Ezinụlọ Ndị Kraịst, Ṅomienụ Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ!
Ezinụlọ Ndị Kraịst, Ṅomienụ Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ!
“Kraịst . . . [hapụụrụ] unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.”—1 PITA 2:21.
1. (a) Olee otú aka Ọkpara Chineke si dịrị n’okike? (b) Olee otú Jizọs si ele ụmụ mmadụ anya?
MGBE Chineke kere eluigwe na ụwa, Ọkpara ya nọ ya n’akụkụ “dị ka onye ọkà ọrụ.” Ọkpara Chineke nyeere Nna ya aka mgbe ọ haziri ma kee anụmanụ na osisi dị iche iche dị n’ụwa. O nyekwaara ya aka mgbe ọ kwadebere Paradaịs, bụ́ ebe mmadụ o kere n’onyinyo ya nakwa n’oyiyi ya ga-ebi. Ọkpara Chineke, bụ́ onye mechara bụrụ Jizọs, hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu. ‘Ihe na-enye ya obi ụtọ bụ ihe metụtara ụmụ mmadụ.’—Ilu 8:27-31; Jen. 1:26, 27.
2. (a) Gịnị ka Jehova nyere ụmụ mmadụ na-ezughị okè ka o nyere ha aka? (b) Olee otu n’ime nduzi Baịbụl na-enye anyị?
2 Mgbe di na nwunye mbụ mehiere, ịgbapụta ụmụ mmadụ, bụ́ ndị mmehie, ghọrọ otu n’ime ihe dị mkpa Jehova zubere ime. Jehova chụrụ Kraịst n’àjà ka e wee gbapụta ụmụ mmadụ. (Rom 5:8) Jehova nyekwara ụmụ mmadụ Okwu ya, bụ́ Baịbụl, bụ́ nke na-akụziri ha ihe ha ga-eme ka ihe wee na-agara ha nke ọma n’agbanyeghị na ha ezughị okè. (Ọma 119:105) Jehova ji Okwu ya akụziri ndị mmadụ ihe ha ga-eme ka ezinụlọ ha wee kwụrụ chịm ma na-enwe obi ụtọ. Akwụkwọ Jenesis kwuru banyere alụmdi na nwunye wee sị na nwoke ‘ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’—Jen. 2:24.
3. (a) Gịnị ka Jizọs kụziri banyere alụmdi na nwunye? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?
3 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ kụziiri ndị Mat. 5:27-37; 7:12) N’isiokwu a, anyị ga-amụ otú ihe Jizọs kụziri mgbe ọ bịara n’ụwa na ihe nlereanya o setịpụrụ ga-esi nyere ndị bụ́ di, ndị bụ́ nwunye, ndị nne na nna, na ụmụ ha aka inwe obi ụtọ ná ndụ.
mmadụ na e kwesịghị itisa alụmdi na nwunye etisa. Ọ kụzikwaara ha ihe ndị ha na-agaghị na-eme ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ezinụlọ ha na-enwe obi ụtọ, nakwa ihe ha na-agaghị eme ka alụmdi na nwunye ha ghara itisa. (Otú Onye Kraịst Bụ́ Di Si Asọpụrụ Nwunye Ya
4. Olee otú ọrụ Jizọs na ọrụ Onye Kraịst bụ́ di si yie?
4 Chineke mere di onyeisi ezinụlọ, dị ka Jizọs bụ Isi ọgbakọ ya. Pọl onyeozi sịrị: “Di bụ isi nke nwunye ya dị ka Kraịst bụkwa isi nke ọgbakọ ahụ, ebe ọ bụ onye nzọpụta nke ahụ́ a. Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara ọgbakọ ahụ n’anya ma nyefee onwe ya maka ya.” (Efe. 5:23, 25) Ndị ikom bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-emeso ndị nwunye ha ihe otú ahụ Kraịst si meso ndị na-eso ụzọ ya. Ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ Jizọs si jiri ikike Chineke nyere ya meso ndị na-eso ụzọ ya ihe.
