Na-anụrụ Ụlọ Jehova Ọkụ n’Obi!
Na-anụrụ Ụlọ Jehova Ọkụ n’Obi!
“Ekworo [ma ọ bụ, ịnụ ọkụ n’obi] maka ụlọ gị ga-eripịa m.”—JỌN 2:17.
1, 2. Gịnị ka Jizọs mere n’ụlọ nsọ n’afọ 30 O.A., gịnịkwa mere o ji mee otú ahụ?
JIZỌS gara Jeruselem n’oge Ememme Ngabiga nke afọ 30 O.A., bụ́ mgbe ọ gaferela ọnwa isii o bidoro ozi ya n’ụwa. Mgbe o ruru n’Ogige Ndị Jentaịl, nke dị n’ụlọ nsọ ahụ, ọ hụrụ ndị nọ ebe ahụ “na-ere ehi na atụrụ na nduru, na ndị na-agbanwe ego, ka ha nọ n’oche ha.” O ji ụdọ mee ụtarị wee chụpụ anụmanụ niile nọ ebe ahụ nakwa ndị na-ere ha. Jizọs wụfukwara mkpụrụ ego nke ndị ahụ na-agbanwe ego, ma kpuo tebụl ha ihu. Ọ gwara ndị na-ere nduru ka ha buru ngwongwo ha pụọ.—Jọn 2:13-16.
2 Ihe mere Jizọs ji mee ihe a bụ na ọ na-anụrụ ụlọ nsọ ahụ ọkụ n’obi. Ọ gwara ndị ahụ na-ere ahịa, sị: “Kwụsịnụ ime ka ụlọ Nna m bụrụ ụlọ ahịa!” Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ nke a, ha chetara ihe Devid dere ọtụtụ narị afọ gara aga, sị: “Ekworo maka ụlọ gị ga-eripịa m.”—Jọn 2:16, 17; Ọma 69:9.
3. (a) Gịnị bụ ịnụ ọkụ n’obi? (b) Olee ajụjụ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
3 Ihe mere Jizọs ji mee ihe a o mere bụ na ọ na-anụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi. Ịnụ ọkụ n’obi pụtara “iji obi dum na-eme ihe.” Taa, e nwere ihe karịrị nde mmadụ asaa bụ́ Ndị Kraịst, ndị na-anụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘Ole otú m ga-esi na-anụkwu ọkụ n’obi maka ụlọ Jehova?’ Iji zaa ajụjụ a, ka anyị buru ụzọ tụlee ihe bụ́ ụlọ Chineke taa. Anyị mechaa, anyị ga-atụle ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị nụụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi. E dere akụkọ banyere ha “iji nye anyị ntụziaka,” nke a nwekwara ike ime ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi.—Rom 15:4.
Ụlọ Chineke n’Oge Ochie Nakwa Taa
4. Olee ihe e ji ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn wuru mee?
4 N’Izrel oge ochie, ụlọ Chineke bụ ụlọ nsọ dị na Jeruselem. N’eziokwu, Jehova ebighị ebe ahụ. Jehova sịrị: “Eluigwe bụ ocheeze m, ụwa bụkwa ihe mgbakwasị ụkwụ m. Olee ụlọ unu pụrụ iwuru m, oleekwa ebe ga-abụ ebe izu ike m?” (Aịza. 66:1) Ma, ụlọ nsọ e wuru mgbe Sọlọmọn na-achị ghọrọ ebe bụ́ isi a nọ na-efe Jehova, bụ́ ebe a na-anọ ekpeku ya ekpere.—1 Eze 8:27-30.
5. Olee ndokwa e mere n’oge a nke ụlọ nsọ Sọlọmọn sere onyinyo ya?
5 Taa, ụlọ Jehova abụghị ụlọ nkịtị nke dị na Jeruselem ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ. Kama nke ahụ, ọ bụ ndokwa Chineke mere ka anyị wee nwee ike ịna-efe ya ofufe, bụ́ nke àjà Kraịst ji ọbara ya chụọ mere ka o kwe omume. Ndị niile na-efe Chineke ofufe n’ụwa na-efe ya n’ụlọ nsọ ime mmụọ a.—Aịza. 60:4, 8, 13; Ọrụ 17:24; Hib. 8:5; 9:24.
