Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”

“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”

“Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Unu Na-anụ Ọkụ n’Obi”

“Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme. Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi. Bụrụnụ ndị ohu Jehova.”—ROM 12:11.

1. Gịnị mere ndị Izrel ji jiri ụmụ anụmanụ na ihe ndị ọzọ na-achụ àjà n’oge ochie?

OBI na-adị Jehova ụtọ maka àjà ndị ohu ya ji obi ha dum na-achụ iji gosi na ha hụrụ ya n’anya nakwa na ha na-erubere ya isi. N’oge ochie, ọ na-anara àjà dị iche iche e ji ụmụ anụmanụ na-achụrụ ya, na-anarakwa àjà ndị ọzọ. Ndị Izrel chụrụ àjà ndị a dị ka Iwu Mozis si gwa ha, ha mere nke a iji rịọ Jehova mgbaghara ma ọ bụkwanụ iji kelee ya maka ihe o meere ha. N’ọgbakọ Ndị Kraịst, Jehova achọghị ka anyị jiri ụmụ anụmanụ na-achụ àjà. Ma, ihe Pọl dere n’isi iri na abụọ nke akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom gosiri na e nwere ụdị àjà a ka chọrọ ka anyị na-achụ. Ka anyị tụlee otú anyị ga-esi na-achụ àjà ahụ.

Àjà Dị Ndụ

2. Olee ụdị ndụ anyị bụ́ Ndị Kraịst na-ebi, gịnị ka nke a gụnyere?

2 Gụọ Ndị Rom 12:1, 2. Ná mmalite akwụkwọ ozi nke Pọl degaara ndị Rom, o mere ka o doo anya na ọ bụ Onye Kraịst e tere mmanụ bụ́ onye Juu ma ọ bụ onye nke bụ́ onye Jentaịl, ka Chineke ga-akpọ onye ezi omume n’ihi okwukwe o nwere, ọ bụghị n’ihi na ọ na-arụ ọrụ nke iwu. (Rom 1:16; 3:20-24) Pọl kwuru n’isi iri na abụọ nke akwụkwọ ozi ahụ na Ndị Kraịst kwesịrị igosi na ha na-ekele Chineke site n’ibi ndụ na-egosi na ha ji onwe ha chụọ àjà. Iji mee nke a, anyị kwesịrị ime ka uche anyị dị ọhụrụ. Ezughị okè anyị ketara n’aka Adam emeela ka ‘iwu nke mmehie na nke ọnwụ’ na-achị anyị. (Rom 8:2) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime “ka ike nke na-eduzi uche [anyị] dị ọhụrụ,” site n’ịgbanwe ọchịchọ anyị kpamkpam. (Efe. 4:23) Ọ bụ naanị Chineke na mmụọ ya ga-enyere anyị aka ime mgbanwe a. Nke a chọkwara ka anyị jiri ‘ike iche echiche’ anyị na-agbasi mbọ ike. Ọ pụtara na anyị ga-eme ike anyị niile ka anyị ghara ịna-eme “omume dị ka usoro ihe nke a si dị,” ya bụ, ka anyị zere omume rụrụ arụ, ntụrụndụ rụrụ arụ, na echiche na-ezighị ezi.—Efe. 2:1-3.

3. Gịnị mere anyị ji eme ihe dị iche iche Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme?

3 Pọl gwakwara anyị ka anyị jiri ‘ike iche echiche’ chọpụta n’onwe anyị ihe “bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” Gịnị mere anyị ji agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-atụgharị uche n’ihe anyị na-agụ, na-ekpe ekpere, na-aga ọmụmụ ihe, na-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke? Ọ̀ bụ n’ihi na ndị okenye na-agba anyị ume ka anyị na-eme ihe ndị a? Ọ bụ ezie na obi dị anyị ụtọ na ndị okenye na-agba anyị ume site n’oge ruo n’oge, ma, ọ bụ mmụọ Chineke na-eme ka anyị na-eme ihe dị iche iche Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme, bụ́ ndị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu. Ihe ọzọkwa bụ na anyị chọpụtara n’onwe anyị na Chineke chọrọ ka anyị na-eme ihe ndị ahụ. (Zek. 4:6; Efe. 5:10) Ọ na-enye anyị nnukwu ọṅụ na afọ ojuju ịmata na ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ otú ezigbo Ndị Kraịst kwesịrị isi na-ebi, anyị na Chineke ga-adị ná mma.

