Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”!

“Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”!

“Na-anụ Ọkụ n’Obi Ịrụ Ezi Ọrụ”!

“[Jizọs] nyere onwe ya n’ihi anyị ka o wee napụta anyị n’ụdị mmebi iwu niile, wee sachaara onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche, ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.”—TAỊ. 2:14.

1. Gịnị mere n’ụlọ nsọ mgbe Jizọs rutere na ya na Naịsan 10, n’afọ 33 O.A.?

NA NAỊSAN 10, bụ́ abalị ole na ole tupu a malite ime Ememme Ngabiga nke afọ 33 O.A., ìgwè ndị bịara Ememme ahụ nọ n’akụkụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem na-enwe aṅụrị maka ya. Gịnị ga-eme ma Jizọs rute? Matiu, Mak, na Luk, bụ́ mmadụ atọ n’ime ndị dere Oziọma ahụ, kwuru na Jizọs chụpụrụ ndị nọ ebe ahụ na-ere na-azụ. Nke a bụ nke abụọ Jizọs na-eme nke a. O kpuru tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu. (Mat. 21:12; Mak 11:15; Luk 19:45) Jizọs akwụsịlatabeghị ịnụ ọkụ n’obi kemgbe o mere ụdị ihe a afọ atọ ya gara aga.—Jọn 2:13-17.

2, 3. Olee otú anyị si mara na ihe Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi mee abụghị naanị ịchụpụ ndị nọ n’ụlọ nsọ na-azụ ahịa?

2 Ihe Matiu dere gosiri na ihe Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi mee n’oge ahụ abụghị naanị ịchụpụ ndị ahụ n’ụlọ nsọ. Ọ gwọrọ ndị ìsì na ndị ngwọrọ bịakwutere ya n’ebe ahụ. (Mat. 21:14) Luk dere ihe ndị ọzọ Jizọs rụrụ n’ụbọchị ahụ. ‘Jizọs malitere izi ihe kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ.’ (Luk 19:47; 20:1) Ihe ndị a na-egosi na Jizọs ji ịnụ ọkụ n’obi jee ozi ya mgbe ọ nọ n’ụwa.

3 Ka oge na-aga, Pọl onyeozi deere Taịtọs akwụkwọ ozi wee kwuo na Jizọs “nyere onwe ya n’ihi anyị ka o wee napụta anyị n’ụdị mmebi iwu niile, wee sachaara onwe ya ndị bụ́ ndị nke ya pụrụ iche, ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.” (Taị. 2:14) Olee otú anyị ga-esi “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ” n’oge a? Oleekwa otú ihe dị iche iche ndị eze Juda mere, bụ́ ndị bụ́ ndị ezi omume, ga-esi gbaa anyị ume?

Iji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-arụ Ọrụ Ikwusa Ozi Ọma na Ọrụ Izi Ihe

4, 5. Olee otú ndị eze anọ chịrị Juda si nụọ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ?

4 Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya mere ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ iji hụ na a kwụsịrị ikpere arụsị na Juda. Esa wepụchara “ebe ịchụàjà ndị mba ọzọ na ebe ndị dị elu ma kụtusịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ.” (2 Ihe 14:3) Jehọshafat wepụrụ “ebe ndị dị elu na ogwe osisi ndị dị nsọ na Juda” n’ihi na ọ na-anụ ya ọkụ n’obi ka a na-efe Jehova.—2 Ihe 17:6; 19:3. *

5 Mgbe ndị Izrel mechara Ememme Ngabiga ha mere abalị asaa, bụ́ nke Hezekaya haziri na Jeruselem, “ndị Izrel niile nọ n’ebe ahụ gara n’obodo ndị dị na Juda. Ha wee kụrisịa ogidi nsọ dị iche iche, gbutusịakwa ogwe osisi ndị dị nsọ ma kwatuo ebe ndị dị elu na ebe ịchụàjà ndị dị na Juda na Benjamin dum nakwa n’Ifrem na Manase ruo mgbe ha mechara.” (2 Ihe 31:1) Josaya malitere ịchị mgbe ọ dị naanị afọ asatọ. Baịbụl kwuru, sị: “N’afọ nke asatọ nke ọchịchị ya, mgbe ọ ka bụ nwata, ọ malitere ịchọ Chineke Devid nna nna ya. N’afọ nke iri na abụọ, ọ malitekwara ikpochapụ ebe ndị dị elu na ogwe osisi dị nsọ na ihe oyiyi a pịrị apị na ihe oyiyi a wụrụ awụ na Juda na Jeruselem.” (2 Ihe 34:3) Ihe a niile gosiri na ndị eze anọ ahụ nụrụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.

