Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Mgbakọ Atọ Si Mee Ka Ndụ M Gbanwee

Otú Mgbakọ Atọ Si Mee Ka Ndụ M Gbanwee

Otú Mgbakọ Atọ Si Mee Ka Ndụ M Gbanwee

Dị ka George Warienchuck si kọọ

Ọ̀ DỊLA mgbe ihe ị nụrụ ná mgbakọ anyị metụrụ gị n’obi nke ukwuu nke mere ka i mee mgbanwe dị ukwuu ná ndụ gị? Nke a mere m. M ka na-echeta mgbakọ atọ kachaa mee ka ndụ m gbanwee. Mgbakọ nke mbụ mere ka m kwụsịlata ime ihere; nke abụọ emee ka ihe m nwere na-eju m afọ; nke atọ emee ka m wepụta onwe m ijere Jehova ozi. Ma, tupu m gwa gị banyere mgbanwe ndị ahụ m mere, ka m buru ụzọ gwa gị ihe ndị mere tupu mgbakọ ndị ahụ, ya bụ, ihe ndị metụtara m mgbe m bụ nwata.

A mụrụ m n’afọ 1928, m bụkwa nke ikpeazụ n’ime ụmụ atọ papa m na mama m mụrụ. Papa m na mama m nọ na South Bound Brook, New Jersey, U.S.A., bụ́ obodo ihe dị ka puku mmadụ abụọ bi n’oge ahụ, zụọ mụ na ụmụnne m abụọ bụ́, Margie na Olga. Mama m na-emesapụ aka n’agbanyeghị na anyị abaghị ọgaranya. Mgbe ọ bụla ọ hụrụ ego wee sie ezigbo nri, ọ na-enyetụ ndị agbata obi anyị. Mgbe m dị afọ itoolu, otu Onyeàmà nke na-asụ asụsụ Hungarian ziri mama m ozi ọma ya egee ntị n’ihi na Hungarian bụ asụsụ mama m. Ka oge na-aga, Bertha, bụ́ nwanna nwaanyị na-erubeghị iri afọ abụọ na ise, malitere ịmụrụ mama m ihe, ya emechaa ghọọ ohu Jehova.

Adịghị m ka mama m. M na-emekarị ihere. Mkparị mama m ji ya akparị m mere ka ihe ka njọ. Mgbe m beere ákwá jụọ ya otu ụbọchị, sị, “Olee ihe mere i ji akọkarị m ọnụ?” ya agwa m na ya hụrụ m n’anya, ma, na ya achọghị ka m dị iberiibe. Mama m buuru m ezigbo ihe n’obi, ma, otú o si akọ m ọnụ mere ka ọ dị m ka o nweghị ihe m ma.

Otu ụbọchị, onye agbata obi anyị, bụ́ onye na-agwakarị m okwu ọma, gwara m ka m soro nwa ya nwoke gaa chọọchị ha. M ma na ọ dịghị mma, ma, achọghị m ịjụ ime ihe ezigbo nwaanyị a gwara m. Nke a mere ka m gaa chọọchị ọtụtụ ọnwa n’agbanyeghị na ọ masịghị m. N’ụlọ akwụkwọ, ịtụ mmadụ egwu mekwara ka m mee ihe akọnuche m na-anabataghị. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị, bụ́ nwoke na-achị anyị n’aka ike, nyere ndị nkụzi iwu ka ha manye ụmụ akwụkwọ niile ikele ọkọlọtọ. M sokwa ha na-ekele ya. M mere nke a ihe dị ka otu afọ wee kwụsị.

M Mụtara Otú M Ga-esi Na-enwe Obi Ike

N’afọ 1939, anyị malitere inwe ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ n’ụlọ anyị. Ọ bụ Ben Mieszkalski, nwa okorobịa bụ ọsụ ụzọ, na-eduzi ya. O nwere ezigbo ihe mere anyị ji akpọ ya Ben Ukwu. N’oge ahụ, ọ na-adị m ka isi ya ọ na-emetụ n’elu ụzọ e si abata n’ụlọ anyị nakwa na ọ naghị aba na ya. Ma, n’agbanyeghị na ọ hà otú ahụ, o nwere obiọma. Ihu na-adị ya mma mgbe niile, nke a mekwara ka ahụ́ ruo m ala. N’ihi ya, mgbe ọ gwara m ka m soro ya gaa ozi ọma, m ji obi ụtọ kwere. Mụ na ya ghọrọ enyi. Mgbe ọ bụla obi na-adịghị m mma, ọ na-agwa m okwu otú mmadụ si agwa nwanne ya ọ tọrọ okwu. Nke ahụ nyeere m nnukwu aka, meekwa ka m hụ ya n’anya nke ukwuu.

