Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ịhụnanya Kraịst Na-akpali Anyị Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya

Ịhụnanya Kraịst Na-akpali Anyị Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya

Ịhụnanya Kraịst Na-akpali Anyị Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya

“[Jizọs] hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.”—JỌN 13:1.

1, 2. (a) Olee otú ịhụnanya Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ si pụọ iche? (b) Olee ihe anyị ga-atụle banyere ịhụnanya n’isiokwu a?

JIZỌS setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya n’ihe banyere ịhụnanya. Ihe niile banyere ya, ya bụ, otú o si gwa ndị mmadụ okwu, otú o si kpaa àgwà, ihe ọ kụziri, na otú o si jiri ndụ ya chụọ àjà, gosiri na ọ hụrụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs nọgidere na-egosi na ya hụrụ ndị ọzọ n’anya, karịchaa, ndị na-eso ụzọ ya, ruokwa mgbe ọ nwụrụ n’ụwa.

2 Ịhụnanya dị ukwuu Jizọs nwere n’ebe ndị mmadụ nọ gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha kwesịrị isi hụ ndị ọzọ n’anya. Ọ na-emekwa ka anyị hụ ụmụnna anyị na mmadụ niile n’anya. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ndị okenye ọgbakọ nwere ike ịmụta n’aka Jizọs banyere otú ha ga-esi egosi ndị mere mmehie na ha hụrụ ha n’anya, ya bụrụgodị ndị nke mere mmehie dị oké njọ. Anyị ga-atụlekwa otú ịhụnanya Jizọs nwere si eme ka Ndị Kraịst nyere ụmụnna ha ihe na-esiri ike, ndị ọdachi dakwasịrị, na ndị na-arịa ọrịa, aka.

3. N’agbanyeghị na Pita mere ihe na-adịghị mma, olee otú Jizọs si lee ya anya?

3 N’abalị bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, onyeozi ya bụ́ Pita gọnahụrụ ya ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Ma, ozugbo Pita laghachiri, dị ka Jizọs kwuru na ọ ga-alaghachi, Jizọs gbaghaara ya. Jizọs nyere Pita ọrụ ndị dị ezigbo mkpa. (Luk 22:32; Ọrụ 2:14; 8:14-17; 10:44, 45) Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jizọs banyere otú anyị ga-esi na-emeso ndị mere mmehie dị oké njọ?

Na-emeso Ndị Mere Mmehie Ihe Dị Ka Jizọs Si Meso Ha

4. Olee mgbe ọ dị ezigbo mkpa ka a na-emeso ndị ọzọ ihe ka Kraịst?

4 Otu n’ime ọtụtụ mgbe anyị kwesịrị inwe ụdị echiche Kraịst, bụ́kwanụ mgbe obi na-agbawa anyị, bụ mgbe mmadụ mere mmehie dị oké njọ, ma onye ahụ ọ̀ bụ onye ezinụlọ anyị ma ọ bụ nwanna anyị na ya nọ n’otu ọgbakọ. Ọ dị mwute na ka ụbọchị ikpeazụ nke ụwa Setan ji ọsọ na-agwụcha, mmụọ nke ụwa na-eme ka ọtụtụ ndị na-emekwu omume ọjọọ. Ndị na-eto eto na ndị toworo eto nwere ike ịmụta àgwà ọjọọ juru n’ụwa a nakwa omume onye mere otú masịrị ya, bụ́ nke nwere ike ime ka o siere ha ike ije ije n’ụzọ ahụ dị warara. E nwere ụfọdụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ na narị afọ mbụ, nweekwa ndị a dọrọ aka ná ntị. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. (1 Kọr. 5:11-13; 1 Tim. 5:20) Ma, ọ bụrụ na ndị okenye, bụ́ ndị na-eleba anya n’okwu ikpe, ejiri ịhụnanya mee nke a ka Kraịst, ha ga-enyere onye ahụ mere mmehie aka.

5. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi na-eṅomi Kraịst ma ha na-emeso ndị mere ihe ọjọọ ihe?

