Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Gbanyere “Mgbọrọgwụ ma Guzosie Ike na Ntọala Ahụ”?

Ị̀ Gbanyere “Mgbọrọgwụ ma Guzosie Ike na Ntọala Ahụ”?

Ị̀ Gbanyere “Mgbọrọgwụ ma Guzosie Ike na Ntọala Ahụ”?

Ị̀ HỤTỤLA ebe oké ifufe na-enugharị nnukwu osisi? Ọ naghị emere nnukwu osisi ebere, ma, ịkwatu ya na-ara ya ahụ́. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala. Anyị nwere ike ịdị ka nnukwu osisi. Ọ bụrụ na nnukwu ọnwụnwa abịara anyị, anyị nwere ike ịkwụsi ike ma anyị “gbanye mgbọrọgwụ ma guzosie ike na ntọala ahụ.” (Efe. 3:14-17) Gịnị bụ ntọala ahụ?

Baịbụl sịrị na “Kraịst Jizọs n’onwe ya bụ nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala” ọgbakọ Ndị Kraịst. (Efe. 2:20; 1 Kọr. 3:11) A gbara anyị bụ́ Ndị Kraịst ume ka anyị na-eje ‘ije dị ka ndị ha na ya dị n’otu, bụrụ ndị gbanyere mgbọrọgwụ n’ime ya, ndị a na-ewulikwa elu n’ime ya, ndị a na-eme ka ha gbasie ike n’okwukwe.’ Ọ bụrụ na anyị emee otú a, anyị ga-emerili ọnwụnwa ọ bụla nwere ike imetụ okwukwe anyị aka, nke gụnyere “arụmụka ire ụtọ,” nke bụ́ “aghụghọ efu” ụmụ mmadụ na-aghọ.—Kọl. 2:4-8.

“Ịdị Obosara na Ịdị Ogologo na Ịdị Elu na Ịdị Omimi”

Ma, olee otú anyị nwere ike isi “gbanye mgbọrọgwụ” ma “gbasie ike n’okwukwe”? Otu n’ime ụzọ ndị anyị nwere ike isi gbanyesie mgbọrọgwụ ike n’ala ihe atụ ahụ bụ ịmụsi Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee ike. Jehova chọrọ ka anyị “jiri uche ghọta ihe bụ́ ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke eziokwu dị na Baịbụl. (Efe. 3:18) Ya mere, ọ dịghị Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị inwe afọ ojuju n’ihi na ọ ma naanị ihe ole na ole dị n’Okwu Chineke, ya bụ, “ihe ndị mbụ,” dị na ya. (Hib. 5:12; 6:1) Kama nke ahụ, o kwesịrị ịna-enu onye ọ bụla n’ime anyị enu ịghọtakwu eziokwu dị na Baịbụl.—Ilu 2:1-5.

Ma, nke ahụ apụtaghị na naanị ihe dị anyị mkpa iji “gbanye mgbọrọgwụ ma guzosie ike” n’eziokwu bụ nnukwu amamihe. A sị kwuwe, Setan ma ihe dị na Baịbụl. Ọ bụghị naanị ihe dị na Baịbụl ka anyị kwesịrị ịma. Anyị kwesịrị “ịmara ịhụnanya nke Kraịst bụ́ nke karịrị ihe ọmụma.” (Efe. 3:19) Ma, ọ bụrụ na anyị na-amụ ihe n’ihi na anyị hụrụ Jehova na eziokwu dị na Baịbụl n’anya, anyị ga-enwekwu amamihe, bụ́ nke ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike.—Kọl. 2:2.

Legodị Ma Ị Ma Ihe Ndị A

Legodị ma ị ma ole na ole n’ime eziokwu ndị dị mkpa dị na Baịbụl. Ime otú ahụ nwere ike ime ka ị na-amụchikwu ihe anya. Dị ka ihe atụ, gụọ amaokwu ndị malitere akwụkwọ ozi Pọl onyeozi degaara Ndị Efesọs. (Gụọ igbe bụ́  “Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs.”) Ị gụchaa amaokwu ndị ahụ, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ ghọtara ihe dị n’amaokwu ndị a, bụ́ ndị e ji aka akwụkwọ dị iche dee n’igbe a?’ Ka anyị tụlee ha otu otu.

