Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”

“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”

“Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”

“Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke, ebe unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.”—JUD 21.

1, 2. Olee otú Jehova sirila gosi na ya hụrụ anyị n’anya, oleekwa otú anyị si mara na ọ gaghị eme ka anyị nọrọ n’ịhụnanya ya ma ànyị chọrọ ma anyị achọghị?

E NWERE ọtụtụ ụzọ Jehova Chineke sirila gosi na ya hụrụ anyị n’anya. Ma, o doro anya na ụzọ kachanụ Jehova si gosi na ya hụrụ anyị n’anya bụ na o mere ndokwa ka a chụọ àjà iji gbapụta anyị. Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu nke na o zitere Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya n’ụwa ka ọ nwụọ n’ihi anyị. (Jọn 3:16) Ihe mere Jehova ji mee nke a bụ na ọ chọrọ ka anyị dị ndụ ebighị ebi, ọ chọkwara ka anyị na-erite uru n’ịhụnanya ya ruo mgbe ebighị ebi.

2 Ma, ànyị kwesịrị iche na Jehova ga-eme ka anyị nọrọ n’ịhụnanya ya n’agbanyeghị ihe anyị kpebiri ime? Mba. Ihe mere anyị ji kwuo otú a bụ na Jud amaokwu nke iri abụọ na otu gbara anyị ume, sị: “Nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke, ebe unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke na-eduga ná ndụ ebighị ebi.” Okwu ahụ bụ́ “nọrọnụ n’ịhụnanya Chineke” gosiri na e nwere ihe anyị kwesịrị ime. Gịnị bụ ihe ahụ anyị kwesịrị ime iji nọrọ n’ịhụnanya Chineke?

Olee Otú Anyị Ga-esi Nọrọ n’Ịhụnanya Chineke?

3. Olee ihe Jizọs kwuru na ya kwesịrị ime iji nọrọ n’ịhụnanya Nna ya?

3 Ihe Jizọs kwuru n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ zara ajụjụ ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya.” (Jọn 15:10) O doro anya na Jizọs ghọtara na ọ bụ idebe ihe Nna ya nyere n’iwu ga-eme ka ya na ya dịrị ná mma. Ugbu a, ebe ọ bụ na Ọkpara Chineke nke zuru okè ghọtara nke a, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime otu ihe ahụ?

4, 5. (a) Olee ụzọ bụ́ isi anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya? (b) Olee ihe mere anyị ekwesịghị ịjụ idebe ihe Jehova nyere n’iwu?

4 Ụzọ bụ́ isi anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ irubere ya isi. Jọn onyeozi kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị na-edebe ihe o nyere n’iwu; ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” (1 Jọn 5:3) Ọ bụ eziokwu na n’ụwa taa, ọtụtụ ndị anaghị achọ iji ntị anụ okwu gbasara irube isi. Ma, cheta na amaokwu ahụ sịrị: “Ma ihe o nyere n’iwu adịghị arọ.” Jehova anaghị agwa anyị ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli.

5 Dị ka ihe atụ: Ị̀ ga-agwa ezigbo enyi gị ka o buru ihe ị ma na ọ gaghị ebuli? Mbanụ! Jehova ka anyị nwee obiọma, karakwa anyị mara ihe anyị na-agaghị emeli. Baịbụl mesiri anyị obi ike na Jehova “na-echeta na anyị bụ ájá.” (Ọma 103:14) Ọ dịghị mgbe Jehova ga-agwa anyị ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli. N’ihi ya, o nweghị ihe mere anyị ga-eji jụ idebe iwu ya. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịghọta na irubere ya isi bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si egosi na anyị hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya n’ezie, chọọkwa ịnọ n’ịhụnanya ya.

Onyinye Pụrụ Iche Jehova Nyere Anyị

6, 7. (a) Gịnị bụ akọnuche? (b) Nye ihe atụ otú akọnuche nwere ike isi nyere anyị aka ịnọ n’ịhụnanya Chineke.

