Jiri Ịhụnanya Na-akụzi Ihe Ka Jizọs
Jiri Ịhụnanya Na-akụzi Ihe Ka Jizọs
“Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.”—JỌN 7:46.
1. Olee otú otú Jizọs si kụzie ihe dị ndị mmadụ?
CHEEDỊ ihe ọ dị ka ya ịnụ ka Jizọs na-akụzi ihe! Baịbụl kọtụụrụ anyị otú ọ dị ndị nọ na-ege ya ntị mgbe ọ na-akụzi ihe. Dị ka ihe atụ, Luk, bụ́ onye so dee Oziọma banyere Jizọs, kwuru na ‘okwu ọma ndị si n’ọnụ ya na-apụta tụrụ ndị obodo ya n’anya.’ Matiu kwuru na ‘otú Jizọs si ezi ihe juru ndị gere Ozizi Elu Ugwu ahụ anya.’ Jọn kwukwara na ndị ọrụ nche e ziri ka ha gaa kpụta Jizọs gba aka lọta ma kwuo, sị: “Ọ dịtụbeghị onye ọzọ si otú a kwuo okwu.”—Luk 4:22; Mat. 7:28; Jọn 7:46.
2. Olee ụzọ ndị Jizọs si kụzie ihe?
2 Ndị ọrụ nche ahụ kwuru eziokwu. O doro anya na Jizọs bụ Onye Ozizi kacha ndị ozizi niile e nwetụrụla n’ụwa. Ihe ọ kụziri doro anya ma kwe nghọta, o nweghịkwa mgbagha. O ji ihe atụ kwekọrọ n’ihe ọ na-akụzi na ajụjụ ndị na-akpali mmadụ iche echiche kụzie ihe. Ọ na-akụzi ihe otú ọ ga-eru ndị na-ege ya ntị n’obi, ma ndị ọ na-agwa okwu hà bụ ndị nwere ọkwà dị elu ma hà bụ ndị nkịtị. Eziokwu ọ kụziri dị mfe nghọta ma dị ezigbo mkpa. Ma, ọ bụghị naanị ihe ndị a mere ka Jizọs bụrụ Onye Ozizi ukwu.
Ọ Hụrụ Ndị Ọ Kụziiri Ihe n’Anya
3. Olee otú Jizọs si bụrụ onye nkụzi dị iche ná ndị ndú okpukpe nke oge ya?
3 O doro anya na e nwere ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii maara ihe, marakwa otú ha ga-esi kụziere ndị ọzọ ihe. Oleezi ihe mere Jizọs ji dị iche? Ndị ndú okpukpe nke oge ahụ ahụghị ndị mmadụ n’anya. Kama nke ahụ, ha ledara ha anya, werekwa ha ka “ndị a bụrụ ọnụ.” (Jọn 7:49) Ma, Jizọs dị iche, o nwere ọmịiko n’ebe ha nọ n’ihi na “a gbara ha akpụkpọ, na-achụsakwa ha, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.” (Mat. 9:36) O nwere ọmịiko na obiọma. Ndị ndú okpukpe ahụghịkwa Chineke n’anya. (Jọn 5:42) Ma, Jizọs hụrụ Nna ya n’anya, ọ na-atọkwa ya ụtọ ime uche ya. Ndị ndú okpukpe gbagọrọ okwu Chineke otú ọ ga-esi dịrị ha mma, ma, Jizọs ji “okwu Chineke” kpọrọ ihe, ọ kụziri ya, kọwaa ya, gwa ndị na-emegide okwu Chineke nke bụ́ eziokwu, meekwa ihe e dere na ya. (Luk 11:28) N’ezie, Kraịst hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ mere o ji kụziere ha ihe, o ji ịhụnanya meso ndị ọzọ ihe, jirikwa ịhụnanya kụziere ha ihe.
