Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?

Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?

Gịnị Ka Ekpere Gị Na-egosi Banyere Gị?

“Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” —ỌMA 65:2.

1, 2. Gịnị mere ndị ohu Jehova ga-eji jiri obi ike na-ekpeku ya ekpere?

JEHOVA na-anụ ekpere nke ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi na-ekpeku ya. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-anụ nke anyị. Ọ bụrụgodị na nde kwuru nde Ndịàmà Jehova ekpekuo Chineke ekpere n’otu oge, ọ ga-anụ ha niile.

2 Obi siri ọbụ abụ bụ́ Devid ike na Chineke na-anụ ekpere ya. Nke a mere o ji kwuo, sị: “Gị Onye na-anụ ekpere, ọ bụ gị ka anụ ahụ́ niile bụ́ mmadụ ga-abịakwute.” (Ọma 65:2) Jehova zara ekpere Devid n’ihi na ọ na-efe ya. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ekpere m ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị Jehova obi nakwa na m ji ife ya kpọrọ ihe? Gịnị ka ekpere m na-egosi banyere m?’

Jiri Obi Umeala Na-ekpeku Jehova Ekpere

3, 4. (a) Olee ụdị obi anyị ga-eji na-ekpeku Chineke ekpere? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị ‘na-echegbu onwe anyị’ n’ihi mmehie dị oké njọ anyị mere?

3 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke na-aza anyị ekpere, anyị aghaghị iji obi umeala na-ekpeku ya ekpere. (Ọma 138:6) Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nyochaa anyị, dị ka Devid gwara ya mgbe ọ sịrị: “Chineke, biko, nyochaa m, marakwa obi m. Nyochaa m, marakwa nchegbu m, lee ma m̀ na-eje ije n’ụzọ ọ bụla nke na-eweta ihe mgbu, na-edukwa m n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi.” (Ọma 139:23, 24) Ọ bụghị naanị ekpere ka anyị ga na-ekpeku Jehova, kamakwa anyị kwesịrị ikwe ka o nyochaa anyị, kwesịkwa ịnabata ndụmọdụ sitere n’Okwu ya. Jehova nwere ike idu anyị “n’ụzọ nke mgbe ebighị ebi,” nke ga-enyere anyị aka ịkpa àgwà ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi.

4 Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị ‘na-echegbu onwe anyị’ n’ihi mmehie dị oké njọ anyị mere? (Gụọ Abụ Ọma 32:1-5.) Mmadụ ịgbalị ileghara obi ahụ na-ama ya ikpe anya nwere ike ime ka ike gwụ ya, dị nnọọ ka osisi na-akpọ nkụ n’oge ọkọchị. Mmehie Devid mere mere ka ọ kwụsị inwe obi ụtọ, o nwekwara ike ịbụ na ọ kpataara ya ọrịa. Ma, o nweere onwe ya mgbe o kwupụtaara Chineke mmehie ya. Cheedị otú obi dị Devid mgbe ọ chọpụtara na Jehova agbagharala ya “nnupụisi ya.” Ahụ́ ga-eru onye mere mmehie ala ma ọ bụrụ na o kwupụtara Chineke mmehie ya, ya na Chineke ga-adịghachikwa ná mma ma ọ bụrụkwa na ndị okenye enyere ya aka.—Ilu 28:13; Jems 5:13-16.

Rịọ Chineke Arịrịọ, Keleekwa Ya

5. Olee mgbe ọ kacha mkpa ka anyị rịọ Jehova arịrịọ?

5 Ọ bụrụ na e nwere ihe na-echegbu anyị, anyị kwesịrị ime ihe Pọl dụrụ n’ọdụ. Ọ sịrị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” (Fil. 4:6) Mgbe ọ kacha mkpa ka anyị rịọ Jehova ka o nyere anyị aka ma duzie anyị bụ mgbe anyị nọ n’ihe ize ndụ ma ọ bụ mgbe a na-akpagbu anyị.

6, 7. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị ịna-ekele Jehova mgbe anyị na-ekpe ekpere?

6 Ma, ọ bụrụ na mgbe anyị na-ekpe ekpere bụ naanị mgbe ihe dị anyị mkpa, gịnị ka nke ahụ na-egosi banyere ihe dị anyị n’obi? Pọl kwuru na anyị kwesịrị ‘iji ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike’ mee ka Chineke mara ihe na-akpa anyị. N’ezie, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwuo ihe Devid kwuru mgbe ọ sịrị: “Jehova, gị onwe gị nwe ịdị ukwuu na ike na ịma mma na  ebube na nsọpụrụ; n’ihi na ihe niile dị n’eluigwe na n’elu ụwa bụ nke gị. Jehova, Onye na-emekwa onwe ya ka ọ dị elu dị ka onyeisi nke mmadụ niile ọ bụ gị nwe alaeze. . . . Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-ekele gị ma na-eto aha ọma gị.”—1 Ihe 29:11-13.

