Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịchọta Akụ̀ ‘e ji Nlezianya Zochie n’Ime Ya’

Ịchọta Akụ̀ ‘e ji Nlezianya Zochie n’Ime Ya’

Ịchọta Akụ̀ ‘e ji Nlezianya Zochie n’Ime Ya’

“E ji nlezianya zochie akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.”—KỌL. 2:3.

1, 2. (a) Olee ihe ndị a chọtara n’afọ 1922, oleekwa ebe ihe ndị ahụ dị ugbu a? (b) Gịnị ka Okwu Chineke gwara mmadụ niile ka ha mee?

ỊCHỌTA akụ̀ zoro ezo bụ oké ihe. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye Britain aha ya bụ Howard Carter, onye na-amụ banyere ihe mgbe ochie, tara ahụhụ ọtụtụ iri afọ na-achọ ihe n’ime ala, ọ hụrụ otu ihe dị ịtụnanya n’afọ 1922. Ọ hụrụ ili Fero Tutankhamen, nke ihe dị n’ime ya ruru puku ise.

2 Ọ bụ ezie na ihe ahụ Carter chọtara dị ịtụnanya, ọtụtụ n’ime ha dị ugbu a n’ebe a na-edebe ihe mgbe ochie nakwa n’ụlọ ndị mmadụ. Ọ bụ ezie na ha mara mma, nweekwa ike inyere anyị aka ịmata ihe ndị mere n’oge ochie, ma, ha agaghị enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị. Ma, Okwu Chineke gwara anyị ka anyị chọọ akụ̀ ga-abara anyị ezigbo uru. Ọ gwara mmadụ niile ka ha mee nke a, ọ bụrụkwa na anyị achọta akụ̀ a, ọ ga-abara anyị uru karịa akụ̀ nkịtị ọ bụla.—Gụọ Ilu 2:1-6.

3. Olee otú akụ̀ Jehova gwara ndị ohu ya ka ha chọọ si baa uru?

3 Tụlee uru akụ̀ ahụ Jehova gwara ndị ohu ya ka ha chọọ bara. Otu n’ime akụ̀ ndị ahụ ọ sị ha chọọ bụ “egwu Jehova,” bụ́ nke nwere ike ichebe anyị n’oge a dị egwu. (Ọma 19:9) Ọ bụrụ na mmadụ achọta “ihe ọmụma Chineke,” ọ ga-eme ka onye ahụ nwee ihe ùgwù kacha ihe ùgwù niile mmadụ nwere ike inwe, ya bụ, ya na Onye Kacha Ihe Niile Elu ga-adị ná mma. Ọ bụrụ na anyị enweta akụ̀ ahụ, bụ́ amamihe, ihe ọmụma, na nghọta si n’aka Chineke, anyị ga-enwe ike ịma ihe anyị ga-eme banyere nsogbu ndị anyị na-enwe kwa ụbọchị. (Ilu 9:10, 11) Olee otú anyị nwere ike isi chọta akụ̀ ndị ahụ dị oké ọnụ ahịa?

Ịchọta Akụ̀ Ime Mmụọ

4. Olee otú anyị ga-esi achọta akụ̀ ime mmụọ?

4 Anyị adịghị ka ndị na-amụ banyere ihe mgbe ochie na ndị na-eme nchọpụta, bụ́ ndị na-agagharị ebe niile ma hà ga-achọta akụ̀ dị oké ọnụ ahịa. Anyị ma kpọmkwem ebe anyị ga-achọta akụ̀ ime mmụọ. Dị ka map na-enyere ndị na-achọ akụ̀ nkịtị dị oké ọnụ ahịa aka, Okwu Chineke na-egosi anyị kpọmkwem ebe anyị ga-achọta akụ̀ Chineke kwere anyị ná nkwa. Pọl onyeozi dere banyere Kraịst, sị: “E ji nlezianya zochie akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.” (Kọl. 2:3) Ka anyị gụchara amaokwu a, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Olee ihe mere anyị ji kwesị ịchọ akụ̀ ndị a? Olee ihe ‘izochi ha n’ime’ Kraịst pụtara? Oleekwa otú anyị ga-esi chọta ha?’ Iji zaa ajụjụ ndị a, ka anyị leruo ihe ahụ Pọl onyeozi kwuru anya.

