Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Bara Uru Na-enweghị Atụ
Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Bara Uru Na-enweghị Atụ
“Ana m agụ ihe niile n’ezie dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs.”—FIL. 3:8.
1, 2. Olee mkpebi Ndị Kraịst ụfọdụ merela, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
MALITE mgbe Robert dị obere, ọ na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe ọ dị naanị afọ asatọ, otu n’ime ndị nkụzi ha gara n’ụlọ ha wee gwa ya na o nweghị ihe ụbụrụ ya na-agaghị emeli. Ọ gwara ya na ya nwere olileanya na ọ ga-abụ dọkịta otu ụbọchị. Otú o si mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ kọleji mere ka o ruo eru ịga akwụkwọ n’otu n’ime mahadum ndị kacha mma n’ala ha. Ma, Robert hapụrụ ohere ahụ ọtụtụ ndị sịrị na ọ bụ ohere na-enweghị atụ, wee malite ọrụ ịsụ ụzọ oge niile.
2 Ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto na ndị nke torola eto na-enwe ohere yiri nke ahụ Robert nwere, ya bụ, ohere nke ga-eme ka ha nwee ọganihu n’ụwa a. Ụfọdụ n’ime ha na-ajụ ụdị ohere ahụ ka ha wee nwee ike ilekwasị anya nke ọma n’ife Jehova. (1 Kọr. 7:29-31) Gịnị na-eme ka Ndị Kraịst, dị ka Robert, nwee ike iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma? Ihe bụ́ isi mere ha ji eme nke a bụ na ha hụrụ Jehova n’anya, ghọtakwa uru na-enweghị atụ ihe Chineke na-akụziri ha bara. Ì chetụla echiche na nso nso a banyere otú ndụ gị gaara adị ma a sị na ị nataghị eziokwu a? Ọ bụrụ na anyị ana-echeta ụfọdụ n’ime ngọzi ndị pụrụ iche anyị nwerela n’ihi ihe Jehova na-akụziri anyị, anyị agaghị echefu uru ozi ọma anyị na-ezisa bara. Nke ahụ ga-emekwa ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ezisa ya.
Ndị Chineke Na-akụziri Ihe Nwere Nnukwu Ihe Ùgwù
3. Olee ihe mere anyị ji mara na Jehova nwere mmasị ịkụziri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe?
3 Jehova nwere mmasị ịkụziri ụmụ mmadụ na-ezughị okè ihe n’ihi ịdị mma ya. Aịzaya 54:13 buru amụma banyere Ndị Kraịst e tere mmadụ, sị: “Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Jehova kụziiri ihe, udo nke ụmụ gị ga-adịkwa ukwuu.” Amaokwu a na-emezukwa n’ahụ́ “atụrụ ọzọ” nke Kraịst. (Jọn 10:16) Anyị na-ahụ nke a n’otu n’ime amụma ndị na-emezu n’oge anyị a. Aịzaya hụrụ ndị si mba niile n’ọhụụ ka ha nuuru na-aga ife Jehova. O kwuru na ha na-agwarịta ibe ha, sị: “Ka anyị gbagoo n’ugwu Jehova, n’ụlọ Chineke nke Jekọb; ọ ga-akụziri anyị ụzọ ya, anyị ga-ejekwa ije n’ụzọ ya.” (Aịza. 2:1-3) N’ezie, ndị Chineke na-akụziri ihe nwere nnukwu ihe ùgwù.
4. Olee ihe Jehova chọrọ ka ndị ọ na-akụziri ihe na-eme?
4 Olee ihe anyị ga-eme iji ruo eru ịbụ ndị Chineke na-akụziri ihe? Ihe mbụ ga-eme ka mmadụ ruo eru bụ ya dịrị umeala n’obi, dịrịkwa njikere ịnabata ihe Chineke na-akụziri ya. Ọbụ abụ bụ́ Devid dere, sị: “Jehova dị mma, bụrụkwa onye ezi omume. . . . Ọ ga-ezikwa ndị dị umeala n’obi ụzọ ya.” (Ọma 25:8, 9) Jizọs kwukwara, sị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m enye gị otuto n’ihu ọha n’ihi na i zonahụwo ndị maara ihe na ndị nwere ọgụgụ isi ihe ndị a nke ọma ma kpugheere ha ụmụ ọhụrụ.” (Luk 10:21) Ọ̀ bụ na ịmara na Chineke “na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ” anaghị eme ka anyị hụ ya n’anya?—1 Pita 5:5.
