Na-erube Isi Ka Jizọs, Nweekwa Obi Ike Ka Ya
Na-erube Isi Ka Jizọs, Nweekwa Obi Ike Ka Ya
“Nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”—JỌN 16:33.
1. Olee otú Jizọs si rubere Chineke isi n’ihe niile?
JIZỌS KRAỊST na-eme uche Chineke mgbe niile. E nweghị mgbe o chetụrụ n’echiche inupụrụ Nna ya nke eluigwe isi. (Jọn 4:34; Hib. 7:26) Ma, ule ndị o nwetara mgbe ọ bịara n’ụwa emeghị ka ọ dịrị ya mfe irube isi. Malite mgbe Jizọs bidoro ije ozi ọma n’ụwa, ndị iro ya, gụnyere Setan, ji mmanye na aghụghọ gbalịa ime ka ọ kwụsị ime uche Nna ya. (Mat. 4:1-11; Luk 20:20-25) Ndị iro a mere ka Jizọs nwee ihe mgbu dị ukwuu. Ha mechara kpọgbuo ya n’osisi ịta ahụhụ. (Mat. 26:37, 38; Luk 22:44; Jọn 19:1, 17, 18) N’agbanyeghị ahụhụ niile Jizọs tara, o ‘rubere isi ruo ọnwụ.’—Gụọ Ndị Filipaị 2:8.
2, 3. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si rube isi n’agbanyeghị ahụhụ ndị ọ tara?
2 Ahụhụ Jizọs tara n’ụwa kụziiri ya otú mmadụ ga-esi erube isi n’agbanyeghị na ọ na-ata ahụhụ. (Hib. 5:8) O nwere ike iyi ka Jizọs ọ̀ mụtachaala ihe niile banyere ijere Jehova ozi. A sị kwuwe, ya na Jehova anọọla ọtụtụ ijeri afọ, ọ bụkwa “onye ọkà ọrụ” Chineke mgbe a na-eke ụwa. (Ilu 8:30) N’agbanyeghị nke a, otú o si tachie obi mgbe ọ tara ahụhụ n’ụwa gosiri na okwukwe ya bụ a kwaa akwụrụ. Ihe ndị a mere ka Jizọs, bụ́ Ọkpara Chineke, na Nna ya dịkwuo ná mma. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị mere ya?
3 N’agbanyeghị na Jizọs zuru okè, ọ gbalịghị irube isi n’ike onwe ya. O kpekuru Chineke ekpere ka o nyere ya aka irube isi. (Gụọ Ndị Hibru 5:7.) Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-erube isi, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi, kwesịkwa ịna-ekpeku Chineke ekpere. Ọ bụ nke a mere Pọl onyeozi ji dụọ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara,” bụ́ onye “wedara onwe ya ala wee rube isi ruo ọnwụ.” (Fil. 2:5-8) Ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ gosiri na ụmụ mmadụ nwere ike irubere Chineke isi n’agbanyeghị na ha bi n’ụwa ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na mmadụ nwere ike ikwu na nke Jizọs bụ na o zuru okè, oleekwanụ banyere ụmụ mmadụ ndị dị ka anyị?
Ndị Rubere Isi n’Agbanyeghị na Ha Ezughị Okè
4. Olee ihe otú Jehova si kee anyị ka anyị nwee ike ịna-ahọrọ ihe masịrị anyị chọrọ anyị n’aka?
4 Chineke kere Adam na Iv nye ha amamihe, o kekwara ha otú ha ga-enwe ike ịhọrọ ihe masịrị ha. Anyị onwe anyị, bụ́ ụmụ ha, nwekwaara onwe anyị ịhọrọ ihe masịrị anyị. Gịnị ka nke a pụtara? Ọ pụtara na anyị nwere ike ikpebi ime ihe ziri ezi ma ọ bụ ime ihe na-ezighị ezi. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, Chineke mere ka anyị nwere onwe anyị ikpebi ma ànyị ga-erubere ya isi ma ọ bụ na anyị agaghị erubere ya. Ma, anyị ga-aza ajụjụ banyere ihe anyị họọrọ ime. N’ezie, ihe ndị anyị họọrọ ime nwere ike ime ka anyị dị ndụ ma ọ bụ kpatara anyị ọnwụ. Ha na-emetụtakwa ndị nọ anyị nso.