6. Olee ihe mere a ga-eji jiri ozi anyị tụnyere ihe ndị eze chịrị Juda, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, mere iji kwụsị ikpere arụsị?

6 Taa, anyị na-emekwa ihe yiri ihe ndị eze anọ ahụ mere mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ ka ha ghara ikwere ozizi okpukpe ụgha, gharakwa ikpere arụsị. Ozi ọma anyị na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ na-eme ka anyị zie ụdị mmadụ niile ozi ọma. (1 Tim. 2:4) Otu nwa agbọghọ onye Eshia chetara otú mama ya si achụ àjà n’ihu ọtụtụ ihe onyinyo ndị dị n’ụlọ ha. Nwa agbọghọ ahụ kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka ya mara onye ezi Chineke bụ, n’ihi na obi ya nọ na-agwa ya na ihe onyinyo ndị ahụ niile enweghị ike ịnọchite anya ezi Chineke. Otu ụbọchị, mgbe ọ pụtara ka ọ mata ndị kụrụ aka n’ụzọ, ọ hụrụ Ndịàmà abụọ, bụ́ ndị bịara ime ka ọ mara aha Chineke, bụ́ Jehova. O nwekwara obi ụtọ nke ukwuu mgbe ọ matara ihe bụ́ eziokwu banyere arụsị. Ugbu a, o ji ezigbo ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi ọma wee na-enyere ndị ọzọ aka ịmara onye Chineke bụ.—Ọma 83:18; 115:4-8; 1 Jọn 5:21.

7. Gịnị ka anyị ga-eme iji ṅomie ndị ahụ gazuru ala Juda n’oge Jehọshafat wee kụziere ndị mmadụ ihe?

7 Ànyị na-ejezu ókèala anyị mgbe anyị na-eje ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ? Ọ dị mma ịmara na n’afọ nke atọ nke ọchịchị Jehọshafat, o ziri ozi ka a kpọọrọ ya mmadụ ise o mere ndị isi, ndị Livaị itoolu, na ndị nchụàjà abụọ. Ọ gwara ha ka ha gaa n’obodo niile dị na Juda kụziere ndị mmadụ iwu Jehova. Ihe ha kụziri na Juda rụpụtara ezigbo ihe nke na mba ndị dị Juda nso malitere ịtụ egwu Jehova. (Gụọ 2 Ihe E Mere 17:9, 10.) Ọ bụrụ na anyị agaa n’ụlọ ndị mmadụ n’oge dị iche iche nakwa n’ụbọchị dị iche iche, anyị ga-enwe ike izi ọtụtụ ndị bi n’ụlọ ahụ ozi ọma.

8. Olee otú anyị nwere ike isi mụbaa ozi anyị?

8 Taa, ọtụtụ ndị ohu Chineke na-eji obi ha dum ahapụ obodo ha wee gaa na-eje ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka Ndịàmà na-anụ ọkụ n’obi. Ì nwere ike ime otú ahụ? Ụfọdụ n’ime anyị, bụ́ ndị na-enweghị ike ime otú ahụ, nwere ike ịgbalị izi ndị bi n’obodo ha, bụ́ ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ozi ọma. Ron, onye dị afọ iri asatọ na otu, mụtara otú e si ekele ndị mmadụ n’asụsụ iri atọ na abụọ n’ihi ndị si ọtụtụ mba bi n’ókèala ya. N’oge na-adịbeghị anya, ọ hụrụ di na nwunye si Africa n’ụzọ wee jiri asụsụ ha, bụ́ Yoruba, kelee ha. Ha jụrụ Ron ma ọ̀ gatụla Africa. Mgbe ọ gwara ha na ya agatụbeghị, ha jụrụ ya otú o si mara asụsụ ha. Nke a mere ka o zie ha ozi ọma. Ha ji obi ụtọ nata ya magazin ụfọdụ wee gwa ya ebe ha bi. Ọ gwara ọgbakọ dị ebe ahụ ebe ha bi ka e wee malite ịmụrụ ha Baịbụl.