5. Olee otú anyị si nwee ike ịmara Chineke?
5 Ọ̀ bụ n’ihi na ike anyị, bụ́ ndị ohu Jehova, ebuka ma ọ̀ bụkwanụ na anyị amaka ihe mere anyị ji chọta eziokwu? Mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị agaraghị amara Chineke n’onwe anyị ma a sị na e nyereghị anyị aka. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Jehova ji ozi ọma anyị na-ekwusa na mmụọ nsọ adọta ndị yiri atụrụ, bụ́ “ihe a na-achọsi ike nke mba niile.” (Hag. 2:7) Obi ọ́ dịghị gị ụtọ na i so ná ndị Jehova dọtara ka ha na-eso ụzọ Ọkpara ya?—Gụọ Jeremaya 9:23, 24.
Ihe Chineke Na-akụziri Anyị Na-agbanwe Ndụ
6. Olee mgbanwe na-enweghị atụ “ihe ọmụma Jehova” nwere ike ime ka ndị mmadụ mee ná ndụ ha?
6 Amụma Aịzaya ji ihe atụ mara mma gosi mgbanwe ndị mmadụ na-eme n’oge anyị a. Ndị na-emebu ihe ike aghọọla ndị na-eme udo. (Gụọ Aịzaya 11:6-9.) Ndị ha na ndị ọzọ bụbu ndị iro n’ihi na ha abụghị otu agbụrụ, otu mba, n’ihi na ha anaghị asụ otu asụsụ, ma ọ bụ n’ihi na omenala ha dị iche na nke ha, dịzi n’otu n’enweghị nsogbu. E nwere ike ikwu na ha ‘akpụgharịala mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè.’ (Aịza. 2:4) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka ndị mmadụ ji eme mgbanwe ndị a na-enweghị atụ? Ọ bụ n’ihi na ha enwetala “ihe ọmụma Jehova” ma na-eme ihe ha mụtara. N’agbanyeghị na ndị ohu Chineke ezughị okè, ha na ụmụnna ha ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa dị n’otu. Otú ozi ọma Alaeze si amasị ọtụtụ mmadụ n’ụwa niile nakwa mkpụrụ ọma ọ na-amịpụta na-egosi na ihe Chineke na-akụziri anyị bara uru na-enweghị atụ.—Mat. 11:19.
7, 8. (a) Olee ụfọdụ n’ime “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike,” bụ́ ndị ihe Chineke na-akụziri anyị merela ka ndị mmadụ merie? (b) Gịnị na-egosi na ihe Chineke na-akụziri anyị na-ewetara ya otuto?
7 Pọl onyeozi ji agha ime mmụọ tụnyere ozi ọma ndị ohu Chineke na-ezisa. Ọ dere, sị: “Ngwá agha anyị ji ebu agha abụghị nke anụ ahụ́, kama ọ bụ ihe Chineke mere ka ọ dị ike, nke e ji akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike. N’ihi na anyị na-akụghasị echiche na-ezighị ezi na ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.” (2 Kọr. 10:4, 5) Gịnị bụ ụfọdụ n’ime “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike,” bụ́ ndị ihe Chineke na-akụziri ndị mmadụ na-eme ka ha ghara imetụta ha? Ozizi ụgha, nkwenkwe ụgha, na nkà ihe ọmụma si n’aka ụmụ mmadụ, bụ naanị ole na ole n’ime ha. (Kọl. 2:8) Ihe Chineke na-akụziri ndị mmadụ na-eme ka ha kwụsị omume na-adịghị mma, meekwa ka ha na-akpa àgwà masịrị Chineke. (1 Kọr. 6:9-11) Ọ na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ. Ọ na-emekwa ka ndị na-enweghị olileanya malite inwe olileanya. Ọ bụ ụdị ihe ndị a ka e kwesịrị ịna-akụziri ndị mmadụ taa.
