Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs

Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs

Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma Ka Jizọs

‘Anyị ji nkwuwa okwu zie unu ozi ọma.’—1 TESA. 2:2.

1. Gịnị mere ozi ọma banyere Alaeze Chineke ji eme ka e nwee obi ụtọ dị ukwuu?

ỊNỤ ozi ọma na-eme ka e nwee obi ụtọ dị ukwuu. Ozi kacha ozi niile mma bụ ozi ọma banyere Alaeze Chineke. Ozi ọma a na-eme ka obi sie anyị ike na ahụhụ, ọrịa, ihe mgbu, iru uju, na ọnwụ agakwaghị adị. Ọ na-eme ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi, mee ka anyị mara nzube Chineke, meekwa ka anyị mara otú anyị na ya ga-esi dị ná mma. Ozi ọma a Jizọs ziri ndị mmadụ kwesịrị ime ka onye ọ bụla nke nụrụ ya nwee obi ụtọ. Ma, ọ dị mwute ikwu na ọ bụghị onye ọ bụla nụrụ ya nwere obi ụtọ.

2. Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị, “M bịara ịkpata nkewa”?

2 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa; abịara m iweta, ọ bụghị udo, kama mma agha. N’ihi na m bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwaanyị megide nne ya, nakwa nwaanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya. N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:34-36) Ọtụtụ ndị na-ajụ ozi ọma ahụ kama iji obi ụtọ nabata ya. Ụfọdụ na-ebuso ndị na-ekwusa ya iro, n’agbanyeghị na ha bụ ndị ezinụlọ ha.

3. Gịnị dị anyị mkpa iji jezuo ozi anyị?

3 Otu ozi ọma ahụ Jizọs ziri ndị mmadụ ka anyị na-ezikwa taa, ihe ndị mmadụ mere mgbe Jizọs ziri ha ya ka ọtụtụ ndị na-emekwa taa. Nke a anaghị atụ anyị n’anya. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) N’ọtụtụ ala, a naghị akpagbu anyị nke otú ahụ, ma, ụfọdụ ndị anaghị enwe mmasị n’ozi anyị. N’ihi ya, okwukwe na obi ike dị anyị mkpa ka anyị wee jiri nkwuwa okwu na-ezi ozi ọma.—Gụọ 2 Pita 1:5-8.

4. Gịnị mere Pọl ji kwesị iji “nkwuwa okwu” na-ezi ozi ọma?

4 Ije ozi ọma nwere ike ịna-esiri gị ike mgbe ụfọdụ. Ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ụfọdụ n’ime ihe ozi ọma anyị gụnyere nwere ike ịna-ara gị ahụ́. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị ka ọ na-eme. Pọl onyeozi zisara ozi ọma n’atụghị egwu, ọ makwa eziokwu dị na Baịbụl nke ọma, ma, izi ozi ọma siiri ya ike mgbe ụfọdụ. Pọl deere Ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ ozi, sị: “Unu makwaara otú anyị si nwee nkwuwa okwu site n’enyemaka Chineke, anyị wee gbasie mgba ike zie unu ozi ọma Chineke mgbe anyị bu ụzọ tasịa ahụhụ, e meekwa anyị ihe ihere na Filipaị (dị nnọọ ka unu maara).” (1 Tesa. 2:2) Na Filipaị, ndị ọchịchị nyere iwu ka a pịa Pọl na Saịlas ụtarị tụba ha n’ụlọ mkpọrọ ma kpọchie ụkwụ ha n’ọtọsị. (Ọrụ 16:16-24) N’agbanyeghị nke ahụ, Pọl na Saịlas ji “nkwuwa okwu” na-ekwusa ozi ọma. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ha? Anyị ga-aza ajụjụ a site n’ịtụle ihe mere ka ndị ohu Chineke oge ochie jiri nkwuwa okwu gwa ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova. Anyị ga-atụlekwa otú anyị ga-esi na-eme ka ha.