9. Olee ihe mere ịgụpụtara ndị mmadụ Baịbụl mgbe anyị nọ ozi ọma ji dị mkpa? Nye ihe atụ.

9 Ndị ahụ Jehọshafat ziri ka ha gaa kụziere ndị bi na Juda iwu Chineke ji “akwụkwọ iwu Jehova” gaa. N’ụwa dum, anyị na-agbasi mbọ ike ka anyị jiri Baịbụl na-ezi ndị mmadụ ihe n’ihi na ọ bụ Okwu Chineke. Mgbe anyị na-ezisa ozi ọma, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike gosi ndị mmadụ otú Baịbụl si dị mkpa site n’isi na ya na-agụpụtara ha ihe ọ na-ekwu. Otu onye Linda gara izi ozi ọma gwara ya na ya na-elekọta di ya na-arịa ọrịa strok. Ọ sịrị: “M maghị ihe m mere, nke mere Chineke ji kwe ka nsogbu a dakwasị m.” Linda wee gwa ya, sị: “O nwere ihe m ga-agwa gị nke ga-akasi gị obi.” Ya ewee gụọ Jems 1:13 ma sị ya: “Ahụhụ niile anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-ata esighị n’aka Chineke.” Nwaanyị ahụ wee makụọ Linda. Linda kwuru, sị: “M ji Baịbụl kasie ya obi. Mgbe ụfọdụ, amaokwu Baịbụl ndị anyị na-agụrụ onye anyị bịara ozi ọma na nke ya bụ ndị ọ na-anụtụbeghị.” Ya na nwaanyị ahụ mechara malite ịmụchi Baịbụl anya.

Ndị Na-eto Eto, Ndị Ji Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-eje Ozi

10. Olee otú Josaya si setịpụrụ Ndị Kraịst oge a, bụ́ ndị na-eto eto, ezigbo ihe nlereanya?

10 Ka anyị laghachi n’ihe ahụ Josaya mere. Anyị ga-echeta na ọ malitere ife Chineke na nwata nakwa na mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ, o mere ihe iji hụ na a kwụsịrị ikpere arụsị na Juda. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:1-3.) Ọtụtụ ndị na-eto eto taa na-eji ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ eje ozi ha.

11-13. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe nlereanya nke ndị na-eto eto, bụ́ ndị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi taa?

11 Hannah, onye bi n’England, dị afọ iri na atọ mgbe ọ na-amụ asụsụ French n’ụlọ akwụkwọ wee nụ na e nwere otu ìgwè nke nọ n’otu obodo dị ha nso nke malitere ịmụ ihe n’asụsụ French. Papa ya kwetara na ya ga-eso ya na-aga ọmụmụ ihe ebe ahụ. Hannah, bụ́ onye dị afọ iri na asatọ ugbu a, bụ ọsụ ụzọ nke ji asụsụ French ezi ozi ọma. Ì nwere ike ịmụ asụsụ ala ọzọ ka i wee nyere ndị ọzọ aka ịmara onye Jehova bụ?

12 Vidio bụ́ Pursue Goals That Honor God masịrị Rachel mgbe o kirichara ya. O kwuru ihe ọ nọ na-eche mgbe ọ malitere ife Jehova n’afọ 1995. Ọ sịrị: “M nọ na-eche na m na-efe Jehova nke ọma.” O kwukwara, sị: “Mgbe m kirichara vidio ahụ, m chọpụtara na o nwebeghị ezigbo ihe m mere kemgbe ọtụtụ afọ. M chọpụtakwara na aghaghị m iji eziokwu a kpọrọ ihe nakwa na aghaghị m ịna-agbasi mbọ ike ịgachi ozi ọma anya na inwe ọmụmụ ihe onwe onye.” Rachel achọpụtala ugbu a na ya jizi ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova. Gịnị sirila na nke a pụta? Ọ sịrị: “Mụ na Jehova adịkwuola ná mma. Ekpere m na-ekpe ugbu a na-erijuzi afọ. M na-amụsikwa ihe ike ugbu a, ọ na-atọkwukwa m ụtọ. Akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl bụkwa eziokwu n’anya m ugbu a. N’ihi ya, ịga ozi ọma na-atọ m nnọọ ụtọ, m na-enwekwa obi ụtọ ka m na-ahụ ka okwu Jehova na-akasị ndị ọzọ obi.”