8 Otu n’ime àgwà nke Jehova na-enyere ndị mmadụ aka ịkpa bụ ịkwụwa aka ọtọ, dị ka akụkọ na-esonụ na-egosi. (Hib. 13:18) N’India, otu nwaanyị kwetara ka e duziwere ya ọmụmụ ihe ma mechaa ghọọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. O si ebe ọ gara ịrụ ọrụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-alọta otu ụbọchị wee hụ otu ihe olu ọlaedo, bụ́ nke ọnụ ego ya ruru ihe dị ka narị dọla asatọ, n’ebe dị nso n’ebe bọs na-akwụsị. N’agbanyeghị na ọ bụ ogbenye, o wegara ihe olu ahụ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii. Ọ dị onye uwe ojii nọ n’ebe ahụ ka ọ bụ na nrọ! Ka a nọtụrụ, onye uwe ojii ọzọ jụrụ ya, sị, “Olee ihe mere i wereghị ihe olu ahụ?” Ọ zara ya, sị, “Ihe m mụtara na Baịbụl emeela ka m gbanwee, ana m akwụwazi aka ọtọ.” Ihe a niile masịrị onye uwe ojii ahụ nke mere ka ọ gwa okenye ya na nwanna nwaanyị ahụ so bịa, sị: “E nwere ihe karịrị nde mmadụ iri atọ na asatọ na steeti a. Ọ ga-adị nnọọ mma ma ọ bụrụ na ị ga-enwe ike inyere mmadụ iri aka ka ha dị ka nwaanyị a.” Anyị kwesịrị inye Jehova otuto dị ukwuu ma anyị cheta nde kwuru nde ndị ihe Chineke na-akụziri ha merela ka ha gbanwee ndụ ha.
9. Olee ihe na-eme ka ndị mmadụ mee mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha?
9 Ike Baịbụl na-akpa n’ahụ́ ndị mmadụ nakwa aka Jehova ji mmụọ nsọ ya na-enyere ha na-eme ka ha mee mgbanwe dị ukwuu ná ndụ ha. (Rom 12:2; Gal. 5:22, 23) Ndị Kọlọsi 3:10 kwuru, sị: “Yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ, nke a na-esite n’ezi ihe ọmụma na-eme ka ọ dị ọhụrụ dị ka onyinyo nke Onye ahụ kere ya si dị.” Ihe dị n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, na-eme ka mmadụ mara ụdị onye yanwa bụ n’ezie, o nwekwara ike ịgbanwe otú onye ahụ si eche echiche nakwa otú o si ele ihe anya. (Gụọ Ndị Hibru 4:12.) Mmadụ nwere ike ịghọ enyi Chineke wee nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi ma onye ahụ mara ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma ma na-edebe iwu ezi omume dị iche iche Jehova nyere anyị.
Jehova Na-akwadebe Anyị Maka Ọdịnihu
10. (a) Gịnị mere o ji bụrụ naanị Jehova nwere ike ịkwadebe anyị maka ọdịnihu? (b) Olee ihe na-enweghị atụ nke ga-eme n’ụwa dum n’oge na-adịghị anya?
10 Ọ bụ naanị Jehova nwere ike inyere anyị aka ịkwadebe maka ọdịnihu n’ihi na ọ bụ naanị ya ma ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ọ na-ekpebi ihe ọdịnihu ụmụ mmadụ ga-abụ. (Aịza. 46:9, 10) Amụma Baịbụl kwuru na “oké ụbọchị Jehova dị nso.” (Zef. 1:14) Ihe Ilu 11:4 kwuru banyere ụbọchị ahụ ga-emezu. Ọ sịrị: “Ihe dị oké ọnụ ahịa agaghị aba uru n’ụbọchị oké iwe, ma, ọ bụ ezi omume ga-anapụta mmadụ n’ọnwụ.” Mgbe Jehova ga-eme ụwa Setan ihe o kpere n’ikpe, ihe ga-azọ anyị bụ adịm ná mma anyị na Chineke. Ego agaghị azọ anyị. N’ezie, Ezikiel 7:19 sịrị: “N’okporo ámá ka ha ga-atụfu ọlaọcha ha, ihe na-asọ oyi ka ọlaedo ha ga-aghọkwa.” Ịmara nke a ga-eme ka anyị mee ihe anyị kwesịrị ime ugbu a.