6. Olee ndị eze Juda ndị nụrụ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova?
6 Mgbe e kewachara Izrel na 997 T.O.A., ndị eze anọ n’ime ndị eze iri na itoolu chịrị Juda nụrụ nnọọ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova. Ha bụ Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya. Olee ihe ndị dị mkpa anyị nwere ike ịmụta n’aka ha?
Iji Obi Dum Na-efe Jehova Na-eweta Ngọzi
7, 8. (a) Olee ụdị ofufe Jehova na-agọzi? (b) Olee ihe dị ezigbo mkpa nke anyị kwesịrị ịkpachara anya maka ya, bụ́ nke anyị na-amụta n’akụkọ banyere Eze Esa?
7 Mgbe Eze Esa na-achị, Jehova họpụtara 2 Ihe E Mere 15:1-8.) Otú Esa si mee ka ndị Juda maliteghachi ife Jehova mere ka ndị Juda na ọtụtụ ndị si n’alaeze ebe ugwu Izrel, bụ́ ndị bịara ememme pụrụ iche e mere na Jeruselem, dịrị n’otu. Ha niile ṅụrụ iyi na ha ga-anọgide na-efe Jehova. Baịbụl sịrị: “Ha wee jiri oké olu na iti mkpu ọṅụ na ịfụ opi dị iche iche ṅụọrọ Jehova iyi. Juda niile wee ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe ha ṅụrụ n’iyi; n’ihi na ha ji obi ha dum ṅụọ iyi, jirikwa obi ụtọ chọọ ya, o wee kwe ka ha chọta ya; Jehova nọkwa na-enye ha ezumike gbaa gburugburu.” (2 Ihe 15:9-15) Jehova ga-agọzikwa anyị ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-efe ya ofufe.—Mak 12:30.
ndị amụma nyeere ndị Chineke aka ịnọgide na-efe ya ofufe. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị na Esa gere Azaraya onye amụma, bụ́ nwa Oded, ntị. (Gụọ8 Ọ dị mwute na e mechara nwee mgbe Esa jụrụ ndụmọdụ Hanenaị onye ọhụ ụzọ nyere ya. (2 Ihe 16:7-10) Olee ihe anyị na-eme mgbe Jehova si n’aka ndị okenye ọgbakọ nye anyị ndụmọdụ? Ànyị na-anabata ndụmọdụ ha si n’Akwụkwọ Nsọ nye anyị ma ghara iwe iwe?
9. Olee nsogbu chere Jehọshafat na ndị Juda ihu, gịnịkwa ka ha mere?
9 Jehọshafat chịrị Juda na narị afọ nke iri T.O.A. Ndị agha Amọn, Moab, na ndị bi n’ógbè Sia bụ́ ugwu ugwu, chọrọ ịlụso ndị Juda agha. Gịnị ka eze ahụ mere n’agbanyeghị na ụjọ ji ya? Ya na ndị ọ na-achị, na ndị nwunye ha na ụmụ ha, gbakọtara n’ụlọ Jehova ka ha wee kpee ekpere. (Gụọ 2 Ihe E Mere 20:3-6.) Jehọshafat kpekuru Jehova ekpere na-emetụ n’ahụ́ dị ka nke ahụ Sọlọmọn kpere mgbe ọ raara ụlọ nsọ ahụ nye. Ọ sịrị: “Chineke anyị, ị́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe n’ahụ́ ha? N’ihi na anyị enweghị ike iguzo n’ihu nnukwu ìgwè mmadụ a na-abịa ibuso anyị agha; anyị amaghịkwa ihe anyị ga-eme, kama ọ bụ gị ka anyị lekwasịrị anya.” (2 Ihe 20:12, 13) Mgbe Jehọshafat kpechara ekpere, “n’etiti ndị ahụ zukọtara,” mmụọ Jehova kpaliri Jahazayel, bụ́ onye Livaị, ikwu okwu na-akasi obi, nke mere ka obi sie ndị Juda ike.—Gụọ 2 Ihe E Mere 20:14-17.
