Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, na Òtù Na-achị Isi Na-anọchite Anya Ya

Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, na Òtù Na-achị Isi Na-anọchite Anya Ya

Onye ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, na Òtù Na-achị Isi Na-anọchite Anya Ya

“Ònye n’ezie bụ onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, nke nwere uche, onye nna ya ukwu ga-eme onye na-elekọta ìgwè ndị na-ejere ya ozi, ka ọ na-enye ha ihe oriri ga-ezuru ha n’oge kwesịrị ekwesị?”—LUK 12:42.

1, 2. Olee ajụjụ dị mkpa Jizọs jụrụ mgbe ọ na-ekwu ihe a ga-eji mara oge ikpeazụ?

MGBE Jizọs na-ekwu ihe a ga-eji mara oge ikpeazụ, ọ jụrụ ajụjụ a: “Ònye n’ezie bụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke nna ya ukwu mere onye na-elekọta ezinụlọ ya, ka ọ na-enye ha nri ha n’oge kwesịrị ekwesị?” Jizọs kwuziri na ihe a ga-eji kwụọ ohu a ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi bụ ime ya onye na-elekọta ihe niile Nna ya Ukwu nwere.—Mat. 24:45-47.

2 O nweela oge ọzọ Jizọs jụrụ ụdị ajụjụ a ọ jụrụ n’elu. (Gụọ Luk 12:42-44.) Ọ kpọrọ ohu a “onye ahụ na-elekọta ụlọ” kwuokwa na “ezinụlọ” ahụ bụ “ìgwè ndị na-ejere ya ozi.” Onye na-elekọta ụlọ bụ onye na-elekọta ndị na-eje ozi ma ọ bụ onyeisi ha. Ma, onye ahụ na-elekọta ụlọ bụkwa onye na-eje ozi. Ònye ka ohu a ma ọ bụ onye a na-elekọta ụlọ bụ, olee otú o si enye ezinụlọ ahụ nri “n’oge kwesịrị ekwesị”? Anyị niile kwesịrị ịnabata onye Jizọs si n’aka ya na-enye anyị nri ime mmụọ.

3. (a) Olee otú ndị Krisendọm sirila kọwaa ihe Jizọs kwuru banyere “ohu” ahụ? (b)  Ònye bụ ‘onye na-elekọta ụlọ,’ ma ọ bụ “ohu” ahụ, olee ndị bụkwa ‘ndị na-eje ozi,’ ma ọ bụ “ezinụlọ”?

3 Ndị Krisendọm na-ekwukarị na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ maka ndị nwere ọkwá n’etiti ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst. Ma, Jizọs, bụ́ ‘nna ukwu’ n’ihe atụ ahụ, ekwughị na a ga-enwe ọtụtụ ndị ohu, bụ́ ndị ga-anọ na chọọchị dị iche iche na Krisendọm. Kama, o mere ka o doo anya na ya nwere naanị otu ‘onye na-elekọta ụlọ,’ ma ọ bụ “ohu,” bụ́ onye ọ ga-eme onye na-elekọta ihe niile o nwere. Dị ka Ụlọ Nche kọwarala ọtụtụ mgbe, onye ahụ na-elekọta ụlọ bụ “ìgwè atụrụ nta” ahụ, ya bụ, ndị niile e tere mmanụ na-eso ụzọ Jizọs. Ihe e dere na Luk isi iri na abụọ na-egosi na Jizọs nọ na-ekwu banyere ha. (Luk 12:32) Ọ ka bụ otu ìgwè ahụ ka a kpọrọ ‘ìgwè ndị ahụ na-eje ozi,’ ma ọ bụ “ezinụlọ,” ma, aha ndị a a kpọrọ ha na-egosi ọrụ onye nke ọ bụla n’ime ha na-arụ. Ma, e nwere otu ajụjụ dị mkpa, ya bụ, Onye ọ bụla so n’òtù ohu a ò so enye “ezinụlọ” Kraịst nri ime mmụọ n’oge kwesịrị ekwesị? Anyị ga-amata azịza nke ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị enyochaa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ohu ahụ nke ọma.