5. Olee ihe mere Pọl ji dee banyere akụ̀ ime mmụọ?

5 Ọ bụ Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi ka Pọl degaara okwu ahụ. Ọ gwara ha na ya na-agbasi mgba ike n’ihi ha ka e wee “kasie ha obi, [nakwa] ka e wee jikọọ ha ọnụ n’ịhụnanya.” (Gụọ Ndị Kọlọsi 2:1, 2.) Olee ihe mere ihe metụtara ha ji echu ya ụra? O yiri ka Pọl ọ̀ ma na ụfọdụ ụmụnna ndị nọ n’ebe ahụ, bụ́ ndị na-akụzi ozizi ndị Gris, ma ọ bụkwanụ na-akụzi ka a maliteghachi idebe Iwu Mozis, nọ na-eduhie ndị ọzọ. Ọ dọsiri ha aka ná ntị ike, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.”—Kọl. 2:8.

6. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịṅa ntị na ndụmọdụ Pọl?

6 Taa, Setan na ụwa ọjọọ ya na-achọkwa iduhie anyị. Nkà ihe ọmụma nke ụwa na ozizi evolushọn agbanweela otú ụfọdụ ndị si eche echiche, nakwa otú ha si eme omume. Ha emekwaala ka ndị mmadụ hapụ ihe ndị ha kwesịrị ịna-achụ chụwa ihe ọzọ, gbanweekwa otú ha si ebi ndụ. Okpukpe ụgha nọ n’isi ọtụtụ ememme ndị a ma ama. Ihe juru n’ihe ndị e ji atụrụ ndụ bụ ihe ndị rụrụ arụ, ọtụtụ ihe a na-ahụ n’Ịntanet na-emebi omume ndị na-eto eto nakwa nke ndị torola eto. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekiri ihe ndị a, ma na-etinye aka n’ihe ndị ọzọ juru n’ụwa, ha nwere ike ime ka anyị ghara ịna-aṅa ntị n’ihe Jehova na-agwa anyị, meekwa ka anyị ghara ime ihe ọ chọrọ ka anyị mee. Nke a ga-eme ka anyị ghara ijidesi aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie. (Gụọ 1 Timoti 6:17-19.) N’ezie, anyị kwesịrị ịghọta ihe Pọl gwara ndị Kọlọsi ma mee ihe ọ dụrụ n’ọdụ ma ọ bụrụ na anyị achọghị ka Setan mata anyị n’ọnyà.

7. Olee ihe abụọ Pọl sị na ha ga-enyere ndị Kọlọsi aka?

7 Ka anyị laghachi n’ihe ahụ Pọl gwara ndị Kọlọsi. Anyị ga-ahụ na mgbe Pọl kwuchara otú o si na-eche banyere ha, o kwuru ihe abụọ ga-akasi ha obi nke ga-emekwa ka e jikọọ ha n’ịhụnanya. Nke mbụ bụ “obi ike zuru ezu ná nghọta ha.” Ha kwesịrị ịhụ na ha ghọtara Akwụkwọ Nsọ nke ọma ka okwukwe ha wee nwee ebe o hiwere isi. (Hib. 11:1) Ihe ọzọ o kwuru okwu ya bụ “ezi ihe ọmụma banyere ihe nzuzo dị nsọ nke Chineke.” Ha kwesịrị ịma ihe karịrị eziokwu ndị bụ́ isi, ya bụ, ha kwesịrị ịghọta ihe ndị miri emi nke Chineke. (Hib. 5:13, 14) N’ezie, nke a bụ ndụmọdụ ndị Kọlọsi kwesịrị ịṅa ntị na ya, anyịnwa kwesịkwara ime otú ahụ taa. Ma, olee otú anyị nwere ike isi nweta obi ike na ezi ihe ọmụma a dị mkpa? Pọl gwara anyị otú anyị nwere ike isi nweta ha mgbe o kwuru okwu ahụ gbara ọkpụrụkpụ banyere Jizọs Kraịst, sị: “E ji nlezianya zochie akụ̀ niile dị oké ọnụ ahịa nke amamihe na nke ihe ọmụma n’ime ya.”