A Họpụtara Anyị “Tupu A Tọọ Ntọala Ụwa”

Pọl degaara ụmụnna ya akwụkwọ ozi, sị: “[Chineke] họpụtara anyị tupu oge eruo ka o doo anyị dị ka ụmụ nye onwe ya site n’aka Jizọs Kraịst.” Jehova kpebiri na ya ga-eme ka ụmụ mmadụ ụfọdụ soro n’ezinụlọ ya zuru okè nke dị n’eluigwe. Ndị a Chineke doro ka ha bụrụ ụmụ ya ga-eso Kraịst bụrụ ndị eze na ndị nchụàjà. (Rom 8:19-23; Mkpu. 5:9, 10) Mgbe Setan kwuru n’ogige Iden na otú Jehova si achị adịghị mma, o kwuru ihe na-egosi na ụmụ mmadụ nwere ntụpọ. Ọ bụ ya mere o ji kwesị nnọọ ekwesị na Jehova si n’ụmụ mmadụ họrọ ndị ga-eso kpochapụ ihe ọjọọ dị n’ụwa, bibiekwa onye kpatara ihe ọjọọ niile, bụ́ Setan Ekwensu. Ma, Jehova ebughị ụzọ kpebie onye ọ ga-edo ịbụ nwa ya tupu a mụọ onye ahụ. Kama nke ahụ, Chineke kpebiri na a ga-enwe ụmụ mmadụ ndị ha na Kraịst ga-abụ ndị eze n’eluigwe.—Mkp. 14:3, 4.

Olee “ụwa” Pọl bu n’obi mgbe o degaara ụmụnna ya akwụkwọ ozi wee gwa ha na a họọrọ ha “tupu a tọọ ntọala ụwa”? Ihe o bu n’obi abụghị na a họọrọ ha tupu Chineke ekee ụwa ma ọ bụ ụmụ mmadụ. Nke ahụ agaghị abụ ikpe ziri ezi. Olee otú a ga-esi maa Adam na Iv ikpe ma ọ bụrụ na Chineke bu ụzọ kpebie tupu ya ekee ha na ha ga-eme mmehie? Oleezi mgbe Chineke kpebiri otú ọ ga-esi mezie ihe mebiri mgbe Adam na Iv na Setan nupụụrụ ọchịchị ya isi? Jehova kpebiri nke a mgbe Adam na Iv nupụụrụ ya isi, ya bụ, tupu a mụọ ụmụ mmadụ na-ezughị okè bụ́ ndị ruru eru ịbụ ndị a ga-agbapụta.

“Dị Ka Obiọma Ya Dị Ukwuu nke Na-erughịrị Mmadụ Si Dị”

Gịnị mere Pọl ji kwuo na Chineke mere ndokwa ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị malitere akwụkwọ Ndị Efesọs n’ihi “obiọma ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ”? O kwuru nke a iji gosi na ọ dịghị onye Jehova ji ụgwọ ịnapụta ndị mmehie.

Ọ dịghị onye n’ime anyị ruru ka Chineke gbapụta ya. Ma, nnukwu ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ụmụ mmadụ nọ mere ka o mee ndokwa pụrụ iche iji gbapụta anyị. Anyị cheta na anyị bụ ndị na-ezughị okè na ndị mmehie, anyị amara na mgbagha adịghị n’ihe ahụ Pọl kwuru mgbe ọ sịrị na mgbapụta a gbapụtara anyị bụ obiọma na-erughịrị anyị.

Ihe Nzuzo Dị Nsọ nke Nzube Chineke

Ná mmalite, Chineke emeghị ka ndị mmadụ mara otú ọ ga-esi dozie ihe Setan mebiri. Ọ bụ ‘ihe nzuzo dị nsọ.’ (Efe. 3:4, 5) Ka oge na-aga, mgbe ọgbakọ Ndị Kraịst malitere, Jehova mere ka a mara otú ọ ga-esi mezuo ihe o zubeere ụmụ mmadụ na ụwa mgbe o kere ha. Pọl kwuru na Chineke malitere “ilekọta ihe mgbe oge ahụ a kara aka zuru,” bụ́ nke ga-eme ka a chịkọta mmadụ niile ọnụ.