N’afọ 1941, Ben gwara ezinụlọ anyị na ya ga-ebu anyị n’ụgbọala ya gaa mgbakọ a ga-enwe na St. Louis, Missouri. Obi dị m ụtọ nke ukwuu. Tupu mgbe ahụ, m sitụbeghị n’ụlọ anyị gaa ebe karịrị iri kilomita asatọ. Ma, ịga mgbakọ ahụ pụtara na m ga-aga ebe karịrị otu puku kilomita na narị ise! Ma, nsogbu dapụtara na St. Louis. Ndị ụkọchukwu gwara ndị chọọchị ha ka ha ghara inye Ndịàmà ụlọ n’agbanyeghị na ha ekwela ha nkwa inye ha ụlọ. Ọtụtụ n’ime ha mere ihe ndị ụkọchukwu ha gwara ha. Ha gwara ezinụlọ anyị ga-anọ na nke ha ihe ha ga-eme ha ma ha nye anyị ụlọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ezinụlọ ahụ nabatara anyị. Ha sịrị na o nweghị ihe ga-eme ka ha ghara inye anyị ụlọ ha kwere nkwa inye anyị. Ụdị obi ike ha nwere masịrị m.

E mere ụmụnne m baptizim ná mgbakọ ahụ. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Nwanna Rutherford, bụ́ onye si Betel nke dị na Brooklyn, kwuru okwu na-emetụ n’obi, bụ́ nke o kwukatara wee gwa ụmụaka niile chọrọ ime uche Chineke ka ha bilie ọtọ. Ihe dị ka puku ụmụaka iri na ise biliri ọtọ. Mụnwa bilikwara. Ya agwazie anyị ka onye ọ bụla n’ime anyị nke chọrọ ime ike ya niile n’ikwusa ozi ọma sị, “Ee.” Mụ na ụmụaka ndị ọzọ ji olu dara ụda kwuo “Ee!” Mgbe anyị kwuru nke a, ndị bịara mgbakọ ahụ kụrụ aka dara oké ụda. Nke a mere ka obi sie m ike.

Mgbe anyị si ná mgbakọ ahụ laa, anyị gara na nke otu nwanna nwoke bi na West Virginia. Ọ kọọrọ anyị na otu ụbọchị ya gara ozi ọma, otu ìgwè mmadụ ozi ọma anyị na-adịghị mma gburu ya ilu, wụọ ya korota ma wụsa ya ábụ́bà ọkụkọ n’ahụ́. M gere ntị nke ọma mgbe nwanna ahụ na-akọ akụkọ ahụ. O mechara kwuo, sị: “Ma, m gaghị akwụsị izi ozi ọma.” Mgbe anyị si na nke ya pụta, m nwere ụdị obi ike ahụ Devid nwere. M dị njikere ibuso Golayat agha, ya bụ, onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị.

Mgbe m rutere n’ụlọ akwụkwọ, m gakwuuru ya. Ya ejiri iwe lee m anya. Mụ ekpekuo Jehova ekpere n’obi m ka o nyere m aka. Mụ ekwuo ngwa ngwa, sị: “M gara mgbakọ Ndịàmà Jehova. M gaghị ekele ọkọlọtọ ọzọ!” Ya agba nkịtị. Ya ejiri nwayọọ bilie n’oche ya bịawa ebe m nọ. Ihu ya agbarụọ. Ya ejiri olu ike kwuo, sị: “M ga-achụ gị ma ọ bụrụ na ị chọghị ikele ọkọlọtọ!” Ma, ekeleghị m ọkọlọtọ na nke ugbu a. Nke a mere ka m nwee ụdị ọṅụ m na-enwetụbeghị.

Obi dị m ụtọ nke ukwuu nke na m chọrọ ịgwa Ben ihe merenụ ozugbo. Mgbe m hụrụ ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, m ji oké olu gwa ya, sị: “A chụrụ m n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ekeleghị m ọkọlọtọ!” Ben wee konye m aka n’olu mụmụọ ọnụ ọchị, sị: “O doro m anya na Jehova hụrụ gị n’anya.” (Diut. 31:6) Ihe a o kwuru mesiri m obi ike nke ukwuu. E mere m baptizim n’abalị iri na ise nke ọnwa June n’afọ 1942.