Nkwuwa Okwu Dị Ha Mkpa Iji Merie Ndị Iro

5. Gịnị mere nkwuwa okwu ji dị ndị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mkpa kemgbe ụwa?

5 Onye kacha nwee obi ike na nkwuwa okwu bụ Jizọs Kraịst. Kemgbe ụwa, nkwuwa okwu dị ndị niile nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ mkpa. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Mgbe Adam na Iv nupụụrụ Jehova isi n’Iden, Jehova buru amụma na iro ga-adị n’etiti ndị na-efe ya na ndị na-efe Setan. (Jen. 3:15) A malitere ịhụ iro a ozugbo Ken gburu nwanne ya, bụ́ Ebel, onye ezi omume. Ka oge na-aga, iro a rutere Inọk, bụ́ onye ezi omume ọzọ dịrị ndụ tupu Iju Mmiri. O buru amụma na Chineke na ọtụtụ iri puku ndị nsọ ya ga-abịa mee ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke ihe e kpere n’ikpe. (Jud 14, 15) N’oge ahụ, ọtụtụ mmadụ enweghị mmasị n’ozi a. Ndị mmadụ kpọrọ Inọk asị, ha gaara egbu ya ma à sị na Chineke akpọpụghị ya. Inọk nwere nnọọ obi ike.—Jen. 5:21-24.

6. Gịnị mere Mozis ji kwesị inwe nkwuwa okwu tupu ya agwa Fero okwu?

6 Cheekwa banyere otú Mozis si jiri nkwuwa okwu gwa Fero okwu, bụ́ eze e weere na ọ na-anọchite anya chi dị iche iche, bụrụkwa chi n’onwe ya, ya bụ, nwa chi anyanwụ aha ya bụ Ra. O nwere ike ịbụ na ọ na-efe onyinyo onwe ya ofufe, dị ka ndị Fero ọzọ mere. Fero bụ eze onye agwala m. Ọ dị mpako, dị isi ike, jirikwa aka ike na-achị, ọ naghị achọ ka onye ọzọ gwa ya ihe ọ ga-eme. Ọ bụ ụdị onye a ka Mozis, bụ́ onye ọzụzụ atụrụ dị umeala n’obi, bịakwutere ugboro ugboro, n’agbanyeghị na ọ sịghị ya bịa, ọ nabataghịkwa ya. Gịnị ka Mozis gwara ya? Ọ gwara ya na a ga-eti Ijipt ihe otiti ga-akpa ala ahụ aka ọjọọ. Gịnị ka Mozis gwara ya ka o mee? Ka ọ hapụ nde kwuru nde ndị ohu ya ka ha laa! Nkwuwa okwu ọ̀ dị Mozis mkpa n’oge ahụ? À na-ajụkwa ajụ!—Ọnụ Ọg. 12:3; Hib. 11:27.

7, 8. (a) Olee ụdị ọnwụnwa bịaara ndị ohu Chineke ndị dịrị ndụ tupu Kraịst abịa n’ụwa? (b) Olee ihe nyeere ha aka ịkwado ofufe Chineke n’atụghị egwu?

7 Ka oge na-aga, ndị amụma na ndị ohu Chineke ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi, nọgidere na-eji obi ike na-ejere Jehova ozi. Ụwa Setan ahụghị ha n’anya. Pọl sịrị: “A tụrụ ha nkume, a nwara ha ọnwụnwa, a kwọbiri ha akwọbi, e ji mma agha gbuo ha, ha yi akpụkpọ atụrụ na akpụkpọ ewu na-agagharị, ka ha nọ n’ụkọ, ná mkpagbu, ka a na-emeso ha mmeso ọjọọ.” (Hib. 11:37) Gịnị nyeere ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị ohu Chineke, aka iguzosi ike? N’amaokwu ole na ole bu amaokwu nke iri atọ na asaa ụzọ, Pọl kwuru ihe nyeere Ebel, Ebreham, Sera, na ndị ọzọ aka ịtachi obi. Ọ sịrị: “Ha enwetaghị mmezu nke nkwa ndị ahụ, ma ha [ji okwukwe hụ] ha n’ebe dị anya ma nabata ha.” (Hib. 11:13) O doro anya na ihe nyeere ndị amụma ndị dị ka Ịlaịja, Jeremaya, na ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge Ndị Kraịst, bụ́ ndị fere Chineke n’atụghị egwu, aka idi ihe bịaara ha bụ na obi siri ha ike na nkwa dị iche iche Jehova kwere ga-emezu.—Taị. 1:2.

