Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị ka Ilu 24:27 na-akụziri anyị?

Onye dere akwụkwọ Ilu nyere nwa okorobịa ndụmọdụ, sị: “Kwadebe ọrụ gị n’èzí, kwadebekwara ya onwe gị n’ubi. E mesịa, wulitekwa ezinụlọ gị.” Gịnị ka ilu a si n’ike mmụọ nsọ pụtara? Ọ pụtara na nwoke nke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ịma ihe dị n’ịlụ nwaanyị ka o wee kwadebe nke ọma tupu ya alụọ nwaanyị wee nwee ezinụlọ nke ya.

E nwere mgbe anyị na-ekwu na amaokwu a pụtara na ọ bụghị naanị na nwoke bụ́ di, bụrụkwa nna, aghaghị ịna-arụsi ọrụ ike iji kpata ihe ezinụlọ ya na-eri, kamakwa na ọ ga na-arụsi ọrụ ike iji mee ka ezinụlọ ya sie ike n’okwukwe site n’iji Baịbụl na-agba ha ume. N’agbanyeghị na nke ahụ dị mma ma bụrụ ihe Akwụkwọ Nsọ na-agba anyị ume ka anyị na-eme, o yiri ka ọ bụchaghị ihe amaokwu a na-ekwu. Gịnị ka anyị ji kwuo otú a? Tụlee ihe abụọ mere anyị ji kwuo otú a.

Nke mbụ bụ na iwulite ezinụlọ amaokwu a kwuru okwu ya abụghị mmadụ ịgba ezinụlọ o nwerela enwe ume, ma ọ bụkwanụ ime ka okwukwe ha sie ike. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe yiri iwu ụlọ. Okwu e si na ya sụgharịta ‘wulite’ nwekwara ike ịbụ ihe e ji mee ihe atụ iwulite ezinụlọ, ma ọ bụ ịmalite ya, ya bụ, ịlụ nwaanyị na ịmụ ụmụ.

Nke abụọ bụ na amaokwu a na-ekwu banyere ime ihe n’usoro, nke dị ka ịsị mmadụ, “Buru ụzọ mee nke a; i mechaa ya, i mee nke ọzọ.” Ọ̀ pụtaziri na ilu a na-ekwu na mmadụ kwesịrị ibu ụzọ chụta ihe anụ ahụ́ tupu ya ekwuwe okwu banyere Chineke? Mbanụ!

N’oge ochie, ọ bụrụ na nwoke achọọ ‘iwulite ezinụlọ ya,’ ya bụ, ọ chọọ inwe ezinụlọ site n’ịlụ nwaanyị, o kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Àdị m njikere ilekọta nwunye m na ụmụ ndị anyị nwere ike ịmụ?’ Tupu ya enwee ezinụlọ, o kwesịrị inwe ugbo nke ya. Ya mere, otú e si sụgharịa ya ná nsụgharị bụ́ Today’s English Version bụ: “Ewula ụlọ gị, amalitekwala ezinụlọ gị ruo mgbe i wetawara ihe n’ubi gị, bụ́ mgbe o doro gị anya na ị ga-akpatali ihe ị ga-eri.” Ndụmọdụ a ọ̀ gbasara anyị taa?

Ee. Nwoke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ịkwadebe nke ọma. O kwesịrị ịna-arụ ọrụ ma ọ bụrụ na o nweghị ihe na-eme ya. Ma, ihe nwoke ji arụsi ọrụ ike ekwesịghị ịbụ naanị iji nye ndị ezinụlọ ya ihe na-akpa anụ ahụ́ ha. Baịbụl kwuru na nwoke nke na-anaghị enye ndị ezinụlọ ya ihe na-akpa anụ ahụ́ ha ma ọ bụ nke na-anaghị emere ha ihe ga na-eme ha obi ụtọ ma ọ bụkwanụ nke na-anaghị akụziri ha Okwu Chineke, ka onye na-ekweghị ekwe njọ! (1 Tim. 5:8) Ya mere, nwa okorobịa nke na-akwadebe ịlụ nwaanyị na inwe ezinụlọ nke ya kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ jikerela nke ọma ịna-enye ndị ezinụlọ m ihe ga na-akpa anụ ahụ́ ha? M̀ dị njikere ibutere ezinụlọ m ụzọ n’ihe ndị metụtara ofufe? M̀ ga-enwe ike iwepụta oge ka mụ na nwunye m na ụmụ m na-amụ ihe mgbe niile?’ Baịbụl kwusiri okwu ike banyere ọrụ a dị mkpa.—Diut. 6:6-8; Efe. 6:4.

Ya mere, nwa okorobịa ọ bụla nke chọrọ ịlụ nwaanyị kwesịrị ichebara ihe ahụ dị n’Ilu 24:27 echiche nke ọma. Nwa agbọghọ kwesịkwara ịjụ onwe ya ma ọ̀ dịkwa njikere ịrụ ọrụ nwunye na nne na-arụ. Ndị lụrụ ọhụrụ kwesịkwara ịjụ onwe ha ajụjụ ndị yiri ndị a tupu ha amalite ịmụ ụmụ. (Luk 14:28) Ọ bụrụ na ndị Chineke anabata ntụziaka a sitere n’ike mmụọ nsọ, ha agaghị enwe ọtụtụ nsogbu, udo ga-adịkwa n’ezinụlọ ha.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 12]

Olee ajụjụ ndị nwa okorobịa kwesịrị ịjụ onwe ya banyere alụmdi na nwunye?