4, 5. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị iji ịhụnanya na-akụzi ihe? (b) Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkụzi ihe nke ọma, olee ihe mere o ji kwesị ịma ihe ọ ga-akụzi, marakwa otú ọ ga-esi kụzie ya?
1 Pita 2:21) N’ihi ya, ebumnobi anyị ekwesịghị ịbụ naanị ịkụziri ndị mmadụ Baịbụl, kamakwa, ọ bụ ịkpa àgwà ka Jehova, karịchaa, ịhụ ndị mmadụ n’anya ka ya. Ma ànyị ma ihe nke ukwuu ma ọ̀ bụ na anyị amachaghị, ma ànyị ma akụzi ihe ma ọ̀ bụ na anyị amachaghị, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị anyị na-ezi ozi ọma nọ ga-eme ka ozi ọma anyị na-ezi ha ruo ha n’obi. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịrụpụta ihe n’ọrụ ime ndị na-eso ụzọ e nyere anyị, anyị aghaghị iji ịhụnanya na-akụzi ihe ka Jizọs.
4 Oleekwanụ maka anyị? Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị kwesịrị iṅomi ya mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma nakwa n’otú anyị si ebi ndụ. (5 N’ezie, ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkụzi ihe nke ọma, anyị aghaghị ịma ihe anyị chọrọ ịkụzi, marakwa otú anyị ga-esi kụzie ya. Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịma ihe ha ga-akụzi nakwa otú ha ga-esi kụzie ya. Taa, Jehova sikwa n’ọgbakọ ya enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-akụzi na otú anyị ga-esi kụzie ya. (Gụọ Aịzaya 54:13; Luk 12:42.) Ma, anyị kwesịkwara ịhụ ndị anyị na-akụziri ihe n’anya. Ọ bụrụ na anyị amara ihe anyị na-akụzi, mara otú anyị ga-esi kụzie ya, hụkwa ndị anyị na-akụziri ihe n’anya, anyị ga-arụpụta ezigbo ihe. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya mgbe anyị na-akụziri ha ihe? Olee otú Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya si mee nke a? Ka anyị chọpụta.
Anyị Aghaghị Ịhụ Jehova n’Anya
6. Olee otú obi na-adị anyị mgbe anyị na-ekwu okwu banyere onye anyị hụrụ n’anya?
6 Ọ na-atọ anyị ụtọ ịkọrọ ndị ọzọ banyere ihe ndị masịrị anyị. Mgbe anyị na-ekwu okwu banyere ihe ndị masịrị anyị, ihu anyị na-egosi otú obi dị anyị, ndị mmadụ na-ahụkwa na obi dị anyị ụtọ. Nke a na-emekarị mgbe anyị na-ekwu okwu banyere onye anyị hụrụ n’anya. Ọ na-anụkarị anyị ọkụ n’obi ịgwa ndị ọzọ ihe anyị ma banyere onye ahụ. Anyị na-eto onye ahụ, na-asọpụrụ ya, ma na-agbachitere ya. Ihe mere anyị ji eme nke a bụ ka ndị ọzọ soro anyị hụ onye ahụ n’anya ma nwee mmasị n’àgwà ya.
7. Gịnị ka ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe Chineke nọ mere ka o mee?
7 Tupu anyị enwee ike ime ka ndị ọzọ hụ Jehova n’anya, anyị aghaghị ibu ụzọ mara onye ọ bụ ma hụ ya n’anya. A sị kwuwe, ihe mere anyị ji efe Chineke bụ na anyị hụrụ ya n’anya. (Mat. 22:36-38) Jizọs setịpụrụ ihe nlereanya na-enweghị atụ na nke a. O ji obi ya dum, uche ya dum, mkpụrụ obi ya dum, na ike ya dum, hụ Jehova n’anya. Jizọs ma Nna ya nke eluigwe nke ọma n’ihi na ya na ya anọọla ọtụtụ ijeri afọ. Gịnị si na nke a pụta? Jizọs kwuru, sị: “M hụrụ Nna m n’anya.” (Jọn 14:31) Ihe niile Jizọs kwuru na ihe ndị o mere gosiri na ọ hụrụ Nna ya n’anya. O mere ka o mee ihe na-amasị Chineke mgbe niile. (Jọn 8:29) Nke a mere ka ọ katọọ ndị ndú okpukpe, bụ́ ndị ihu abụọ, ndị sị na ha na-anọchite anya Chineke. O mekwara ka ọ gwa ndị ọzọ banyere Jehova ma nyere ha aka ịmara ya na ịhụ ya n’anya.