5. Olee ihe anyị na ya na-agba mgba, oleekwa otú anyị ga-esi emeri ya?
5 Ọ naghị adịrị anyị mfe irube isi n’ihi na anyị ezughị okè. Ọ naghị adịcha mfe ime ihe Chineke nyere n’iwu. Ọ dịkwaraghị Pọl mfe. O dere, sị: “Ana m ahụ n’ahụ́ m iwu ọzọ nke na-alụso iwu nke uche m agha, na-adọrọkwa m n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị n’ahụ́ m.” (Rom 7:23) N’ezie, ọ na-adịrị anyị mfe irube isi mgbe ime otú ahụ na-agaghị esiri anyị ike ma ọ bụ mgbe ọ na-enweghị ihe ọ ga-efu anyị. Ma, gịnị ka anyị na-eme mgbe anyị chọrọ irube isi ma “ọchịchọ nke anụ ahụ́ na ọchịchọ nke anya” anyị achọghị? Ọ bụ ezughị okè na “mmụọ nke ụwa,” nke juru ebe niile, na-eme ka anyị na-enwe ọchịchị ndị a, ọchịchọ ndị a sikwara ike. (1 Jọn 2:16; 1 Kọr. 2:12) Ọ bụrụ na anyị achọghị inwe ọchịchọ ndị a, anyị aghaghị ‘idozi obi anyị’ tupu anyị enwewe ihe isi ike, ma ọ bụ tupu ọnwụnwa abịara anyị, ma kpebisie ike na anyị ga-erubere Jehova isi n’agbanyeghị ihe bịara anyị. (Ọma 78:8) E nwere ọtụtụ ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, bụ́ ndị rubeere Jehova isi n’ihi na ha doziri obi ha.—Ezra 7:10; Dan. 1:8.
6, 7. Nye ihe atụ otú ọmụmụ ihe onwe onye nwere ike isi nyere anyị aka ịhọrọ ime ihe ziri ezi.
6 Otu n’ime ụzọ ndị anyị si edozi obi anyị bụ ịmụchi Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl anya. Were ya na ọ bụ gị ka ihe na-esonụ mere. Ka e were ya na ị chọrọ ịmụ ihe ná mgbede i ji enwe ọmụmụ ihe onwe onye. I kpeela ekpere ka mmụọ Jehova nyere gị aka ime ihe ị na-amụta na Baịbụl. E nwekwaranụ fim ị chọrọ ile na tiivi ná mgbede echi. E kwuola na fim ahụ dị mma, ma, ị ma na e nwetụrụ ebe a na-eme omume rụrụ arụ na ihe ike na ya.
7 I chetara ihe Pọl dụrụ n’ọdụ ná Ndị Efesọs 5:3. Ọ sịrị: “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu, dị nnọọ ka o kwesịrị ndị nsọ.” I chetakwara ndụmọdụ Pọl nyere ná Ndị Filipaị 4:8. (Gụọ.) Ka ị na-atụgharị ihe ndị a Baịbụl kwuru n’uche, gị ajụọ onwe gị sị, ‘Ọ bụrụ na mụ amara ụma lee fim ahụ, àna m erubere Chineke isi n’ihe niile dị ka Jizọs mere?’ Gịnị ka ị ga-eme? Ị̀ ka ga-ele fim ahụ?
8. Gịnị mere anyị ekwesịghị ileghara ihe Jehova kwuru banyere omume anya?
8 Ọ ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị ilegharatụ iwu Jehova anya, ikekwe na-eche na anyị dị ike, na o nweghị ihe mkpakọrịta ọjọọ ga-eme anyị, a sịgodị na mkpakọrịta ọjọọ ahụ metụtara ihe ntụrụndụ ndị na-egosi ime ihe ike na omume rụrụ arụ. Kama ichewe otú a, anyị kwesịrị ichebe onwe anyị na ụmụ anyị ka Setan ghara inweta anyị. Dị nnọọ ka mmadụ na-agbasi mbọ ike ka ọ ghara ibute ọrịa na-efe efe, anyị kwesịkwara ịkpachara anya ka anyị wee chebe onwe anyị ka Setan ghara iji “atụmatụ aghụghọ” ya nweta anyị.—Efe. 6:11.