Ohu Jehova n’Oge Ochie

4. Olee ihe Jehova kpọrọ mba Izrel oge ochie, oleekwa ihe dị mkpa ka anyị mara banyere mba ahụ?

4 Jehova kpọrọ ndị ya, ya bụ, mba Izrel oge ochie, ohu ya. Ọ sịrị: “‘Unu [ìgwè mmadụ] bụ ndị àmà m,’ ka Jehova kwuru, ‘ọbụna ohu m [otu onye] nke m họọrọ.’” (Aịza. 43:10) Ọ bụ mmadụ niile nọ ná mba ahụ ka ọ kpọrọ ohu ya. Ma, ọ dị mkpa ịmara na ọ bụ naanị ndị nchụàjà na ndị Livaị ndị ọzọ na-abụghị ndị nchụàjà na-akụziri mba ahụ Iwu Chineke.—2 Ihe 35:3; Mal. 2:7.

5. Olee nnukwu mgbanwe Jizọs kwuru na a ga-enwe?

5 Ọ̀ bụ mba Izrel bụ ohu ahụ Jizọs kwuru okwu ya? Mba. Anyị ma na ọ bụghị ha n’ihi ihe Jizọs kwuru banyere ndị Juu n’oge ọ nọ n’ụwa. Ọ sịrị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” (Mat. 21:43) O doro anya na ihe ga-agbanwe. Jehova ga-ahọrọ mba ọhụrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, ohu ahụ Jizọs kwuru okwu ya na-arụ ọrụ yiri nke “ohu” Chineke nke nọ n’Izrel n’oge ochie rụrụ.

E Nweta Ohu Kwesịrị Ntụkwasị Obi

6. Olee mba ọhụrụ malitere ịdị na Pentikọst afọ 33 O.A., oleekwa ndị so ná mba ahụ?

6 Ọ bụ Izrel ime mmụọ bụ mba ọhụrụ ahụ, ya bụ, “Izrel nke Chineke.” (Gal. 6:16; Rom 2:28, 29; 9:6) Mba ọhụrụ a malitere ịdị mgbe mmụọ Chineke dakwasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs na Pentikọst afọ 33 O.A. Mgbe nke ahụ gachara, Ndị Kraịst niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ghọrọ mba ahụ nke bụ́ òtù ohu ahụ, nke Nna Ya Ukwu, bụ́ Jizọs Kraịst, mere onye na-elekọta ezinụlọ ya. E nyere onye ọ bụla so ná mba ahụ ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ma, onye ọ bụla so n’òtù ahụ ọ̀ ga-eso na-enye nri ime mmụọ ahụ nke a ga na-enye n’oge kwesịrị ekwesị? Ka anyị hụ otú Akwụkwọ Nsọ si zaa ajụjụ a.

7. N’oge mbụ Jizọs họọrọ ndịozi ya, gịnị bụ ọrụ bụ́ isi o nyere ha, oleekwa ọrụ ọzọ e nyekwuru ha?

7 Mgbe Jizọs họọrọ ndịozi iri na abụọ, ọrụ bụ́ isi o zigara ha ka ha gaa rụọ bụ ikwusara ndị ọzọ ozi ọma. (Gụọ Mak 3:13-15.) Ọrụ a kwekọrọ n’ihe bụ́ isi okwu Grik bụ́ apostolos pụtara, nke e si n’okwu pụtara “ziga” nweta. Ma, ka oge na-aga, mgbe ọ fọrọ obere ka e hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst, ọrụ onyeozi ghọrọ “ọrụ nlekọta.”—Ọrụ 1:20-26.

8, 9. (a) Olee ihe ndịozi iri na abụọ ahụ kacha lekwasị anya? (b) Olee ndị ọzọ e nyekwuru ọrụ, bụ́ nke òtù na-achị isi nabatara?

