Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ

Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ

Otú Gị na Ndị Enyi Gị Ga-esi Na-abụ Enyi n’Ụwa A Ịhụnanya Kọrọ

“Ihe ndị a ka m na-enye unu n’iwu, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya.”—JỌN 15:17.

1. Olee ihe mere Ndị Kraịst narị afọ mbụ na ndị ibe ha ji kwesị ịnọgide na-abụ ezigbo ndị enyi?

N’ABALỊ bọtara ụbọchị Jizọs nwụrụ, ọ gbara ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ntụkwasị obi ume ka ha na ibe ha nọgide na-abụ enyi. Ná mgbede ahụ, ọ gwara ha na ọ bụ ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ ka a ga-eji mara na ha bụ ndị na-eso ụzọ ya. (Jọn 13:35) Ndịozi ahụ niile na ibe ha kwesịrị ịbụ ezigbo ndị enyi ka ha wee nwee ike idi ule ndị ga-abịara ha, nweekwa ike ịrụzu ọrụ Jizọs na-aga inye ha n’oge na-adịghị anya. N’ezie, e ji ezigbo ịhụnanya Ndị Kraịst narị afọ mbụ nwere n’ebe Chineke nakwa n’ebe ndị ibe ha nọ mara ha.

2. (a) Gịnị ka anyị kpebisirila ike ime, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?

2 Ọ bụ ihe na-enye obi ụtọ taa na anyị nọ n’ọgbakọ zuru ụwa ọnụ, bụ́ nke ndị nọ na ya na-eme ka Ndị Kraịst narị afọ mbụ. Anyị ekpebisiela ike ime ihe Jizọs gwara anyị ka anyị mee, nke bụ́ ịhụrịta ibe anyị n’anya site n’obi. Ma, n’ụbọchị ikpeazụ a, ọtụtụ mmadụ adịghị eguzosi ike n’ihe, ha enweghịkwa obi mmadụ. (2 Tim. 3:1-3) Ụfọdụ ndị enyi na-etisa ngwa ngwa, ndị ọtụtụ ndị na-emetekwa enyi taa bụ ndị ha ga-erite ihe n’aka. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-abụ ezigbo Ndị Kraịst, anyị ekwesịghị ịna-akpa ụdị àgwà ndị a. Ugbu a, ka anyị tụlee ajụjụ ndị na-esonụ: Olee ihe mere anyị ji achọ inwe ezigbo ndị enyi? Olee otú anyị nwere ike isi nweta ezigbo ndị enyi? Olee mgbe anyị na mmadụ kwesịrị ịkwụsị ịbụ enyi? Oleekwa otú anyị na ezigbo ndị enyi anyị ga-esi nọgide na-abụ enyi?

Olee Ihe Mere Anyị Ji Achọ Inwe Ezigbo Ndị Enyi?

3, 4. Gịnị kacha eme ka enyi na enyi dịrị n’ezigbo mma, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

3 Ọ bụ ịhụnanya enyi na enyi nwere n’ebe Jehova nọ kacha eme ka ha bụrụ ezigbo enyi. Eze Sọlọmọn dere, sị: “Ọ bụrụkwa na mmadụ pụrụ imeri onye ọ bụ naanị ya, mmadụ abụọ gbakọrọ aka pụrụ iguzogide ya. Ụdọ atọ a tụkọtara ọnụ, a pụghị ịdọbi ya ngwa ngwa.” (Ekli. 4:12) Ọ bụrụ na Jehova abụrụ onye nke atọ n’etiti enyi na enyi, ha ga-anọgide na-abụ enyi.

4 Ọ bụ eziokwu na ndị na-ahụghị Jehova n’anya nwere ike ịbụ enyi, ma, mgbe mmadụ abụọ bụ enyi n’ihi na ha hụrụ Chineke n’anya, o nweghị ihe ga-etisa ha. Ọ bụrụgodị na ndị bụ ezigbo enyi enwee nghọtahie, ha ga-emeso ibe ha ihe otú ga-adị Jehova mma. Ọ bụrụ na ndị iro Chineke achọọ ịkpata nkewa, ha na-achọpụta na ha agaghị emeli ka ezigbo Ndị Kraịst na ibe ha kwụsị ịbụ enyi. Kemgbe ụwa, ndị ohu Jehova na-adị njikere ịnwụ kama itinye ụmụnna ha ná nsogbu.—Gụọ 1 Jọn 3:16.

