Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ofufe Ezinụlọ Dị Mkpa Maka Nzọpụta!

Ofufe Ezinụlọ Dị Mkpa Maka Nzọpụta!

Ofufe Ezinụlọ Dị Mkpa Maka Nzọpụta!

CHEEDỊ otú “agha nke oké ụbọchị nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” ga-esi dị egwu! (Mkpu. 16:14) Maịka onye amụma ji ihe atụ doro anya kọwaa otú ọ ga-adị. Ọ sịrị: “Ugwu niile ga-agbaze . . . , ndagwurugwu niile ga-agbawasị, dị ka mgbá aṅụ nke ọkụ gbazere, dị ka mmiri a wụpụrụ n’ebe kpọdara akpọda.” (Maị. 1:4) Gịnị ga-eme ndị na-anaghị efe Jehova? Baịbụl sịrị: “Ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa.”—Jere. 25:33.

N’ihi nke a, ndị isi ezinụlọ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha bụ nne ma ọ bụ nna naanị ya na-azụ ụmụ ya, kwesịrị ịjụ onwe ha sị, ‘Ụmụ m ndị torola eto, hà ga-alanahụ ihe a dị egwu nke na-aga ime?’ Baịbụl na-emesi anyị obi ike na o nweghị ihe ga-eme ha ma ọ bụrụ na ha na Jehova dị ná mma.—Mat. 24:21.

Ọ Dị Mkpa Iwepụta Oge Maka Ofufe Ezinụlọ

Gị, bụ́ nne ma ọ bụ nna, hụ na i mere ihe niile i nwere ike ime ka i wee zụlite ụmụ gị “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Ọ dị ezigbo mkpa ka ị na-amụrụ ụmụ gị ihe. Anyị chọrọ ka ụmụ anyị dịrị ka Ndị Kraịst nọ na Filipaị, bụ́ ndị Pọl jara mma n’ihi na ha ji obi ha na-erubere Jehova isi. O dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, otú ahụ unu si na-erube isi mgbe niile, ọ bụghị naanị mgbe m nọ ya, kama ugbu a m na-anọghị ya, na-erubenụ isi karị, jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”—Fil. 2:12.

Mgbe ị na-anọghị ya, ụmụ gị hà na-eme ihe Jehova nyere n’iwu? Oleekwanụ maka mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ? Olee otú i nwere ike isi nyere ụmụ gị aka ka ha kwenyesie ike na ime ihe Jehova nyere n’iwu ga-abara ha uru ka ha wee nwee ike ikwe ka nke a na-eduzi ha ọbụna mgbe ị na-anọghị ya?

Okwukwe ụmụ gị nwere ike isi ike ma ọ bụrụ na unu ana-enwe ofufe ezinụlọ. N’ihi ya, ka anyị tụlee isi ihe atọ ga-eme ka ọmụmụ ihe ezinụlọ na-aga nke ọma.

Na-amụchi Ya Anya

Okwu Hibru e si sụgharịta “otu ụbọchị,” nke dị na Job 1:6, na-egosi na ndị mmụọ ozi Chineke nwere oge a kara aka ha ji ezukọ n’ihu ya. Mee otú a n’ezinụlọ gị. Wepụta oge unu ga na-enwe Ofufe Ezinụlọ, hụkwanụ na o nweghị ihe ọ bụla ga-egbochi unu inwe ya n’oge ahụ. Wepụtakwa oge ọzọ unu nwere ike inwe ya, adịghị ama ama e nwee ihe gbochiri unu inwe ya mgbe unu kwesịrị.

Ka oge na-aga, ekwela ka ọ ghọọ ihe unu na-eme mgbe ọ dapụtara. Cheta na ndị kacha mkpa n’ime ndị ị na-amụrụ Baịbụl bụ ụmụ gị. Ma, Setan ga-achọ inweta ha. (1 Pita 5:8) Ọ bụrụ na unu ejiri mgbede unu ji enwe Ofufe Ezinụlọ a dị ezigbo mkpa na-ele tiivi ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ na-enweghị isi, ọ pụtara na Setan emeriela unu.—Efe. 5:15, 16; 6:12; Fil. 1:10.

