Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Unu Bụ Ndị Enyi M”

“Unu Bụ Ndị Enyi M”

“Unu Bụ Ndị Enyi M”

“Unu bụ ndị enyi m ma ọ bụrụ na unu emee ihe m na-enye unu n’iwu.”—JỌN 15:14.

1, 2. (a) Olee ụdị ndị bụ ndị enyi Jizọs? (b) Olee ihe mere o ji dị mkpa ka anyị bụrụ ndị enyi Jizọs?

NDỊOZI Jizọs, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ọnụ ụlọ ahụ dị n’elu, nwere ọrụ dị iche iche ha na-arụ, ha sikwa n’ezinụlọ dị iche iche. Pita na Andru nwanne ya bụ ndị ọkụ azụ̀. Matiu bụbu onye ọnaụtụ, ndị Juu kpọkwara ọrụ ahụ ọ na-arụ asị. Eleghị anya ụfọdụ ndị ọzọ, dị ka Jems na Jọn, ma Jizọs kemgbe ọ bụ nwata. E nwekwara ike ya abụrụ na ọ dịbeghị anya ndị ọzọ, dị ka Nataniel, matara ya. (Jọn 1:43-50) N’agbanyeghị nke a, ha niile, bụ́ ndị nọ n’abalị Ememme Ngabiga ahụ pụrụ iche e mere na Jeruselem, kwere na Jizọs bụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, bụ́ Ọkpara nke Chineke dị ndụ. (Jọn 6:68, 69) Ọ ghaghị ịbụ na obi tọrọ ha ụtọ mgbe Jizọs gwara ha, sị: “Ana m akpọ unu ndị enyi m, n’ihi na ihe niile m nụrụ n’ọnụ Nna m ka m mere ka unu mara.”—Jọn 15:15.

2 Okwu ahụ Jizọs gwara ndịozi ya, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, gbasara Ndị Kraịst niile e tere mmanụ taa, gbasakwa “atụrụ ọzọ” ahụ bụ́ ndị enyi ha. (Jọn 10:16) N’agbanyeghị ụdị ndị anyị bụ, anyị nwere ike ịbụ ndị enyi Jizọs. Ọ dị mkpa ka anyị bụrụ ndị enyi Jizọs n’ihi na ndị bụ ndị enyi ya bụkwa ndị enyi Jehova. N’ezie, anyị agaghị abịaruli Jehova nso ma ọ bụrụ na anyị ebughị ụzọ bịaruo Kraịst nso. (Gụọ Jọn 14:6, 21.) Oleezi ihe anyị ga-eme ka anyị wee ghọọ ndị enyi Jizọs, anyị na ya anọgidekwa na-abụ enyi? Tupu anyị atụlewe nke a, ka anyị lee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Jizọs si bụrụ ezigbo enyi, hụkwa ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú ndị na-eso ụzọ ya si gosi na obi dị ha ụtọ na ha na ya bụ enyi.

Otú Jizọs Si Bụrụ Ezigbo Enyi

3. Gịnị ka e ji mara Jizọs?

3 Eze Sọlọmọn maara ihe dere, sị: “Ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.” (Ilu 14:20) Nke a bụ nnọọ ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè na-achọkarị ime, ya bụ, ndị ha na-emete enyi bụ ndị ha ga-erite ihe n’aka, ọ bụghị ndị ha ga-enye enye. Jizọs emeghị otú a. O meteghị ndị mmadụ enyi n’ihi na ha nwere ego ma ọ bụ n’ihi na ha bụ ndị a ma ama. Ọ bụ ezie na Jizọs hụrụ otu nwa okorobịa bara ọgaranya n’anya ma gwa ya ka ọ bịa bụrụ onye na-eso ụzọ ya, ma, Jizọs gwara ya ka ọ gaa ree ihe o nwere nye ndị ogbenye. (Mak 10:17-22; Luk 18:18, 23) Ihe e ji mara Jizọs abụghị na ya na ndị ọgaranya na ndị a na-anụ aha ha bụ enyi, kama ọ bụ na ya na ndị ogbenye na ndị ọ na-enweghị otú ọ hà ha bụ enyi.—Mat. 11:19.

4. Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na ndị enyi Jizọs ezughị okè?

4 N’ezie, ndị enyi Jizọs ezughị okè. O nwere mgbe Pita na-eleghị ihe anya otú Chineke si lee ya. (Mat. 16:21-23) Jems na Jọn mere ihe gosiri na ha nwere oké ọchịchọ mgbe ha gwara Jizọs ka o nye ha ọkwà dị elu n’Alaeze ya. Ihe ahụ ha mere were ndịozi ndị ọzọ iwe, ihe banyere onye ka ibe ya ukwuu sekwaara ha okwu ọtụtụ mgbe. Ma, Jizọs ji ndidi gbazie ndị enyi ya, o wesaghịkwa ha iwe.—Mat. 20:20-28.

5, 6. (a) Olee ihe mere Jizọs na ọtụtụ n’ime ndịozi ya ka ji bụrụ enyi? (b) Olee ihe mere Jizọs na Judas ji kwụsị ịbụ enyi?

5 Ihe mere Jizọs na ndị ikom ndị a na-ezughị okè ji nọgide na-abụ enyi abụghị n’ihi na ọ na-anabata ihe ọjọọ ma ọ bụkwanụ n’ihi na ọ maghị na ha ezughị okè. Kama nke ahụ, ọ họọrọ ilekwasị anya n’ebe ha na-eme nke ọma. Dị ka ihe atụ, e nwere mgbe Pita, Jems, na Jọn nọ na-ehi ụra kama iso Jizọs mụrụ anya n’oge ihe kacha siere ya ike mgbe ọ nọ n’ụwa. Nke a wutere Jizọs n’ezie. N’agbanyeghị nke a, ọ ma na ha bu ezi ihe n’obi. Ọ sịrị: “N’ezie, mmụọ dị njikere, ma anụ ahụ́ adịghị ike.”—Mat. 26:41.

6 Ma, Jizọs na Judas Iskarịọt kwụsịrị ịbụ enyi. N’agbanyeghị na Judas na-eme ka ya na Jizọs ọ̀ bụ enyi, Jizọs chọpụtara na onye a bụbu enyi ya enweela obi ọjọọ. Judas ghọrọ onye iro Chineke n’ihi na ọ ghọọla enyi ụwa. (Jems 4:4) Jizọs achụpụlarị Judas tupu ya agwa ndịozi ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi na ha bụ ndị enyi ya.—Jọn 13:21-35.

7, 8. Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ndị enyi ya n’anya?

7 Jizọs elekwasịghị anya n’ebe ezigbo ndị enyi ya na-anaghị emezi emezi, o mekwaara ha ihe ọma. Dị ka ihe atụ, o kpere ekpere ka Nna ya chebe ha mgbe ọnwụnwa bịaara ha. (Gụọ Jọn 17:11.) Jizọs gosiri na ya ma ihe ha ga-emeli nakwa ihe ha na-agaghị emeli. (Mak 6:30-32) Ihe bụ́ mkpa ya abụghị naanị ịgwa ha ihe chere, kamakwa, ọ na-ege ha ntị iji ghọta ihe ha chere nakwa otú obi dị ha.—Mat. 16:13-16; 17:24-26.

8 Jizọs nyeere ndị enyi ya aka mgbe ọ nọ ndụ, ọ nwụkwara n’ihi ha. Ọ bụ eziokwu na Jizọs ma na ya aghaghị iji ndụ ya chụọ àjà ka o wee mee ihe Nna ya chọrọ iji gosi na Nna ya na-ekpe ikpe ziri ezi, ma, ọ bụ ịhụnanya o nwere n’ebe ndị mmadụ nọ mere o ji jiri ndụ ya chụọ àjà. (Mat. 26:27, 28; Hib. 9:22, 28) Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.”—Jọn 15:13.

Olee Ihe Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Mere Banyere Ọbụbụ Ha na Ya Bụ Enyi?

9, 10. Olee ihe ndị Jizọs meere ihe ọma mere?