8 Olee ihe ndịozi iri na abụọ ahụ kacha lekwasị anya? Ihe ndị mere mgbe ụbọchị Pentikọst gafere ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a. Mgbe e nwere esemokwu n’ihi otú e si na-enye ndị di ha nwụrụ nri, ndịozi iri na abụọ ahụ kpọkọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs wee, sị: “Ọ dịghị mma ka anyị hapụ okwu Chineke wee na-ekesa ihe oriri na tebụl.” (Gụọ Ọrụ 6:1-6.) N’ihi ya, ndịozi họpụtara ụmụnna ruru eru ịrụ “ọrụ a dị mkpa” ka ndịozi wee na-eje “ozi banyere okwu Chineke.” Ndokwa a ha mere wetara ngọzi Jehova, n’ihi na “okwu Chineke nọ na-eto eto, ọnụ ọgụgụ nke ndị na-eso ụzọ Jizọs nọkwa na-amụba nke ukwuu na Jeruselem.” (Ọrụ 6:7) Ya mere, inye ndị na-eso ụzọ Jizọs nri ime mmụọ bụ ọrụ bụ́ isi ndịozi nọ na-arụ.—Ọrụ 2:42.

9 Ka oge na-aga, e nyere ndị ọzọ ọrụ ndị dị mkpa. Mmụọ nsọ duzikwara ọgbakọ Antiọk ha wee zipụ Pọl na Banabas ka ha gaa ala ọzọ zie ozi ọma. A kpọkwara ha ndịozi, n’agbanyeghị na ha esoghị ná ndịozi iri na abụọ mbụ ahụ Jizọs họpụtara. (Ọrụ 13:1-3; 14:14; Gal. 1:19) Òtù na-achị isi nke nọ na Jeruselem nabatara nhọpụta a họpụtara ha. (Gal. 2:7-10) Obere oge mgbe nke ahụ gachara, Pọl nyere aka mee ka ndị mmadụ nweta nri ime mmụọ. O dere akwụkwọ ozi mbụ o ji ike mmụọ nsọ dee.

10. Na narị afọ mbụ, ọ̀ bụ Ndị Kraịst niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ kwadebere iri ime mmụọ? Kọwaa.

10 Ma, ọ̀ bụ Ndị Kraịst niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma n’oge ahụ, na-akwadebekwa nri ime mmụọ? Mba. Pọl onyeozi gwara anyị, sị: “Ọ̀ bụ ha niile bụ ndịozi? Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị amụma? Ọ̀ bụ ha niile bụ ndị ozizi? Ọ̀ bụ ha niile na-arụ ọrụ dị ike?” (1 Kọr. 12:29) Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst niile e ji mmụọ nsọ tee mmanụ zisara ozi ọma, ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha, ya bụ, naanị mmadụ asatọ dere akwụkwọ iri abụọ na asaa dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst.

Ohu ahụ Kwesịrị Ntụkwasị Obi nke Oge A

11. Gịnị bụ ihe Kraịst “nwere” bụ́ ndị o mere ohu ahụ onye na-elekọta ha?

11 Ihe Jizọs kwuru nke dị na Matiu 24:45 na-eme ka o doo anya na òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, ka ga-anọ n’ụwa n’oge ọgwụgwụ. Mkpughe 12:17 kpọrọ ha “ndị fọdụrụ” n’ime mkpụrụ nwaanyị ahụ. Kraịst mere ndị ahụ fọdụrụ ndị na-elekọta ihe niile o nwere n’ụwa. Ihe niile Jizọs “nwere,” bụ́ ndị e nyere onye ahụ na-elekọta ụlọ, bụ́ onye kwesịrị ntụkwasị obi, ka ọ na-elekọta bụ ihe niile Nna Ya Ukwu, bụ́ eze, nwere n’ụwa. Ihe ndị a gụnyere ndị ga-ebi n’ụwa mgbe Alaeze ahụ ga na-achị nakwa ụlọ dị iche iche e wuru maka ikwusa ozi ọma.

12, 13. Olee otú Onye Kraịst si ama ma à kpọrọ ya òkù ịga eluigwe?