6 N’ụwa a siri ike anyị bi, anyị nwere ọtụtụ mkpebi ndị anyị kwesịrị ime, bụ́ ndị ga-egosi ma ànyị na-erubere Chineke isi. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịma ma mkpebi ndị anyị na-eme hà kwekọrọ n’uche Chineke? Jehova nyere anyị onyinye nwere ike inyere anyị ezigbo aka irubere ya isi. Onyinye ahụ bụ akọnuche. Gịnị bụ akọnuche? Ọ bụ ihe pụrụ iche nke na-enyere mmadụ aka ịtụle ihe o merela eme ma ọ bụkwanụ nke ọ ka chọrọ ime eme. Ọ na-ekpe anyị ikpe, na-enyere anyị aka ileru ihe anyị chọrọ ime ná ndụ anya ma ọ bụ mee ka anyị chebara ihe anyị mere echiche ma chọpụta ma ọ̀ dị mma ka ọ̀ dị njọ, ma ò ziri ezi ka ọ̀ bụ na o zighị.—Gụọ Ndị Rom 2:14, 15.

7 Olee otú akọnuche anyị ga-esi nyere anyị aka? Chebara ihe atụ a echiche. Ka e were ya na ị chọrọ ịga ebe ị na-agatụbeghị. Ị maghị ụzọ ebe ahụ, e nweghịkwa ihe ga-ezi gị ụzọ. Ma i nwere ike ịgaru ebe ahụ ị chọrọ ịga. Olee otú i nwere ike isi agaru ebe ahụ? Ị ga-eru ebe ahụ ma ọ bụrụ na gị na onye ị tụkwasịrị obi nke gatụrụla ebe ahụ esoro. Ọ bụrụ na ụzọ ebe ahụ doro ya anya nke ọma, ọ ga-ezi gị ụzọ. Ọ bụrụ na onye ahụ ezighị gị ụzọ, i nwere ike ifu ụzọ. Otú ahụ ka onye na-enweghị akọnuche ga-efu ụzọ ma ọ bụrụ na ọ chọwa ikpebi ihe bụ́ àgwà na omume ndị ziri ezi na ndị na-ezighị ezi.

8, 9. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ịma banyere ihe nwere ike ime akọnuche anyị? (b) Olee ihe anyị nwere ike ime iji hụ na akọnuche anyị na-enyere anyị aka n’ezie?

8 Dị ka onye na-ezi mmadụ ụzọ nwere ike idufu onye ahụ, akọnuche nwere ike iduhie mmadụ. Ọ bụrụ na e nwere otú ụzọ si gbagwojuo onye na-ezi gị ụzọ anya, o nwere ike idufu gị. N’otu aka ahụ, gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-emekarị ihe anụ ahụ́ anyị chọrọ? Ọchịchọ anụ ahụ́ anyị nwere ike ime ka akọnuche anyị duhie anyị. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na “obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite.” (Jer. 17:9; Ilu 4:23) Ọ bụrụkwa na ị na-arụ onye ahụ na-ezi gị ụzọ ụka, jụ iso ụzọ o ziri gị ma tinye isi n’ebe masịrị gị, i nwere ike ifu ụzọ. N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị anaghị eso nduzi na-anaghị agbanwe agbanwe, nke dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl, akọnuche anyị agaghị abara anyị uru ọ bụla. (Ọma 119:105) Ọ dị mwute na ọtụtụ ndị nọ n’ụwa taa na-emekarị ihe obi ha chọrọ n’achọghị ịma iwu dị n’Okwu Chineke. (Gụọ Ndị Efesọs 4:17-19.) Ọ bụ ya mere ọtụtụ ndị ji eme ihe ọjọọ dị iche iche n’agbanyeghị na ha nwere akọnuche.—1 Tim. 4:2.