Onyinye Dị Iche Iche

4, 5. Olee otú ndị okenye ọgbakọ kwesịrị isi jiri onyinye ha na-eje ozi?

4 Gụọ Ndị Rom 12:6-8, 11. Pọl kwuru na “anyị nwere onyinye dị iche iche dị ka obiọma na-erughịrị mmadụ nke e nyere anyị si dị.” Ụfọdụ n’ime onyinye ndị Pọl kwuru okwu ha, ndị dị ka inye ndụmọdụ na idu ndú, kacha gbasa ndị okenye ọgbakọ, bụ́ ndị e nyere ndụmọdụ ka ha “jiri ezi ịdị ọkụ n’obi na-edu ndú.”

5 Pọl kwukwara na ndị nlekọta ọgbakọ kwesịrị iji otu ịdị ọkụ n’obi ahụ na-ezi ihe ma ‘na-eje ozi.’ Ihe ndị ọzọ Pọl kwuru okwu ha ná Ndị Rom isi iri na abụọ yiri ka hà na-egosi na “ozi” o kwuru okwu ya bụ nke a na-eje n’ọgbakọ, ya bụ, “n’otu ahụ́.” (Rom 12:4, 5) Ozi ahụ yiri nke e kwukwara okwu ya n’Ọrụ 6:4, bụ́ ebe ndịozi kwuru, sị: “Anyị onwe anyị ga-anọgidesi ike n’ikpe ekpere, na-ejekwa ozi banyere okwu Chineke.” Gịnị ka ozi ahụ gụnyere? Ndị okenye ọgbakọ na-eji onyinye e nyere ha eme ka okwukwe ndị nọ n’ọgbakọ sie ike. Ha ‘na-eje ozi’ ma ọ bụrụ na ha ejiri ezi ịdị ọkụ n’obi na-elekọta ọgbakọ, jiri Okwu Chineke na-ezi ha ihe, na-amụsi ihe ike, na-emekwa nchọnchọ n’akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Ndị nlekọta ọgbakọ kwesịrị iji “mgbasapụ ihu” na nlezianya jiri onyinye ha na-elekọta atụrụ Chineke.—Rom 12:7, 8; 1 Pita 5:1-3.

6. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ihe a dụrụ anyị n’ọdụ nke dị ná Ndị Rom 12:11, bụ́ ebe isiokwu a anyị na-amụ dabeere?

6 Pọl sịkwara: “Unu adịla umengwụ n’ihe unu na-eme. Ka mmụọ Chineke mee ka unu na-anụ ọkụ n’obi. Bụrụnụ ndị ohu Jehova.” Ọ bụrụ na anyị achọpụta na anyị ejighịzi ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi anyị, ka anyị gbanwee otú anyị si amụ ihe, ka anyị na-ekpechikwu ekpere anya ma na-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, bụ́ nke ga-eme ka anyị kwụsị ịda mba n’ozi anyị ma maliteghachi ịnụ ọkụ n’obi. (Luk 11:9, 13; Mkpu. 2:4; 3:14, 15, 19) Mmụọ nsọ nyere Ndị Kraịst oge ochie obi ike ikwu “ihe ndị dị ebube nke Chineke.” (Ọrụ 2:4, 11) Ọ ga-emekwa ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi.

Obi Umeala

7. Gịnị mere anyị ji kwesị iji obi umeala na-ejere Jehova ozi?

7 Gụọ Ndị Rom 12:3, 16. Onyinye ọ bụla anyị nwere bụ n’ihi ‘obiọma na-erughịrị mmadụ’ nke Jehova nwere n’ebe anyị nọ. Pọl kwuru n’ebe ọzọ, sị: “Ọ bụ Chineke na-eme ka anyị ruo eru nke ọma.” (2 Kọr. 3:5) N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-eto onwe anyị. Anyị kwesịrị iji obi umeala kweta na ihe ọma ọ bụla anyị rụpụtara n’ozi anyị bụ ngọzi si n’aka Chineke, ọ bụghị n’ihi na anyị amaka ihe. (1 Kọr. 3:6, 7) Ọ bụ nke a mere Pọl ji kwuo, sị: “Ana m agwa onye ọ bụla n’etiti unu n’ebe ahụ ka ọ ghara iche banyere onwe ya karịa ka o kwesịrị iche.” Mmadụ inwe ùgwù na ọṅụ na afọ ojuju n’ozi anyị na-ejere Jehova dị mma. Ma, ọ bụrụ na anyị dị obi umeala, ya bụ, ọ bụrụ na anyị amara otú ike anyị hà, anyị agaghị abụ ndị na-anaghị anabata echiche ndị ọzọ. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị ịna-eche “echiche iji nwee uche zuru okè.”

8. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị wee ghara inwe “uche n’anya onwe [anyị]”?

8 Ọ ga-abụrụ anyị iberiibe ma anyị jiri ihe anyị na-arụpụta n’ozi anyị na-etu ọnụ. ‘Ọ bụ Chineke na-eme ka o too.’ (1 Kọr. 3:7) Pọl kwuru na Chineke nyere onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ “okwukwe.” Kama ibuli onwe anyị elu, anyị kwesịrị inwe obi ụtọ n’ihe ndị ọzọ na-arụpụta n’ozi anyị dị ka okwukwe Chineke nyere ha si dị. Pọl sịkwara: “Na-elenụ ndị ọzọ anya otú unu si ele onwe unu.” N’akwụkwọ ozi ọzọ onyeozi ahụ dere, ọ gwara anyị ka anyị “ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.” (Fil. 2:3) Tupu anyị ekweta na ụmụnna anyị karịrị anyị, anyị aghaghị ịgbasi mbọ ike dịrị obi umeala. Ịdị obi umeala ga-eme ka anyị ghara inwe “uche n’anya onwe [anyị].” Ọ bụ ezie na ihe ùgwù ndị pụrụ iche nwere ike ime ka ụfọdụ n’ime anyị bụrụ ndị a ma ama, ma, anyị niile ga-enwe ọṅụ ma anyị na-arụ ọrụ “ndị dị ala,” ya bụ, ọrụ ndị dị ala nke ndị mmadụ na-eleda anya.—1 Pita 5:5.

Otú Ọgbakọ Si Dịrị n’Otu

9. Gịnị mere Pọl ji jiri Ndị Kraịst a mụrụ site na mmụọ nsọ tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche?

9 Gụọ Ndị Rom 12:4, 5, 9, 10. Pọl ji Ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị na-eje ozi n’okpuru Onyeisi ha bụ́ Kraịst, tụnyere akụkụ ahụ́ dị iche iche. (Kọl. 1:18) O chetaara Ndị Kraịst e tere mmanụ na ahụ́ nwere ọtụtụ akụkụ, bụ́ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche, nakwa na ha niile “bụ otu ahụ́ n’ime Kraịst, ọ bụ ezie na [ha] dị ọtụtụ.” Pọl gbakwara Ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’Efesọs ume, sị: “Ka anyị site n’ịhụnanya tolite n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi, ya bụ, Kraịst. Ọ bụ site n’aka ya ka ahụ́ dum, site n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa, dị ka ịrụ ọrụ nke akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu si dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.”—Efe. 4:15, 16.

10. Olee ndị “atụrụ ọzọ” kwesịrị ịna-erubere isi?

10 N’agbanyeghị na “atụrụ ọzọ” esoghị n’ahụ́ Kraịst, ha nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’ihe atụ a. (Jọn 10:16) Pọl kwuru na Jehova doro “ihe niile n’okpuru ụkwụ [Jizọs], meekwa ya onyeisi nke ihe niile n’ihi ọgbakọ ya.” (Efe. 1:22) Taa, atụrụ ọzọ so ‘n’ihe niile’ ahụ Jehova doro n’okpuru Ọkpara ya. Ha sokwa n’ihe Kraịst “nwere,” bụ́ nke o nyere “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche,” ka ọ na-elekọta. (Mat. 24:45-47) N’ihi ya, ndị nwere olileanya iketa ụwa kwesịrị ikweta na Kraịst bụ Onyeisi ha, ha kwesịkwara irubere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na Òtù Na-achị Isi na-anọchite anya ya isi, rubekwara ndị ikom a họpụtara ka ha na-elekọta ọgbakọ. (Hib. 13:7, 17) Nke a so n’ihe na-eme ka Ndị Kraịst dị n’otu.