9. N’ihi gịnị ka anyị ga-eji kpebisie ike kwa ụbọchị irubere Jehova isi?
9 Kwa ụbọchị, anyị aghaghị ịhọrọ ma ànyị ga-eme uche Jehova ma ọ bụ na anyị agaghị eme ya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị, anyị aghaghị ịna-erubere Chineke isi ma na-eme ihe kwekọrọ n’iwu ya ziri ezi. Ọ bụrụ na anyị erube isi “ruo ọnwụ,” dị ka Kraịst mere, anyị na-egosi na okwukwe anyị siri ike. Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ n’ihi na anyị na-erubere ya isi. Jizọs kwere nkwa, sị: “Onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.” (Mat. 24:13) N’ezie, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị, anyị aghaghị inwe obi ike ka Jizọs.—Ọma 31:24.
Jizọs—Onye Kacha Nwee Obi Ike
10. Olee ihe ndị anyị na ha na-alụ, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime?
10 Ebe ndị na-akpa àgwà ọjọọ n’ụwa gbara anyị gburugburu, obi ike dị anyị mkpa ka anyị ghara ịdị ka ha. E nwere ọtụtụ ihe ndị nwere ike ime ka Ndị Kraịst mebie iwu Jehova. Ha gụnyere, ndị na-eme omume ọjọọ, nsogbu ego, na ndị na-anaghị efe Chineke. Ọtụtụ ndị ka ndị ezinụlọ ha na-emegide. Ná mba ụfọdụ, a na-akụzi n’ọtụtụ ụlọ akwụkwọ na mmadụ si n’enwe pụta, e nwekwaala ọtụtụ ndị sị na ha ekweghị na Chineke dị. Anyị agaghị agbachi ihe ndị a nkịtị. Anyị ga-emerịrị ihe wee chebe onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị achọghị ịdị ka ha. Jizọs gosiri anyị otú anyị ga-esi mee nke a.
11. Olee otú ịtụgharị uche n’ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ nwere ike isi nyere anyị aka inwekwu obi ike?
11 Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.” (Jọn 16:33) O kweghị ka ụwa mebie ya. O kweghị ka ụwa mee ka ọ kwụsị ikwusa ozi ọma ma ọ bụ mee ka o tinye aka n’ofufe ụgha ma ọ bụ mewe omume na-ezighị ezi, anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ụwa duhie anyị. Jizọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha abụghị nke ụwa, dị nnọọ ka m na-abụghị nke ụwa.” (Jọn 17:16) Ịmụ banyere obi ike Kraịst nwere na ịtụgharị ya n’uche nwere ike ime ka anyị nwee obi ike dị anyị mkpa iji dịrị iche n’ụwa.
Si n’Aka Jizọs Mụta Inwe Obi Ike
12-14. Nye ihe atụ ndị gosiri na Jizọs nwere obi ike.
12 Jizọs nwere nnọọ obi ike n’oge o jere ozi n’ụwa. N’ihi ikike o nwere maka na ọ bụ Ọkpara Chineke, o ji obi ike “banye n’ime ụlọ nsọ ma chụpụ ndị niile na-ere ma na-azụ ahịa n’ime ụlọ nsọ ahụ, o kpukwara tebụl nke ndị na-agbanwe ego na oche nke ndị na-ere nduru ihu.” (Mat. 21:12) Mgbe ndị agha bịara ijide Jizọs n’abalị bọtara ụbọchị ahụ e gburu ya, o ji obi ike pụta ichebe ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ọ bụ m ka unu na-achọ, hapụnụ ndị a ka ha laa.” (Jọn 18:8) O mechara gwa Pita ka ọ mịghachi mma ya n’ọbọ. Nke a gosiri na ọ bụ Jehova bụ obi ike Jizọs, ọ bụghị ngwá agha.—Jọn 18:11.