9 Jizọs wepụtara nnọọ oge ya iji nyere ndị mmadụ aka. O nyekwara ha ihe ndị na-akpa ha, hụkwa ha n’anya. Nke a mere ka ndị mmadụ bịaruo ya nso, nweekwa obi ụtọ iji ihe ha nwere jeere ya ozi. (Luk 8:1-3) Jizọs si na nke a mara na ọ bụrụ na anyị emeere ndị ọzọ ihe ọma, ha ga-emekwara anyị. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. Ha ga-awụnyekwa n’apata ụkwụ unu ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma, nke a bịara aka, yọkọta ọnụ, nke jubigakwara ókè. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”—Luk 6:38.

10 E nwere ndị soro Jizọs naanị n’ihi ihe ha na-erite n’aka ya. Ndị a na-abụghị ezigbo ndị enyi ya hapụrụ ya mgbe ha na-aghọtaghị otu n’ime ihe ndị o kwuru. Kama ịtụkwasị Jizọs obi, ha ghọtahiere ya ma kwụsị iso ya. Ma, ndịozi ya nọgidere na-eso ya. O nwere ọtụtụ ihe nwalere ma hà bụ ezigbo ndị enyi Kraịst, ma, ha mere ihe niile ha nwere ike ime iji kwado Jizọs, ma mgbe ihe dị mma ma mgbe e nwere nsogbu. (Gụọ Jọn 6:26, 56, 60, 66-68.) N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, o gosiri ndị enyi ya na ya hụrụ ha n’anya. Ọ sịrị: “Ọ bụ unu rapaara m n’ahụ́ n’ọnwụnwa m dị iche iche.”—Luk 22:28.

11, 12. Olee otú Jizọs si mesie ndị na-eso ụzọ ya obi ike, oleekwa ihe ha mere?

11 N’oge na-adịghị anya ka Jizọs jachara ndị na-eso ụzọ ya mma n’ihi otú ha si kwụsie ike n’akụkụ ya, ha hapụrụ ya gbalaga. Ha kwere ka egwu mmadụ mee ka ha chefuo ịhụnanya ha nwere n’ebe Kraịst nọ. Ma, Jizọs gbaghaara ha. Mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ, o mesiri ha obi ike na ha ka bụ ndị enyi ya. O nyekwara ha ọrụ dị nsọ ha ga-arụ, ya bụ, ime “ndị mba niile” ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, nakwa ịbụ ndị àmà ya ‘ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Mat. 28:19; Ọrụ 1:8) Gịnị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs mere?

12 Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe niile ha nwere ike ime iji kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Jehova ji mmụọ ya nyere ha aka, nke a mekwara ka ha mee ka ozizi ha jupụta Jeruselem n’egbughị oge. (Ọrụ 5:27-29) Egwu e yiri ha na a ga-egbu ha emeghịdị ka ha kwụsị ime ihe Jizọs gwara ha mee, nke bụ́ ime ndị ọzọ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Mgbe iri afọ ole na ole gafere ka Jizọs nyechara ha iwu a, Pọl onyeozi dere na e kwusaala ozi ọma ahụ “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) N’ezie, ndị na-eso ụzọ Jizọs gosiri nnọọ na obi dị ha ụtọ na ha na Jizọs bụ enyi!

13. Olee otú ihe Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya si gbanwee ha?

13 Ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs kwekwara ka ihe ndị Jizọs kụziiri ha gbanwee ndụ ha. Ọtụtụ n’ime ha gbanwere àgwà ndị jọgburu onwe ha ha na-akpabu. Ụfọdụ ndị, bụ́ ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, bụbu ndị ha na nwoke ibe ha ma ọ bụ nwaanyị ibe ha na-enwe mmekọahụ, ndị ha na onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ, ndị aṅụrụma, ma ọ bụ ndị ohi. (1 Kọr. 6:9-11) Ndị ọzọ gbanwere otú ha si ele ndị na-abụghị ndị agbụrụ ha anya. (Ọrụ 10:25-28) N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ha mere ihe Jizọs gwara ha mee. Ha yipụrụ mmadụ ochie ma yiri mmadụ ọhụrụ. (Efe. 4:20-24) Ha mụtara “uche nke Kraịst,” ghọtakwa otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà ma ṅomie ya.—1 Kọr. 2:16.