5. Olee ihe mere Rut na Neomi ji bụrụ enyi ruo ogologo oge?

5 O doro anya na ebe anyị ga-akacha enweta ezigbo ndị enyi bụ n’etiti ndị hụrụ Jehova n’anya. Tụlee ihe banyere Rut na Neomi. Adịm ná mma ndị inyom abụọ a so n’adịm ná mma ndị kacha mma e dere na Baịbụl. Gịnị mere ha ji bụrụ enyi ruo ogologo oge? Rut kwuru ihe kpatara ya mgbe ọ gwara Neomi, sị: “Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m. . . . Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.” (Rut 1:16, 17) O doro anya na Rut na Neomi hụrụ Chineke n’anya nke ukwuu, ha mesokwara ibe ha ihe n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Chineke nọ. Nke a mere ka Jehova gọzie ụmụ nwaanyị abụọ a.

Otú E Si Emete Ezigbo Ndị Enyi

6-8. (a) Gịnị na-eme ka mmadụ na ibe ya nọgide na-abụ enyi? (b) Olee otú i nwere ike isi bute ụzọ n’imete ndị enyi?

6 Akụkọ banyere Rut na Neomi na-egosi na ndị mmadụ anaghị anọkata bụrụ ezigbo ndị enyi n’enweghị ihe kpatara ya. Ọ na-abụkarị n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ. Ma, ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide na-abụ enyi, ha ga-arụsi ọrụ ike, legharakwa ọtụtụ ihe na-amasị ha anya. Ndị bụ ụmụnne, bụ́ ndị na-efe Jehova, kwesịkwara ịgbasi mbọ ike ka ha na ibe ha bụrụ ezigbo enyi. Olee otú i nwere ike isi mete ezigbo ndị enyi?

7 Bute ụzọ. Pọl onyeozi gbara ndị enyi ya nọ n’ọgbakọ dị na Rom ume ka ha ‘na-ele ọbịa.’ (Rom 12:13) Ihe na-amara mmadụ ahụ́ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe ahụ mgbe mgbe. Otú ahụ ka ọ dị n’ile ọbịa. Ọ dịghị onye ga-elechitere gị ọbịa. (Gụọ Ilu 3:27.) Otu ụzọ ị ga-esi bụrụ onye na-ele ọbịa bụ ịkpọ ndị dị iche iche nọ n’ọgbakọ unu ka ha bịa n’ụlọ gị soro gị rie nri. Ì nwere ike ịna-ele ndị gị na ha nọ n’ọgbakọ ọbịa site n’oge ruo n’oge?

8 Ụzọ ọzọ i nwere ike isi bute ụzọ n’imete ndị enyi bụ iso ndị dị iche iche na-aga ozi ọma. Ọ bụrụ na ị nụ ka onye gị na ya so na-aga ozi ọma na-agwa mmadụ otú ọ hụruru Jehova n’anya, nke a ga-eme ka gị na ya bụrụ ezigbo enyi.

9, 10. Olee ihe nlereanya Pọl setịpụrụ, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?

9 Hụkwuo ọtụtụ ndị ọzọ n’anya. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:12, 13.) È nwetụla mgbe ọ dị gị ka ọ dịghị onye gị na ya nwere ike ịbụ enyi n’ọgbakọ ị nọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ̀ ga-abụ na ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka i chere na gị na ha nwere ike ịbụ enyi? Pọl onyeozi setịpụrụ ezigbo ihe nlereanya n’ịhụkwu ọtụtụ ndị ọzọ n’anya. E nwere mgbe ọ na-enweghị ihe ga-eme ka ya na ndị na-abụghị ndị Juu bụrụ enyi. Ma, ọ ghọrọ “onyeozi nke ndị mba ọzọ.”—Rom 11:13.

