Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Afọ Iri Itoolu Gara Aga, m Malitere ‘Icheta Onye Okike Ukwu m’

Afọ Iri Itoolu Gara Aga, m Malitere ‘Icheta Onye Okike Ukwu m’

Afọ Iri Itoolu Gara Aga, m Malitere ‘Icheta Onye Okike Ukwu m’

Dị ka Edwin Ridgwell si kọọ

NA NOVEMBER 11, 1918, a kpọkọtara ụmụaka nọ n’ụlọ akwụkwọ anyị na mberede maka ememme e ji echeta mgbe Agha Ukwu ahụ biri, nke e mechara kpọwa Agha Ụwa nke Mbụ. Adị m naanị afọ ise mgbe ahụ, aghọtachaghịkwa m ihe mere e ji na-eme ememme ahụ. Ama m na ekwesịghị m iso mee ememme ahụ n’ihi ihe ndị mụrụ m kụziiri m banyere Chineke. Ekpekuru m Chineke ekpere, ma, ejidelighị m onwe m, wee malite ibe ákwá. N’agbanyeghị nke a, esoghị m ha mee ememme ahụ. Ọ bụ otú a ka m si malite ‘icheta Onye Okike Ukwu m.’—Ekli. 12:1.

Ọnwa ole na ole tupu ihe a emee n’ụlọ akwụkwọ anyị, ezinụlọ anyị kwagara n’ebe dị nso na Glasgow, nke dị na Scotland. N’oge ahụ, papa m gara gee okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Ma Ọlị.” Ọ gbanwere ndụ ya. Papa m na mama m malitere ịmụ Baịbụl, ha na-akparịta ụka ọtụtụ mgbe banyere Alaeze Chineke na ngọzi ndị ọ ga-eweta. Ekelere m Chineke na site mgbe ahụ gawa, ndị mụrụ m kụziiri m otú m ga-esi hụ Chineke n’anya ma tụkwasị ya obi.—Ilu 22:6.

M Malitere Ozi Oge Niile

Ekwesịrị m ịbanye mahadum mgbe m dị afọ iri na ise, ma achọrọ m ije ozi oge niile. Papa m chere na m torubeghị ịmalite ozi oge niile, n’ihi ya, arụrụ m ọrụ n’otu ọfịs obere oge. Ma, ijere Jehova ozi oge niile gụsiri m agụụ ike nke na otu ụbọchị, edegaara m J. F. Rutherford akwụkwọ. Ọ bụ ya na-elekọta ọrụ nkwusa n’ụwa niile mgbe ahụ. Ajụrụ m ya ihe o chere banyere ihe m chọrọ ime. Nwanna Rutherford zara m akwụkwọ ozi ahụ, sị: “Ọ bụrụ na i toruola ịrụ ọrụ, i toruokwala ijere Onyenwe anyị ozi. . . . Ama m na Onyenwe anyị ga-agọzi gị ma ọ bụrụ na ị gbaa mbọ na-ejere ya ozi.” Akwụkwọ ozi ahụ, bụ́ nke o dere na March 10, 1928, metụrụ ezinụlọ anyị n’ahụ́. N’oge na-adịghị anya, mụ na papa m na mama m na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m, malitere ije ozi oge niile.

Na mgbakọ e nwere na London n’afọ 1931, Nwanna Rutherford jụrụ ma è nwere ndị ga-achọ ịga kwusaa ozi ọma ná mba ọzọ. Ewepụtara m onwe m, e zigakwara mụ na Andrew Jack n’obodo Kaunas, nke bụ́ isi obodo Lithuania mgbe ahụ. Adị m afọ iri na asatọ n’oge ahụ.

Ikwusa Ozi Ọma ná Mba Ọzọ

N’oge ahụ, Lithuania bụ mba dara ogbenye e ji ịkọ ugbo mara, ọ dịghịkwa mfe ikwusa ozi ọma n’ime ime obodo ndị dị ebe ahụ. O siri ike inweta ụlọ, anyị agaghịkwa echefu ụfọdụ ebe ndị anyị biri echefu. Dị ka ihe atụ, n’otu abalị, mụ na Andrew tetara ụra n’ime abalị n’ihi na o nwere ihe nọ na-ata anyị. Mgbe anyị mụnyere lampụ anyị, anyị hụrụ na chịnchị juru n’ihe anyị dina. Ha takasịrị anyị ahụ́! Kwa ụtụtụ, m na-eguzo na mmiri na-eru m n’olu ka ahụ́ na-agbakasị m wee kwụsịtụ. M mere nke a otu izu. N’agbanyeghị nke a, anyị kpebisiri ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma. N’oge na-adịghị anya, anyị kwụsịrị inwe nsogbu ụlọ obibi mgbe anyị na otu di na nwunye lụrụ ọhụrụ matara, bụ́ ndị nabatara ozi ọma. Ha kwere ka anyị biri n’ụlọ ha, bụ́ nke dị obere, ma dị ọcha. Obi dị anyị ụtọ idina n’ala ụlọ ha dị ọcha karịa idina n’ihe ndina chịnchị juru.