5 Dị ka Jizọs mere, ndị okenye aghaghị ịhụ na a na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova mgbe niile. Ọ bụrụ na ha emee otú a, ha na-egosi na ha dị umeala n’obi, nwee obiọma, nweekwa ịhụnanya, ka Jehova. Ọ bụrụ na mmadụ echegharịa n’eziokwu, nwee ‘obi tiwara etiwa,’ bụrụkwa onye ihe o mere ‘gburu mmụọ ya,’ ọ gaghị esiri ndị okenye ike “iji mmụọ dị nwayọọ gbazie onye ahụ.” (Ọma 34:18; Gal. 6:1) Ma, oleekwanụ ihe a ga-eme onye kpọrọ ekwo nkụ jụ ichegharị?

6. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị izere mgbe ha na-eleba anya n’okwu ikpe, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Ọ bụrụ na onye mere ihe ọjọọ ekweghị anara ndụmọdụ e nyere ya, ma ọ bụkwanụ chọọ ibulara onye ọzọ ụta, nke a nwere ike iwe ndị okenye na ndị ọzọ iwe. Ha nwere ike chọọ ka ha mesie onye ahụ ike n’ihi na ha ma nsogbu ihe ahụ o mere kpatarala. Ma, iwe na-emebi ihe, onye na-ewe iwe anaghị egosi na ya nwere “uche nke Kraịst.” (1 Kọr. 2:16; gụọ Jems 1:19, 20.) Jizọs dọrọ ụfọdụ ndị aka ná ntị n’ezoghị ọnụ mgbe ọ nọ n’ụwa, ma, o nweghị mgbe ọ gwara ha okwu ọjọọ ma ọ bụ okwu na-egbu mmụọ. (1 Pita 2:23) Kama nke ahụ, o mere ka ndị mmehie nwee ohere ichegharị wee laghachikwuru Jehova. N’ezie, otu n’ime ihe ndị dị mkpa mere Jizọs ji bịa n’ụwa bụ “ịzọpụta ndị mmehie.”—1 Tim. 1:15.

7, 8. Gịnị ka ndị okenye kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-eleba anya n’okwu ikpe?

7 Olee otú ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ kwesịrị isi mee ka anyị mara otú anyị ga-esi na-emeso ndị e kwesịrị ịdọ aka ná ntị n’ọgbakọ? Cheta na ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, nke bụ́ ka a na-ekpe ndị mere ihe ọjọọ nọ n’ọgbakọ ikpe, bụ ka e wee chebe atụrụ Jehova, o nwekwara ike ime ka onye ahụ a dọrọ aka ná ntị chegharịa. (2 Kọr. 2:6-8) Ọ dị mwute na ụfọdụ anaghị echegharị, nke na-eme ka a chụpụ ha n’ọgbakọ. Ma, obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ n’ime ha na-emecha lọghachikwute Jehova na ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na ndị okenye na-akpa àgwà ka Kraịst, ha ga-eme ka ọ dịrị onye ahụ mfe ịgbanwe obi ya ma lọghachi. Ka oge na-aga, ndị ahụ mere ihe ọjọọ nwere ike ghara ichetacha ndụmọdụ ndị okenye ji Akwụkwọ Nsọ nye ha, ma, ha ga-echetarịrị na ndị okenye kwanyeere ha ùgwù ma jiri ịhụnanya meso ha ihe.

8 N’ihi ya, ndị okenye kwesịrị inwe “mkpụrụ nke mmụọ nsọ,” karịchaa, ha kwesịrị ịhụ ndị ọzọ n’anya ka Kraịst, ọ bụrụgodị na onye ahụ mere mmehie anabataghị ndụmọdụ e nyere ya. (Gal. 5:22, 23) Ha ekwesịghị iji ọsọ chụpụ onye mere ihe ọjọọ n’ọgbakọ. Ha kwesịrị igosi na ha chọrọ ka onye mere ihe ọjọọ lọghachikwute Jehova. N’ihi ya, mgbe onye mere mmehie mechara chegharịa, dị ka ọtụtụ n’ime ha na-eme, o nwere ike iji obi ya dum kelee Jehova, keleekwa “onyinye n’ụdị mmadụ,” bụ́ ndị mere ka ọ dịrị ya mfe ịlọghachi n’ọgbakọ.—Efe. 4:8, 11, 12.