13 Jizọs ji obi ike gbaa ndị ozizi ụgha na-ahụghị ndị mmadụ n’anya na ozizi ụgha ha n’anwụ. Jizọs gwara ha, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! n’ihi na unu na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu ndị mmadụ . . . unu na-eleghara ihe ndị ka mkpa n’Iwu ahụ anya, ya bụ, ikpe ziri ezi na ebere na ikwesị ntụkwasị obi. . . . Unu na-eme ka azụ iko na efere dị ọcha, ma ime ha jupụtara n’ihe e bukọọrọ n’ike na imefe ihe ókè.” (Mat. 23:13, 23, 25) Ụdị obi ike a dịkwa ndị na-eso ụzọ Jizọs mkpa n’ihi na ndị ndú okpukpe ụgha ga-akpagbu ha ma gbuo ụfọdụ n’ime ha.—Mat. 23:34; 24:9.
14 Jizọs jikwa obi ike gwa ndị mmụọ ọjọọ okwu. E nwere mgbe o zutere otu nwoke mmụọ ọjọọ ji, onye siri nnọọ ike nke na o nweghị onye na-enwe ike eke ya agbụ ígwè. Ụjọ atụghị Jizọs, ọ chụpụrụ ọtụtụ ndị mmụọ ọjọọ ji nwoke ahụ. (Mak 5:1-13) Chineke enyeghị Ndị Kraịst ike taa ịrụ ọrụ ebube. Ma, anyị na-eji ozi ọma nke anyị na-ekwusa alụso Setan agha, bụ́ onye merela “ka uche ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì.” (2 Kọr. 4:4) Dị ka ọ dị na nke Jizọs, ngwá agha anyị “abụghị nke anụ ahụ́, kama ọ bụ ihe Chineke mere ka ọ dị ike, nke e ji akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike,” ya bụ, ozizi okpukpe ụgha ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike. (2 Kọr. 10:4) Ọ bụrụ na anyị ejiri ngwá agha ime mmụọ ndị a na-alụ agha, anyị na-egosi na anyị mụtara nnukwu ihe n’aka Jizọs.
15. Olee ihe mere Jizọs ji nwee obi ike?
15 Ihe mere Jizọs ji nwee obi ike abụghị n’ihi na ọ na-aka anya, kama, ọ bụ n’ihi na o nwere okwukwe. Otú ahụkwa ka o kwesịrị ịdị anyị. (Mak 4:40) Olee otú anyị nwere ike isi nwee ezigbo okwukwe? Ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ nwekwara ike inyere anyị aka ime nke a. Ọ ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma, kwerekwa n’ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru. Ngwá agha Jizọs ji lụso ndị iro ya ọgụ abụghị mma agha nkịtị, kama, ọ bụ mma agha ime mmụọ, ya bụ, Okwu Chineke. Ọtụtụ mgbe, o gosiri na ihe ọ kụziri sitere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-asịkarị “E dere, sị,” ya bụ, e dere ya n’Okwu Chineke, * mgbe ọ na-amalite ikwu okwu.
16. Olee otú anyị nwere ike isi nwekwuo okwukwe?
16 Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri ule ndị na-abịara onye ọ bụla na-eso ụzọ Jizọs, anyị aghaghị ịna-agụ ma na-amụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Ihe ndị a ga-enyere anyị aka ịmụta eziokwu nke ga-eme ka okwukwe anyị sie Rom 10:17) Anyị ga na-atụgharịkwa uche n’ihe anyị na-amụta, kwere ka ọ bamie n’obi anyị. Ọ bụ naanị mgbe anyị nwere okwukwe siri ike ka anyị ga-enwe ike iji obi ike na-eme ihe. (Jems 2:17) Anyị ga na-ekpekwa ekpere maka mmụọ nsọ n’ihi na okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Gal. 5:22.
ike. (17, 18. Olee otú otu nwa agbọghọ bụ́ Onye Kraịst si gosi na ya nwere obi ike n’ụlọ akwụkwọ?