Ndị ụkọchukwu Roman Katọlik nakwa ndị nke Ọtọdọks nke Russia na-akpakwa ike ebe ahụ. Ọ bụ naanị ndị ọgaranya na-azụtali Baịbụl n’ebe ahụ. Ihe bụ́ ebumnobi anyị bụ ịgazu ozi ọma n’ókèala buru ibu ma nye ọtụtụ ndị nwere mmasị akwụkwọ e ji amụ Baịbụl. Tupu anyị emee nke ahụ, anyị ga-ebu ụzọ chọta ụlọ. Ihe ọzọ anyị na-eme bụ iji akọ gazuo ozi ọma n’ebe ndị dị n’ime ime n’obodo ọ bụla anyị gara, anyị gachaa ha, anyị agazie ebe ndị fọrọ afọ ngwa ngwa. Anyị na-esi otú a gachaa ebe ndị anyị chọrọ ịga tupu ndị ụkọchukwu nọ ebe ndị ahụ ebido inye anyị nsogbu.

Ihe Ndị E Mere Anyị Mere Ka Ọtụtụ Ndị Mara Anyị

N’afọ 1934, a kpọrọ Andrew ka ọ bịa rụwa n’alaka ụlọ ọrụ dị na Kaunas, e zitekwara John Sempey ka ọ bịakwute m ka mụ na ya na-eje ozi. E nwere ụfọdụ ihe ndị mere anyị, bụ́ ndị anyị na-agaghị echefu echefu. Otu ụbọchị, agara m ozi ọma n’ụlọ ọrụ otu ọkàiwu. Iwe were nwoke ahụ, ya ewepụta égbè ya, gwa m ka m si n’ọfịs ya pụọ. Ekpere m ekpere n’ime obi m ma cheta ndụmọdụ Baịbụl nyere nke sịrị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.” (Ilu 15:1) N’ihi ya, agwara m ya sị, “Abụ m enyi gị bịara izi gị ozi ọma. M na-ekelekwa gị na ị gbaghị m égbè.” Nwoke ahụ wepụrụ mkpụrụ aka ọ chọrọ iji gbaa égbè ahụ, ejikwa m nwayọọ jiri azụ si n’ọfịs ya pụọ.

Mgbe m hụrụ John, ọ kọkwaara m ihe ya na ụbọchị jere. A kpọgara ya n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’ihi na e boro ya ebubo na o zuru ezigbo ego nke otu nwaanyị ọ gara na nke ya izi ozi ọma. Mgbe John ruru n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, a gbara ya ọtọ ma chọọ ego ahụ. O doro anya na ọ bụghị ya zuru ego ahụ. E mechara hụ onye zuru ego ahụ.

Ihe abụọ a merenụ ghọrọ okwu a kpụ n’ọnụ n’obodo ahụ anyị nọ, ha mekwara ka a mara banyere ọrụ anyị.

E Nwere Onye Na-agbara Ndị Ọchịchị Àmà

Otu ọrụ dị ize ndụ anyị rụrụ bụ ibuga akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’obodo Latvia, bụ́ ebe dị anyị nso, ebe a machibidoro ọrụ anyị iwu. Otu ugboro n’ọnwa, anyị na-agba ụgbọ okporo ìgwè n’abalị gaa Latvia. Mgbe ụfọdụ, anyị busachaa akwụkwọ anyị bu, anyị agaa Estonia butekwuo akwụkwọ, busa ha na Latvia ma anyị lọpụta.

