enwe. Nke a mere obi ji sie m ike na ihe ga-eme ka m nwee obi ụtọ abụghị ma m̀ ga-alụ di n’ọdịnihu ma ọ bụ na m gaghị alụ.” Dị ka Jizọs kwuru, ihe bụ́ isi ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ mmadụ inye ndị ọzọ ihe na ijere ha ozi, nke bụ́ ihe Ndị Kraịst niile ga-emeli.—Jọn 13:14-17; Ọrụ 20:35.
O doro anyị anya na ihe kacha enye anyị ọṅụ bụ na anyị ma na Jehova ga-agọzi anyị n’ihi àjà ọ bụla anyị chụrụ iji mee uche ya. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—Hib. 6:10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 N’agbanyeghị na ọ bụ ụmụnna nwaanyị ka e ji nye ihe atụ n’ebe a, okwu a gbasakwara ụmụnna nwoke.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 25]
“Ihe m nwere juru m afọ, ihe na-erughị m aka anaghị echu m ụra.”—Carmen
[Foto dị na peeji nke 26]
Ozi Loli na Lidiana na-eje n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu na-enye ha obi ụtọ
[Foto dị na peeji nke 27]
Chineke na-agwa ndị ohu ya niile ka ha bịaruo ya nso