5. Olee otú Jizọs si jiri ikike Jehova nyere ya meso ndị na-eso ụzọ ya ihe?
5 Jizọs “dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.” (Mat. 11:29) Ọ na-anụ ọkụ n’obi. O legharaghị ọrụ ya anya. (Mak 6:34; Jọn 2:14-17) O ji obiọma nye ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ ugboro ugboro mgbe ọ dị mkpa ka o mee otú ahụ. (Mat. 20:21-28; Mak 9:33-37; Luk 22:24-27) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs agwaghị ha okwu mkparị ma ọ bụ kwuo ihe ga-emenye ha ihere. O meghịkwa ha ihe ga-eme ka ha chewe na ọ hụghị ha n’anya ma ọ bụkwanụ na ha agaghị emeli ihe ọ na-akụziri ha. Kama nke ahụ, ọ jara ha mma ma gbaa ha ume. (Luk 10:17-21) Ịhụnanya na ọmịiko Jizọs ji meso ndị na-eso ụzọ ya ihe mere ha ji kwanyere ya ùgwù.
6. (a) Gịnị ka onye bụ́ di ga-amụta n’otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya ihe? (b) Olee ndụmọdụ Pita nyere ndị bụ́ di?
6 Otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya ihe na-akụziri Ndị Kraịst bụ́ di na ha ekwesịghị iji aka ike na-emeso ndị nwunye ha ihe. Kama nke ahụ, ha kwesịrị ịna-asọpụrụ ha, hụkwa ha n’anya. Pita onyeozi dụrụ ndị bụ́ di ọdụ ka ha ṅomie otú Jizọs si hụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya site na ha na ‘ndị nwunye ha ibi otú ahụ,’ nakwa site na ha ‘inye ha nsọpụrụ.’ (Gụọ 1 Pita 3:7.) Olee otú di ga-esi na-arụ ọrụ ya dị ka isi nwunye ya ma na-emeso ya ihe dị ka onye e kwesịrị inye nsọpụrụ?
7. Olee otú di ga-esi na-asọpụrụ nwunye ya? Nye ihe atụ.
7 Otu n’ime ụzọ onye bụ́ di nwere ike isi nye nwunye ya nsọpụrụ bụ iji nlezianya tụlee ihe bụ́ echiche nwunye ya tupu ya ekpebie otú a ga-esi mee ihe n’ezinụlọ. Ihe ahụ ọ ga-ekpebi nwere ike ịbụ ebe ha ga-akwaga, ịgbanwe ọrụ, ma ọ bụkwanụ banyere ihe ndị ọzọ ha na-eme kwa ụbọchị, dị ka ebe ha ga-aga ezumike, ma ọ bụ iwetulata aka n’ego ha na-emefu maka na Ilu 15:22) Ọ bụrụ na Ndị Kraịst bụ́ di na-asọpụrụ ndị nwunye ha, ndị nwunye ha ga-ahụ ha n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù. Ma, nke ka nke bụ na ndị di ahụ na Jehova ga-adị ná mma.—Efe. 5:28, 29.
ihe esiwele ike. Ebe ọ bụ ihe ga-emetụta ezinụlọ ha, ọ ga-adị mma ma onye bụ́ di tụlee ihe bụ́ echiche nwunye ya n’ihi na o nwere ike inyere ya aka ikpebi ihe dị mma, nke ga-abara onye ọ bụla uru. Nke a ga-emekwa ka nwunye ya kwado ya. (Otú Nwunye Na-esi Akwanyere Di Ya Ùgwù nke Ukwuu
8. Olee ihe mere anyị ekwesịghị iṅomi Iv?
8 Ndị nwunye bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi Jizọs n’otú ha si erubere di ha isi. Otú Jizọs si erubere onye bụ́ isi ya isi dị nnọọ iche n’otú nwunye mbụ e nwere n’ụwa si lee irubere onye bụ́ isi ya isi anya. Iv abụghị ihe nlereanya ndị bụ́ nwunye kwesịrị iṅomi. O nwere onye Chineke mere isi ya, bụ́ onye Jehova si n’aka ya nye ya iwu. Ma, Iv ledara onye bụ́ isi ya anya. Ọ ṅaghị ntị ná ntụziaka Adam nyere ya. (Jen. 2:16, 17; 3:3; 1 Kọr. 11:3) Ọ bụ eziokwu na a ghọgburu Iv, ma, o kwesịrị ibu ụzọ gwa di ya ihe olu ahụ nke sịrị na ihe ya gwara ya bụ ihe “Chineke maara” kwuru. Ihe ọ ga-eji gwa di ya bụ iji mara ma ọ̀ ga-eme ihe olu ahụ kwuru. Kama nke ahụ, ọ naghaara di ya ọrụ wee ghọọ isi di ya.—Jen. 3:5, 6; 1 Tim. 2:14.