8 Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ ndị dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst, nọ na-atụ anya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ha ga-emecha zuo okè mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha ewee “nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure” n’oge Kraịst Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ndị ya na ha ga-abụ ndị nchụàjà ga na-arụ ọrụ ha ji bụrụ ndị nchụàjà. (Rom 8:21) Ihe ọzọkwa nyeere Jeremaya na ndị ohu Chineke ndị ọzọ aka ịkata obi bụ na Chineke mesiri ha obi ike, dị ka ihe ọ gwara Jeremaya na-egosi. Ọ sịrị: “Ha ga-alụsokwa gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihi na ‘anọnyeere m gị,’ ka Jehova kwuru, ‘ịnapụta gị.’” (Jer. 1:19) Taa, mgbe anyị chetara ihe dị iche iche Chineke kwere nkwa na ya ga-emere anyị n’ọdịnihu nakwa otú o si emesi anyị obi ike na ya agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mebie adịm ná mma anyị na ya, okwukwe anyị na-esikwa ike.—Ilu 2:7; gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:17, 18.

Ịhụnanya Mere Jizọs Ji Jiri Nkwuwa Okwu Zisaa Ozi Ọma

9, 10. Gịnị ka Jizọs mere iji gosi na ya anaghị atụ ụjọ mgbe ọ bịara n’ihu (a) ndị ndú okpukpe, (b) ìgwè ndị agha, (c) onyeisi nchụàjà, (d) Paịlet?

9 Onye Anyị Na-eṅomi, bụ́ Jizọs, ji nkwuwa okwu mee ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara ndị mmadụ ihe Chineke chọrọ ka ha mara, n’agbanyeghị na ndị ọchịchị na ndị a na-anụ aha ha kpọrọ ya asị. Ọ katọrọ ndị ndú okpukpe a ma ama, ndị bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha, katọọkwa ozizi ụgha ha na-ezi. Ha na-eme ihe na-ezighị ezi, Jizọs ezoghịkwa ọnụ mgbe ọ gwara ha na ihe ha na-eme ezighị ezi. O nwere mgbe ọ gwara ha, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu yiri ili e tere nzụ, bụ́ nke na-eyi ihe mara mma n’elu ma ime ya ejupụta n’ọkpụkpụ nke ndị nwụrụ anwụ nakwa n’ụdị adịghị ọcha ọ bụla. Otú ahụkwa ka unu onwe unu na-eyi ndị ezi omume n’anya ndị mmadụ, ma ime unu jupụtara n’ihu abụọ na mmebi iwu.”—Mat. 23:27, 28.

10 Mgbe ìgwè ndị agha bịara n’ogige Getsemeni ka ha jide Jizọs, ọ tụghị egwu ịgwa ha na ọ bụ ya bụ Jizọs. (Jọn 18:3-8) Ka e mechara, ha kpụụrụ ya gaa Sanhedrin, bụ́ ebe onyeisi nchụàjà gbara ya ajụjụ. Jizọs atụghị egwu ịgwa onyeisi nchụàjà ahụ na ya bụ Kraịst, bụrụkwa Ọkpara Chineke, n’agbanyeghị na ọ ma na ọ na-achọ ka Jizọs kwuo ụdị ihe ahụ ka o wee maa ya ikpe ọnwụ. Ọ gwakwara ya na ha ga-ahụ ya ka ya “nọ ọdụ n’aka nri nke ike ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.” (Mak 14:53, 57-65) N’oge na-adịghị anya, e kefere Jizọs aka azụ kpụgara ya Paịlet, bụ́ onye nwere ike ịhapụ ya ma ọ chọọ. Ma, Jizọs atụpụghị ọnụ mgbe a na-ebo ya ebubo. (Mak 15:1-5) Jizọs mere ihe a niile n’ihi na o nwere obi ike.

11. Olee otú ịhụnanya si eme ka anyị nwee nkwuwa okwu?

11 Ma, Jizọs gwara Paịlet, sị: “Ọ bụ n’ihi nke a ka e ji mụọ m, ọ bụkwa n’ihi nke a ka m ji bịa n’ụwa, ka m wee gbaara eziokwu àmà.” (Jọn 18:37) Jehova zitere Jizọs ka ọ bịa zie ndị mmadụ ozi ọma, ọ masịkwara Jizọs ime otú ahụ n’ihi na ọ hụrụ Nna ya nke eluigwe n’anya. (Luk 4:18, 19) Jizọs hụkwara ndị ọ na-ezi ozi ọma n’anya. Ọ ma na ihe na-esiri ha ike. Ọ bụkwa ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke na ndị agbata obi anyị nọ mere anyị ji ezi ndị mmadụ ozi ọma n’atụghị egwu.—Mat. 22:36-40.