8. Olee ihe ịhụnanya ndị na-eso ụzọ Jizọs nwere n’ebe Chineke nọ mere ka ha mee?
8 Ndị na-eso ụzọ Jizọs na narị afọ mbụ hụkwara Jehova n’anya dị ka Jizọs hụrụ ya, nke a mere ka ha jiri obi ike na ịnụ ọkụ n’obi kwusaa ozi ọma. Ha mere ka ozizi ha jupụta Jeruselem, n’agbanyeghị na ndị ndú okpukpe a ma ama megidere ha. Ndị na-eso ụzọ Jizọs enweghị ike ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị ha hụrụ na ihe ndị ha nụrụ. (Ọrụ 4:20; 5:28) Ha ma na Jehova nọnyeere ha nakwa na ọ ga-agọzi ha—ọ gọzikwara ha! Mgbe ọ na-erubeghị afọ iri atọ Jizọs nwụrụ, Pọl onyeozi dere na e kwusaala ozi ọma “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.”—Kọl. 1:23.
9. Olee otú anyị ga-esi mee ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike?
9 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịkụzi ihe nke ọma, anyị kwesịrị ịhụ na ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ nọgidere na-esi ike. Olee otú anyị ga-esi mee nke a? Ọ bụ site n’ịna-ekpeku Chineke ekpere mgbe niile. Anyị na-ahụkwu Chineke n’anya site n’ịmụ Okwu ya, ịgụ akwụkwọ Abụ Ọma 104:33, 34.
ndị e ji amụ Baịbụl, na ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ọ bụrụ na anyị na-amụtakwu banyere Chineke, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Ọ bụrụ na anyị ana-ekwu na anyị hụrụ Chineke n’anya, ma na-eme ihe ndị gosiri na anyị hụrụ ya n’anya, ndị ọzọ ga-ahụ ya, nke ahụ nwekwara ike ịdọta ha n’ebe Jehova nọ.—GụọAnyị Aghaghị Iji Ihe Anyị Na-akụzi Kpọrọ Ihe
10. Olee ihe e ji ama ezigbo onye nkụzi?
10 Ezigbo onye nkụzi na-eji ihe ọ na-akụzi akpọrọ ihe. Ọ ghaghị ibu ụzọ kwere na ihe ọ na-akụzi bụ eziokwu, na ọ dị mkpa, nakwa na ọ bara uru. Ọ bụrụ na onye nkụzi enwee mmasị n’ihe ọ na-akụzi, a ga-ahụ ya n’ihu ya, nke ahụ ga-emekwa ka ndị ọ na-akụziri ihe mewe ihe ha na-amụta. Ma, ọ bụrụ na onye nkụzi ejighị ihe ọ na-akụzi kpọrọ ihe, olee otú o si chee na ndị ọ na-akụziri ihe ga-eji ihe ọ na-akụziri ha kpọrọ ihe? Ihe nlereanya gịnwa, bụ́ onye na-akụzi Okwu Chineke, dị ezigbo mkpa. Jizọs sịrị: “Onye ọbụla a kuziri ihe nke ọma, ga-adị ka onyenkuzi ya.”—Luk 6:40, nsụgharị Nhazi Katọlik.