9. Olee otú Jizọs si gosi anyị otú e si erube isi?
9 Jizọs emeghị ka Iv. O mere ihe anyị kwesịrị iṅomi site n’irubere onye bụ́ Isi ya isi. Àgwà ya na otú o si bie ndụ gosiri na “o cheghị echiche ịnara ọkwá n’ike, ya bụ, ka ọ hara ka Chineke.” Kama nke ahụ, “o mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu.” (Fil. 2:5-7) Jizọs ka na-eme otú ahụ ruo taa, n’agbanyeghị na ọ bụ Eze. O ji obi umeala na-erubere Nna ya isi n’ihe niile ma na-akwado ya.—Mat. 20:23; Jọn 5:30; 1 Kọr. 15:28.
10. Olee otú onye bụ́ nwunye kwesịrị isi na-akwado di ya?
10 Onye Kraịst bụ́ nwunye kwesịrị iṅomi Jizọs site n’ịkwado di ya. (Gụọ 1 Pita 2:21; 3:1, 2.) Ka anyị tụlee mgbe o nwere ike ime nke a. Ka e were ya na nwa ya nwoke bịakwutere ya ka ọ nara ya ike ga mee ihe ya na di ya kwesịrị inye ya ike ka o mee. Ebe ọ bụ na ya na di ya ekwubeghị banyere ihe ahụ, ọ ga-adị mma ma ọ jụọ ya, sị, “Ị̀ gwala papa gị?” Ọ bụrụ na ọ gwabeghị papa ya, o kwesịrị ịgakwuru di ya ka ha kpebie ihe ha ga-agwa nwa ha nwoke. Ihe ọzọkwa bụ na Onye Kraịst bụ́ nwunye ekwesịghị ịrụ di ya ụka n’ihu ụmụ ya ma ọ bụkwanụ nọrọ n’ihu ha kwuo na ya ekweghị ihe o kwuru. Ọ bụrụ na o nwere ihe di ya kpebiri nke ọ na-anabataghị, o kwesịrị ịgwa ya di ya mgbe naanị ha abụọ nọ.—Efe. 6:4.
Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụụrụ Ndị Nne na Nna
11. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụụrụ ndị nne na nna?
11 N’agbanyeghị na Jizọs alụghị nwaanyị Luk 8:1) Otú Jizọs si kpaso ndị na-eso ụzọ ya àgwà kụziiri ha otú ha kwesịrị isi na-emeso ibe ha ihe.—Gụọ Jọn 13:14-17.
ma ọ bụkwanụ mụta nwa, o setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị iṅomi. Olee otú o si mee nke a? Ma n’okwu ọnụ ma n’omume, o ji ịhụnanya na ndidi kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe. O gosiri ha otú ha ga-esi na-arụ ọrụ o nyere ha. (12, 13. Gịnị ka ndị nne na nna kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ha chọrọ izulite ụmụ ga na-atụ egwu Chineke?
12 Ma ndị nne na nna hà na-eme ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ, ụmụ ha na-eṅomikarị ha. N’ihi ya, ndị nne na nna, jụọnụ onwe unu, sị: ‘Gịnị ka anyị na-akụziri ụmụ anyị ma ọ bụrụ na anyị na-eji oge buru ibu ekiri tiivi ma ọ bụ na-atụrụ ndụ ma anyị anaghị eji oge buru ibu amụ Baịbụl ma na-eje ozi ọma? Gịnị ka ezinụlọ anyị na-ebute ụzọ? Ànyị na-esetịpụ ezi ihe nlereanya site n’ibute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ?’ Iwu Chineke aghaghị ibu ụzọ dịrị n’obi ndị nne na nna ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịzụlite ụmụ ha ka ha na-atụ egwu Chineke.—Diut. 6:6.
