Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpụrụ Nke Eziokwu Ruru n’Ime Ime Obodo

Mkpụrụ Nke Eziokwu Ruru n’Ime Ime Obodo

Mkpụrụ Nke Eziokwu Ruru n’Ime Ime Obodo

OBODO Tuva Republic nke Russia dị n’ebe ndịda ndịda Siberia, obodo Mongolia adịrịkwa na ndịda ya nakwa n’ebe ọwụwa anyanwụ ya. Ọtụtụ ndị Tuva bi n’ime ime obodo, o sikwara ike ịga ebe ahụ zie ha ozi ọma Alaeze. Ma, n’oge na-adịbeghị anya, e nwere ndị si n’ọtụtụ obodo dị n’ime ime obodo Tuva bịa nzukọ na Kyzyl bụ́ isi obodo ya. Mgbe otu ọsụ ụzọ bi na Kyzyl, aha ya bụ Maria, nụrụ na ha bịara, ọ ghọtara na ọ bụ ezigbo ohere ọ ga-eji zie ndị a ozi ọma, ebe ọ bụ na anaghị ezi ha ozi ọma mgbe niile.

Ka Maria kọrọ anyị ihe merenụ. Ọ sị: “Ụlọ akwụkwọ ebe m na-akụzi ihe haziri nzukọ maka otú a ga-esi enyere ndị mmanya na ọgwụ ike riri ahụ́ aka ịkwụsị ya. Ihe dị ka iri mmadụ ise si n’ime ime obodo Tuva ga-abịa ya. Ha bụ ndị nkụzi, ndị ọkà mmụta banyere akparamàgwà ụmụ mmadụ, ndị na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka na ndị ọzọ.” Maria ma na nzukọ ahụ a ga-enwe ga-eme ka o zie ndị mmadụ ozi ọma, ma ọ ga-esitụrụ ya ike. O kwuru, sị: “Abụ m onye ihere kemgbe a mụrụ m, ọ na-esikwara m ike ịgba àmà mgbe m na-anọghị n’ozi. Ma, ekpekuru m Jehova ekpere ka o nye m obi ike m ga-eji zie ndị bịara nzukọ ahụ ozi ọma.” Jehova ọ̀ zara ekpere ya?

Maria kwukwara, sị: “A hụrụ m Teta! kwuru banyere ịtụ ụjọ. E chere m na ndị ọkà n’akparamàgwà ụmụ mmadụ ga-enwe mmasị ịgụ ya. N’ihi ya, m ji ya gaa ụlọ akwụkwọ. N’ụbọchị ahụ, otu n’ime ndị nkụzi bịara nzukọ ahụ batara n’ọfịs m, mụ enye ya magazin ahụ. O ji obi ụtọ nara m ya. N’eziokwu, o kwuru na ya bụkwa onye ụjọ. N’echi ya, enyere m ya akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1. O jikwa obi ụtọ were ya. Otú o si were akwụkwọ ahụ mere ka m chee na ndị nkụzi ndị ọzọ ga-achọkwa ịgụ ya. N’ihi ya, ebuuru m otu katọn akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ na akwụkwọ ndị ọzọ gaa ụlọ akwụkwọ.” O gbughị oge ha ewerechaa akwụkwọ ndị ahụ. Maria kwuru ihe merenụ, sị: “Ọtụtụ ndị nkụzi ha na onye nkụzi ahụ m nyere akwụkwọ Ndị Na-eto eto Na-ajụ na-arụkọ ọrụ bịara n’ọfịs m, jụọ m, sị: ‘Olee ebe a na-enye ndị mmadụ akwụkwọ ndị ahụ?’” Ebe a ha bịara bụ ebe a na-enye ya!

E mechiri nzukọ ahụ n’ụbọchị Saturday. Maria anaghị abịa ụlọ akwụkwọ n’ụbọchị ahụ, n’ihi ya, o debere akwụkwọ n’ọtụtụ tebụl dị n’ọfịs ya. Na bọọdụ dị n’ọfịs ahụ, o dere, sị: “Ezi Ndị Nkụzi! Unu nwere ike iwere akwụkwọ ndị unu ga-agụ, werekwa ndị unu ga-enye ndị enyi unu. Akwụkwọ ndị a magburu onwe ha ga-enyere unu aka ime nke ọma n’ọrụ unu, meekwa ka ezinụlọ unu sikwuo ike.” Olee ihe ha mere? “Agara m n’ọfịs m n’ụbọchị ahụ ma chọpụta na ha ewerela ọtụtụ n’ime ha. Agara m ozugbo butekwuo akwụkwọ na magazin.” Mgbe e mechiri nzukọ ahụ, Maria nyere narị magazin atọ na iri asatọ, narị akwụkwọ na iri asaa na atọ, na iri broshuọ atọ na anọ. Ndị bịara nzukọ ahụ ji akwụkwọ ndị ahụ ha weere laghachi n’ime ime obodo ndị ha si bịa. Maria sịrị: “Obi na-atọ m ezigbo ụtọ na mkpụrụ nke eziokwu ahụ eruola n’ime ime obodo ndị dị na Tuva!”—Ekli. 11:6.

[Map dị na peeji nke 32]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

RUSSIA

TUVA REPUBLIC