9 Anyị kwesịrị ikpebisi ike na anyị agaghị eme ka ha! Kama ime ka ha, ka anyị nọgide na-ekwe ka Okwu Chineke na-azụ akọnuche anyị ka o wee baara anyị ezigbo uru. Anyị kwesịrị ige akọnuche anyị e ji Baịbụl zụọ ntị kama ikwe ka ọchịchọ anụ ahụ́ anyị na-atụrụ anyị ụka. Anyị kwesịkwara ịna-agbalị na-akwanyere akọnuche ụmụnna anyị ùgwù. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị wee ghara ime ka ha sụọ ngọngọ, ebe anyị ma na akọnuche ha nwere ike ịnabata ihe akọnuche anyị jụrụ ma ọ bụkwanụ jụ ihe akọnuche anyị nabatara.—1 Kọr. 8:12; 2 Kọr. 4:2; 1 Pita 3:16.

10 Ka anyị tụlee ebe atọ anyị kwesịrị igosi na anyị hụrụ Jehova n’anya site n’irubere ya isi. Akọnuche anyị ga-eduzi anyị na nke ọ bụla n’ime ha. Ma, ka o wee nwee ike iduzi anyị nke ọma, a ga-eji Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ na-eduzi ya. Ụzọ atọ anyị ga-esi na-erubere Jehova isi iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya bụ: (1) Anyị kwesịrị ịhụ ndị Jehova hụrụ n’anya n’anya, (2) anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị isi, (3) anyị kwesịkwara ịgbalịsi ike ka anyị na-adị ọcha n’anya Chineke.

Hụ Ndị Jehova Hụrụ n’Anya n’Anya

11. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịhụ ndị Jehova hụrụ n’anya n’anya?

11 Nke mbụ bụ na anyị aghaghị ịhụ ndị Jehova hụrụ n’anya n’anya. A bịa n’ihe banyere mkpakọrịta, e nwere ike ikwu na ndị mmadụ na-eme ka ákwà nke na-amịrị mmiri dị n’ebe ọ bụla a wụsara ya. Anyị na-amụrụkarị ihe ndị nọ anyị gburugburu na-eme. Onye Okike anyị ma uru na ọghọm ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-enwe ma ha na ibe ha na-akpa. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị ndụmọdụ bara uru, sị: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe, ma ihe agaghị agaziri onye ya na ndị nzuzu na-emekọ ihe.” (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:33) Ọ dịghị onye n’ime anyị ‘na-achọghị ka ihe gaziere ya.’ Anyị niile chọrọ ịbụ ndị ‘ma ihe.’ O nweghị onye ga-eme ka Jehova mara ihe karịa otú ọ ma, o nweghịkwa onye ga-eme ka ọ mụta àgwà ọjọọ. N’agbanyeghị nke ahụ, o setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya n’ihe banyere mkpakọrịta. Chetụgodị banyere nke a. N’ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ole ndị ka Jehova na-ahọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya?

12. Olee ụdị ndị Jehova na-ahọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya?

12 Jehova kpọrọ nna ochie bụ́ Ebreham “enyi m.” (Aịza. 41:8) Ọ bụ onye e ji ikwesị ntụkwasị obi, ezi omume na nrubeisi mara. Ọ bụkwa nwoke nwere okwukwe. (Jems 2:21-23) Ọ bụ ndị dị ka ya ka Jehova na-ahọrọ ka ha bụrụ ndị enyi ya. Taa, ya na ndị dị otú ahụ bụ enyi. Ebe ọ bụ na Jehova na-eme otú ahụ, ọ̀ bụ na anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè ekwesịghị ịsa anya ná mmiri hụ na anyị na ndị ma ihe na-akpa ka anyị wee nwee ike ịma ihe?