11. Olee ihe mere Jizọs ji jiri ihe ọ kụziri kpọrọ ihe?
11 Jizọs ji ihe ọ kụziri kpọrọ ihe. Ọ ma na e nwere ihe dị ezigbo mkpa ya ga-akụziri ndị mmadụ, ya bụ, eziokwu banyere Nna ya nke eluigwe, “ihe Chineke kwuru,” nakwa “okwu nke ndụ ebighị ebi.” (Jọn 3:34; 6:68) Dị ka ìhè na-enwusi ike na-eme ka a hụ ihe nke ọma, eziokwu ahụ nke Jizọs kụziri gbara ihe ọjọọ n’anwụ, meekwa ka a mara ihe bụ́ ihe ọma. Eziokwu ahụ kasiri ndị dị umeala n’obi obi, bụ́ ndị ndị ndú okpukpe ụgha duhiere, Ekwensu ana-emegbukwa ha. O mekwara ka ha nwee olileanya. (Ọrụ 10:38) Otú Jizọs si kụzie ihe na ihe niile o mere gosiri na o ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe.
12. Olee otú ozi ọma dị Pọl?
12 Dị ka Jizọs mere, ndị na-eso ụzọ Jizọs ji eziokwu banyere Jehova na Kraịst kpọrọ ihe nke na ndị mmegide emelighị ka ha kwụsị ịgwa ya ndị ọzọ. Pọl degaara Ndị Kraịst ibe ya nọ na Rom akwụkwọ, sị: “Ọ na-agụsi m agụụ ike izisakwara unu ozi ọma . . . N’ihi na ihere ozi ọma ahụ adịghị eme m; n’eziokwu, ọ bụ ike Chineke maka ịzọpụta onye ọ bụla nke nwere okwukwe.” (Rom 1:15, 16) Pọl weere ikwusa ozi ọma ka ihe ùgwù. O dere, sị: “Ọ bụ m, . . . ka e nyere obiọma a na-erughịrị mmadụ, ka m wee zisaara ndị mba ọzọ ozi ọma banyere akụ̀ Kraịst nke a na-apụghị ịghọta aghọta.” (Efe. 3:8) O sighị ike ịchọpụta na obi na-atọ Pọl ụtọ ma ọ na-akụziri ndị ọzọ banyere Jehova na nzube ya.
13. Olee ihe mere anyị ga-eji jiri ozi ọma anyị na-ezisa kpọrọ ihe?
13 Ozi ọma nke dị n’Okwu Chineke na-eme ka anyị mara Onye kere anyị, meekwa ka anyị na ya dịrị ná mma. Ozi ọma ahụ na-aza anyị ọtụtụ ajụjụ ndị dị mkpa ná ndụ, o nwekwara ike ịgbanwe ndụ anyị, mee ka anyị nwee olileanya, meekwa ka anyị kwụrụ chịm mgbe nsogbu bịaara anyị. Ọ na-emekwa ka anyị mara otú anyị ga-esi nweta ndụ dị mma nke ga-adịru ebighị ebi. E nweghị ihe ọmụma ka ozi ọma Alaeze Chineke dịrị mkpa ma ọ bụ baa uru. Ọ bụ onyinye dị oké ọnụ ahịa e nyere anyị, bụ́ nke ga-eme ka anyị nwee ọṅụ dị ukwuu. Anyị ga-enwekwukwa ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị emee ka onyinye ahụ rute ndị ọzọ aka.—Ọrụ 20:35.