Otú Anyị na Kraịst Si Abụ Enyi Taa

14. Gịnị ka Jizọs kwere nkwa na ya ga-eme n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a”?

14 Ọtụtụ n’ime Ndị Kraịst na narị afọ mbụ ma Jizọs, ọtụtụ ndị ọzọ hụkwara ya mgbe o si n’ọnwụ bilie. O doro anya na ọ dịghị onye n’ime anyị hụtụrụla ya. Oleezi otú anyị ga-esi abụ ndị enyi ya? Otu n’ime ụzọ anyị na ya ga-esi abụ enyi bụ ime ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nke bụ́ ụmụnna ime mmụọ ya e tere mmanụ ka nọ ndụ n’ụwa, kwuru. Jizọs kwere nkwa na ya ga-ahọpụta ohu a n’oge “ọgwụgwụ usoro ihe a” ka ọ “na-elekọta ihe niile o nwere.” (Mat. 24:3, 45-47) Taa, ọtụtụ n’ime ndị na-agba mbọ ịbụ ndị enyi Kraịst esoghị n’ohu a. Olee otú otú ha si eme ihe ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi kwuru si ekpebi ma ha na Kraịst ọ̀ ga-abụ enyi?

15. Gịnị na-ekpebi ma mmadụ ọ̀ ga-abụ atụrụ ka ọ̀ ga-abụ ewu?

15 Gụọ Matiu 25:31-40. Jizọs kpọrọ ndị so n’ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ụmụnna ya. N’ihe atụ ahụ Jizọs nyere banyere ikewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ, o kwuru na ọ bụ ya ka e mere ihe ọ bụla e mere ụmụnna ya. Ọ sịrị na ihe ga-egosi ma mmadụ ọ̀ bụ atụrụ ma ọ̀ bụ ewu bụ otú onye ahụ si mesoo “otu n’ime ndị kasị nta n’ime ụmụnna [ya] ndị a.” N’ihi ya, ụzọ bụ́ isi ndị nwere olileanya ibi n’ụwa si egosi na ha chọrọ ka ha na Kraịst bụrụ enyi bụ ịkwado ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi.

16, 17. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na ụmụnna Kraịst bụ enyi?

16 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa n’Alaeze Chineke, olee otú i nwere ike isi mete ụmụnna Kraịst enyi? Ka anyị tụlee naanị ụzọ atọ i nwere ike isi mee nke a. Nke mbụ bụ site n’iji obi gị dum na-ekwusa ozi ọma. Kraịst gwara ụmụnna ya ka ha kwusaa ozi ọma n’ụwa niile. (Mat. 24:14) Ma, ọ ga-ara ndị fọdụrụ n’ime ụmụnna ya nọ n’ụwa ahụ́ ịrụ ọrụ a naanị ha ma ọ bụrụ na atụrụ ọzọ enyeghịrị ha aka. N’ezie, mgbe ọ bụla ndị so n’atụrụ ọzọ na-ekwusa ozi ọma, ha na-enyere ụmụnna Kraịst aka ịrụ ọrụ a dị nsọ e nyere ha. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, nwere obi ụtọ dị ukwuu maka aka a ndị enyi ha na-enyere ha, obi dịkwa Kraịst ụtọ.

17 Ụzọ nke abụọ atụrụ ọzọ nwere ike isi nyere ụmụnna Kraịst aka bụ site n’iji ego na-akwado ọrụ nkwusa Alaeze. Jizọs gbara ndị na-eso ụzọ ya ume ka ha jiri “akụ̀ ajọ omume” metere onwe ha enyi. (Luk 16:9) Nke a apụtaghị na anyị ga-akwụ Jizọs ma ọ bụ Jehova ego ka anyị na ha wee bụrụ enyi. Kama nke ahụ, ọ bụrụ na anyị ejiri ihe onwunwe anyị na-akwado ọrụ Alaeze Chineke, anyị na-egosi na anyị na ha bụ enyi nakwa na anyị hụrụ ha n’anya, ọ bụghị n’ọnụ kama, “n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:16-18) Anyị na-eji ego enye aka ma ọ bụrụ na anyị esoro na-ekwusa ozi ọma, nye ego a ga-eji na-arụ ma na-elekọta ebe ndị anyị na-anọ amụ ihe, nakwa ego a ga-eji hụ na a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Ma, ego anyị nyere ọ̀ dị obere ma ò buru ibu, Jehova na Jizọs nwere mmasị n’ihe anyị ji obi ụtọ na-enye.—2 Kọr. 9:7.