Ịhụ Ndị Ọzọ n’Anya Ka Kraịst n’Oge Ọgwụgwụ A

9. Kwuo otu ihe atụ gosiri na Jizọs hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya.

9 Luk dere otu n’ime ihe Jizọs mere, bụ́ nke gosiri na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya. Jizọs ma na ndị agha Rom ga-abịa nọchibido Jeruselem n’agha, bụ́ nke ga-eme ka o siere ndị mmadụ ike ịgbapụ. Jizọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ sịrị: “Mgbe unu hụkwara Jeruselem ka ụsụụ ndị agha ndị mara ụlọikwuu gbara ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ime ka ọ tọgbọrọ n’efu adịwo nso.” Gịnị ka ha kwesịrị ime? Jizọs gwara ha kpọmkwem ihe ha ga-eme. “Mgbe ahụ, ka ndị nọ na Judia malite ịgbaga n’ugwu, ka ndị nọkwa n’ime ya si na ya pụọ, ka ndị nọkwa n’obodo nta dị iche iche ghara ịbanye n’ime ya; n’ihi na ndị a bụ ụbọchị ime ihe e kpere n’ikpe, ka ihe niile e dere wee mezuo.” (Luk 21:20-22) Mgbe ndị agha Rom mechara hapụ Jeruselem laa n’afọ 66 O.A., ndị rubere isi n’ihe ahụ Jizọs kwuru gbapụrụ.

10, 11. Olee otú ịtụle otú Ndị Kraịst oge ochie si gbapụ na Jeruselem ga-esi nyere anyị aka ịkwadebe maka “oké mkpagbu” ahụ?

10 Mgbe Ndị Kraịst ndị a na-agbapụ na Jeruselem, ha kwesịrị igosi na ha hụrụ ibe ha n’anya dị ka Kraịst hụrụ ha. Ha kwesịrị inyetụ ndị ọzọ ihe ha nwere. Ma, amụma ahụ Jizọs buru abụghị naanị banyere mbibi a ga-ebibi obodo ochie ahụ. O buru amụma, sị: “A ga-enwe oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa malitere ruo ugbu a, ee e, a gaghị enwekwa ya ọzọ.” (Mat. 24:17, 18, 21) Tupu “oké mkpagbu” ahụ abịa, nakwa mgbe ọ bịara, anyị nwekwara ike inwe ihe isi ike ụfọdụ ma ọ bụ daa ụkpa. Inwe echiche Kraịst ga-enyere anyị aka idi ihe ndị a.

11 N’oge ahụ, anyị kwesịrị iṅomi Jizọs site n’iji obi anyị dum hụ ndị ọzọ n’anya. Pọl dụrụ anyị ọdụ banyere nke a, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu. N’ihi na ọbụna Kraịst emeghị ihe masịrị onwe ya . . . Ma ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi mee ka unu nwee n’etiti onwe unu ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere.”—Rom 15:2, 3, 5.

12. Olee ụdị ịhụnanya anyị kwesịrị inwe ugbu a, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Pita, bụ́ otu n’ime ndị Jizọs hụrụ n’anya, gbakwara Ndị Kraịst ume ka ha “nwee ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ,” gwakwa ha ka ha ‘na-erubere eziokwu ahụ isi.’ Ha kwesịrị ‘inwe ịhụnanya siri ike n’ebe ibe ha nọ site n’obi ha.’ (1 Pita 1:22) Anyị kwesịrị inwe àgwà ndị a yiri nke Kraịst ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Nsogbu ndị ohu Chineke niile na-enweta esiwelarị ike. Nsogbu akụnụba e nwere n’ụwa taa na-egosi na anyị ekwesịghị ịtụkwasị ihe ọ bụla dị n’ụwa obi. (Gụọ 1 Jọn 2:15-17.) Kama nke ahụ, ka usoro ihe ochie a ji ọsọ na-agwụ, anyị kwesịrị ịbịaru Jehova na ibe anyị nso, anyị kwesịkwara inwe ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ. Pọl dụrụ anyị ọdụ, sị: “N’ịhụnanya ụmụnna, na-enwenụ obi ọmịiko n’ebe ibe unu nọ. N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” (Rom 12:10) Pita mesikwuru nke a ike mgbe ọ sịrị: “Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

13-15. Mgbe e nwere ọdachi, olee otú ụmụnna ụfọdụ si gosi na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya dị ka Kraịst mere?