17 Otu nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ́ Kitty chọpụtara otú okwukwe siri ike si enyere mmadụ aka inwe obi ike. Malite mgbe ọ dị obere, ọ matara na “ihere ozi ọma ahụ” ekwesịghị ime ya n’ụlọ akwụkwọ, ọ gụsikwara ya agụụ ike izi ụmụ akwụkwọ ibe ya ozi ọma. (Rom 1:16) Kwa afọ, ọ na-ekpebi na ya ga-ezi ndị ọzọ ozi ọma, ma obi anaghị aka ya ime otú ahụ. Ka oge na-aga, ọ gafere ụlọ akwụkwọ ọzọ. O kpebiri, sị: “Agaghị m ekwe ka ihe ọ bụla ọzọ gbochie m izi ndị ọzọ ozi ọma.” Kitty kpere ekpere ka Jehova nyere ya aka inwe obi ike ka Kraịst, ka o mee ka ya dị akọ, meekwa ka ya nweta onye ya nwere ike izi ozi ọma.
18 N’ụbọchị mbụ a malitere akwụkwọ, a gwara ụmụ akwụkwọ niile ka ha kọwaa onwe ha n’otu n’otu. Ọtụtụ ndị kwuru aha okpukpe ha ma kwuo na ha anaghị agachi okpukpe ha anya. Kitty chọpụtara na nke a bụ ohere o kpere ekpere maka ya. Mgbe o ruru ya, o ji obi ike kwuo, sị: “Abụ m Onyeàmà Jehova, ọ bụ Baịbụl na-agwa m otú m ga-esi na-efe Chineke.” Ka ọ na-ekwu na-aga, ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe ya nọ na-arọ ya anya. Ma, ndị ọzọ gere ya ntị ma mechaa jụọ ya ajụjụ. Onye nkụzi ha na-ejidị Kitty ama atụ onye ji okpukpe ya kpọrọ ihe. Obi dị Kitty ụtọ nke ukwuu na ya mụtara inwe obi ike ka Jizọs.
Nwee Okwukwe na Obi Ike Ka Kraịst
19. (a) Gịnị ka inwe ezigbo okwukwe gụnyere? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi Jehova ṅụrịa?
19 Ndịozi chọpụtakwara na ọ bụ okwukwe ga-eme ka ha jiri obi ike na-eme ihe. Ha rịọrọ Jizọs, sị: “Nyekwuo anyị okwukwe.” (Gụọ Luk 17:5, 6.) Inwe okwukwe siri ike karịrị ikwere na Chineke dị. Ọ pụtara na anyị na ya ga-adị n’ezigbo mma, ụdị adịm ná mma na-adị n’etiti obere nwa na nna ya hụrụ ya n’anya ma nwee obiọma. Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Nwa m, ọ bụrụ na obi gị amara ihe, obi m ga-aṅụrị ọṅụ, ee, obi nke m. Akụrụ m ga-enwekwa aṅụrị mgbe egbugbere ọnụ gị na-ekwu ihe ziri ezi.” (Ilu 23:15, 16) N’otu aka ahụ, Jehova na-aṅụrị ọṅụ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi ike mee ihe ziri ezi, nke a ga-emekwa ka anyị nwekwuo obi ike. N’ihi ya, ka anyị na-eṅomi Jizọs mgbe niile, jiri obi ike na-eme ihe ziri ezi!
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 15 Dị ka ihe atụ, gụọ Matiu 4:4, 7, 10; 11:10; 21:13; 26:31; Mak 9:13; 14:27; Luk 24:46; Jọn 6:45; 8:17.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-erube isi n’agbanyeghị na anyị ezughị okè?
• Gịnị ga-eme ka anyị nwee okwukwe siri ike, oleekwa otú nke a ga-esi nyere anyị aka inwe obi ike?
• Gịnị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-erube isi, nweekwa obi ike ka Kraịst?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 13]
Ị̀ ‘na-edozi obi gị’ iji merie ọnwụnwa?
[Foto dị na peeji nke 15]
Okwukwe nwere ike inyere anyị aka inwe obi ike, dị ka o nyeere Jizọs