13. Gịnị nwere ike inyere anyị aka imete ezigbo ndị enyi?

13 Gịnị ga-enyere gị aka imete ezigbo ndị enyi? Ịmụ ihe atụ ndị dị na Baịbụl ga-enyere gị aka. Chegodị echiche ụdị enyi Rut na nne di ya bụ́ Neomi bụ, ụdị enyi Devid na Jọnatan bụ, ma ọ bụkwanụ nke Timoti na Pọl. (Rut 1:16, 17; 1 Sam. 23:16-18; Fil. 2:19-22) Ihe kacha mee ka ndị a bụrụ ezigbo ndị enyi bụ na onye ọ bụla n’ime ha hụrụ Jehova n’anya. Ì nwere ike imete ndị enyi hụrụ Jehova n’anya ka gị? Ka obi sie gị ike na ndị hụrụ Jehova n’anya juru eju n’ọgbakọ Ndị Kraịst. Ụdị ndị enyi a agaghị eme ka i mee ihe ga-emebi adịm ná mma gị na Jehova. Kama nke ahụ, ha ga-enyere gị aka irubere Jehova isi, mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma, meekwa ka ị na-agha mkpụrụ maka mmụọ nsọ. (Gụọ Ndị Galeshia 6:7, 8.) Ha ga-enyere gị aka ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke.

Na-erubere Ndị Isi Isi

14. Olee ihe ndị na-eme ka ọ na-esiri anyị ike irubere ndị isi isi?

14 Ụzọ nke abụọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya gbasara otú anyị si erubere ndị isi isi. Anyị kwesịrị ịna-asọpụrụ ndị isi. Ma, gịnị mere irubere ndị isi isi ji esiri anyị ike mgbe ụfọdụ? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ndị mmadụ na-achị anyị ezughị okè. Anyịnwa ezughịkwa okè. Mmụọ nnupụisi dị anyị n’ọbara.

15, 16. (a) Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ ndị Jehova gwara ka ha na-elekọta ndị ya? (b) Olee ihe anyị na-amụta n’otú Jehova si lee isi ndị Izrel nupụụrụ Mozis anya?

15 I nwere ike iche, sị, ‘Ebe ọ bụ na ịsọpụrụ ndị isi na-esiri anyị ike otú a, oleezi ihe mere anyị ji kwesị ịna-erubere ha isi?’ Ọ bụ n’ihi na ọ na-egosi onye anyị chọrọ ka ọ na-achị anyị. Ònye ka ị chọrọ ka ọ na-achị gị? Ọ bụrụ na anyị ekpebie na ọ bụ Jehova ga na-achị anyị, anyị kwesịrị ịna-erubere ya isi. Ọ bụrụ na anyị anaghị erubere ya isi, ànyị nwere ike ikwu n’ezie na ọ bụ ya na-achị anyị? Ihe ọzọ bụ na ndị Jehova na-ejikarị eduzi anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, bụ́ ndị ọ gwara ka ha na-elekọta ndị ya. Olee otú Jehova ga-esi na-ele anyị anya ma ọ bụrụ na anyị na-enupụrụ ha isi?—Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:12, 13.

16 Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel tamuru ntamu ma nupụrụ Mozis isi, Jehova weere ya na ọ bụ ya ka ha nupụụrụ isi. (Ọnụ Ọgụ. 14:26, 27) Chineke agbanwebeghị. Ọ bụrụ na anyị anọkata nupụwere ndị ọ gwara ka ha na-edu anyị isi, ọ bụ ya ka anyị na-enupụrụ isi!

17. Olee otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-edu ndú n’ọgbakọ omume?

17 Pọl onyeozi kwuru otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-edu ndú n’ọgbakọ ihe. O dere, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha, n’ihi na ha na-eche mkpụrụ obi unu nche dị ka ndị ga-aza ajụjụ; ka ha wee jiri ọṅụ na-eme nke a, ọ bụghị ịsụ ude, n’ihi na nke a ga-emebiri unu ihe.” (Hib. 13:17) Ọ bụ eziokwu na irubere ha isi chọrọ nnukwu mgbalị n’aka anyị, ma, ka anyị cheta na anyị na-eme nke a iji nọrọ n’ịhụnanya Chineke. Nke ahụ ó kwesịghị ime ka anyị na-agbalịsi ike?