Agba nke mbụ nke nchịkọta ahụ bidoro na Pentikọst nke 33 O.A., bụ́ mgbe Jehova malitere ịchịkọta ndị ha na Kraịst ga-abụ ndị eze n’eluigwe. (Ọrụ 1:13-15; 2:1-4) Agba nke abụọ bụ nchịkọta nke ndị ga-ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs, bụ́ mgbe Alaeze Mesaya nke dị n’aka Kraịst ga na-achị ụwa. (Mkpu. 7:14-17; 21:1-5) Okwu ahụ bụ́ “ilekọta ihe” anaghị ekwu banyere Alaeze Mesaya, ebe ọ bụ na e guzobeghị Alaeze ahụ tupu afọ 1914. Kama nke ahụ, okwu ahụ na-ekwu banyere otú Chineke ga-esi mee ihe iji mezuo ihe o zubere iji mee ka mmadụ niile dị n’otu.

Bụrụ Dimkpa n’Ike Ịghọta Ihe”

O doro anya na inwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ga-enyere gị aka ịghọtazu “ịdị obosara na ịdị ogologo na ịdị elu na ịdị omimi” nke eziokwu dị na Baịbụl. O dokwara anya na ọ bụrụ na anyị anaghị enwe ohere, Setan nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ma ọ bụkwanụ mee ka anyị kwụsị inwe ya enwe. Ekwela ka o mee nke a. Jiri “ikike inwe nghọta” Chineke nyere gị ghọọ “dimkpa n’ike ịghọta ihe.” (1 Jọn 5:20; 1 Kọr. 14:20) Gbaa mbọ mara ihe mere i ji kwere ihe ọ bụla i kweere, gbaakwa mbọ mgbe niile ka i nwee ike ikwu ‘ihe mere i ji nwee olileanya ahụ i nwere.’—1 Pita 3:15.

Ọ bụrụ na ị nọ n’Efesọs mgbe mbụ a gụrụ akwụkwọ ozi Pọl, ihe dị na ya ọ́ garaghị eme ka ị chọọ inwe ‘ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke’? (Efe. 4:13, 14) Ọ gaara eme. Ya mere, ka ihe ahụ Pọl ji ike mmụọ nsọ dee mee ka i mee otu ihe ahụ okwu ya mere ka ndị mmadụ mee n’oge ahụ. Ịhụ Jehova n’anya nke ukwuu na ịmara nke bụ́ eziokwu banyere Okwu ya ga-enyere gị aka ‘ịgbanyesi mgbọrọgwụ ike ma guzosie ike na ntọala ahụ’ bụ́ Kraịst. Nke a ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa ọ bụla Setan ga-ewetara gị tupu ọgwụgwụ nke ụwa ọjọọ a eruo.—Ọma 1:1-3; Jer. 17:7, 8.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 27]

 “Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Efesọs”

“Ka Chineke na Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụrụ onye a gọziri agọzi, n’ihi na o jiriwo ngọzi niile nke mmụọ nsọ gọzie anyị n’ebe ndị dị n’eluigwe n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst, dị nnọọ ka ọ họọrọ anyị ka anyị na Kraịst dịrị n’otu tupu a tọọ ntọala ụwa, ka anyị wee dị nsọ, gharakwa inwe mmerụ n’ihu ya n’ihi ịhụnanya. N’ihi na ọ họpụtara anyị tupu oge eruo ka o doo anyị dị ka ụmụ nye onwe ya site n’aka Jizọs Kraịst, dị ka o si dị ya ezi mma n’uche, ka e wee too ya n’ihi obiọma ya na-erughịrị mmadụ nke dị ebube bụ́ nke o ji obiọma meere anyị site n’aka onye ọ hụrụ n’anya. E si n’aka ya jiri ihe mgbapụta tọhapụ anyị, site n’ọbara nke onye ahụ, ee, mgbaghara nke njehie anyị, dị ka obiọma ya dị ukwuu nke na-erughịrị mmadụ si dị. O mere ka nke a jupụta n’ebe anyị nọ n’amamihe na ezi uche niile, ebe o mere ka anyị mara ihe nzuzo dị nsọ nke uche ya. Ihe nzuzo a bụ dị ka ihe dị ya ụtọ si dị bụ́ nke o zubere n’ime onwe ya maka ilekọta ihe mgbe oge ahụ a kara aka zuru, ya bụ, ịchịkọtaghachi ihe niile n’ime Kraịst, ihe ndị dị n’eluigwe na ihe ndị dị n’ụwa.”—Efe. 1:3-10.