Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Wepụtala Oge Ị Ga-eji Na-amụ Ihe?

Ì Wepụtala Oge Ị Ga-eji Na-amụ Ihe?

Ì Wepụtala Oge Ị Ga-eji Na-amụ Ihe?

N’AFỌ gara aga, Òtù Na-achị Isi mara ọkwa na a gbanweela oge e ji enwe ọmụmụ ihe n’ọgbakọ ka ezinụlọ wee nwekwuo ohere ha ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ ma na-anọkọ ọnụ. Ọ bụrụ na ị bụ onyeisi ezinụlọ, hụ na gị na nwunye gị na ụmụ gị na-amụ ihe ndị metụtara mkpa ezinụlọ unu, nakwa na unu na-amụchi ya anya. Di na nwunye na-amụbeghị ụmụ kwesịrị iji oge a na-amụkọ ihe ọnụ. Ụmụnna ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, bụ́ ndị na-enwebeghị ezinụlọ ha na-elekọta, ga-enwe ike iji oge a na-enwe ọmụmụ ihe.

Ọtụtụ ndị ekeleela Òtù Na-achị Isi maka ndokwa a e mere ka e nwee mgbede a ga-eji na-enwe Ofufe Ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, otu okenye aha ya bụ́ Kevin dere banyere ọgbakọ ha, sị: “Anyị amaghị otú ọzọ ka mma anyị ga-esi kelee Òtù Na-achị Isi karịa ịsị naanị ‘unu emeela.’ Anyị bụ́ ndị okenye ekwurịtala otú anyị si eji mgbede a na-eme ihe Òtù Na-achị Isi ji wepụta ya, ya bụ, iji ya na-enwe ọmụmụ ihe ezinụlọ.”

Jodi, bụ́ onye di ya bụ okenye, dere, sị: “Anyị mụrụ ụmụ nwaanyị atọ, otu dị afọ iri na ise, nke ọzọ dị afọ iri na otu, nke atọ adịrị afọ abụọ. Ọ dịbeghị anya anyị gafere n’ọgbakọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. Ịkwadebe ọmụmụ ihe niile na-ewe oge, chọọkwa mgbalị. Kemgbe e mere ndokwa a, anyị enwekwuola oge anyị ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ!”

John na JoAnn, bụ́ di na nwunye na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ, dere, sị: “Anyị anaghị enwechibu ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị anya n’ihi na anyị na-agba mbọ ma ànyị ga na-enwe ya n’agbata oge ọmụmụ ihe ọgbakọ dị iche iche. Ndokwa ọhụrụ a bụ onyinye si n’aka Jehova, bụ́ nke na-eme ka anyị na ya dịkwuo ná mma ma ọ bụrụ na anyị ejiri oge a na-eme ihe e ji wepụta ya.”

Tony, bụ́ nwanna nwoke na-alụbeghị nwaanyị, onye dị afọ iri abụọ na ụma, wepụtara mgbede Tuesday maka ọmụmụ ihe onwe onye. Ọ na-eji oge ndị ọzọ e nwere n’izu akwadebe maka ọmụmụ ihe ọgbakọ. Ma, Tony kwuru, sị: “Ọ na-agụ m ka ụbọchị Tuesday ruwe eruwe.” N’ihi gịnị? “Ọ bụ n’ihi na mgbede ụbọchị ahụ bụ oge pụrụ iche mụ na Jehova ji anọkọ.” Tony kwukwara, sị: “M na-eji ihe dị ka awa abụọ amụ isiokwu ndị na-eme ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. Inwekwu oge maka ọmụmụ ihe na-eme ka m na-atụgharị uche n’amaokwu Baịbụl ndị m gụrụ.” Gịnị ka nke a rụpụtara? Ọ sịrị “Ndụmọdụ Jehova na-enye na-erukwu m n’obi ugbu a karịa mgbe mbụ.” Dị ka ihe atụ, “N’akwụkwọ Insight, agụtara m otú Devid na Jọnatan si bụrụ enyi. Amụtara m nnukwu ihe banyere otú Jọnatan si bụrụ onye na-anaghị achọ naanị ọdịmma ya. Ihe nlereanya ya nyeere m aka ịghọtakwu otú m ga-esi bụrụ ezigbo enyi. M na-atụsi anya ike ịmụtakwu ihe ndị bara uru otú a ná mgbede Tuesday ọ bụla!”

O doro anya na ndị ohu Jehova niile ga-erite uru dị ukwuu ma ọ bụrụ na ha ejiri oge a e wepụtara na-amụ Baịbụl ma na-enwe ofufe ezinụlọ.