Na-amụnụ Ihe Ndị Metụtara Mkpa Ezinụlọ Unu

E kwesịghị iji mgbede e ji enwe Ofufe Ezinụlọ na-amụ ihe ọ bụla a hụrụ. Gbalịanụ ka unu na-amụ ihe ndị metụtara ọnọdụ unu. Olee otú unu ga-esi eme nke a? Mgbe ụfọdụ, mụọnụ isiokwu metụtara ihe ụmụ unu ga-ezute n’ụbọchị ma ọ bụ n’izu ndị na-abịa. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ịmụgharị otú e si ekwusa ozi ọma. Ọ na-atọ ndị na-eto eto ụtọ ime ihe ha ma eme. Ịmụgharị ihe ndị a ga-ekwu n’ozi ọma na ichebara otú a ga-esi ekwu ha echiche ga-eme ka obi sikwuo ụmụ gị ike ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke.—2 Tim. 2:15.

Unu nwekwara ike ịmụ ihe ndị ga-enyere ụmụ unu aka ịma ihe ha ga-eme mgbe ndị ọgbọ ha chọrọ ka ha mee ihe na-adịghị mma. Ezinụlọ unu nwere ike ịmụ isi nke 15 nke akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, nke 2. Na chaatị bụ́ “Ihe M Ga-eme Ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” bụ́ nke dị na peeji nke 132 na 133, a tụrụ aro ihe a ga-eme, nyekwa ụmụaka ohere ikwu ihe ha chere. E dere ihe na-esonụ n’ala ala peeji nke 133: “Gị na papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụ enyi gị toro eto mụgharịa ihe ị ga-agwa ha.” Ọ ga-adị mma ma unu na-amụgharị nke a site n’oge ruo n’oge mgbe unu na-enwe Ofufe Ezinụlọ.

Oge e ji enwe ofufe ezinụlọ bụ oge dị mma nne na nna ga-eji na-akọrọ ụmụ ha uru inwe ihe mgbaru ọsọ n’ozi Jehova bara. Isi nke 38 nke Akwụkwọ bụ́ Ndị Na-Eto Eto Na-Ajụ, nke 2, nke isiokwu ya bụ “Gịnị Ka M Ga-eji Ndụ M Eme?,” ga-enye ezigbo aka na nke a. Mgbe unu na-atụle isiokwu a, nyerenụ ụmụ unu aka ịghọta na ijere Jehova ozi bụ ihe kacha mma ha ga-eji ndụ ha eme. Nyerenụ ha aka ka ha nwee ọchịchọ ịrụ ọrụ ịsụ ụzọ, ije ozi na Betel, ịga Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, ma ọ bụkwanụ ịbanye ozi oge niile ndị ọzọ.

Ihe unu ga-akpachara anya na ya: Ụfọdụ ndị nne na nna ndị bu ezigbo ihe n’obi na-elekwasị nnọọ anya n’ihe ha ga-achọ ka ụmụ ha bụrụ nke na ha na-echefu ịja ha mma maka ihe ndị ha na-eme. Ọ dị mma ịgba ụmụ gị ume ka ha mee ka ozi Betel bụrụ ihe mgbaru ọsọ ha. Ma, lezienụ anya ka unu ghara iji ihe ndị unu chọrọ ka ụmụ unu bụrụ kpasuo ha iwe ma ọ bụ mee ka obi daa ha mba. (Kọl. 3:21) Ya adịla mgbe ị ga-echefu na ọ bụ nwa gị ga-eji aka ya, jirikwa obi ya dum hụ Jehova n’anya, ọ bụghị gị ga-emere ya nke a. (Mat. 22:37) N’ihi ya, gbalịa na-aja nwa gị mma maka ihe ọ na-eme ugbu a ma ghara ilekwasị anya n’ihe ọ na-anaghị eme. Nyere ya aka ka o gosi na obi dị ya mma maka ihe Jehova meere anyị. Hapụzie ya ka o jiri obi ya kelee Jehova maka ịdị mma ya.

Mee Ka Ọ Na-atọ Ụtọ

Ihe nke atọ dị mkpa nke ga-eme ka Ofufe Ezinụlọ na-aga nke ọma bụ ime ya ka ọ na-atọ ụtọ. Olee otú i nwere ike isi mee nke a? Ikekwe, mgbe ụfọdụ, unu nwere ike igere ihe nkiri ndị a na-egere egere ma ọ bụkwanụ unu ekirie vidio Ndịàmà Jehova mepụtara ma kwurịta ihe unu kiriri. Ma ọ bụkwanụ unu nwere ike ịgụkọ otu isiakwụkwọ Baịbụl ọnụ, kenye onye nke ọ bụla ebe ọ ga-agụ.