Na-adị Ọcha n’Anya Jehova

18. Gịnị mere Jehova ji chọọ ka anyị na-adị ọcha?

18 Ụzọ nke atọ anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ anyị ịgba mbọ na-adị ọcha n’anya ya. Ndị nne na nna na-agbasi mbọ ike na-eme ka ụmụ ha dị ọcha. N’ihi gịnị? Otu n’ime ihe mere ha ji eme nke a bụ n’ihi na ọ bụrụ na nwata adịrị ọcha, ọ gaghị na-arịakarị ọrịa. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-ewetara ezinụlọ ya aha ọma, ọ ga-emekwa ka a mata na ndị mụrụ ya hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya. Ọ bụ ụdị ihe ahụ mere Jehova ji chọọ ka anyị na-adị ọcha. Ọ ma na ịdị ọcha ga-abara anyị uru. Ọ makwa na ọ bụrụ na anyị na-adị ọcha, ọ ga-eme ka e too ya, bụ́ Nna anyị nke eluigwe. Ọ bụ nke a kacha anyị mkpa, n’ihi na ndị mmadụ nwere ike ịchọ ifewe Chineke ma ha hụ otú anyị si dị iche n’ebe ndị ọzọ nọ n’ụwa a rụrụ arụ nọ.

19. Olee otú anyị si mara na anyị kwesịrị ịna-adị ọcha n’anụ ahụ́?

19 Olee n’ihe ndị anyị kwesịrị ịna-adị ọcha? Anyị ga na-adị ọcha n’ihe niile. Jehova mere ka o doo ndị ya, bụ́ Izrel oge ochie, anya na ha kwesịrị ịdị ọcha n’anụ ahụ́. (Lev. 15:31) Iwu Mozis gwara ụmụ Izrel ka ha na-eli nsị n’ala, na-eme ka arịa ha dị ọcha, na-akwọ aka, na-asa ụkwụ, na-asakwa ákwà ha. (Ọpụ. 30:17-21; Lev. 11:32; Ọnụ Ọgụ. 19:17-20; Diut. 23:13, 14) A gwara ụmụ Izrel na Chineke ha, bụ́ Jehova, dị nsọ, nke pụtara na ‘ọ dị ọcha,’ ‘o nweghịkwa ntụpọ.’ Ndị ohu Chineke nke dị nsọ kwesịkwara ịdị nsọ.—Gụọ Levitikọs 11:44, 45.

20. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịgba mbọ na-adị ọcha na ha?

20 N’ihi ya, anyị kwesịrị ịdị ọcha ma n’ime ahụ́ ma n’elu ahụ́. Anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ka anyị na-eche naanị ihe ndị dị mma. Anyị kwesịrị ịna-erube isi n’iwu Jehova nyere banyere omume dị ọcha, n’agbanyeghị na ara ịkwa iko na-agba ndị mmadụ n’ụwa a. Nke kacha mkpa bụ na anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka ofufe anyị na-efe Jehova dị ọcha. Anyị ekwesịghị ikwe ka e jiri ihe ọ bụla si n’okpukpe ụgha merụọ ya. Anyị ekwesịghị ichefu aka ná ntị ahụ e si n’ike mmụọ nsọ dọọ anyị n’Aịzaya 52:11. Ebe ahụ sịrị: “Pụọnụ, pụọnụ, sinụ n’ebe ahụ pụọ, unu emetụla ihe na-adịghị ọcha aka; sinụ n’etiti ya pụọ, debenụ onwe unu ọcha.” Taa, anyị na-ezere ofufe na-adịghị ọcha ma ọ bụrụ na anyị anaghị etinye aka n’ihe ọ bụla Nna anyị nke eluigwe kpọrọ ofufe na-adịghị ọcha. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ya mere anyị anaghị etinye aka n’ememme niile okpukpe ụgha na-eme n’ụwa taa. N’eziokwu, mmadụ ịdị ọcha adịghị mfe. Ma, ndị Jehova na-agbalị ka ha na-adị ọcha, n’ihi na ha ma na ime otú a ga-eme ka ha nọrọ n’ịhụnanya Chineke.