18. Olee otú anyị kwesịrị isi na-eme ihe ndị okenye ji Baịbụl gwa anyị ka anyị mee?

18 Ụzọ nke atọ anyị niile ga-esi egosi na anyị bụ ndị enyi Kraịst bụ site n’irubere ndị okenye ọgbakọ isi. E ji mmụọ nsọ họpụta ha. (Efe. 5:23) Pọl onyeozi dere, sị: “Na-eruberenụ ndị na-edu ndú n’etiti unu isi, na-anọkwanụ n’okpuru ha.” (Hib. 13:17) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe ndị okenye ọgbakọ ji Baịbụl gwa anyị ka anyị mee. Anyị nwere ike ịhụ ebe ndị ha na-anaghị emete, nke a nwekwara ike ime ka anyị leda ndụmọdụ ha na-enye anyị anya. N’agbanyeghị na ha ezughị okè, Kraịst, bụ́ Isi nke ọgbakọ, ka ji ha na-arụ ọrụ. N’ihi ya, otú anyị si erubere ha isi ga-ekpebi ma ànyị na Kraịst ọ̀ ga-abụ enyi ma ọ bụkwanụ ma anyị na ya agaghị abụ. Ọ bụrụ na anyị eleghara ebe ndị okenye na-anaghị emezi emezi anya, ma jiri obi ụtọ na-erubere ha isi, anyị na-egosi na anyị hụrụ Kraịst n’anya.

Ebe Anyị Nwere Ike Ịchọta Ezigbo Ndị Enyi

19, 20. Gịnị ka anyị nwere ike ịhụ n’ọgbakọ, oleekwa ihe ọzọ anyị ga-atụle?

19 Ọ bụghị naanị site n’aka ndị ọzụzụ atụrụ hụrụ atụrụ ha na-elekọta n’anya ka Jizọs si elekọta anyị, kama ọ na-esikwa n’aka ndị nne ime mmụọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom ime mmụọ anyị nọ n’ọgbakọ elekọta anyị. (Gụọ Mak 10:29, 30.) Olee ihe ndị ikwu gị mere mgbe ị batara n’ọgbakọ Jehova ọhụrụ? Eleghị anya ha kwadoro mkpebi i mere ịbịaru Chineke na Kraịst nso. Ma, Jizọs gwara anyị na mgbe ụfọdụ “ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.” (Mat. 10:36) Ọ bụ ihe na-akasi nnọọ obi na n’ime ọgbakọ, anyị nwere ike ịhụ ndị ga-anọ anyị nnọọ nso karịa ụmụnne anyị.—Ilu 18:24.

20 Ekele Pọl ji mechie akwụkwọ ozi o degaara ọgbakọ dị na Rom gosiri na o nwere ọtụtụ ezigbo ndị enyi. (Rom 16:8-16) Jọn onyeozi si otú a mechie akwụkwọ ozi ya nke atọ: “Keleere m ndị enyi anyị n’otu n’otu.” (3 Jọn 14) O doro anya na yanwa nwekwara ọtụtụ ezigbo ndị enyi. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya nke oge ochie site n’imete ụmụnna anyị enyi na ịhụ na anyị na ha nọgidere na-abụ ezigbo enyi? Anyị ga-aza ajụjụ a n’isiokwu na-eso.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ n’otú mmadụ ga-esi bụrụ ezigbo enyi?

• Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si gosi na obi dị ha ụtọ na Jizọs bụ enyi ha?

• Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị bụ ndị enyi Kraịst?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 14]

Jizọs chọrọ ịma ihe ndị enyi ya na-eche nakwa otú obi dị ha

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị chọrọ ka anyị na Kraịst bụrụ enyi?