10. (a) Olee otú e si gwa Jehọshafat na ndị Juda ihe ha ga-eme? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị nwere ekele maka ntụziaka Jehova na-enye anyị taa?
10 Anyị ahụla na n’oge ahụ, Jehova si n’aka Jahazayel gwa Jehọshafat na alaeze Juda ihe ha ga-eme. Taa, Jehova na-esi n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na-akasi anyị obi, na-agwakwa anyị ihe anyị ga-eme. N’ezie, anyị kwesịrị ịna-aṅa ndị okenye ha họpụtara ntị ma na-akwanyere ha ùgwù. Ndị okenye ndị a na-arụsi ọrụ ike ịhụ na ha na-elekọta anyị, ha na-agbalịsikwa ike ime ihe “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” kwuru.—Mat. 24:45; 1 Tesa. 5:12, 13.
11, 12. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe mere n’oge Jehọshafat na-achị Juda?
11 Dị nnọọ ka Jehọshafat na ndị ọ na-achị zukọtara ka ha mara ihe Jehova ga-agwa ha, ka anyị gbalịsie ike na-aga ọmụmụ ihe mgbe niile, bụ́ ebe anyị na ụmụnna anyị ga na-anọkọ. Ọ bụrụ na anyị enwee nsogbu nke anyị na-amaghị ihe anyị ga-eme banyere ya, ka anyị ṅomie Jehọshafat na ndị Juda site n’ikpeku Jehova ekpere, tụkwasịkwa ya obi na ọ ga-enyere anyị aka. (Ilu 3:5, 6; Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụgodị na anyị nọ ebe ụmụnna anyị na-anọghị, ekpere anyị na-ekpeku Jehova na-eme ka obi sie anyị ike na anyị na “òtù ụmụnna [anyị] niile ndị nọ n’ụwa” dị n’otu.—1 Pita 5:9.
12 Jehọshafat na ndị ọ na-achị mere ihe Chineke gwara Jahazayel ka ọ gwa ha mee. Gịnị si na nke a pụta? Ha meriri n’agha ahụ ha lụrụ ma “jiri ọṅụ lọta Jeruselem,” jirikwa “ụbọ akwara na une na opi . . . rute n’ụlọ Jehova.” (2 Ihe 20:27, 28) Anyị kwesịkwara ịṅa ntị n’ihe Jehova si n’aka ndị o ji na-eduzi anyị na-agwa anyị, ma soro na-eto ya.
Na-elekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Amụ Ihe
13. Olee ọrụ Hezekaya bidoro ịrụ mgbe ọ malitere ọchịchị?
13 Hezekaya gosiri na ya ji ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova site n’ịrụzi ụlọ nsọ n’ime ọnwa mbụ ọ malitere ọchịchị. Ọ gwara ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha gaa mee ka ụlọ Chineke dị ọcha. Ha ji ụbọchị iri na isii mee nke a. (Gụọ 2 Ihe E Mere 29:16-18.) Nke a na-echetara anyị na anyị kwesịrị ịna-elekọta ebe anyị na-anọ amụ ihe ma na-arụzi ihe ndị mebiri emebi na ya. Ime otú a na-egosi na anyị na-anụ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova. Ọ̀ bụ na ị nụtụbeghị akụkọ banyere ndị nwere mmasị n’ebe anyị nọ n’ihi otú ụmụnna anyị si jiri ịnụ ọkụ n’obi rụọ ọrụ ndị a? N’ezie, mbọ ha na-agba na-ewetara nnọọ Jehova otuto.
14, 15. Olee ọrụ na-ewetara Jehova otuto taa? Nye ihe atụ.
14 N’otu obodo dị n’ebe ugwu England, otu nwoke ekweghị na a ga-arụgharị Ụlọ Nzukọ Alaeze dị nso n’ụlọ ya. Ụmụnna ndị ebe ahụ ji obiọma meso ya ihe. Mgbe ha chọpụtara na mgbidi nwoke ahụ ji gbaa ụlọ ya ogige mebiri emebi, ha gwara ya na ha ga-arụzi ya n’anaghị ya ego ọ bụla. N’ezie, ha rụsiri ọrụ ike wee wughachi mgbidi ahụ. Otú ụmụnna ndị a si meso onye agbata obi ha ahụ ihe mere ka ọ gbanwee obi. Ugbu a, ọ na-enye aka na-echere ụmụnna Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ nche.