Akụ̀ Ndị E ‘Zochiri n’Ime’ Kraịst

8. Kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ ‘e zochiri’ ya n’ime Kraịst pụtara.

8 Na e ‘zochiri’ akụ̀ nke amamihe na ihe ọmụma n’ime Kraịst apụtaghị na a kpọchiri ha n’ebe mmadụ na-agaghị enwetali ha. Kama nke ahụ, ihe ọ pụtara bụ na anyị aghaghị ịgbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta akụ̀ ndị ahụ, ọ pụtakwara na anyị aghaghị ịchọ ya n’ime Jizọs Kraịst. Nke a kwekọrọ n’ihe Jizọs kwuru banyere onwe ya, sị: “Ọ bụ m bụ ụzọ na eziokwu na ndụ. Ọ dịghị onye na-abịakwute Nna m ma ọ́ bụghị site na mụ.” (Jọn 14:6) N’ezie, ọ bụrụ na anyị chọrọ inweta ihe ọmụma Chineke, anyị aghaghị ime ihe Jizọs gwara anyị mee.

9. Olee ọrụ ndị e nyere Jizọs?

9 Mgbe Jizọs kwuchara na ya bụ “ụzọ,” o kwukwara na ya bụ “eziokwu na ndụ.” Nke a pụtara na Jizọs nwere ọrụ ọzọ dị ezigbo mkpa ọ na-arụ ma e wezụga na ọ bụ ụzọ e si abịakwute Nna anyị nke eluigwe. Jizọs na-enyere anyị aka ịghọta eziokwu dị na Baịbụl, nyekwara anyị aka inweta ndụ ebighị ebi. N’ezie, e zoro akụ̀ ime mmụọ na-enweghị atụ n’ime Jizọs, ọ bụkwa ndị ji nlezianya na-amụ Baịbụl ga-achọta ya. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime akụ̀ ndị a dị oké ọnụ ahịa, bụ́ ndị ga-eme ka ihe dịrị anyị mma n’ọdịnihu, meekwa ka anyị na Chineke dị ná mma.

10. Gịnị ka anyị mụtara banyere Jizọs ná Ndị Kọlọsi 1:19 na 2:9?

10 “Ọ bụ n’ime ya ka izu ezu niile nke ọdịdị Chineke bi n’anụ ahụ́.” (Kọl. 1:19; 2:9) Ebe ọ bụ na Jizọs na Nna ya anọọla ijeri kwuru ijeri afọ, ọ ma Chineke karịa onye ọ bụla ọzọ. Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, ọ kụziiri ndị ọzọ ihe Nna ya kụziiri ya, kpaakwa àgwà ndị Nna ya kụziiri ya. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kwuo, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) E zochiri amamihe na ihe ọmụma niile si n’aka Chineke n’ime Kraịst, o nweghịkwa ụzọ ọzọ ka mma anyị ga-esi mụta banyere Jehova ma ọ́ bụghị site n’iji nlezianya mụọ banyere Jizọs.

11. Olee ihe jikọrọ Jizọs na amụma ndị dị na Baịbụl?

11 “Ịgba àmà banyere Jizọs bụ ihe na-akpali ibu amụma.” (Mkpu. 19:10) Nke a na-egosi na ọtụtụ amụma ndị e buru na Baịbụl mezuru n’ahụ́ Jizọs. Anyị ga-aghọta amụma ndị e buru na Baịbụl nke ọma, malite n’amụma Jehova buru, nke e dere na Jenesis 3:15, ruo n’amụma ndị dị ebube e dere n’akwụkwọ Mkpughe, ma ọ bụrụ na anyị aghọta ọrụ Jizọs na-arụ n’Alaeze Mesaya. Ọ bụ ya mere ọtụtụ n’ime amụma ndị e buru n’Akwụkwọ Nsọ Hibru ji agbagwoju ndị na-ekweghị na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa anya. Ọ bụkwa ya mere ndị na-ekweghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, bụ́ ebe e buru ọtụtụ amụma banyere Mesaya, ji were Jizọs ka naanị otu n’ime ndị a ma ama. Ọmụma ndị ohu Chineke ma Jizọs na-enyere ha aka ịghọta ihe amụma ndị dị na Baịbụl, bụ́ ndị na-emezubeghị, pụtara.—2 Kọr. 1:20.

