Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Nwanna nwaanyị ò kwesịrị ikpuchi isi ya ma ọ na-asụgharị asụsụ ndị ogbi n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ ná mgbakọ?

Anyị manụ na nwanna nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-arụ ihe di ya ma ọ bụ nwanna nwoke ọzọ kwesịrị ịrụ n’ọgbakọ. Nke a kwekọrọ n’ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ sịrị na “nwaanyị ọ bụla nke na-ekpuchighị isi ya na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ebu amụma na-emenye isi ya ihere” n’ihi na ‘nwoke bụ isi nke nwaanyị.’ (1 Kọr. 11:3-10) Nwanna nwaanyị na-egosi na ọ na-erube isi n’usoro ihe si aga n’ọgbakọ Ndị Kraịst ma o jiri ihe kwesịrị ekwesị kpuchie isi mgbe ọ na-eme ihe ndị a.—1 Tim. 2:11, 12. *

Ma, nwanna nwaanyị ò kwesịrị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-asụgharịrị ndị ogbi ihe nwanna nwoke nọ n’ikpo okwu na-ekwu? Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe nwanna nwaanyị ahụ na-asụgharị bụ ihe onye ọzọ na-ekwu. Ya bụ na ọ bụghị ya na-ezi ihe, kama ọ bụ nwanna nwoke ahụ ọ na-asụgharị ihe ọ na-ekwu. Ma, ịsụgharịrị ndị ogbi okwu dị nnọọ iche n’ịtụgharị okwu n’asụsụ ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ ana-atụgharị okwu nke na-abụghị asụsụ ndị ogbi, ndị na-ege ntị nwere ike na-ele ọkà okwu anya ma na-anụ ihe onye ahụ nke na-atụgharị okwu na-ekwu. Ụmụnna nwaanyị ndị na-atụgharị ụdị okwu a anaghị anọkarịkwa ebe onye ọ bụla ga na-ahụ ha dị ka ndị na-asụgharị asụsụ ndị ogbi na-eme. Mgbe ụfọdụ, ha na-anọ n’oche ma ha na-atụgharị okwu, ma ọ bụkwanụ guzo ọtọ ma na-ele ọkà okwu anya kama ile ndị na-ege ntị anya. Ya mere, ọ gaghị adị mkpa ka nwanna nwaanyị nke na-atụgharị okwu nke na-abụghị asụsụ ndị ogbi kpuchie isi ya.

Ihe ọzọ bụkwa na ihe dị iche iche e ji nkà na ụzụ rụpụta na-eme ka onye na-asụgharịrị ndị ogbi ihe a na-ekwu bụrụ onye ndị na-ege ntị na-ewere na ọ bụ ya na-ekwu okwu ahụ. Ọtụtụ mgbe, ndị na-ege ntị anaghịdị ahụ ọkà okwu anya, ma, ha na-ahụ onye na-asụgharị ihe ọ na-ekwu ná nnukwu tiivi. N’ihi ihe ndị a niile, nwanna nwaanyị na-asụgharịrị ndị ogbi ihe kwesịrị ikpuchi isi ya iji gosi na ọ bụghị ya bụ ọkà okwu ahụ.

Olee otú ihe anyị kwuru n’isiokwu a, nke na-abụghị ihe a na-emebu, ga-esi metụta otú e si asụgharịrị ndị ogbi okwu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, mgbe a na-eme ihe ngosi, mgbe a na-aza ajụjụ n’Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, mgbe a na-eme ihe omume ná Nzukọ Ije Ozi, nakwa n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche? Nwanna nwaanyị ò kwesịrị ikpuchi isi ya ma ya na-atụgharịrị ndị ogbi okwu a na-ekwu n’oge ndị a? O yiri ka ọ dịghị mkpa ka nwanna nwaanyị na-ekpuchi isi ya n’oge ụfọdụ, ebe ọ bụ na ndị niile na-ege ntị ga-aghọta na ọ bụghị ya na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ dịghị mkpa ka o kpuchie isi ya ma ọ na-atụgharị ajụjụ ndị na-ege ntị na-aza, ihe omume nwanna nwaanyị na-eme, ma ọ bụ ihe ngosi. Ma, o kwesịrị ikpuchi isi ya ma ọ na-atụgharị ihe omume ụmụnna ndị ikom, mgbe ọ na-atụgharị ihe nwanna nwoke na-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-ekwu ma ọ bụ ihe onye na-eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ na-ekwu, ma ọ bụkwanụ mgbe ọ bụ ya na-edu ndú n’ịsụgharịrị ndị ogbi abụ. A bịa ọmụmụ ihe, nwanna nwaanyị nwere ike ịtụgharị okwu ụmụnna ndị ikom, ụmụnna ndị inyom, ụmụaka, na ndị okenye na-ekwu. N’ihi ya, o nwere ike ịka mma ka nwanna nwaanyị ga-eme ihe ndị a kpuchie isi ya ruo mgbe a mụchara ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụrụ na ị chọọ ịmatakwu ihe anyị kwurula banyere mgbe nwanna nwaanyị kwesịrị ikpuchi isi ya, gụọ akwụkwọ bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” peeji nke 209 ruo nke 212.