15 Ndị Jehova nwere ọtụtụ ụlọ ha na-ewu n’ụwa niile. Ọtụtụ ndị na-ewepụta onwe ha soro ndị ọrụ afọ ofufo si mba ọzọ bịa na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze, Ụlọ Mgbakọ, na Alaka ụlọ ọrụ. Sam bụ injinia nke na-arụzi ihe na-eme ka ụlọ na-ekpo ọkụ, ebe ikuku si abata ma na-apụ n’ụlọ, nakwa ntụoyi. Ya na nwunye ya, bụ́ Ruth, agaala ọtụtụ mba e nwere na Yurop na Africa iji nyere ụmụnna aka wuo ụlọ ndị ha na-ewu. Ebe ọ bụla ha gara, ha na-eso ụmụnna ndị ebe ahụ aga ozi ọma. Sam kwuru ihe mere o ji na-eso arụ ihe ndị a a na-arụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ọ sịrị: “Ọ bụ agbamume m nwetara n’aka ndị ọzọ jere ozi na Betel dị na Britain nakwa ná mba ndị ọzọ, kpaliri m ịrụ ọrụ a. Ịhụ otú ha si anụ ọkụ n’obi nakwa otú ha si enwe ọṅụ mere ka m malite ọrụ a.”
Na-aṅa Ntị ná Ntụziaka Chineke
16, 17. Olee ọrụ pụrụ iche ndị Chineke ji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ taa, gịnịkwa ka ha na-arụpụta?
16 Ihe ọzọ Hezekaya mere ma e wezụga ịrụzi ụlọ nsọ ahụ bụ ịmaliteghachi ime Ememme Ngabiga Jehova nyere iwu ka a na-eme kwa afọ. (Gụọ 2 Ihe E Mere 30:1, 4, 5.) Hezekaya na ndị bi na Jeruselem kpọrọ ndị Izrel niile òkù ka ha bịa, tinyere ndị nke bi n’alaeze ebe ugwu. Ndị ọgbọ ọsọ ji akwụkwọ ozi e ji akpọ ndị mmadụ òkù gazuo ala ahụ dum.—2 Ihe 30:6-9.
17 Anyị emeela ihe yiri nke a n’afọ ole na ole gara aga. Anyị ji akwụkwọ ịkpọ òkù ndị mara mma kpọọ ndị bi n’ókèala anyị òkù ka ha bịa soro anyị ná Nri Anyasị nke Onyenwe anyị, dị ka Jizọs nyere n’iwu. (Luk 22:19, 20) Anyị na-anata ntụziaka ná Nzukọ Ije Ozi ma jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Jehova agọziela nnọọ ọrụ a anyị na-arụ. N’afọ gara aga, ihe dị ka nde mmadụ asaa n’ime anyị kesara akwụkwọ ịkpọ òkù, nde mmadụ iri na asaa, narị puku asaa na iri puku itoolu, narị isii na iri atọ na otu, bịakwara ná Nri Anyasị nke Onyenwe anyị.
18. Olee ihe mere o ji dị ezigbo mkpa ka ị na-anụ ọkụ n’obi maka ofufe Jehova?
18 Baịbụl kwuru banyere Hezekaya, sị: “Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke Izrel ka ọ tụkwasịrị obi; mgbe ọ nwụsịrị, ọ dịghị onye dị ka ya n’ime ndị eze niile nke Juda, ọbụna ndị bu ya ụzọ. O wee rapara Jehova n’ahụ́. Ọ kwụsịghị iso ya, kama ọ nọ na-edebe ihe o nyere n’iwu, nke Jehova nyere Mozis n’iwu.” (2 Eze 18:5, 6) Ka anyị na-eme ka ya. Otú anyị si anụ ọkụ n’obi maka ụlọ Chineke ga-enyere anyị aka ‘ịrapara Jehova n’ahụ́,’ ọ ga-emekwa ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.—Diut. 30:16.