21. Olee otú anyị ga-esi hụ na o nweghị ihe ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke?

21 Jehova chọrọ ka anyị nọrọ n’ịhụnanya ya ruo mgbe ebighị ebi. Ma, anyị niile kwesịrị ịna-eme ike anyị niile iji nọrọ n’ịhụnanya Chineke. Anyị nwere ike ime nke a ma ọ bụrụ na anyị eṅomie ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ ma gosi na anyị hụrụ Jehova n’anya site n’ime ihe o nyere n’iwu. Ọ bụrụ na anyị emee otú a, o nweghị ihe ‘ga-ekewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke nke o gosiri site n’aka Kraịst Jizọs Onyenwe anyị.’—Rom 8:38, 39.

Ì Chetara?

• Olee otú akọnuche anyị si enyere anyị aka ịnọ n’ịhụnanya Chineke?

• Gịnị mere anyị ji kwesị ịhụ ndị Jehova hụrụ n’anya n’anya?

• Olee ihe mere irubere ndị isi isi ji dị oké mkpa?

• Olee otú ịdị ọcha dịruru ndị Chineke mkpa?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

10. Olee ụzọ ihe atọ anyị kwesịrị ịna-eme ná ndụ bụ́ ndị anyị ga-atụle ugbu a?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 20]

AKWỤKWỌ NKE NA-ENYERE ANYỊ AKA ỊKPA ÀGWÀ ỌMA

Ná mgbakọ distrikti e nwere malite na September 2008 ruo January 2009, e wepụtara otu akwụkwọ dị narị peeji abụọ na iri abụọ na anọ nke aha ya bụ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Olee ihe mere e ji bipụta akwụkwọ ọhụrụ a? E bipụtara ya iji nyere Ndị Kraịst aka ịmara iwu Jehova na ịhụ iwu ya n’anya. Isi ihe akwụkwọ a na-ekwu bụ banyere otú anyị ga-esi na-akpa àgwà ka Ndị Kraịst. Ọ bụrụ na anyị ejiri nlezianya mụọ akwụkwọ ahụ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” obi ga-esikwu anyị ike na ọ kacha mma ime uche Jehova ugbu a, nakwa na anyị ga-enweta ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị emee uche Jehova.

Nke ka mkpa bụ na e bipụtara akwụkwọ a ka o nyere anyị aka ịchọpụta na irubere Jehova isi abụghị ibu arọ. Kama ịbụ ibu arọ, ọ bụ ụzọ anyị si egosi Jehova otú anyị hụruru ya n’anya. Ya mere, akwụkwọ a ga-eme ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Olee ihe mere m ji na-erubere Jehova isi?’

Mgbe ndị mmadụ mere ihe na-ekwesịghị ekwesị wee si n’ịhụnanya Jehova pụọ, nke ahụ na-abụkarị n’ihi àgwà ha, ọ bụghị n’ihi na ha aghọtaghị eziokwu Baịbụl. N’ihi ya, ọ dị ezigbo mkpa ka anyị hụkwuo iwu Jehova, bụ́ ndị na-eduzi anyị kwa ụbọchị, n’anya. Obi siri anyị ike na akwụkwọ ọhụrụ a ga-enyere atụrụ Jehova ndị nọ n’ụwa niile aka ịnọgide na-eme ihe ziri ezi ma gosi na Setan bụ onye ụgha. Nke kacha mkpa bụ na obi siri anyị ike na ọ ga-enyere ha aka ịnọrọ n’ịhụnanya Chineke!—Jud 21.

[Foto dị na peeji nke 18]

“Ọ bụrụ na unu edebe ihe m nyere n’iwu, unu ga-anọgide n’ịhụnanya m, dị nnọọ ka m debere ihe Nna m nyere n’iwu wee nọgide n’ịhụnanya ya”