14. Olee otú anyị ga-esi jirikwuo ihe anyị na-akụzi kpọrọ ihe?
14 Olee ihe i nwere ike ime ka i wee jirikwuo ozi ọma ị na-ekwusa kpọrọ ihe? Mgbe ị na-agụ Okwu Chineke, kwụsịtụ ma chebara ihe ị na-agụ echiche. Dị ka ihe atụ, were ya na gị na Jizọs so mgbe ọ na-eje ozi ya n’ụwa ma ọ bụkwanụ na gị na Pọl onyeozi so mgbe ọ na-eje ozi ala ọzọ. Weregodị ya na ị nọ n’ụwa ọhụrụ ma hụ otú ndụ si dị nnọọ iche. Chee banyere ngọzi ndị i nwetarala n’ihi na ị na-erube isi n’ozi ọma. Ọ bụrụ na ị nọgide na-eji ozi ọma ahụ akpọrọ ihe, ndị ị na-akụziri ihe ga-achọpụta nke a. N’ihi ya, ka anyị na-echebara ihe ndị anyị mụtara echiche nke ọma ma na-elezi anya n’ihe anyị na-akụziri ndị mmadụ.—Gụọ 1 Timoti 4:15, 16.
Anyị Aghaghị Ịhụ Ndị Mmadụ n’Anya
15. N’ihi gịnị ka onye nkụzi ji kwesị ịhụ ndị ọ na-akụziri ihe n’anya?
15 Ezigbo onye nkụzi na-eme ka ahụ́ ruo ndị ọ na-akụziri ihe ala ka ha wee nwee ike itinye uche n’ihe ha na-amụ, nweekwa obi ụtọ ikwu okwu mgbe a jụrụ ha ajụjụ. Onye nkụzi hụrụ ndị ọ na-akụziri ihe n’anya na-akụziri ha ihe n’ihi na o nwere mmasị n’ebe ha nọ. Ọ na-akụziri ha ihe otú ọ ga-abara ha uru nakwa otú ha ga-aghọta ihe ọ na-akụziri ha. Ọ na-eburu n’uche otú ndị ọ na-akụziri ihe maruru ihe nakwa ọnọdụ ha ná ndụ. Ọ bụrụ na ndị nkụzi enwee ụdị ịhụnanya a, ndị ha na-akụziri ihe ga-ahụ ya, nke a ga-emekwa ka ịkụzi ihe na ịmụ ihe na-atọ ụtọ.
16. Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị mmadụ n’anya?
16 Jizọs nwere ịhụnanya dị otú a. Otu ihe kacha gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya bụ ndụ ya zuru okè ọ tọgbọrọ ka e wee zọpụta ndị ọzọ. (Jọn 15:13) Mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, ọ gbalịsiri ike inyere ndị mmadụ aka na ịkụziri ha ihe banyere Chineke. Kama ichere ka ndị mmadụ bịakwute ya, o ji ụkwụ gaa ọtụtụ narị kilomita ka o wee zie ndị mmadụ ozi ọma. (Mat. 4:23-25; Luk 8:1) O nwere ndidi, dịkwa obiọma. Mgbe ndị na-eso ụzọ ya mere ihe na-adịghị mma, o ji ịhụnanya gbazie ha. (Mak 9:33-37) Ọ gbara ha ume site n’igosi na obi siri ya ike na ha ga-ekwusali ozi ọma nke ọma. Ọ dịtụbeghị mmadụ ọ bụla ji ịhụnanya kụzie ihe ka Jizọs. Ịhụnanya o nwere n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ mere ha ji hụ ya n’anya ma debe ihe o nyere n’iwu.—Gụọ Jọn 14:15.
17. Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si gosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya?
17 Dị ka Jizọs mere, ndị na-eso ụzọ Jizọs gosikwara na ha hụrụ nnọọ ndị ha na-ekwusara ozi ọma n’anya. Ha jeere ndị ọzọ ozi ma kwusaa ozi ọma n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha, ndụ ha anọrọkwa n’ihe ize ndụ. Ha nwere nnọọ ọmịiko n’ahụ́ ndị nabatara ozi ọma ha na-ekwusa. Okwu Pọl onyeozi kwuru gosiri na o nwere ọmịiko n’ahụ́ ndị mmadụ. Ọ sịrị: “Anyị ghọrọ ndị dị nwayọọ n’etiti unu, dị ka mgbe nne nke na-enye nwa ara na-elekọta ụmụ ya. Ya mere, ebe anyị nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe unu nọ, ọ masịrị anyị ọ bụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kamakwa inye unu mkpụrụ obi anyị, n’ihi na unu ghọrọ ndị anyị hụrụ n’anya.”—1 Tesa. 2:7, 8.