10 Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụghị naanị ndị ha na Pọl bụ ọgbọ ka o metere enyi. Dị ka ihe atụ, ya na Timoti bụ ezigbo enyi n’agbanyeghị na ha abụghị ọgbọ, otú e sikwa zụlite ha adịrị iche. Taa, ọ na-amasị ọtụtụ ndị na-eto eto ka ha na ndị merela agadi nọ n’ọgbakọ nọgide na-abụ enyi. Vanessa, bụ́ onye dị afọ iri abụọ na ụma, sịrị: “Enwere m otu ezigbo enyi nke gaferela afọ iri ise. M na-agwa ya ihe ọ bụla m nwere ike ịgwa ndị enyi m mụ na ha bụ ọgbọ. Ọ hụkwara m n’anya nke ukwuu.” Olee otú e si emete ụdị enyi a? Vanessa kwuru, sị: “M gbara mbọ n’onwe m iji nwee ụdị enyi a, echereghị m ka ọ bịa mete m enyi.” Ị̀ ga-achọ imete ndị na-abụghị ndị ọgbọ gị enyi? N’ezie, Jehova ga-agọzi gị maka mbọ ị na-agba ime otú a.

11. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jọnatan na Devid?

11 Kwụsie ike n’akụkụ enyi gị. Sọlọmọn dere, sị: “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.” (Ilu 17:17) O nwere ike ihe Sọlọmọn bu n’uche mgbe o dere ihe a bụ ụdị enyi nna ya bụ́ Devid na Jọnatan bụ. (1 Sam. 18:1) Eze Sọl chọrọ ka nwa ya bụ́ Jọnatan nọchie ya. Ma, Jọnatan kwetara na Jehova ahọrọla Devid ka ọ bụrụ eze. Jọnatan emeghịrị Devid anyaụfụ dị ka Sọl mere. O wuteghị ya na a na-eto Devid, ọ kwereghịkwa akụkọ ọjọọ Sọl nọ na-akọsa banyere Devid. (1 Sam. 20:24-34) Ànyị dị ka Jọnatan? Ànyị na-enwe obi ụtọ mgbe e nyere ndị enyi anyị ihe ùgwù? Ànyị na-akasi ha obi ma na-enyere ha aka mgbe ihe na-esiri ha ike? Ọ bụrụ na anyị anụ ebe a na-akọta enyi anyị, ànyị na-ekwere ihe e kwuru banyere ya n’ajụghị ase? Ka ànyị na-agbachitere enyi anyị, dị ka Jọnatan mere?

Mgbe Anyị na Ndị Enyi Anyị Kwesịrị Ịkwụsị Ịbụ Enyi

12-14. Olee nsogbu nke ụfọdụ ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-enwe, oleekwa otú anyị nwere ike isi nyere ha aka?

12 Mgbe onye a na-amụrụ Baịbụl malitere ịgbanwe ndụ ya, ya na ndị enyi ya nwere ike inwe ezigbo nsogbu. O nwere ike ịbụ na ya na ha dịbu ná mma, ma, ha anaghị eme ihe Baịbụl kwuru. O nwekwara ike ịbụ na ya na ha na-anọkarị tupu ya amalite ịmụ Baịbụl. Ma ugbu a, ọ chọpụtala na ha nwere ike imebi omume ọma ya, ya ewee chee na ya kwesịrị ịkwụsịlatatụ otú ya na ha si akpa. (1 Kọr. 15:33) Ma, o nwekwara ike iche na ọ bụrụ na ya ahapụ ha, nke a ga-egosi na ya abụghị ezigbo enyi.

13 Ọ bụrụ na ị na-amụ Baịbụl ma nwee ụdị nsogbu a, cheta na onye bụ́ ezigbo enyi gị ga-enwe obi ụtọ na ị na-agba mbọ ịkpa àgwà ọma. O nwedịrị ike ịchọ iso gị na-amụ banyere Jehova. Ma, ndị enyi na-abụghị ezigbo ya ‘ga na-ekwujọ gị’ n’ihi na ‘i soghị ha na-ebi ndụ ịla n’iyi.’ (1 Pita 4:3, 4) N’ezie, ọ bụ ha bụ ndị na-akwụsighị ike n’akụkụ gị, ọ bụghị gịnwa.

14 Mgbe ndị na-ahụghị Chineke n’anya, bụ́ ndị ha na ndị anyị na-amụrụ Baịbụl bụbu enyi hapụrụ ha, ndị nọ n’ọgbakọ kwesịrị imete ha enyi. (Gal. 6:10) Ị̀ ma ndị a na-amụrụ Baịbụl, bụ́ ndị na-abịa ọmụmụ ihe? Ị̀ na-agbalị ka gị na ha na-akpa ka i wee nyere ha aka inwe ọganihu?