11. Na gịnị ka ịdị n’otu anyị hiwere isi, oleekwa ndụmọdụ ọzọ Pọl nyere anyị?

11 Ọ bụ ịhụnanya, bụ́ “nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu,” mere ka Ndị Kraịst dịrị n’otu. (Kọl. 3:14) Pọl mere ka nke a pụta ìhè ná Ndị Rom isi iri na abụọ, bụ́ ebe o kwuru na ịhụnanya anyị ekwesịghị “ịbụ nke ihu abụọ” nakwa na anyị kwesịrị inwe ‘obi ọmịiko n’ebe ibe anyị nọ’ “n’ịhụnanya ụmụnna.” Nke a na-eme ka anyị na-akwanyere ibe anyị ùgwù. Onyeozi ahụ sịrị: “N’inye ibe unu nsọpụrụ, na-ebutenụ ụzọ.” Ma, ịhụnanya anyị ekwesịghị ịgabiga ókè. Anyị kwesịrị ime ike anyị niile iji dewe ọgbakọ ọcha. Mgbe Pọl nyere ndụmọdụ banyere ịhụnanya, ọ sịrị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.”

Ile Ọbịa

12. A bịa n’ile ọbịa, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Ndị Kraịst nọ na Masedonia oge ochie?

12 Gụọ Ndị Rom 12:13. Ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ ga-eme ka anyị na-enye “ndị nsọ ihe dị ka mkpa ha si dị” nakwa dị ka ike anyị hà. Ọ bụrụgodị na anyị abụghị ndị ọgaranya, anyị nwere ike inyetụ ndị ọzọ ihe anyị nwere. Pọl dere banyere Ndị Kraịst nọ na Masedonia, sị: “N’oge ha nọ ná mmekpa ahụ́ n’ihi oké ule ha nọ na ya, ọṅụ dị ukwuu ha nwere kpaliri ha igosi na ha bara ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ site n’oké mmesapụ aka ha, n’agbanyeghị na ha dara ogbenye nke ukwuu. N’ihi na dị ka ike ha hà n’ezie, ee, m na-agba akaebe na nke a bụ karịa otú ike ha hà n’ezie. Ha onwe ha rịọsiri anyị arịrịọ ike dị ka ha kpebiri n’onwe ha, ka anyị kwe ka ha nwee ihe ùgwù nke iji obiọma na-enye ihe, ka ha kerekwa òkè n’ozi a na-ejere ndị nsọ [nọ na Judia].” (2 Kọr. 8:2-4) N’agbanyeghị na Ndị Kraịst nọ na Masedonia abụghị ndị ọgaranya, ha na-emesapụ aka. Inye ụmụnna ha ndị ihe na-esiri ike nọ na Judia ihe, bụ ihe ùgwù n’anya ha.

13. Gịnị ka ‘ile ọbịa’ pụtara?

13 Okwu Grik e si sụgharịta “na-elenụ ọbịa” pụtara mmadụ ime ihe n’echeghị ka a gwa ya agwa. Otú e si dee ya ná nsụgharị bụ́ The New Jerusalem Bible bụ “na-achọ otú ị ga-esi na-ele ndị ọzọ ọbịa.” Mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ile onye ọzọ ọbịa site n’ịkpọ ya ka ọ bịa n’ụlọ ya rie nri, nke a dị mma ma ọ bụrụ ịhụnanya ka e ji mee ya. Ma, ọ bụrụ na ọ na-amasị anyị ile ọbịa, anyị ga-ahụ ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ anyị ga-esi na-ele ndị ọzọ ọbịa. Ọ bụrụ na aka anyị erughị isi nnukwu nri, anyị nwere ike iji mmanya ọtọ bịrịbịrị ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ọzọ lee ndị ọzọ ọbịa.

14. (a) Gịnị ka okwu Grik e si sụgharịta ‘ile ọbịa’ pụtara? (b) Mgbe anyị na-eje ozi ọma, olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-eche banyere ndị na-anaghị anụ asụsụ anyị?

14 Otu anyị si ele ọbịa na-egosi ihe anyị na-eche banyere ndị ọzọ. Okwu Grik abụọ e si sụgharịta ‘ile ọbịa’ pụtara “ịhụnanya” na “onye mmadụ na-amabughị.” Olee otú anyị si emeso ndị anyị na-amabughị ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ? Ndị Kraịst, bụ́ ndị na-agba mbọ na-amụ asụsụ ọzọ ka ha wee jiri ya na-ezi ndị ala ọzọ kwatara n’ókèala ha ozi ọma, na-ele ọbịa nke ọma. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọnọdụ ọtụtụ n’ime anyị nọ na ya agaghị ekwe anyị ịmụ asụsụ ọzọ. Ma, anyị niile nwere ike inyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka dị ukwuu site n’iji akwụkwọ bụ́ Good News for People of All Nations, bụ́ nke e dere n’ọtụtụ asụsụ, na-ezi ha ozi ọma. Ojiji i ji akwụkwọ a eje ozi ọma ọ̀ rụpụtala ezigbo ihe?