E nwere onye gwara otu onye na-arụ n’ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe ndị e si mba ọzọ ebubata ihe anyị na-eme. Nke a mere ka ọ gwa anyị otu ụbọchị ka anyị rịtuo n’ụgbọ anyị nọ ma buru akwụkwọ anyị bịa hụ nna ya ukwuu. Mụ na John kpere ekpere ka Jehova nyere anyị aka. Ọ tụrụ anyị n’anya na ọ gwaghị nna ya ukwu ihe anyị bu kama ọ sịrị, “Ndị a nwere ihe ha chọrọ ịgwa gị.” Agwara m ya na akwụkwọ anyị bu ga-enyere ụmụ akwụkwọ aka ịghọta ihe nsogbu nke jupụtara n’ụwa a na-egosi. Ọ gwara anyị ka anyị gafee, anyị gawakwara ebe anyị na-aga wee busa akwụkwọ ndị ahụ n’enweghị nsogbu.

Ka ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị e nwere n’Estonia, Latvia, na Lithuania na-akakwu njọ, e nwere ọtụtụ ndị na-enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, a machibidokwara ọrụ anyị iwu na Lithuania. A gbaara Andrew na John ụgbọ nwa mkpi, a gwakwara ndị Britain niile ka ha lawa n’ihi Agha Ụwa nke Abụọ na-achọ ịmalite. Mụnwa jikwa mwute laa.

Ihe Ùgwù na Ngọzi Ndị M Nwetara na Northern Ireland

Tupu mụ alọta, ndị mụrụ m akwagalarị Northern Ireland, n’ihi ya, m kwagara ebe ahụ n’afọ 1937. A machibidokwara akwụkwọ anyị iwu na Northern Ireland n’ihi otú obi dị ndị mmadụ maka agha na-achọ ịmalite. Ma, anyị nọgidere na-ekwusa ozi ọma n’oge agha ahụ. Mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, a kagburu iwu a machibidoro ọrụ anyị, anyị gakwara n’ihu n’ọrụ anyị n’enweghị nsogbu. Harold King, onye rụterela ọrụ ịsụ ụzọ aka nke mechara jee ozi na China, haziri okwu ihu ọha ndị a nọ n’èzí kwuo. Otu ụbọchị ọ sịrị: “Na Saturday a, ọ bụ m ga-ekwu okwu ihu ọha mbụ a ga-anọ n’èzí kwuo.” O lere m anya ma kwuo sị: “Ọ bụ gị ga-ekwu na Saturday ọzọ.” Ọ tụrụ m n’anya.

Echetara m nnọọ ihe mere n’okwu ihu ọha mbụ m kwuru. Imeriime mmadụ bịara. Eguzo m n’elu otu igbe kwuo ya, ejighịkwa m ígwè okwu. Mgbe m kwuchara, otu nwoke bịakwutere m, kwee m n’aka, ma gwa m na aha ya bụ́ Bill Smith. Ọ sị na ya hụrụ ìgwè mmadụ wee bịa ka ya mara ihe na-aganụ. Achọpụtara m na e nweela mgbe papa m ziri Bill ozi ọma, ma ha ahụghịzi onwe ha mgbe papa m na nne nne m kwagara Dublin ịga rụọ ọrụ ịsụ ụzọ. Amụwaara m ya Baịbụl. Ka oge na-aga, mmadụ itoolu si n’ezinụlọ Bill ha ghọrọ ndị Jehova.

E nwere mgbe m kwusara ozi ọma n’otu ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ná mpụga obodo Belfast. Ahụrụ m otu nwaanyị bụ́ onye Russia n’ebe ahụ, onye biburu na Lithuania. Mgbe m gosiri ya akwụkwọ ụfọdụ, ọ tụrụ otu n’ime ha aka ma gwa m, sị: “Enwere m nke ahụ. Ọ bụ nwanne papa m, onye bụ́ prọfesọ na mahadum dị na Kaunas, nyere m ya.” O gosiri m akwụkwọ anyị ji amụ Baịbụl mgbe ahụ, nke dị n’asụsụ Polish. O dejuru ihe n’akụkụ ya. Ọ tụrụ ya n’anya ịmata na ọ bụ m nyere nwanne papa ya akwụkwọ ahụ na Kaunas!—Ekli. 11:1.

Mgbe John Sempey nụrụ na m na-aga Northern Ireland, ọ gwara m ka m gaa na nke nwanne ya nwaanyị nke ọ tọrọ, aha ya bụ Nellie, n’ihi na ọ dị mgbe o nwere mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl. Mụ na nwanne m nwaanyị bụ́ Connie mụụrụ ya Baịbụl. Nellie nwere ọganihu ngwa ngwa ma rara ndụ ya nye Jehova. Ka oge na-aga, mụ na ya kpawara wee lụọ.