7 Jizọs kelere Chineke maka nri o nyere ha nakwa maka achịcha a tara n’oge Nri Anyasị nke Onyenwe anyị nakwa maka mmanya a ṅụrụ n’oge ahụ. (Mat. 15:36; Mak 14:22, 23) E wezụga ikele Jehova maka ihe oriri ọ na-enye anyị, anyị kwesịkwara ‘ikele ya’ maka “ọrụ dị ebube ndị ọ na-arụrụ ụmụ mmadụ,” keleekwa ya maka “mkpebi ikpe [ya] ziri ezi,” nakwa maka okwu ya, ma ọ bụ ozi ya, bụ́ nke dị ugbu a na Baịbụl.—Ọma 107:15; 119:62, 105.

Na-ekpe Ekpere Maka Ndị Ọzọ

8, 9. Olee ihe mere anyị ji kwesị ikpe ekpere maka ụmụnna anyị?

8 O doro anya na anyị na-ekpe ekpere maka mkpa anyị, ma, anyị kwesịkwara itinye ndị ọzọ n’ekpere, ọbụna Ndị Kraịst ndị anyị na-amaghị. N’agbanyeghị na o nwere ike ịbụ na Pọl onyeozi amaghị Ndị Kraịst niile nọ na Kọlọsi, o dere, sị: “Anyị na-ekele Chineke bụ́ Nna nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst oge niile mgbe anyị na-ekpe ekpere maka unu, ebe anyị nụrụ banyere okwukwe unu nwere n’ime Kraịst Jizọs na ịhụnanya unu nwere maka ndị nsọ niile.” (Kọl. 1:3, 4) Pọl kpekwara ekpere maka Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka. (2 Tesa. 1:11, 12) Ụdị ekpere a na-egosi ụdị ndị anyị bụ, na-egosikwa otú anyị si ele ụmụnna anyị anya.

9 Ekpere anyị na-ekpe maka Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ “atụrụ ọzọ,” na-egosi na ihe banyere ọgbakọ Chineke na-echu anyị ụra. (Jọn 10:16) Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha kpee ekpere ‘ka e wee nye ya ike ikwu okwu ka ya wee jiri nkwuwa okwu mee ka a mara ihe nzuzo dị nsọ banyere ozi ọma ahụ.’ (Efe. 6:17-20) Ànyị na-ekpe ụdị ekpere a maka ụmụnna anyị?

10. Olee otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ ihe ma ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere maka ha?

10 Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere maka ndị ọzọ, ọ ga-agbanwe otú anyị si emeso ha ihe. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere maka onye ihe ya na-anaghị amasịcha anyị, ọ ga-esi ike anyị emee ya ihe ọjọọ? (1 Jọn 4:20, 21) Ụdị ekpere a na-ewusi okwukwe ndị ọzọ ike ma na-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’otu. Ekpere ndị dị otú a na-egosikwa na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya ka Kraịst. (Jọn 13:34, 35) Àgwà dị otú a so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Chineke. Ànyị na-ekpe ekpere n’otu n’otu ka Jehova nye anyị mmụọ nsọ ya, nakwa ka o nyere anyị aka inwe àgwà ndị so ná mkpụrụ ya, ndị gụnyere ịhụnanya, ọṅụ, udo, ogologo ntachi obi, obiọma, ịdị mma, okwukwe, ịdị nwayọọ, na njide onwe onye? (Luk 11:13; Gal. 5:22, 23) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, ihe ndị anyị na-ekwu na ihe ndị anyị na-eme ga na-egosi na anyị na-eje ije ná mmụọ nsọ.—Gụọ Ndị Galeshia 5:16, 25.

11. Olee ihe mere ị ga-eji kwuo na ọ dị mma ịgwa ndị ọzọ ka ha cheta anyị n’ekpere?

11 Ọ bụrụ na anyị amata na a na-anwa ụmụ anyị ọnwụnwa ka ha ghọọ aghụghọ ule, anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ha ma jiri Akwụkwọ Nsọ nyere ha aka ka ha ghara itinye aka n’aghụghọ ule ma ghara ime ihe ọjọọ. Pọl gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, sị: “Anyị na-ekpeku Chineke ekpere ka unu ghara ime ihe ọjọọ ọ bụla.” (2 Kọr. 13:7) Ekpere dị otú a e ji obi umeala kpee na-amasị Jehova, ọ na-egosikwa na anyị na-eme nke ọma. (Gụọ Ilu 15:8.) Anyị nwekwara ike ịgwa ndị ọzọ ka ha cheta anyị n’ekpere, dị ka Pọl onyeozi mere. O dere, sị: “Na-ekpenụ ekpere maka anyị, n’ihi na anyị kwenyesịrị ike na anyị nwere akọ na uche ziri ezi, ebe anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”—Hib. 13:18.