13 N’ụwa dum, a ma na Ndịàmà Jehova hụrụ ibe ha n’anya dị ka Kraịst hụrụ ndị ọzọ n’anya. Tụlee otú ụfọdụ Ndịàmà si nyere ndị ọzọ aka mgbe ajọ ifufe kpara mkpamkpa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda United States n’afọ 2005. Ịhụnanya ụmụnna a nwere n’ebe ibe ha nọ, bụ́ nke yiri nke Jizọs, mere ka iri puku mmadụ abụọ hapụ ụlọ ha, bụ́ ebe ha tụsaara ahụ́, hapụkwa ọrụ ha ma gaa nyere ndị ọdachi ahụ dakwasịrị aka.

14 E nwere ebe ajọ ifufe fere wee mee ka e nwee nnukwu ebili mmiri ogo ya dị mita iri, nke sọbara n’ebe ndị mmadụ bi, nke ruru ihe dị ka iri kilomita asatọ. Mgbe mmiri ahụ talatara, a chọpụtara na ọ laala ọtụtụ ụlọ n’iyi. Ọtụtụ Ndịàmà si mba dị iche iche, bụ́ ndị ma otú e si arụ ụlọ, ji ngwá ọrụ na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ụlọ gaa n’ebe ahụ ka ha wee nye aka. Ụmụnne abụọ di ha nwụrụ kwakọtara ngwongwo ha n’ụgbọala pikọp ma gbaa ihe karịrị puku kilomita atọ ka ha wee nye aka. Otu n’ime ha ka nọ ebe ahụ na-enyere kọmitii enyemaka aka, na-arụkwa ọrụ ịsụ ụzọ.

15 Ụlọ ndị a rụghachiri n’ebe ahụ na ndị nke a rụziri arụzi karịrị puku ise na narị isii, ma nke ụmụnna ma nke ndị ọzọ bi ebe ahụ. Olee otú ịhụnanya a e gosiri ụmụnna ndị ebe ahụ dị ha? Otu nwanna nwaanyị ụlọ ya mebiri gara biri n’otu obere ụlọ ụgbọala na-adọkpụ nke na-ehi mmiri, ihe e ji esi nri na ya mebikwara emebi. Ụmụnna rụọrọ ya obere ụlọ dị nnọọ mma. Mgbe nwanna nwaanyị ahụ guzo n’ihu ụlọ ọma ya ahụ, anya mmiri gbara ya ebe ọ na-ekele Jehova na ụmụnna ya. N’ọtụtụ ebe, ụmụnna ụfọdụ biri n’ebe ha kwagara ruo otu afọ ọbụna mgbe a rụchara ụlọ ha. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka ndị na-arụ ọrụ enyemaka wee nwee ike ịnọ n’ụlọ ha na-arụ ọrụ ha. Nke a na-egosi na ha nwere ụdị echiche Kraịst nwere.

Inwe Ọmịiko n’Ebe Ndị Ọrịa Nọ Ka Kraịst

16, 17. Olee otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọrịa ihe ka Kraịst?

16 Ọ bụ mmadụ ole na ole n’ime anyị ka ọdachi ndị na-emere onwe ha dakwasịtụrụla. Ma, o nweghị onye ọrịa na-anaghị emetụta, ma ọ́ bụghị onye ahụ na-arịa n’onwe ya ya abụrụ onye ezinụlọ ya. Jizọs kụziiri anyị otú anyị ga-esi na-emeso ndị na-arịa ọrịa. Ịhụnanya o nwere n’ebe ha nọ mere ka o metere ha ebere. Mgbe ìgwè mmadụ kpọtaara ya ndị na-arịa ọrịa, ‘ọ gwọrọ ndị niile ahụ́ na-adịghị mma.’—Mat. 8:16; 14:14.

17 Taa, Ndị Kraịst enweghị ike iji ọrụ ebube gwọọ ọrịa ka Jizọs, ma, ha nwere ike inwe ọmịiko n’ahụ́ ndị ọrịa dị ka Jizọs mere. Olee otú ha si eme nke a? Dị ka ihe atụ, ndị okenye na-egosi na ha na-eṅomi Kraịst site n’ime ndokwa ka a na-aga enyere ndị na-arịa ọrịa aka, ha na-ahụkwa na a na-eme nke a. Ha si otú a na-eme ihe e dere na Matiu 25:39, 40. * (Gụọ.)