15, 16. (a) Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na enyi anyị akwụsị ife Jehova? (b) Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị hụrụ Chineke n’anya?

15 Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na onye bụ́ enyi anyị nke nọ n’ọgbakọ ekpebie ịhapụ Jehova, ikekwe, a chụọ ya n’ọgbakọ? Nke a nwere ike ịgbawa obi. Otu nwanna nwaanyị kwuru otú ọ dị ya mgbe ezigbo enyi ya kwụsịrị ife Jehova. Ọ sịrị: “Ọ dị m ka mmadụ ọ̀ nwụnahụrụ m. M na-echebu na enyi m siri ike n’ọgbakọ, ma, achọpụtala m na o sighị. Ọ dị m ka ihe mere o ji na-efe Jehova kemgbe bụ ka obi dị ndị ezinụlọ ya ụtọ. Nke a mere ka m chebara onwe m echiche. Èbu m ezigbo ihe n’obi na-efe Jehova?” Olee otú nwanna nwaanyị a si die nke a? O kwuru, sị: “Atụkwasịrị m Jehova ibu arọ m. Ekpebisiela m ike igosi Jehova na m ji obi ọcha hụ ya n’anya, ọ bụghị n’ihi ndị enyi o mere ka m nwee n’ọgbakọ ya.”

16 O nweghị otú anyị na Chineke ga-esi nọgide na-abụ enyi ma ọ bụrụ na anyị na ndị họọrọ ịbụ ndị enyi ụwa bụ enyi. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems dere, sị: “Ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke? Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.” (Jems 4:4) Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ Chineke n’anya bụ ịtụkwasị ya obi na ọ bụrụ na onye bụbu enyi anyị akwụsị ịbụ enyi anyị, Chineke ga-enyere anyị aka idi ya, ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ejere ya ozi. (Gụọ Abụ Ọma 18:25.) Nwanna nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya sịrị: “Achọpụtala m na anyị agaghị amanyeli mmadụ ka ọ hụ Jehova n’anya ma ọ bụ ka ọ hụ anyị n’anya. Mee elu mee ala, ọ bụ onye ahụ ga-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-eme nke a.” Oleekwanụ ihe anyị nwere ike ime ka anyị na ndị nke ka nọ n’ọgbakọ nọgide na-abụ ezigbo enyi?

Otú Gị na Ezigbo Ndị Enyi Gị Ga-esi Nọgide Na-abụ Enyi

17. Olee otú ndị bụ́ ezigbo enyi kwesịrị isi na-agwa ibe ha okwu?

17 Anyị na ndị enyi anyị ga-anọgide na-adị ná mma ma ọ bụrụ na anyị na ha na-ekwurịta okwu. Ka ị na-agụ akụkọ banyere Rut na Neomi, Devid na Jọnatan, nakwa Pọl na Timoti n’ime Baịbụl, ị ga-ahụ na ezigbo ndị enyi na-akwanyere ibe ha ùgwù mgbe ha na-agwa ha otú ọ dị ha n’obi. Pọl onyeozi kwuru otú anyị kwesịrị isi na-agwa ndị ọzọ okwu. O dere, sị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ.” Ihe Pọl nọ na-ekwu okwu ya bụ otú anyị kwesịrị isi na-agwa ndị “nọ n’èzí” okwu, ya bụ, ndị na-abụghị ụmụnna anyị. (Kọl. 4:5, 6) N’ezie, ọ bụrụ na anyị kwesịrị ịkwanyere ndị na-abụghị ndị Jehova ùgwù ma anyị na-agwa ha okwu, anyị kwesịrị ịkwanyere ndị enyi anyị nọ n’ọgbakọ ùgwù karị!

18, 19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ndụmọdụ ọ bụla Onye Kraịst bụ́ enyi anyị nyere anyị anya, oleekwa ihe nlereanya ndị okenye nọ n’Efesọs setịpụụrụ anyị?