12 Olee otú Onye Kraịst si ama ma ò nwere olileanya ịga eluigwe nke ga-eme ka o soro ná ndị fọdụrụ n’ụmụ Izrel ime mmụọ? Anyị ga-ahụ azịza ajụjụ a n’ihe ahụ Pọl onyeozi gwara ndị ya na ha nwere olileanya ịga eluigwe. Ọ sịrị: “Ndị niile mmụọ Chineke na-edu, ha bụ ụmụ Chineke. N’ihi na unu anataghị mmụọ nke ịnọ n’ohu, nke na-akpata egwu ọzọ, kama unu natara mmụọ nke ịbụ ndị e doro dị ka ụmụ, bụ́ mmụọ nke anyị sitere na ya na-eti mkpu, sị: ‘Aba, Nna!’ Mmụọ nsọ n’onwe ya so mmụọ anyị na-agba àmà na anyị bụ ụmụ Chineke. Ma, ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa: n’ezie, ndị nketa nke Chineke, ma bụrụ ndị ha na Kraịst na-eketakọ ihe, ma ọ bụrụhaala na anyị na ya atakọọ ahụhụ ka e wee mee ka anyị na ya nwekọọ ebube.”—Rom 8:14-17.

13 E kwuo ya ná nkenke, e ji mmụọ Chineke tee ndị a mmanụ, a ‘kpọkwara ha òkù’ ịga eluigwe. (Hib. 3:1) Ọ bụ Chineke kpọrọ ha òkù a. Ha na-aza òkù a ozugbo wee kwere ịbụ ụmụ Chineke, n’enweghị obi abụọ, n’atụghịkwa ụjọ. (Gụọ 1 Jọn 2:20, 21.) Ha anaghị eji aka ha ekpebi na ha nwere olileanya a, kama, ọ bụ Jehova na-aka ha akara, ma ọ bụ wụkwasị ha mmụọ ya.—2 Kọr. 1:21, 22; 1 Pita 1:3, 4.

Echiche Ziri Ezi

14. Olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele òkù ahụ a kpọrọ ha anya?

14 Olee otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya n’oge a ha na-agabeghị eluigwe? Ha kwesịrị icheta na ọ bụ ezie na a kpọrọ ha òkù mara ezigbo mma, ma, ọ ka bụ naanị òkù. Ha aghaghị ikwesị ntụkwasị obi ruo mgbe ha nwụrụ, ka ha wee nweta ihe a na-agbata n’ọsọ. Ha na-eji obi umeala ekwu ka Pọl, bụ́ onye sịrị: “Ụmụnna m, agụbeghị m onwe m n’onye jidere ya; kama o nwere otu ihe dị na ya: Ana m echefu ihe ndị dị n’azụ, na-amatịkwa onwe m inweta ihe ndị dị n’ihu, ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 3:13, 14) Ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ aghaghị iji “egwu na ịma jijiji” na-eme ike ha niile ka ha wee ‘na-eje ije n’ụzọ kwesịrị òkù ahụ a kpọrọ ha, n’ịdị umeala n’obi zuru ezu.’—Efe. 4:1, 2; Fil. 2:12; 1 Tes. 2:12.

15. Olee otú Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ele ndị na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs, na-atakwa achịcha e ji echeta ya anya, oleekwa otú ndị e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ha anya?

15 Ma, olee otú Ndị Kraịst ndị ọzọ kwesịrị isi na-ele onye kwuru na e tere ya mmanụ anya, bụ́ onye na-aṅụ mmanya, na-atakwa achịcha ma a na-echeta ọnwụ Jizọs? E kwesịghị ịkatọ ya. Ọ bụ ya na Jehova ka ọ dịịrị. (Rom 14:12) Ma, Ndị Kraịst e tere mmanụ ekwesịghị ịchọ ka a na-akwanyere ha ùgwù pụrụ iche. Ha ekwesịghị iche na ebe ọ bụ na ha bụ ndị e tere mmanụ na ha nwere amamihe pụrụ iche karịa ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ, bụ́ ndị nọrọla ọdụ n’ọgbakọ. (Mkpu. 7:9) Ha ekwesịghịkwa iche na ha nwere mmụọ nsọ karịa ndị enyi ha, bụ́ ndị so ‘n’atụrụ ọzọ.’ (Jọn 10:16) Ha ekwesịghị ịna-atụ anya ka a na-ebuli ha elu; ọ dịghịkwa mma ka ha na-eche na ha ka ndị okenye ọgbakọ n’ihi na ha na-aṅụ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs, na-atakwa achịcha e ji echeta ya.

16-18. (a) Ndị niile e tere mmanụ hà so ekpebi otú e kwesịrị isi ghọta ihe dị na Baịbụl? Nye ihe atụ. (b) Gịnị mere ọ dịghị mkpa na Òtù Na-achị Isi ga-ajụta ndị niile kwuru na e tere ha mmanụ uche ha tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme?