11. Olee otu n’ime ụzọ ihe Chineke na-akụziri anyị si akwadebe anyị maka ọdịnihu?
11 Otu n’ime ụzọ pụrụ iche ihe Chineke na-akụziri anyị si akwadebe anyị maka ọbịbịa ụbọchị ya bụ ime ka anyị bute ihe ndị ka mkpa ná ndụ anyị ụzọ. Pọl onyeozi degaara Timoti akwụkwọ ozi, sị: “Na-enye ndị bara ọgaranya n’usoro ihe dị ugbu a iwu ka ha ghara inwe anya dị elu, ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ.” Ọ bụrụgodị na anyị abaghị ọgaranya, anyị ga-erite uru ná ndụmọdụ a si n’ike mmụọ nsọ. Gịnị ka nke a pụtara? Kama ịnọ na-akpakọba akụnụba, anyị ga-agba mbọ “na-arụ ọrụ ọma” ma “bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ.” Ọ bụrụ na anyị na-ebute ije ozi Jehova ụzọ ná ndụ anyị, anyị ‘na-atọrọ onwe anyị ezi ntọala maka ọdịnihu.’ (1 Tim. 6:17-19) Onye si otú a wepụta onwe ya wee na-ejere Jehova ozi na-egosi na ya na-eche echiche nke ọma n’ihi na Jizọs sịrị, “olee uru ọ ga-abara mmadụ ma ọ bụrụ na o rite ụwa dum n’uru ma tụfuo mkpụrụ obi ya?” (Mat. 16:26, 27) Ebe ọ bụ na ụbọchị Jehova dị nso, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ebee ka m na-akpakọba akụ̀? Abụ m ohu Chineke ka ọ̀ bụ nke Akụnụba?’—Mat. 6:19, 20, 24.
12. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịda mba ma ọ bụrụ na ndị ụfọdụ na-eleda ozi anyị anya?
12 Ọrụ kacha mkpa ‘n’ọrụ ọma’ niile Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha na-arụ bụ ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze na nke ime ndị na-eso ụzọ, bụ́ ọrụ na-azọpụta ndụ ndị mmadụ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Ndị ụfọdụ nwere ike ịna-eleda ozi ọma anyị na-ezisa anya, dị ka ụfọdụ ndị mere na narị afọ mbụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 1:18-21.) Ma, nke ahụ anaghị eme ka ozi anyị ghara ịba uru, ma ọ bụkwanụ mee ka inye onye ọ bụla ohere ikwere n’ozi ọma a tupu ụbọchị Chineke abịa ghara ịdị mkpa. (Rom 10:13, 14) Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị ọzọ aka irite uru n’ihe Chineke na-akụziri anyị, anyị ga-enweta ọtụtụ ngọzi.
Jehova Na-agọzi Ndị Wepụtara Onwe Ha Na-ejere Ya Ozi
13. Olee ihe ndị Pọl onyeozi leghaara anya n’ihi izisa ozi ọma?
13 Tupu Pọl onyeozi aghọọ Onye Kraịst, a nọ na-azụ ya otú ọ ga-esi bụrụ nnukwu mmadụ n’okpukpe ndị Juu. Mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na atọ, o si n’obodo ya, bụ́ Tasọs, gaa Jeruselem ka otu nwoke a na-anakwanyere ùgwù nke ukwuu nke na-akụzi Iwu, onye aha ya bụ́ Gameliel, kụziwere ya ihe. (Ọrụ 22:3) Ka oge na-aga, Pọl malitere ịgbapụ iche ná ndị ibe ya niile. A sị na o jidere aka ahụ o ji, ọ gaara abụ onye a ma ama n’okpukpe ndị Juu. (Gal. 1:13, 14) Mgbe ọ nabatara ozi ọma Alaeze Chineke wee malite izisa ya, ọ hapụrụ ihe ahụ dum. Pọl ọ̀ kwara ụta maka ihe ndị ahụ ọ hapụrụ? Mba. N’ezie, o dere, sị: “Ana m agụ ihe niile n’ezie dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m bara. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe niile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu.”—Fil. 3:8.