13 Ọ bụrụ na ndị nne na nna na-agba mbọ na-etinye ihe Baịbụl kwuru n’omume kwa ụbọchị, ụmụ ha ga na-ahụ ha. Nke a ga-eme ka ụmụ ha na-eme ihe ha kwuru. Ma, ọ bụrụ na ndị nne na nna na-ekwu ihe ọzọ na-eme ihe ọzọ, ụmụ ha nwere ike iwere ya na ihe Baịbụl kwuru adịghị mkpa nke otú ahụ, ma ọ bụkwanụ na ọ baghị uru. Nke a nwere ike ime ka ụmụ ha ghara idi ọnwụnwa ma ọ bịara ha.
14, 15. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha, oleekwa otu n’ime ụzọ ha nwere ike isi mee nke a?
14 Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịma na ịzụ ụmụaka abụghị naanị inye ha ihe ahụ́ ha chọrọ. Ya mere, ọ gaghị adị mma ma a kụziere nwatakịrị ka ihe mgbaru ọsọ ya bụrụ naanị ihe onwunwe. (Ekli. 7:12) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha buru ụzọ na-achọ alaeze Chineke na ezi omume ya. (Mat. 6:33) Ya mere, dị ka Jizọs mere, ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịgba mbọ kụziere ụmụ ha ka ha nwee mmasị n’ịmụba ozi ha na-ejere Chineke.
15 Otu n’ime ụzọ ndị nne na nna nwere ike isi mee nke a bụ ime ka ụmụ ha na ndị na-eje ozi oge niile na-akpakọrịta. Chegodị ụdị okwukwe onye dị afọ iri na ụma ga-enwe ma ya na ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nlekọta sekit ma ọ bụkwanụ nwunye ya bụrụ enyi. Mgbe ndị na-eje ozi n’ala ọzọ, ndị Betel, na ndị si ala ọzọ bịa iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ bịara na nke unu, ha nwere ike iji obi ụtọ na-ekwu banyere ọṅụ ha na-enwe n’ozi ha na-ejere Jehova. O doro anya na ha nwere ike ịkọ ihe ndị na-enye ha obi ụtọ n’ozi ha. Ezigbo ihe nlereanya ha na-esetịpụ site n’iwepụta onwe ha na-eje ozi, nwere ike inyere ụmụ gị nnukwu aka ime mkpebi dị mma, nweekwa ike inyere ha aka inwe ihe mgbaru ọsọ ga-eme ka ha mụbaa ozi ha. O nwekwara ike ime ka ha
nweta ọzụzụ ga-enyere ha aka ịkpata ihe ha ga na-eri ma ha na-eje ozi oge niile.Gịnị Ga-enyere Ndị Bụ́ Ụmụ Aka Iṅomi Ihe Nlereanya Jizọs Setịpụrụ?
16. Olee otú Jizọs si rubere nne na nna ya isi mgbe ọ bịara n’ụwa, oleekwa otú o si rubere Nna ya nke eluigwe isi?
16 Ndị bụ́ ụmụ, Jizọs setịpụkwaara unu ezigbo ihe nlereanya. Jehova nyefere Jizọs n’aka Josef na Meri ka ha lekọta ya. O rubekwaara ha isi. (Gụọ Luk 2:51.) Ọ ma na Chineke nyere ha ọrụ ilekọta ya n’agbanyeghị na ha ezughị okè. N’ihi ya, o kwesịrị irubere ha isi. (Diut. 5:16; Mat. 15:4) Mgbe Jizọs toro, ọ nọgidere na-eme ihe dị Nna ya nke eluigwe mma. Nke ahụ pụtara na ọ ga na-emeri ọnwụnwa. (Mat. 4:1-10) Unu ndị na-eto eto, o nwere ike ịdị unu mgbe ụfọdụ ka unu nupụrụ nne na nna unu isi. Ya mere, gịnị ga-enyere unu aka iṅomi Jizọs?
17, 18. (a) Olee ụdị ọnwụnwa na-abịara ndị na-eto eto n’ụlọ akwụkwọ? (b) Olee ihe ndị na-eto eto ga-echeta nke ga-enyere ha aka imeri ọnwụnwa?