18 Ndị bụ́ ezigbo enyi na-eji ihe enyi ha kwuru akpọrọ ihe, n’ihi ya, ha kwesịrị ịna-ekwu okwu dị mma ná ntị, ha kwesịkwara ịna-agwa ibe ha eziokwu. Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Ọ bụ mmanụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ na-eme ka obi ṅụrịa, otú ahụkwa ka enyi mmadụ si atọ ụtọ n’ihi ndụmọdụ nke si ná mkpụrụ obi.” (Ilu 27:9) Ọ̀ bụ otú a ka i si ele ndụmọdụ enyi gị nyere gị anya? (Gụọ Abụ Ọma 141:5.) Olee otú ọ na-adị gị ma ọ bụrụ na enyi gị agwa gị ihe na-adịghị mma ị na-eme? Ị̀ na-ewere ya na ihe o ji gwa gị ihe ahụ bụ n’ihi na ọ hụrụ gị n’anya, ka ị̀ na-ewe iwe?

19 Pọl onyeozi na ndị okenye nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs dị n’ezigbo mma. Eleghị anya ọ matara ụfọdụ n’ime ha mgbe ha batara n’ọgbakọ. Ma, ná nnọkọ ikpeazụ ya na ha nwere, ọ gwara ha okwu n’ezoghị ọnụ. Gịnị ka ha mere? Iwe eweghị ndị a bụ́ enyi Pọl. Kama nke ahụ, obi dị ha ụtọ na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi, ha bedịrị ákwá mgbe ọ gwara ha na ha agaghị ahụ ya ọzọ.—Ọrụ 20:17, 29, 30, 36-38.

20. Gịnị ka enyi hụrụ enyi ya n’anya na-eme?

20 Ọ bụghị naanị nnara ka ndị bụ́ ezigbo enyi na-anara ndụmọdụ dị mma, ha na-enyekwa enye. N’ezie, anyị kwesịrị ịma mgbe anyị kwesịrị “ilekwasị anya n’ihe [anyị] na-eme.” (1 Tesa. 4:11) Anyị kwesịkwara ịma na onye ọ bụla n’ime anyị “ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.” (Rom 14:12) Ma, ezigbo enyi kwesịrị ichetara enyi ya ihe Jehova kwuru mgbe enyi ya ahụ chọrọ itinye aka n’ihe ọjọọ. (1 Kọr. 7:39) Dị ka ihe atụ, gịnị ka i kwesịrị ime mgbe ị chọpụtara na enyi gị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na onye na-abụghị onye Jehova na-akpachi anya ka ndị chọrọ ịlụ onwe ha? Ị̀ ga-agbachi nkịtị ka ị ghara ikwu ihe ga-eme ka gị na ya see okwu? Ma ọ bụkwanụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na enyi gị anaraghị ndụmọdụ i nyere ya? Ezigbo enyi kwesịrị ijekwuru ndị okenye ka ha nyere enyi ya nke zọhiere ụkwụ aka. Anyị kwesịrị ịkata obi iji mee nke a. Ma, ọ dịghị ihe ga-eme ka ndị enyi hụrụ Jehova n’anya kwụsị ịbụ enyi kpamkpam.

21. Gịnị ka anyị niile na-eme mgbe ụfọdụ, ma, olee ihe o ji dị mkpa ka anyị nwee ezigbo ndị enyi n’ọgbakọ?

21 Gụọ Ndị Kọlọsi 3:13, 14. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ime ndị enyi anyị ihe ga-eme ka ha “mee mkpesa” megide anyị, ha nwekwara ike ime ma ọ bụ kwuo ihe ga-ewute anyị. Jems dere, sị: “Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro.” (Jems 3:2) Ma, ihe e ji ama ndị bụ́ ezigbo enyi abụghị na ha anaghị emejọ ibe ha, kama, ọ bụ otú ha si eji obi ha dum agbaghara ibe ha. Ọ dị mkpa ka anyị na ndị enyi anyị di n’ezigbo mma site na anyị na ha ịna-ekwurịta okwu n’ezoghị ihe ọ bụla nakwa site n’ịgbaghara ha ma ha mejọọ anyị. Ọ bụrụ na anyị esi otú a gosi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya, ọ ga-abụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee otú anyị nwere ike isi mete ezigbo ndị enyi?

• Olee mgbe anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịkwụsị ịbụ enyi?

• Olee ihe anyị kwesịrị ime ka anyị na ndị enyi anyị nọgide na-abụ enyi?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 18]

Olee ihe mere Rut na Neomi ji bụrụ ezigbo enyi ruo ogologo oge?

[Foto dị na peeji nke 19]

Ị̀ na-ele ndị ọzọ ọbịa site n’oge ruo n’oge?