Ka Ihe Banyere Ndị Ọzọ Na-emetụ Anyị n’Obi

15. Olee otú Jizọs si mee ihe ahụ a dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme, bụ́ nke dị ná Ndị Rom 12:15?

15 Gụọ Ndị Rom 12:15. Isi ihe Pọl na-ekwu n’amaokwu a bụ ka ọnọdụ ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi. Anyị kwesịrị ịghọta mgbe ndị ọzọ na-enwe ọṅụ, ma ọ bụkwanụ mgbe ihe na-ewute ha, ma sonyere ha. Ọ bụrụ na mmụọ Chineke na-eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi, anyị ga-esoro ndị ọzọ nwee ọṅụ mgbe ha na-enwe ọṅụ ma ọ bụkwanụ metere ha ebere mgbe ihe na-ewute ha. Mgbe mmadụ iri asaa, bụ́ ndị na-eso ụzọ Kraịst, ji ọṅụ lọta ozi ọma wee kọọrọ ya ọrụ ọma niile ha rụrụ, o “nwere oké ọṅụ n’ime mmụọ nsọ.” (Luk 10:17-21) Jizọs so ha ṅụrịa ọṅụ. O ‘sokwa ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá’ mgbe enyi ya bụ́ Lazarọs nwụrụ.—Jọn 11:32-35.

16. Olee otú anyị ga-esi gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi, oleekwa ndị ihe banyere ndị ọzọ kwesịrị ịna-emetụ n’obi karịchaa?

16 Anyị kwesịrị iṅomi Jizọs, bụ́ onye ọnọdụ ndị ọzọ na-emetụ n’obi. Mgbe nwanna anyị na-aṅụrị ọṅụ, anyị kwesịrị iso ya na-aṅụrị ọṅụ. Anyị kwesịkwara inwe mwute ma ọ bụrụ na o nwere ihe na-ewute ya. Ọtụtụ mgbe, anyị nwere ike ịkasi nwanna anyị ihe na-ewute obi ma ọ bụrụ na anyị emedaa obi gee ya ntị nke ọma. Mgbe ụfọdụ, ihe ọ na-agwa anyị nwere ike imetụ anyị n’ahụ́ nke ukwuu nke na anyị na-amalite ibe ákwá. (1 Pita 1:22) Ndị okenye, karịchaa, kwesịrị ịṅa ntị na ndụmọdụ ahụ Pọl nyere anyị bụ́ ka ọnọdụ ndị ọzọ na-emetụ anyị n’obi.

17. Gịnị ka anyị mụrụla ná Ndị Rom isi iri na abụọ, gịnịkwa ka anyị ga-amụ n’isiokwu na-esonụ?

17 Amaokwu ndị anyị tụlerela ná Ndị Rom isi iri na abụọ enyela anyị ndụmọdụ banyere otú anyị ga-esi na-ebi ndụ nakwa otú anyị na ụmụnna anyị ga-esi na-emekọrịta ihe. N’isiokwu na-esonụ, anyị ga-atụle amaokwu ndị fọdụrụ ná Ndị Rom isi iri na abụọ, bụ́ ndị na-ekwu otú anyị kwesịrị isi na-ele ndị na-abụghị Ndịàmà anya nakwa otú anyị ga-esi na-emeso ha ihe, tinyere ndị na-emegide anyị na ndị na-akpagbu anyị.

Ntụleghachi

• Olee otú anyị si egosi na ‘mmụọ Chineke na-eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi’?

• Gịnị mere anyị ji kwesị iji obi umeala na-efe Chineke?

• Olee otú anyị ga-esi na-egosi na ọnọdụ ụmụnna anyị na-emetụ anyị n’obi nakwa na anyị na-emetere ha ebere?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 4]

Gịnị mere anyị ji eme ihe ndị a Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme?

[Foto dị na peeji nke 6]

Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi soro na-enyere ndị na-asụ asụsụ ọzọ aka ịnụ ozi ọma Alaeze Chineke?