17 O nwere ike ịbụ na ọtụtụ n’ime ụmụ akwụkwọ unu anaghị erube isi n’iwu dị na Baịbụl. Ha nwere ike ịna-agbalị ime ka i soro ha na-eme ihe na-adịghị mma, ma ọ bụkwanụ ha nwere ike iji gị na-eme ihe ọchị ma ị jụ iso ha. Ụmụ akwụkwọ unu hà na-akparị gị n’ihi na ị naghị ekwe eso ha eme ihe na-ezighị ezi? Ọ bụrụ otú ahụ, olee ihe ị na-eme? Ị manụ na ọ bụrụ na gị ekwere ka ihe ha na-ekwu mee ka ị gbanwee obi gị wee soro ha, ị ga-emejọ nne gị na nna gị, mejọọkwa Jehova. Gịnị nwere ike ime gị ma i soro ụmụ akwụkwọ unu mewe ihe ha na-eme? O nwere ike ịbụ na i nwere ihe mgbaru ọsọ ndị i bu n’obi, dị ka ịmalite ọrụ ịsụ ụzọ ma ọ bụ ịbụ ohu na-eje ozi, ije ozi n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze, ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ ịga Betel. Ị̀ ga-emeli ihe ndị a ma ọ bụrụ na gị na ụmụ akwụkwọ unu na-akpakọrịta?
18 Unu ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ è nwere ihe ndị na-ele okwukwe unu ule? Olee ihe unu na-eme? Chegodịnụ echiche banyere onye unu kwesịrị iṅomi, bụ́ Jizọs. O meriri ọnwụnwa wee nọgide na-eme ihe ndị ọ ma na ha ziri ezi. Ọ bụrụ na unu echeta nke a, unu ga-akwụsi ike wee gwa ụmụ akwụkwọ unu hoo haa na unu agaghị eso ha mee ihe unu ma na ọ dịghị mma. Dị ka Jizọs mere, nọgidenụ na-erubere Jehova isi, jirikwanụ ndụ unu niile na-ejere ya ozi na-enye ọṅụ.—Hib. 12:2.
Isi Ihe nke Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ n’Ezinụlọ
19. Olee ihe na-eme ka e nwee ezigbo obi ụtọ?
19 Jehova Chineke na Jizọs Kraịst buuru ụmụ mmadụ ihe ọma n’obi. Anyị nwere ike inwetụ obi ụtọ ná ndụ ugbu a n’agbanyeghị na anyị ezughị okè. (Aịz. 48:17, 18; Mat. 5:3) Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya eziokwu banyere Chineke, bụ́ nke ga-enyere ụmụ mmadụ aka inwe obi ụtọ. Ma, ọ bụghị naanị nke a ka ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụzikwara ha ụzọ kacha mma mmadụ nwere ike isi bie ndụ. E wezụga ihe o ji ọnụ kụziere ha, otú o si bie ndụ na otú o si kpaa àgwà bụ ezigbo ihe nlereanya anyị kwesịrị iṅomi. Iṅomi Jizọs ga-abara anyị uru n’agbanyeghị ihe ọ bụla anyị bụ n’ezinụlọ. Ya mere, ndị bú di, ndị bú nwunye, ndị nne na nna, na ndị bụ́ ụmụ, ṅomienụ Jizọs! Ịnabata ihe Jizọs kụziri na iṅomi ya bụ isi ihe na-eme ka udo na obi ụtọ dịrị n’ezinụlọ.
[Olee Ihe Ị Ga-aza?]
• Ebe ọ bụ na Chineke mere ndị bụ́ di ndị isi ezinụlọ, olee otú ha kwesịrị isi na-emeso ndị nwunye ha?
• Olee otú onye bụ́ nwunye ga-esi ṅomie ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ?
• Olee ihe ndị nne na nna ga-amụta n’otú Jizọs si meso ndị na-eso ụzọ ya ihe?
• Olee ihe ndị na-eto eto ga-amụta n’ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 8]
Tupu di nke hụrụ nwunye ya n’anya ekpebie ihe ga-emetụta ezinụlọ ya, gịnị ka o kwesịrị ime?
[Foto dị na peeji nke 9]
Olee ihe ndị nwere ike ime ka onye bụ́ nwunye gosi na ya na-akwado di ya?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị bụ́ ụmụ na-eṅomi ezigbo àgwà ndị nne na nna ha na-akpa