E nwere ihe ndị mara mma dị n’Ụlọ Nche na Teta! bụ́ ndị e nwere ike iji nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, unu nwere ike ịmụ ihe ahụ na-adị na peeji nke 31 nke Teta!, nke isiokwu ya bụ “Olee Ihe Ị Ga-aza?” N’ọnwa abụọ ọ bụla, a na-enwe isiokwu bụ́ “Maka Ndị Na-Eto Eto” n’Ụlọ Nche nke ọhaneze, bụ́ nke e nwere ike ji nwee ọmụmụ ihe ezinụlọ. Isiokwu a na isiokwu ọzọ bụ́ maka ụmụaka, nke bụ́ “Kụziere Ụmụ Gị Ihe,” na-eme otu pụta n’ọnwa a nwanne ya apụta n’ọnwa ọzọ.

Isiokwu ndị dị ná “Ndị Na-Eto Eto Na-Ajụ, Sị” na Teta! nakwa akwụkwọ bụ́ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, nke 2, ga-amasị ndị nne na nna ụmụ ha ka na-eto eto. Mgbe unu na-amụ akwụkwọ ahụ, unu ahapụla igbe bụ́ “Gịnị Ka I Chere” nke dị ná ngwụcha isiokwu nke ọ bụla. Ọ bụghị naanị ntụleghachi ka a ga-eji igbe ahụ eme. Ezinụlọ nwere ike iji ya enwe ọmụmụ ihe.

Ma, kpachara anya ka ị ghara iji oge ọmụmụ ihe ezinụlọ na-ajụkasị ụmụaka ajụjụ ahụ́. Dị ka ihe atụ, a manyela nwa gị ka ọ gụpụta ihe o dere na peeji bụ́ “Ebe M Ga-ede Ihe,” ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ o dere ihe n’akwụkwọ ahụ. N’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị Nne na Nna Ga-eburu n’Obi,” e kwuru na peeji nke atọ, sị: “Ka ụmụ gị nwee ike ide ihe bụ́ eziokwu n’akwụkwọ nke ha, hapụrụ ha nke ha. E mechaa, ha nwere ike ịkọrọ gị ihe ha dere.”

Ọ bụrụ na unu ana-enwechi ofufe ezinụlọ anya, na-amụ ihe metụtara ezinụlọ unu ma na-eme ka ofufe ezinụlọ na-atọ ụtọ, Jehova ga-agọzi mgbalị unu n’ụba. Oge a pụrụ iche ezinụlọ ji anọkọ ga-eme ka Jehova na ezinụlọ gị dịrị n’ezigbo mma.

[Igbe dị na peeji nke 31]

Na-echepụta Ihe Ndị Ga-eme Ka Ọmụmụ Ihe Unu Na-atọ Ụtọ

“Mgbe anyị na-amụrụ ụmụ anyị nwaanyị abụọ ihe, mụ na di m na ụmụ anyị na-akwadebe ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, anyị na-agwazi ha ka ha see ihe iji kọwaa ihe ha mụtara. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eji akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl eme ihe ngosi ma ọ bụkwanụ anyị amụgharịa otú e si ekwusa ozi ọma. Anyị na-amụ ihe metụtara ọnọdụ ha, anyị na-ahụkwa na ọ na-atọ ha ụtọ.”—J.M., United States.

“Iji nyere nwa onye m na-amụrụ Baịbụl aka ịghọta otú ịgụ akwụkwọ mpịakọta n’oge ochie si sie ike, anyị bipụtara akwụkwọ Aịzaya nke na-enweghị isiakwụkwọ na amaokwu. Anyị nyakọtara ha ogologo ogologo ma tinye ihe dị ka osisi n’isi ya abụọ. Nwata ahụ wee gbalịa ime ihe Jizọs mere n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret. Luk 4:16-21 kwuru na Jizọs ‘meghere akwụkwọ mpịakọta nke Aịzaya’ ma chọta ebe ọ chọrọ ịgụ. (Aịza. 61:1, 2) Ma, mgbe nwata ahụ gbalịrị ime ihe ahụ Jizọs mere, o siiri ya ike ịchọta Aịzaya isi iri isii na otu n’akwụkwọ mpịakọta ahụ dị ogologo, bụ́ nke na-enweghị isiakwụkwọ na amaokwu. Otú Jizọs si nwee ike ime nke a tụrụ ya n’anya nke mere o ji tie, sị: ‘Jizọs dị egwu o!’”—Y.T., Japan.

[Foto dị na peeji nke 30]

Ọ bụrụ na unu na ụmụ unu ana-amụgharị ihe, ọ ga-enyere ha aka ịma ihe ha ga-eme ma ndị ọgbọ ha chọọ ime ka ha tinye aka n’ihe ọjọọ

[Foto dị na peeji nke 31]

Gbaanụ mbọ mee ka Ofufe Ezinụlọ na-atọ ụtọ