Mụ na Nellie jeere Jehova ozi afọ iri ise na isii, anyị nyekwaara ihe karịrị otu narị mmadụ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl. Anyị nwere olileanya ibigide gafee Amagedọn banye n’ụwa ọhụrụ Jehova, ma, ọ nwụrụ n’afọ 1998. Nke a gbawara m obi, ọ bụkwa otu n’ime ule kacha taa akpụ bịaara m.

M Laghachiri Estonia, Latvia, na Lithuania

Mgbe otu afọ gafere Nellie nwụrụ, enwetara m ngọzi magburu onwe ya. A gwara m ka m bịa n’alaka ụlọ ọrụ dị na Tallinn, Estonia. Ụmụnna nọ n’Estonia detaara m akwụkwọ ozi, sị: “N’ime ụmụnna iri e zitere n’Estonia, Latvia, na Lithuania n’ihe dị ka n’agbata afọ 1929 na 1933, ọ bụ naanị gị ka nọ ndụ.” Ha kwukwara na alaka ụlọ ọrụ ha na-ede akụkọ banyere otú ọrụ anyị si bido n’Estonia, Latvia, na Lithuania, ma chọọ ka m bịa.

Ọ bụ nnukwu ihe ùgwù ịkọ ihe mụ na ndị mụ na ha jekọrọ ozi hụrụ n’afọ ndị ahụ. Na Latvia, egosiri m ụmụnna ụlọ e ji mere alaka ụlọ ọrụ mgbe ahụ nakwa uko ụlọ ebe anyị na-ezo akwụkwọ anyị, bụ́ nke ndị uwe ojii na-ahụghị. Na Lithuania, akpọ m gaa n’obere obodo a na-akpọ Šiauliai, bụ́ ebe m jere ozi ịsụ ụzọ. N’otu nnọkọ anyị nwere n’ebe ahụ, otu nwanna gwara m, sị: “Ọtụtụ afọ gara aga, mụ na mama m zụrụ otu ụlọ n’obodo a. Mgbe anyị na-ekpocha unyí nọ n’ụlọ ahụ, ahụrụ m ụfọdụ akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara ọtụtụ afọ gara aga. Mgbe m gụrụ ya, aghọtara m na ihe ha kwuru bụ eziokwu. Ọ ga-abụ gị dowere akwụkwọ ndị ahụ n’ụlọ ahụ ọtụtụ afọ gara aga.”

Agara m mgbakọ sekit n’obodo m rụrụ ọrụ ịsụ ụzọ. Agara m mgbakọ n’ebe ahụ afọ iri isii na ise gara aga tupu alaka ụlọ ọrụ akpọọ m òkù a ka m bịa. N’oge ahụ, anyị dị mmadụ iri atọ na ise bịara mgbakọ ahụ. Ma, obi dị m ụtọ ugbu a ịhụ otu puku mmadụ na narị mmadụ ise bịaranụ! Jehova agọziela ọrụ anyị nke ukwuu.

‘Jehova Ahapụghị M’

N’oge na-adịghị anya, enwetara m nnukwu ngọzi mgbe otu ọmarịcha nwanna nwaanyị aha ya bụ́ Bee kwetara ka m lụwa ya. Anyị lụrụ na November 2006.

M na-agwa onye ọ bụla na-eto eto nke na-achọ ihe ọ ga-eji ndụ ya mee na amamihe dị n’ime ihe ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” M na-enwe obi ụtọ ugbu a dị ka ọbụ abụ ahụ nwere mgbe ọ sịrị: “Chineke, ị nọwo na-ezi m ihe malite n’oge m bụ nwata, ruo ugbu a, anọ m na-akọ banyere ọrụ gị dị ebube. Chineke, biko, ahapụla m ruo ọbụna mgbe m mere agadi na mgbe isi chara m awọ́, ruo mgbe m kọọrọ ọgbọ ọzọ banyere ogwe aka gị, kọọkwara ndị niile a ka ga-amụ banyere ịdị ike gị.”—Ọma 71:17, 18.

[Map dị na peeji nke 25]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

Ọrụ dị ize ndụ anyị rụrụ bụ ibuga akwụkwọ Latvia

ESTONIA

TALLINN

Ọwara Oké Osimiri Riga

LATVIA

RIGA

LITHUANIA

VILNIUS

Kaunas

[Foto dị na peeji nke 26]

Amalitere m ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ na Scotland mgbe m dị afọ iri na ise

[Foto dị na peeji nke 26]

Mụ na Nellie, mgbe anyị gbara akwụkwọ na 1942