Mmụọ Nsọ Na-eme Ka Anyị Jiri Nkwuwa Okwu Na-ekwusa Ozi Ọma

12. Olee ihe mere ka ndị na-eso ụzọ Kraịst n’oge ochie nwee ọṅụ?

12 Ka izu ole na ole gafere Jizọs nwụrụ, ndị na-eso ụzọ ya nwere obi ụtọ dị ukwuu n’ihi na Jehova mere ka ha nwekwuo ndị ọhụrụ na-eso ụzọ Jizọs. Naanị n’otu ụbọchị, e mere ihe dị ka puku mmadụ atọ baptizim. Ha bụ ndị Juu na ndị ọzọ na-ekpe okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị si ọtụtụ obodo bịa ememme Pentikọst na Jeruselem! Nke a ghọrọ okwu a kpụ n’ọnụ na Jeruselem! Baịbụl sịrị: “Egwu wee malite ịtụ mkpụrụ obi ọ bụla. Ndịozi malitekwara ime ọtụtụ ihe ebube na ihe ịrịba ama.”—Ọrụ 2:41, 43.

13. Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jizọs ji kpee ekpere ka Jehova mee ka ha na-ekwu okwu ya n’atụghị egwu, oleekwa otú e si zaa ekpere ahụ?

13 Nke a were ndị ndú okpukpe iwe. Ha ewee kpọchie Pita na Jọn n’ụlọ mkpọrọ ruo echi ya, ma mechaa nye ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma n’aha Jizọs. Mgbe a hapụrụ ha abụọ, ha gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ihe mere, ha niile wee kpekuo Chineke ekpere banyere mkpagbu a na-akpagbu ha, sị: ‘Jehova, biko, nye ndị ohu gị ike ka anyị nọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.’ Olee otú e si zaa ekpere ahụ? “Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.”—Ọrụ 4:24-31.

14. Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka ikwusa ozi ọma?

14 Cheta na ihe nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu bụ mmụọ nsọ ya dị ike. Obi ike anyị ji agwa ndị ọzọ okwu Chineke, ọbụna mgbe anyị na-agwa ya ndị na-emegide anyị, esighị n’ike anyị. Jehova ga-enye anyị mmụọ nsọ ya ma anyị rịọ ya. Site n’enyemaka Jehova, anyịnwa nwekwara ike inwe obi ike nke ga-enyere anyị aka imeri mkpagbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị.—Gụọ Ọma 138:3.

Ndị Kraịst nke Oge A Na-ekwusa Ozi Ọma n’Atụghị Egwu

15. Olee otú okwu Chineke si ekewa ndị mmadụ taa?

15 Okwu Chineke na-ekewa ndị mmadụ taa, dị ka o kewara ha n’oge ochie. Ụfọdụ nwere mmasị n’otú anyị si efe Chineke, ebe ndị ọzọ na-anaghị aghọta ya, ha enweghịkwa mmasị na ya. Ndị ụfọdụ na-akatọ anyị, jiri anyị na-eme ihe ọchị, ma ọ bụkwanụ kpọ anyị asị, dị ka Jizọs buru n’amụma na ha ga-eme. (Mat. 10:22) Mgbe ụfọdụ, ha na-eji ihe e ji agbasa ozi na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị iji mebie aha anyị. (Ọma 109:1-3) N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Jehova na-ekwusa ozi ọma n’ụwa dum n’atụghị egwu.

16. Olee ihe otu nwanna nwaanyị jetara n’ozi ọma nke na-egosi na inwe obi ike nwere ike ime ka obi ndị anyị na-ezi ozi ọma gbanwee?

16 Ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe otú ha si ele ozi ọma banyere Alaeze Chineke anya ma ọ bụrụ na anyị na-ekwusa ya n’atụghị egwu. Otu nwanna nwaanyị nke nọ na Kyrgyzstan kwuru, sị: “Otu onye m gara na nke ya otu ụbọchị m nọ ozi ọma gwara m, sị: ‘M kwere na Chineke, ma ekweghị m na Chineke Ndị Kraịst. M hụ ụkwụ gị n’ọnụ ụzọ a ọzọ, m gwa nkịta m ka ọ taa gị!’ E nwekwaranụ nkịta ukwuu a manyere agbụ ígwè n’azụ ya. Ma, mgbe anyị na-ekesa Akụkọ Alaeze nke 37, nke isiokwu ya bụ ‘A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!’ m kpebiri ịgaghachi n’ụlọ ahụ ka m zie otu n’ime ndị ezinụlọ nwoke ahụ ozi ọma. Ma, ọ bụ nwoke ahụ mepeere m ụzọ. M kpekuru Jehova ekpere ozugbo wee gwa nwoke ahụ, sị: ‘Ndeewo. M chetara ihe mụ na gị kwuru nwanne nwanne ụnyaahụ. M chetakwara nkịta gị. Ma, m chọrọ iwetara gị traktị a n’ihi na m kwere n’otu ezi Chineke, dị ka gịnwa kwekwara. N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-ebibi okpukpe na-anaghị asọpụrụ ya. Ị ga-aghọtakwu nke a ma ọ bụrụ na ị gụọ traktị a.’ O juru m anya na nwoke ahụ natara traktị ahụ. Ahapụrụ m ya gaa n’ụlọ ọzọ. Mgbe nkeji ole na ole gafere, nwoke ahụ ji traktị ahụ chụrụ m na-abịa. Ya asị: ‘Agụọla m ya. Gịnị ka m ga-eme ka Chineke ghara ịla m n’iyi?’” A malitere ịmụrụ nwoke ahụ ihe, o bidokwara ịga ọmụmụ ihe.