14, 15. Olee ngọzi anyị na-enwe n’ihi na “anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ”?
14 Dị ka Pọl mere, Ndị Kraịst na-eleghara ihe dị iche iche anya taa n’ihi izisa ozi ọma. (Mak 10:29, 30) Ò nwere ihe na-akọ anyị n’ihi na anyị leghaara ihe ndị ahụ anya? Robert, onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite, kwuru uche ọtụtụ ndị, mgbe ọ sịrị: “Anaghị m akwa ụta ọ bụla. Ozi oge niile emeela ka m nwee ọṅụ na afọ ojuju, o mekwaala ka m ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ Mgbe ọ bụla m leghaara ihe nke ụwa anya wee jee ozi Jehova, ọ na-eji ihe karịrị ihe ahụ m leghaara anya agọzi m. Ọ na-adị ka a ga-asị na o nweghị ihe m leghaara anya. M na-enweta mmaji kwuru mmaji!”—Ọma 34:8; Ilu 10:22.
15 Ọ bụrụ na ị malitela ije ozi ọma na ịmụrụ ndị mmadụ ihe, ị ga-edetụkwa Jehova ire wee hụ na ọ dị mma. Ọ̀ dịla mgbe ị na-ezi ozi ọma wee chọpụta na mmụọ Jehova nyeere gị aka? Ọ̀ dịla mgbe ndị ị na-ezi ozi ọma nwere obi ụtọ n’ihi na Jehova meghere obi ha ha ewee gee ntị n’ozi ọma ị na-ezi ha? (Ọrụ 16:14) Ọ̀ dịla mgbe Jehova nyeere gị aka imeri nsogbu, ikekwe, nke ahụ emee ka ị mụbaa ozi gị? Ọ̀ dịla mgbe o nyeere gị aka n’oge ihe siiri gị ike, nke mere ka ị nọgide na-efe ya n’agbanyeghị na i chere na ike adịkwaghị gị ife ya? (Fil. 4:13) Mgbe ọ bụla Jehova nyeere anyị aka n’ozi anyị, ọ na-edokwu anyị anya na ọ nọnyeere anyị nakwa na anyị na ya dị ná mma. (Aịza. 41:10) Mmadụ ‘na Chineke ịrụkọ ọrụ’ n’ọrụ a magburu onwe ya Chineke ji akụziri ndị mmadụ ihe, bụ ngọzi n’ezie.—1 Kọr. 3:9.
16. Olee otú obi na-adị gị n’ihi mbọ ị na-agba nakwa n’ihi ihe ndị ọzọ i leghaara anya iji nwee ike ịkụziri ndị mmadụ banyere Jehova?
16 Ọtụtụ ndị nwere olileanya n’oge ndụ ha na ha ga-arụpụta ọkpụrụkpụ ihe ga-adịte aka. N’ụwa taa, anyị ma na ọ naghị adị anya e chefuo ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ ndị mmadụ rụrụ. Ma, o doro anya na a gaghị echefu ọrụ dị iche iche ndị ohu Jehova na-arụ taa iji doo aha ya nsọ. A ga na-echeta ọrụ ndị a ruo mgbe ebighị ebi. (Ilu 10:7; Hib. 6:10) Ka anyị jiri ihe ùgwù e nyere anyị, ya bụ, ịkụziri ndị mmadụ banyere Jehova, bụ́ ọrụ a na-agaghị echefu echefu, kpọrọ ihe.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Olee ihe Jehova chọrọ ka ndị ọ na-akụziri ihe na-eme?
• Olee otú ihe Chineke na-akụziri anyị si agbanwe ndụ ndị mmadụ?
• Olee ngọzi ndị anyị nwere maka na anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha rite uru n’ihe Chineke na-akụziri anyị?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị Jehova na-akụziri ihe na ụmụnna ha ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa niile dị n’otu
[Foto dị na peeji nke 24]
Ọ̀ bụ na mmadụ ‘na Chineke ịrụkọ ọrụ’ abụghị ngọzi?