13 Luke bụ nwa okorobịa vidio ọzọ bụ́ Young People Ask—What Will I Do With My Life? gbara ume. Mgbe Luke kirichara vidio ahụ, o dere, sị: “O mere ka m malite iche echiche banyere ihe m ji ndụ m na-eme.” O kwukwara, sị: “N’oge gara aga, a kwanyere m ibu ụzọ gaa ụlọ akwụkwọ dị elu ka m wee nwee ezigbo ego. Nke ahụ gachaa, m nweziri ike iji ofufe Jehova kpọrọ ihe. Ụdị mkpebi a anaghị eme ka okwukwe mmadụ sie ike; kama ọ na-eme ka mmadụ ghara isi ike n’ọgbakọ.” Ụmụnna anyị, bụ́ ndị na-eto eto, jisienụ ike jiri ihe unu mụtara n’ụlọ akwụkwọ mụbaa ozi unu dị ka Hannah mere. Ṅomiekwanụ Rachel site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe ndị na-ewetara Chineke nsọpụrụ. Na-emenụ ụdị ihe ahụ Luke mere ka ihe ize ndụ ndị na-amata ọtụtụ ndị na-eto eto n’ọnyà wee ghara inweta unu.

Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-aṅa Ntị n’Ịdọ Aka ná Ntị

14. Olee otú Jehova chọrọ ka anyị si na-efe ya, oleekwa ihe mere ife ya otú ahụ ọ chọrọ si esi ike taa?

14 Ndị Jehova kwesịrị ịna-eme omume dị ọcha ka ha wee fee Chineke otú ga-amasị ya. Aịzaya dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Pụọnụ, pụọnụ, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe na-adịghị ọcha aka; sinụ n’etiti ya [ya bụ, Babịlọn] pụọ, debenụ onwe unu ọcha, unu ndị bu arịa Jehova.” (Aịza. 52:11) Ọtụtụ afọ tupu Aịzaya edee ihe a, Eze Esa, bụ́ onye ezi omume, gbara mbọ ịhụ na a kwụsịrị ime omume rụrụ arụ n’ala Juda. (Gụọ 1 Ndị Eze 15:11-13.) Mgbe ọtụtụ narị afọ gafere, Pọl onyeozi gwara Taịtọs na Jizọs nyere onwe ya iji sachaa ndị na-eso ụzọ ya ka o wee mee ha “ndị nke ya pụrụ iche, ndị na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.” (Taị. 2:14) N’oge a ihe ọjọọ juru ebe niile, ime omume dị ọcha anaghị adịrị anyị mfe, karịchaa, ndị na-eto eto. Dị ka ihe atụ, ndị ohu Chineke niile, ma ndị na-eto eto ma ndị okenye, aghaghị ịna-agbasi mgba ike ka ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ghara imerụ ha. A na-ahụ ihe ndị a na saịn bọọdụ ụfọdụ, na TV, na fim, nakwa n’Ịntanet.

15. Gịnị ga-enyere anyị aka ịkpọ ihe ọjọọ asị?

15 Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị sitere n’aka Chineke, anyị ga-akpọ ihe ọjọọ asị. (Ọma 97:10; Rom 12:9) Anyị kwesịrị ịkpọ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ asị ka o wee ghara ‘ịna-adọrọ anyị otú magnetọ si adọrọ ígwè,’ ma anyị kwuo ya otú otu nwanna nwoke si kwuo ya. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịdọkapụta ígwè magnetọ ji, ọ ghaghị ịdọsi ya ike. Otú ahụkwa ka mmadụ na-aghaghị ịgbasi mgba ike ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ka ihe na-akpali agụụ mmekọahụ ghara ịna-adọrọ mmasị ya. Ma, anyị ga-akpọ ihe na-akpali agụụ mmekọahụ asị ma ọ bụrụ na anyị aghọta ihe o nwere ike ime anyị. Otu nwanne nwoke gbara mbọ dị ukwuu iji kwụsị ịna-aga n’ebe a na-ahụ ihe ndị na-akpali agụụ mmekọahụ n’Ịntanet. O bupụtara kọmputa ya n’ebe ndị ezinụlọ ya niile ga na-ahụ ya. O kpebisikwara ike ịsacha onwe ya na ịna-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ. O mekwara ihe ọzọ. Ebe ọ bụ na ọ ga na-aga n’Ịntanet maka ọrụ ya, o kpebiri na ya ga na-aga n’Ịntanet naanị mgbe nwunye ya nọ ya.