17. Olee otú obi ike otu nwanna nwaanyị nwere si mee ka onye ọ na-amụrụ ihe, nke na-atụbu egwu, nwee obi ike?

17 Ndị ọzọ nwekwara ike inwe obi ike ma ọ bụrụ na ha ahụ na anyị nwere obi ike. Na Russia, otu nwanna nwaanyị nke nọ na bọs na-aga njem nọ na-enye onye ọzọ nọ na bọs ahụ magazin. Otu nwoke wee si n’oche ya malie hịọnara nwanna nwaanyị ahụ magazin ahụ, fụkọta ya tụpụ n’ala. Ya ejiri oké olu na-akpọ nwanna nwaanyị ahụ iyi, wee gwa ya ka o nye ya adres ya. Ọ gwakwara nwanna nwaanyị ahụ na ya anwakwala anwa kwusaa ozi ọma n’obodo ha. Nwanna nwaanyị ahụ wee kpekuo Jehova ekpere ka o nyere ya aka. O wee cheta ihe Jizọs kwuru, mgbe ọ sịrị: “Unu atụkwala egwu ndị na-egbu ahụ́.” (Mat. 10:28) Ya emedaa obi bilie n’oche gwa nwoke ahụ, sị, “M gaghị enye gị adres m. M gaghịkwanụ akwụsị izi ozi ọma n’obodo unu.” Ya arịtuo na bọs ahụ. Ma, nwanna nwaanyị ahụ amaghị na otu onye n’ime ndị ọ na-amụrụ ihe nọ na bọs ahụ. Ịtụ mmadụ egwu mere ka nwaanyị ahụ ọ na-amụrụ ihe ghara ịna-abịa ọmụmụ ihe. Ma, mgbe ọ hụrụ otú nwanna nwaanyị ahụ si gwa nwoke ahụ okwu n’atụghị egwu, o kpebiri na ya ga-amalite ịna-abịa ọmụmụ ihe.

18. Gịnị ga-enyere gị aka ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu, dị ka Jizọs mere?

18 N’ụwa a nke ọtụtụ ndị nọ na ya bụ ndị iro Chineke, mmadụ aghaghị inwe obi ike tupu ya ekwusaa ozi ọma ka Jizọs. Gịnị ga-enyere gị aka inwe obi ike? Nwee olileanya. Ekwela ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nakwa n’ebe onye agbata obi gị nọ jụọ oyi. Kpekuo Jehova ekpere ka o nye gị obi ike. Echefukwala na Jizọs nọnyeere gị. (Mat. 28:20) Mmụọ nsọ ga-enye gị ume. Jehova ga-agọzi gị, kwadokwa gị. N’ihi ya, ka onye ọ bụla n’ime anyị nwee obi ike wee sị: “Jehova bụ onye na-enyere m aka; agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”—Hib. 13:6.

[Gịnị Ka Ị Ga-aza?]

• Gịnị mere ndị ohu Chineke ji kwesị inwe nkwuwa okwu?

• A bịa n’inwe nkwuwa okwu, gịnị ka anyị mụtara n’aka . . .

ndị ji ikwesị ntụkwasị obi fee Chineke tupu Kraịst abịa n’ụwa?

Jizọs Kraịst?

Ndị Kraịst oge ochie?

ụmụnna anyị taa?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 21]

Jizọs ji obi ike kwuo ihe na-adịghị mma ndị ndú okpukpe na-eme

[Foto dị na peeji nke 23]

Jehova na-enye anyị obi ike anyị ji ekwusa ozi ọma