18. Olee otú ụmụnna nwaanyị abụọ si gosi otu nwanna nwaanyị na ha hụrụ ya n’anya, gịnịkwa si na nke a pụta?

18 N’ezie, ọ bụghị naanị ndị okenye kwesịrị inyere ndị ọzọ aka. Tụlee ihe banyere Charlene dị afọ iri anọ na anọ, bụ́ onye na-arịa ọrịa kansa, onye a gwara na ọ fọrọ ụbọchị iri ya anwụọ. Mgbe ụmụnna nwaanyị abụọ, bụ́ Sharon na Nicolette, hụrụ na ọ na-ara di Charlene ezigbo ahụ́ ilekọta ya, ha wepụtara onwe ha inyere ya aka mgbe niile ruo mgbe ọ ga-anwụ. O were izu isii tupu ya anwụọ, ma, ụmụnna nwaanyị abụọ a gosiri na ha hụrụ ya n’anya ruokwa mgbe ọ nwụrụ. Sharon kwuru, sị: “Ọ na-agbawa obi ma ị mara na onye ị na-elekọta agaghị agbake. Ma, Jehova kasiri anyị obi. Ihe a merenụ mere ka anyị na Jehova na ụmụnna anyị dịkwuo ná mma.” Di Charlene kwuru, sị: “M gaghị echefu otú ụmụnna nwaanyị abụọ a si jiri obiọma nyere anyị aka. Otú ha si jiri obi ọcha nyere m aka mere ka ọ dịrị ezigbo nwunye m bụ́ Charlene mfe idi ule ikpeazụ a bịaara ya, ha mekwara ka ihe dịrị m mfe. M gaghị echefu ha echefu. Otú ha si wepụta onwe ha nyere m aka mere ka okwukwe m sikwuo ike, meekwa ka m hụkwuo ụmụnna niile n’anya.”

19, 20. (a) Olee àgwà ise anyị tụlere n’ime àgwà dị iche iche Kraịst nwere? (b) Gịnị ka i kpebisiri ike ime?

19 N’isiokwu atọ a, anyị atụleela ise n’ime àgwà ndị Jizọs nwere nakwa otú anyị nwere ike isi na-eche echiche ka Jizọs ma na-eme ka ya. Ka anyị dịrị “nwayọọ, dịkwa umeala n’obi” ka Jizọs. (Mat. 11:29) Ka anyị gbaa mbọ jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ ihe ọbụna mgbe ha mere ihe nke na-egosi na ha ezughị okè. Ka anyị jiri obi ike na-eme ihe niile Jehova chọrọ, ọbụna mgbe ule bịaara anyị.

20 Ná nchịkọta, ka anyị hụ ụmụnna anyị niile n’anya “ruo ọgwụgwụ,” dị ka Kraịst mere. Ọ bụ ịhụnanya dị otú a ka e ji ama na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs n’ezie. (Jọn 13:1, 34, 35) “Ka ịhụnanya ụmụnna unu dịgide.” (Hib. 13:1) Akwụsịla ime nke a! Kpebisie ike ịnọgide na-eto Jehova ma na-enyere ndị ọzọ aka! Jehova ga-agọzi mbọ i ji ezi obi na-agba.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 17 Gụọ isiokwu bụ́ “Mee Ihe Karịrị Ịsị: ‘Nyaa Ọkụ, Rijuokwa Afọ,’” nke dị n’Ụlọ Nche May 15, 1987.

Ì Nwere Ike Ịkọwa?

• Olee otú ndị okenye nwere ike isi mee ka Kraịst mgbe ha na-emeso ndị mere ihe ọjọọ ihe?

• Olee ihe mere o ji dị mkpa, karịchaa n’oge ọgwụgwụ a, ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya dị ka Kraịst hụrụ ha?

• Olee otú anyị nwere ike isi na-emeso ndị na-arịa ọrịa ihe dị ka Kraịst si meso ha?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 17]

Ndị okenye chọrọ ka ndị mere mmehie lọghachikwute Jehova

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee otú Ndị Kraịst si na Jeruselem na-agbapụ si gosi na ha nwere ụdị echiche Kraịst nwere?

[Foto dị na peeji nke 19]

A ma na Ndịàmà Jehova hụrụ ndị ọzọ n’anya dị ka Kraịst