Otú M Si Mụta Inwe Afọ Ojuju

Ihe dị ezigbo mma n’obodo anyị mgbe agha Ụwa nke Abụọ biri, ọtụtụ ndị malitere ịchụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ. M na-arụ ọrụ ebe a na-akwụ m ezigbo ego. Nke a mere ka m nwee ike ịzụta ihe ndị m na-anaghị arọbu nrọ ha n’oge gara aga na m ga-enwe. Ụfọdụ n’ime ndị enyi m zụrụ ọgba tum tum; ndị ọzọ arụgharịa ụlọ ha. Mụnwa zụrụ ụgbọala ọhụrụ. N’oge na-adịghị anya, ọchịchọ m na-achọ inwetakwu ihe onwunwe mere ka m ghara ịna-etinyekwu oge n’ije ozi Jehova. Ama m na ebe anya m na-aga adịghị mma. Chineke mere ebere ya abụrụ na mgbakọ anyị gara n’afọ 1950 na New York City nyeere m aka ịgbanwe.

Ọkà okwu nke ọ bụla nke kwuru okwu ná mgbakọ ahụ gbara ndị na-ege ntị ume ka ha jisie ike na-ekwusa ozi ọma. Otu ọkà okwu gwara anyị, sị, “Na-achụnụ naanị ihe ndị na-akpa unu ka unu wee nọgide na-agba ọsọ ndụ.” O yiri ka ọ bụ naanị m ka ọ nọ na-agwa okwu ahụ. M hụkwara ememme ngụcha akwụkwọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, bụ́ nke mere ka m malite iche, sị, ‘Ọ bụrụ na Ndịàmà ndị a mụ na ha bụ ọgbọ nwere ike ịhapụ ndụ ha na-ekpori n’ụlọ ha wee gaa ala ọzọ na-eje ozi, m kwesịrị ime otú ihe ahụ n’ebe a.’ Tupu mgbakọ ahụ agbasaa, m kpebielarị na m ga-amalite ọrụ ịsụ ụzọ.

N’oge ahụ, mụ na Evelyn Mondak malitere ịkpa. Ọ bụ otu nwanna nwaanyị na-anụ ọkụ n’obi nke nọ n’ọgbakọ m gafere. Mama Evelyn, bụ́ onye zụlitere ụmụaka isii n’ọgbakọ, anaghị atụ mmadụ ụjọ. Ọ na-amasị ya ije ozi ọma n’ihu nnukwu ụlọ ụka ndị Katọlik. N’agbanyeghị ugboro ole ụkọchukwu na-eji iwe agwa ya ka o si ebe ahụ pụọ, ọ naghị atụpụrụ ya ọnụ. Evelyn na-eme ka mama ya, ọ naghị atụ mmadụ ụjọ.—Ilu 29:25.

N’afọ 1951, mụ na Evelyn lụrụ, gbaa arụkwaghịm n’ọrụ anyị wee malite ịsụ ụzọ. Otu onye nlekọta sekit gbara anyị ume ka anyị kwaga Amagansett, bụ́ otu obere obodo dị n’ikpere Oké Osimiri Atlantic. Obodo ahụ dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri isii ma e si New York City gawa ya. Mgbe ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ gwara anyị na e nweghị ebe anyị ga-ebi, anyị malitere ịchọ ụlọ ụgbọala na-adọkpụ. Ma, anyị enwetaghị nke anyị ga-akwụli ụgwọ ya. Anyị mechara nweta nke mebicharala emebi. Onye nwe ya gwara anyị ka anyị weta narị dọla itoolu. Nke ahụ bụ kpọmkwem ego ole ndị mmadụ nyere anyị n’onyinye mgbe anyị gbara akwụkwọ. Anyị zụụrụ ya, mezie ya wee dọkpụrụ ya gaa ókèala ọhụrụ anyị. Ma, o nweghịzi ego dị anyị n’aka mgbe anyị rutere ebe ahụ, anyị amaghịkwa otú anyị ga-esi na-eri ihe ma na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ.