12, 13. (a) Olee otú Jizọs si bụrụ “ìhè nke ụwa”? (b) Olee ihe ndị na-eso ụzọ Kraịst na-aghaghị ime ebe ha na-anọkwaghị n’ọchịchịrị nke okpukpe?

12 “Abụ m ìhè nke ụwa.” (Gụọ Jọn 8:12; 9:5.) Ọtụtụ afọ tupu a mụọ Jizọs n’ụwa, Aịzaya onye amụma buru amụma, sị: “Ndị na-eje ije n’ọchịchịrị ahụwo oké ìhè. Ìhè enwukwasịwo ndị bi n’ala nke oké ọchịchịrị.” (Aịza. 9:2) Matiu onyeozi kwuru na Jizọs mezuru amụma a mgbe ọ malitere ikwusa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ, sị: “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe eruwo nso.” (Mat. 4: 13, 14, 16, 17) Ozi Jizọs jere mere ka ndị mmadụ hụ ìhè eziokwu, meekwa ka ha hapụ ozizi okpukpe ụgha. Jizọs sịrị: “Abịawo m dị ka ìhè n’ime ụwa, ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’ebe m nọ wee ghara ịnọgide n’ọchịchịrị.”—Jọn 1:3-5; 12:46.

13 Mgbe ọtụtụ afọ gafere, Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya, sị: “Unu bụbu ọchịchịrị, ma ugbu a unu bụ ìhè n’ime Onyenwe anyị. Na-ejenụ ije dị ka ụmụ nke ìhè.” (Efe. 5:8) Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst anọkwaghị n’ọchịchịrị nke okpukpe, ha aghaghị ịna-eje ije dị ka ụmụ nke ìhè. Nke a kwekọrọ n’ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ọ sịrị: “Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha wee hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.” (Mat. 5:16) Obi ọ̀ dị gị ụtọ maka akụ̀ ime mmụọ ị chọtara n’ime Jizọs nke na i nwere ike ịgwa ndị ọzọ banyere ya ma na-akpa àgwà ga-egosi na ị bụ Onye Kraịst?

14, 15. (a) Olee ihe e ji atụrụ na anụmanụ ndị ọzọ na-eme n’ofufe Chineke n’oge ochie? (b) Gịnị mere Jizọs, bụ́ “Nwa Atụrụ Chineke,” ji bụrụ akụ̀ na-enweghị atụ?

14 Jizọs bụ “Nwa Atụrụ Chineke.” (Jọn 1:29, 36) N’ọtụtụ ebe na Baịbụl, e kwuru na e ji atụrụ achụ àjà ka e wee gbaghara mmadụ mmehie ya nakwa ka onye ahụ wee nwee ike ịbịakwute Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe Ebreham chọrọ ịchụ Aịzik nwa ya n’àjà, Jehova gwara ya ka ọ ghara imetụ ya aka kama o nyere ya ebule, ma ọ bụ oké atụrụ, ọ ga-eji chụọ àjà ahụ. (Jen. 22:12, 13) E jikwa atụrụ mee ihe dị mkpa mgbe a napụtara ụmụ Izrel n’Ijipt, e ji ya mee “ememme ngabiga Jehova.” (Ọpụ. 12:1-13) Iwu Mozis kwukwara ka e jiri ụmụ anụmanụ dị iche iche na-achụ àjà, tinyere ewu na atụrụ.—Ọpụ. 29:38-42; Lev. 5:6, 7.

15 Ma, àjà ndị ahụ niile emeghị ka mmadụ nwere onwe ya kpamkpam wee ghara ịna-eme mmehie ma ọ bụkwanụ na-anwụ anwụ. Ọ dịghịkwa àjà ọ bụla mmadụ chụrụ nke ga-emeli nke ahụ. (Hib. 10:1-4) Ma, Jizọs bụ “Nwa Atụrụ Chineke nke na-ewepụ mmehie nke ụwa.” Naanị nke a ezuola ime ka Jizọs bụrụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa karịa akụ̀ ọ bụla a chọtatụrụla. N’ihi ya, ọ ga-adị mma ma anyị wepụta oge mụọ ihe banyere ihe mgbapụta ahụ nke ọma ma nwee okwukwe n’ihe a magburu onwe ya Jehova nyere anyị. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-enwe olileanya inweta ngọzi dị ebube. “Ìgwè atụrụ nta” ahụ ga-enwe ihe ùgwù dị ebube nke bụ́ iso Kraịst chịa n’eluigwe, ebe “atụrụ ọzọ” ahụ ga-adị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa.—Luk 12:32; Jọn 6:40, 47; 10:16.