16 Ndị niile e tere mmanụ nọ n’ụwa hà nọ n’òtù zuru ụwa ọnụ nke na-anọkọ wee kwuo otú e kwesịrị isi ghọta ihe dị na Baịbụl? Mba. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ohu ahụ ka ọ dị n’aka inye Ndị Kraịst nri ime mmụọ, ma, ndị niile so n’ohu ahụ anaghị arụ otu ọrụ ahụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 12:14-18.) Dị ka anyị kwuru na mbụ, na narị afọ mbụ, ndị niile e tere mmanụ kwusara ozi ọma ahụ dị oké mkpa. Ma, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha dere akwụkwọ ndị dị na Baịbụl. Ọ bụkwa mmadụ ole na ole ka ọrụ ilekọta ọgbakọ Ndị Kraịst dịịrị.

17 Dị ka ihe atụ: N’ebe ụfọdụ n’Akwụkwọ Nsọ, e kwuru na “ọgbakọ” kpere ikpe. (Mat. 18:17) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụ naanị ndị okenye kpere ikpe ahụ n’ihi na ha na-anọchite anya ọgbakọ. Ndị okenye anaghị agwa ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ ka ha bịa kwuo uche ha tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. Ha na-arụ ọrụ e nyere ha; ha na-eme mkpebi n’aha ọgbakọ.

18 Taa, mmadụ ole na ole n’ime ndị e tere mmanụ na-anọchite anya ohu ahụ. Ha bụ Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova. Ndị ikom ndị a e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka ọrụ Alaeze na inye ndị Chineke nri ime mmụọ dị n’aka. Dị ka òtù na-achị isi mere na narị afọ mbụ, Òtù Na-achị Isi nke oge a anaghị aga ajụ ndị niile so n’ohu ahụ ihe bụ́ uche ha tupu ha ekpebie ihe ha ga-eme. (Gụọ Ọrụ 16:4, 5.) Ma, Ndịàmà niile e tere mmanụ na-arụsi ọrụ owuwe ihe ubi a a na-arụ n’oge a ike. “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” bụ otu òtù, ma onye ọ bụla n’ime ha nwere ọrụ nke ya.—1 Kọr. 12:19-26.

19, 20. Olee otú ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ kwesịrị isi na-ele “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya anya?

19 Olee otú ihe e kwuru n’isiokwu a ga-esi metụta oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị na-amụba n’ike n’ike, ndị nwere olileanya ibi n’ụwa a ruo mgbe ebighị ebi? Ebe ha so n’ihe Eze ahụ nwere n’ụwa, ha kwesịrị iji obi ụtọ na-anabata ihe niile Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-anọchite anya “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” kpebiri ka e mee. Ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ kwesịrị inwe ekele maka nri ime mmụọ Òtù Na-achị Isi na-enye ndị Chineke. N’agbanyeghị na ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ kwesịrị ịna-akwanyere ohu ahụ ùgwù, ha kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara ịna-ebuli ndị kwuru na ha so n’ohu ahụ elu. Ọ dịghị Onye Kraịst ọ bụla bụ́ ezigbo onye e tere mmanụ nke kwesịrị ịtụ anya ka a na-ebuli ya elu.—Ọrụ 10:25, 26; 14:14, 15.

20 Ma ànyị so ‘n’ezinụlọ’ Kraịst, ya bụ, ndị so ná ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, ma ànyị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-erubere onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya isi. Ka onye ọ bụla n’ime anyị ‘na-eche nche’ ma kwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ.—Mat. 24:13, 42.

Ì Chetara?

• Ònye bụ “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” olekwa ndị bụ ezinụlọ Kraịst?

• Olee otú mmadụ si ama na a kpọrọ ya òkù ịga eluigwe?

• Ònye ka ọ bụ ọrụ ya ịkwadebe nri ime mmụọ ọhụrụ?

• Olee otú onye e tere mmanụ kwesịrị isi na-ele onwe ya anya?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 23]

Taa, Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche. E nwere ihe yiri nke a na narị afọ mbụ