Uru Àgwà Ọma Bara

16, 17. Olee ihe ezigbo àgwà anyị na-akpa nwere ike ime ka ndị na-ahụ anyị mee? Nye ihe atụ.

16 Ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ Jehova nwere nnọọ àgwà dị mma, nke a na-amasịkwa ndị na-ahụ ha. (Gụọ 1 Pita 2:12.) Otu nwoke na-abụghị Onyeàmà nke gara rụzie ígwè e ji ebi akwụkwọ na Betel dị na London gbanwere obi ya banyere Ndịàmà Jehova mgbe ọ rụchara ọrụ n’ebe ahụ otu ụbọchị. Nwunye ya, bụ́ onye ya na otu Onyeàmà na-amụ ihe, chọpụtara na di ya agbanweela. Tupu mgbe ahụ, ọ naghị achọ ka Ndịàmà na-abịa na nke ha. Ma, mgbe o si ọrụ ahụ ọ gara na Betel lọta, ọ malitere na-eto Ndịàmà Jehova maka otú ha si meso ya ihe. O kwuru na ọ dịghị onye kwuru ihe na-adịghị mma n’ebe ahụ. Ha niile nwere ndidi, udo dịkwa n’etiti ha. Ihe kacha masị ya bụ na ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-arụ ọrụ na Betel ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ n’agbanyeghị na a naghị akwụ ha ụgwọ ọnwa. Ha niile wepụtara oge ha na ike ha iji hụ na ndị mmadụ nụrụ ozi ọma.

17 Ụmụnna ndị na-arụ ọrụ n’ebe ndị a na-akwụ ha ego ha ji elekọta ezinụlọ ha na-arụsikwa ọrụ ike. (Kọl. 3:23, 24) Nke a na-emekarị ka obi sie ha ike na ha ga-anọgide na-arụ ọrụ ha, ebe ọ bụ na ha na-arụsi ọrụ ike, ndị ha na-arụrụ ọrụ anaghị achọ ịchụ ha.

18. Olee otú anyị ga-esi “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ”?

18 Anyị na-egosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi maka ụlọ Jehova ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, na-eme ihe o kwuru, na-elekọtakwa ebe ndị anyị na-anọ efe ya ofufe. Anyị kwesịkwara ịna-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, na-emekwa ndị na-eso ụzọ ruo otú ike kwere anyị. Ma ànyị bụ ndị na-eto eto ma ànyị bụ ndị okenye, anyị ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ike anyị niile iji na-efe Jehova otú o si chọọ. A ga-amakwa na anyị bụ ndị “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ.”—Taị. 2:14.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 4 O nwere ike ịbụ na Esa wepụrụ ebe ndị dị elu a na-anọ efe arụsị, ma o wepụghị ebe ndị nke a na-anọ efe Jehova. O nwekwara ike ịbụ na e wughachiri ebe ndị dị elu ndị ahụ n’oge ọ fọrọ obere ka Esa chịchaa, ma, Jehọshafat nwa ya wepụrụ ha.—1 Eze 15:14; 2 Ihe 15:17.

Gịnị ka ị mụtara n’ihe ụmụ mmadụ mere n’oge ochie nakwa n’ihe ndị ọzọ mere n’oge a banyere

• otú ị ga-esi na-anụ ọkụ n’obi site n’izi ozi ọma na ịkụzi ihe?

• otú Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-eto eto, nwere ike isi “na-anụ ọkụ n’obi ịrụ ezi ọrụ”?

• otú anyị ga-esi kwụsị àgwà na-ezighị ezi?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 13]

Ị̀ na-agụrụ ndị mmadụ Baịbụl mgbe niile ị na-aga ozi ọma?

[Foto dị na peeji nke 15]

I nwere ike ịmụba ozi gị ma ị mụta ịsụ asụsụ ọzọ mgbe ị na-aga akwụkwọ