16, 17. Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị ghọta otú Jizọs si bụrụ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị”?

16 Jizọs bụ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị.” (Gụọ Ndị Hibru 12:1, 2.) Pọl onyeozi kọwara nnọọ okwukwe nke ọma ná Ndị Hibru isi iri na otu. O kwuru ihe okwukwe pụtara, kwuokwa aha ndị ikom na ndị inyom nwere okwukwe, ndị dị ka Noa, Ebreham, Sera na Rehab. Mgbe Pọl kwuchara ihe ndị a, ọ gbara ụmụnna ya ume ka ha “na-elegide anya n’ebe Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị nọ, bụ́ Jizọs.” Gịnị mere Pọl ji kwuo nke a?

17 Ọ bụ ezie na obi siri ndị ikom na ndị inyom ahụ kwesịrị ntụkwasị obi e kwuru okwu ha ná Ndị Hibru isi iri na otu ike na nkwa Chineke ga-emezu, ma, ha amaghị kpọmkwem otú ọ ga-esi mezuo nkwa ahụ site n’aka Mesaya ahụ na Alaeze ya. N’ihi nke a, e nwere ike ikwu na okwukwe ha ezughị ezu. N’ezie, ọbụna ndị dere ọtụtụ amụma ndị kwuru banyere Mesaya ahụ aghọtachaghị ihe ihe ha dere pụtara. (1 Pita 1:10-12) Ma taa, anyị ahụla mmezu nke ọtụtụ n’ime amụma ndị e buru banyere Jizọs, nke a emekwaala ka okwukwe anyị zuo ezuo. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji kwuo na Jizọs bụ “Onye Nnọchiteanya Ukwu na Onye Mmezu nke okwukwe anyị.” Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị ghọta nke ọma ọrụ a Jizọs na-arụ.

Na-achọnụ

18, 19. (a) Kwuo akụ̀ ime mmụọ ndị ọzọ e zochiri n’ime Kraịst. (b) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-achọ akụ̀ ime mmụọ n’ime Jizọs?

18 Anyị atụleela naanị ọrụ ole na ole n’ime ọrụ Jizọs na-arụ n’imezu nzube Chineke, nke bụ́ ịzọpụta ụmụ mmadụ. A ka nwekwara akụ̀ ime mmụọ ndị ọzọ e zochiri n’ime Kraịst. Anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị chọta ha, ha ga-abakwara anyị uru. Dị ka ihe atụ, Pita onyeozi kpọrọ Jizọs “Onye Nnọchiteanya Ukwu nke ndụ” na “kpakpando ụtụtụ” nke na-enwu enwu. (Ọrụ 3:15; 5:31; 2 Pita 1:19) Baịbụl kwukwara na Jizọs bụ “Amen.” (Mkpu. 3:14) Ị̀ ma ihe okwu ndị a pụtara na uru ha bara? Dị ka Jizọs kwuru, “na-achọnụ, unu ga-achọta.”—Mat. 7:7.

19 Ọ dịghị onye ọ bụla n’ụwa nke ndụ ya baara anyị uru, onye ndụ ya ga-eme ka anyị nwee ndụ ebighị ebi ka ndụ Jizọs. E nwere ọtụtụ akụ̀ ime mmụọ n’ime Jizọs, bụ́ ndị onye ọ bụla ji obi ya dum na-achọ ga-achọta. Ka anyị nwee ọṅụ a na-enweta n’ịchọta akụ̀ ndị “e ji nlezianya zochie . . . n’ime ya.”

[Ì Chetara?]

• Olee akụ̀ a gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-achọ?

• Olee ihe mere ndụmọdụ Pọl nyere ndị Kọlọsi ka ji baara anyị uru taa?

• Kwuo ụfọdụ akụ̀ ime mmụọ ndị ‘e zochiri n’ime’ Kraịst, kọwaakwa ha.

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 5]

Baịbụl dị ka map e ji achọ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa, bụ́ nke na-enyere anyị aka ịchọta akụ̀ ndị ‘e zochiri’ n’ime Kraịst