Egbula Oge Ime Ihe A Gwara Gị Mee
19. Olee mbọ e ji ịnụ ọkụ n’obi na-agba n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs?
19 Mgbe Josaya bụ eze, o mekwara ndokwa ka e mee Ememme Ngabiga. Ọ kwadebere nke ọma maka ya. (2 Eze 23:21-23; 2 Ihe 35:1-19) Anyị kwesịkwara ịkwadebe nke ọma maka mgbakọ distrikti, mgbakọ sekit, ụbọchị mgbakọ pụrụ iche, na Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọbụna ụmụnna anyị ndị nọ ná mba ebe ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu na-etinye ndụ ha n’ihe ize ndụ wee zukọọ maka icheta ọnwụ Kraịst. Ndị okenye, bụ́ ndị na-anụ ọkụ n’obi, na-ahụ na onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ha bịara. Ha na-enyere ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịchaghị aka ka ha bịa.
20. (a) Gịnị mere mgbe Eze Josaya na-achị, gịnịkwa ka o mere? (b) Gịnị ka nke a na-akụziri anyị?
20 Mgbe Eze Josaya mere ndokwa ka a rụzie ụlọ nsọ ahụ, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Hilkaya “hụrụ akwụkwọ iwu Jehova, nke o nyere site n’aka Mozis.” O nyere ya odeakwụkwọ eze, bụ́ Shefan, Shefan malitekwara ịgụrụ ya Josaya. (Gụọ 2 Ihe E Mere 34:14-18.) Gịnị si na nke a pụta? Nke a wutere eze, ya adọwaa uwe ya ozugbo ma ziga ndị ga-aga jụọ Jehova ase. Chineke si n’ọnụ Họlda onye amụma nwaanyị katọọ ndị na-efe chi ọzọ n’ala Juda. Ma, Jehova hụrụ mbọ Josaya gbara ịhụ na a kwụsịrị ikpere arụsị, Jehova nwekwara mmasị n’ebe ọ nọ n’agbanyeghị na e buru amụma na a ga-ebibi mba ahụ dum. (2 Ihe 34:19-28) Olee ihe nke a na-akụziri anyị? N’ezie, anyị kwesịrị ime ka Josaya. Anyị kwesịrị ime ihe Jehova gwara anyị mee n’egbughị oge ma ghara ichefu ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị akwụsị ife Jehova otú o si chọọ. Ka obi sie anyị ike na Jehova ga-ahụ otú anyị si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-efe ya, ọ ga-amasịkwa ya otú ahụ nke Josaya masịrị ya.
21, 22. (a) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-anụrụ ụlọ Jehova ọkụ n’obi? (b) Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso?
21 Ndị eze anọ ahụ chịrị Juda, ya bụ, Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya, setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya site n’ịnụrụ ụlọ Chineke ọkụ n’obi, ha jikwa ịnụ ọkụ n’obi fee ya. Ọ bụrụ na anyị na-anụ ọkụ n’obi, ọ ga-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi, meekwa ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nọgide na-efe ya. Ịnọgide na-eme ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme ma na-anabata ndụmọdụ a na-enye anyị n’ọgbakọ nakwa nke ndị okenye ji ịhụnanya na-enye anyị bụ ihe amamihe dị na ya, nke ga-emekwa ka anyị nwee obi ụtọ.
22 N’isiokwu na-eso, anyị ga-atụle otú anyị ga-esi jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma. Ọ ga-agbakwa ndị na-eto eto ume iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ozi. Anyị ga-atụlekwa otú anyị ga-esi zere otu n’ime ihe ndị Setan ji na-eduhie ndị mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ejiri ịnụ ọkụ n’obi na-eme ihe ndị a Jehova na-echetara anyị, anyị ga na-eṅomi Ọkpara Jehova, bụ́ Jizọs, onye e kwuru banyere ya, sị: “Ekworo maka ụlọ gị eripịawo m.”—Ọma 69:9; 119:111, 129; 1 Pita 2:21.
Ì Chetara?
• Olee ụdị ofufe Jehova na-agọzi, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?
• Olee otú ịnụ ọkụ n’obi nwere ike isi mee ka anyị mee ihe Chineke gwara anyị mee?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Olee otú Esa, Jehọshafat, Hezekaya, na Josaya si nụọrọ ụlọ Jehova ọkụ n’obi?