18, 19. (a) Gịnị mere anyị ji dị njikere ịchụ ọtụtụ ihe n’àjà iji nwee ike ịnọgide na-ekwusa ozi ọma? (b) Nye ihe atụ iji gosi na ndị ọzọ na-ahụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ.
18 N’oge a kwa, Ndịàmà Jehova na-agazu ụwa niile na-achọ ndị chọrọ ịmata Chineke ma fewe ya. Kemgbe afọ iri na asaa gara aga, anyị na-eji ihe karịrị otu ijeri awa na-ekwusa ozi ọma kwa afọ ma na-eme ndị na-eso ụzọ, anyị akwụsịbeghịkwa ọrụ a. Anyị ji obi anyị dum na-arụ ya, n’agbanyeghị na ikwusa ozi ọma Jọn 17:3; 1 Tim. 2:3, 4) Ọ bụ ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ na-eme ka anyị nyere ndị nwere ezi obi aka ịmata Jehova na ịhụ ya n’anya ka anyị.
chọrọ oge, ume, na ego. Dị ka Jizọs, anyị ma na Nna anyị nke eluigwe chọrọ ka ndị mmadụ mụta ihe ga-eme ka ha dị ndụ ebighị ebi. (19 Ndị ọzọ na-ahụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị nọ na United States na-edegara ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụrụ akwụkwọ ozi iji kasie ha obi. Otu nwoke zara ya akwụkwọ ozi o dere. Ọ sịrị: “Mgbe m nwetara akwụkwọ ozi gị, ọ tụrụ m n’anya na mmadụ ga-anọgide nnọọ na-edegara onye ọ na-amaghị akwụkwọ ozi iji nyere ya aka idi nsogbu ndị bịaara ya. Nke a gosiri na ị hụrụ ndị mmadụ ibe gị n’anya, hụkwa Chineke n’anya, bụ́ onye na-enyere ndị mmadụ aka inweta ndụ.”
20. Olee otú ọ dịruru mkpa ka anyị jiri ịhụnanya na-akụzi ihe?
20 E kwuru na ọ bụrụ na mmadụ ahụ ndị ọzọ n’anya, marakwa otú e si akụzi ihe, ọ ga-arụpụta ezigbo ihe. Mgbe anyị na-akụziri ndị mmadụ ihe, anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ka ha mara Jehova ma hụ ya n’anya. N’ezie, e nwere ihe atọ anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ezigbo ndị nkụzi. Anyị ga-ahụ Chineke n’anya, anyị ga-eji eziokwu ahụ kpọrọ ihe, anyị ga-ahụkwa ndị mmadụ n’anya. Ọ bụrụ na anyị emee ihe ndị a mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị ga-enwe ọṅụ a na-enweta n’inye ihe, nwetakwa obi ụtọ n’ịmara na anyị na-eṅomi Jizọs ma na-eme ihe na-amasị Jehova.
[Olee Ihe Ị Ga-aza?]
• Ka anyị na-ezi ndị ọzọ ozi ọma, olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị. . .
hụ Chineke n’anya?
jiri ihe anyị na-akụzi kpọrọ ihe?
hụ ndị anyị na-akụziri ihe n’anya?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 15]
Olee ihe mere ka otú Jizọs si akụzi ihe dị iche n’otú ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii si akụzi ihe?
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịbụ ezigbo onye nkụzi, ọ ga-ama ihe ọ na-akụzi, marakwa otú e si akụzi ihe. Nke kacha mkpa bụ na ọ ga-enwe ịhụnanya