Evelyn malitere ịna-edebere ndị mmadụ ụlọ ha ọcha. Mụnwa nwetakwara ọrụ idebe ụlọ nri ọcha n’ime abalị ma e rechaa ahịa. Onye nwe ya na-asị m, “Welaara nwunye gị nri ọ bụla e refọrọ.” N’ihi ya, m lọta n’isi isi ụtụtụ, ísì nri m welatara na-ejupụta ụlọ anyị. Anyị dakwachaa nri ndị ahụ n’ọkụ, ha na-atọ anyị ezigbo ụtọ, karịchaa n’oge oyi, bụ́ mgbe oyi nke na-atụ n’ime ụlọ anyị na-eme ka ahụ́ na-ama anyị jijiji. Mgbe ụfọdụ, ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ anyị na-edewere anyị azụ̀ ndị buru ibu na steepụ ụlọ anyị. N’afọ niile anyị so ezigbo ụmụnna ndị a jee ozi n’Amagansett, anyị mụtara na mmadụ inwe afọ ojuju n’ihe ndị dị ya mkpa o nwere na-eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ. Anyị nwere obi ụtọ n’afọ ndị ahụ.

A Gbara Anyị Ume Ka Anyị Jekwuo Ozi

N’ọnwa July nke afọ 1953, anyị hụrụ ọtụtụ ndị na-eje ozi ala ọzọ, bụ́ ndị si ebe dị iche iche ha na-eje ozi bịa mgbakọ mba niile e nwere na New York City. Ha kọrọ ọtụtụ ahụmahụ dị mma. Ya adịzie anyị ka anyị bụrụ ha. Ihe ọzọkwa bụ na mgbe otu ọkà okwu kwuru na a ka nwere ọtụtụ ala ozi ọma na-erubeghị, anyị kpebiri ihe anyị ga-eme, ya bụ, ijekwu ozi. Nke a mere ka anyị nọrọ ná mgbakọ ahụ dejupụta akwụkwọ na anyị chọrọ ịga Ụlọ Akwụkwọ Gilied. N’afọ ahụ, a kpọrọ anyị òkù ịgụ akwụkwọ na klas nke iri abụọ na atọ nke Ụlọ Akwụkwọ Gilied, nke malitere n’ọnwa February nke afọ 1954. Nke a bụụrụ anyị ezigbo ihe ùgwù.

Anyị nwere obi ụtọ mgbe a gwara anyị na anyị ga-aga ozi na Brazil. Tupu anyị amalite njem ahụ ga-ewe anyị abalị iri na anọ, nke anyị ga-eji ụgbọ mmiri gaa, otu nwanna nwoke na-arụ ọrụ na Betel gwara m, sị: “Ụmụnna nwaanyị itoolu, bụ́ ndị ozi ala ọzọ na-alụbeghị di, ga-eso gị na nwunye gị gaa Brazil. Lekọtakwa ha!” Chegodị anya ndị na-akwọ ụgbọ mmiri ahụ nọ na-ele m mgbe ụmụ agbọghọ iri so m n’azụ na-abata n’ụgbọ ahụ. Ma, nke a abụrụghị ụmụnna nwaanyị ndị a nsogbu ọ bụla. Obi lọrọ m mgbe anyị rutere Brazil n’enweghị nsogbu.

Mgbe m mụtara ịsụ asụsụ Portuguese, a họpụtara m ilekọta otu sekit dị na Rio Grande do Sul, bụ́ steeti dị n’ebe ndịda Brazil. Onye nlekọta sekit nke m bịara ịnọchi, bụ́ onye na-alụbeghị nwaanyị n’oge ahụ, gwara mụ na nwunye m, sị: “Ọ tụrụ m n’anya na e zitere di na nwunye ebe a. Ebe a siri ike.” Ọgbakọ ndị dị ebe ahụ dịcha anya, ọ bụ naanị gwongworo ka e ji agaru ụfọdụ n’ime ha. Ndị na-akwọ ụgbọala ndị ahụ na-ahapụ ndị zụnyere ha nri ka ha magoro n’ụgbọala ha. Anyị na-arịgoro wee nọdụ ala n’elu ibu ka ndị na-agba ịnyịnya, wee gadochaa aka n’ụdọ e kere n’ibu. Mgbe ọ bụla gwongworo bu anyị ruru n’ebe ụzọ gbara ngọ wee gbujie dị ka ọ̀ chọrọ ịdaba ná ndagwurugwu, ibu anyị nọ n’elu ha na-ehulata, onye ọ bụla ejidesie aka ike n’ụdọ ndị ahụ ka ọ ghara ịdapụ. Ma, mgbe anyị ruru ebe anyị na-aga wee hụ ụmụnna ka ha ji obi ụtọ na-eche ka anyị rute, obi na-adị anyị ụtọ n’agbanyeghị na njem ahụ were anyị oge.

Anyị na-anọ n’ụlọ ụmụnna. Ha dara nnọọ ogbenye, ma, nke ahụ anaghị eme ka ha ghara inye anyị ihe na-akpa anyị. E nwere otu obodo dịpụrụ adịpụ nke ụmụnna niile ndị nọ na ya na-arụ ọrụ n’otu ụlọ ọrụ nke na-ere anụ. Ego a na-akwụ ha ehighị nne, nke a mekwara ka ha na-eri nri naanị otu ugboro n’ụbọchị. A naghị akwụ ha ụgwọ n’ụbọchị ọ bụla ha arụghị ọrụ. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe ọ bụla anyị letara ọgbakọ ha, ha na-ahapụ ịga ọrụ ụbọchị abụọ ka ha wee soro anyị jee ozi. Ha na-atụkwasị Jehova obi. Anyị agaghị echefu ihe anyị mụtara n’aka ụmụnna ndị ahụ dara ogbenye, ya bụ, ileghara ịchụ ihe onwunwe anya iji nwee ike ije ozi Alaeze Chineke. Mgbe anyị nọ ebe ahụ, ha kụziiri anyị ihe ụlọ akwụkwọ ọ bụla na-enweghị ike ịkụziri anyị. Mgbe ọ bụla m chetara ụmụnna ndị ahụ, m na-enwe obi ụtọ dị ukwuu.

N’afọ 1976, anyị lọtara na United States iji lekọta mama m ahụ́ na-adịghị. Obi ekweghị anyị ịhapụ Brazil, ma, anyị na-ekele Jehova maka otú o si mee ka anyị nọrọ ndụ na-ahụ uto a na-enwe n’ala ahụ. Mgbe ọ bụla anyị si Brazil nweta akwụkwọ ozi, anyị na-echeta ọtụtụ ihe mere anyị obi ụtọ mgbe anyị nọ ebe ahụ.

Anyị na Ndị Ezigbo Enyi Anyị Ahụ Ọzọ

Mgbe ahụ anyị na-elekọta mama m, anyị na-arụ ọrụ ịsụ ụzọ, na-arụkwa ọrụ nwa oge. Mama m ji ikwesi ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo mgbe ọ nwụrụ n’afọ 1980. Ka oge na-aga, a họpụtara m ịbụ onye nlekọta sekit na United States. N’afọ 1990, mụ na nwunye m letara otu ọgbakọ dị na Connecticut, bụ́ ebe anyị hụrụ otu onye pụrụ iche. Otu n’ime ndị okenye ọgbakọ ahụ bụ Ben, ya bụ, Ben ahụ nyeere m aka ihe dị ka iri afọ ise gara aga ịnọgidesi ike na-efe Jehova. Chegodị ụdị ọṅụ juru anyị obi mgbe anyị makụrụ ibe anyị.

Kemgbe afọ 1996, mụ na Evelyn bụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ahụ́ na-adịkwaghị ike, anyị na-ejekwa ozi n’otu ọgbakọ ji asụsụ Portuguese amụ ihe nke dị n’Elizabeth, New Jersey. M na-arịa ọrịa, ma, ezigbo nwunye m na-enyere m aka ka m wee na-aga ozi ọma otú ike kwere m. Evelyn na-enyekwara otu onye agbata obi anyị merela agadi aka. Ị̀ ma aha ya? Ọ bụ Bertha. Ọ bụ ya bụ onye ahụ nyeere mama m aka ịghọ ohu Jehova ihe karịrị afọ iri asaa gara aga! Obi dị anyị ụtọ na anyị na-enyere ya aka iji kelee ya maka ime ka ezinụlọ anyị nata eziokwu.

M na-ekele Jehova maka otú o si jiri mgbakọ atọ ndị ahụ m gara mee ka m nọgide na-efe ya, nakwa maka inyere m aka ịhapụ ịchụ ihe onwunwe ka m wee malite ozi oge niile. N’eziokwu, mgbakọ ndị ahụ mere ka ndụ m gbanwee.

[Foto dị na peeji nke 23]

Mama Evelyn (n’aka ekpe) na mama m

[Foto dị na peeji nke 23]

Ben enyi m nwoke

[Foto dị na peeji nke 24]

Mgbe m nọ na Brazil

[Foto dị na peeji nke 25]

Foto mụ na Evelyn sere n’oge na-adịbeghị anya