Ihe Ndị Ọzọ Ekpere Anyị Na-egosi Banyere Anyị

12. Olee ihe ndị anyị kwesịrị ịna-ekpe n’ekpere?

12 Ekpere anyị ọ̀ na-egosi na anyị bụ Ndịàmà Jehova nwere obi ụtọ ma na-anụ ọkụ n’obi? Ànyị na-ekpe ekpere ka e mee uche Chineke, ka a na-ekwusa ozi ọma Alaeze ya, ka e gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, nakwa ka e doo aha ya nsọ? Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere maka ihe ndị a, dị ka Jizọs gosiri n’ekpere ahụ ọ kụziiri anyị, bụ́ nke si otú a malite: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.”—Mat. 6:9-11.

13, 14. Gịnị ka ekpere anyị na-egosi banyere anyị?

13 Ihe ndị anyị na-ekpe n’ekpere na-egosi ihe dị anyị n’obi, ihe na-amasị anyị, na ihe bụ́ ọchịchọ anyị. Jehova ma ụdị ndị anyị bụ. Ilu 17:3 kwuru, sị: “Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha, ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo, ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.” Chineke na-ahụ ihe dị anyị n’obi. (1 Sam. 16:7) Ọ ma ihe anyị na-eche banyere ọmụmụ ihe, ozi ọma, na ụmụnna anyị. Jehova ma ihe anyị na-eche banyere “ụmụnna” Kraịst. (Mat. 25:40) Ọ ma ma ihe anyị na-ekpe n’ekpere ọ̀ dị anyị mkpa n’ezie ka ihe anyị na-eme ọ̀ bụ naanị ikpeghachi otu ihe ugboro ugboro. Jizọs sịrị: “Ma mgbe ị na-ekpe ekpere, ekwughachila otu ihe ugboro ugboro, dị ka ndị mba ọzọ na-eme, n’ihi na ha na-eche na a ga-anụ olu ha n’ihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu.”—Mat. 6:7.

14 Ihe anyị na-ekpe n’ekpere na-egosikwa otú anyị tụkwasịruru Chineke obi. Devid kwuru, sị: “Ị bụụrụ m ebe mgbaba, bụkwaara m ụlọ elu siri ike n’ihu onye iro. M ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu gị ruo mgbe ebighị ebi; m ga-agbaba n’okpuru nku gị.” (Ọma 61:3, 4) Ọ bụrụ na Chineke ‘agbasaa ụlọikwuu ya n’isi anyị,’ ọ na-echebe anyị. (Mkpu. 7:15) Ọ bụ ihe na-akasi obi ikpeku Jehova ekpere ma nwee obi ike na ‘ọ nọnyeere anyị’ mgbe ọnwụnwa bịaara anyị.—Gụọ Abụ Ọma 118:5-9.

15, 16. Olee ihe ekpere ga-eme ka anyị mata banyere ihe mere anyị ji achọ inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ?

15 Ikpeku Jehova ekpere ma gwa ya ihe dị anyị n’obi ga-enyere anyị aka ịmata ihe anyị bu n’obi n’ezie. Dị ka ihe atụ, ọchịchọ anyị nwere inwe ihe ùgwù n’ọgbakọ ọ̀ bụ n’ihi na anyị chọrọ inyere ndị ọzọ aka nakwa n’ihi na anyị chọrọ ịhụ na ihe metụtara Alaeze Chineke na-aga nke ọma? Ka ọ̀ bụ n’ihi na anyị chọrọ ịnọ “n’ọkwá mbụ” ma ọ bụkwanụ chọọ ime ka ọ̀ bụ anyị “nwe” ndị ọzọ? O kwesịghị ịdị otú a n’etiti ndị Jehova. (Gụọ 3 Jọn 9, 10; Luk 22:24-27.) Ọ bụrụ na anyị nwere ọchịchọ na-ezighị ezi, ịgwa Jehova Chineke eziokwu n’ekpere nwere ike ime ka anyị mata ihe ndị dị anyị n’obi n’ezie, ọ ga-emekwa ka anyị gbanwee ha tupu ha agbanye mgbọrọgwụ.

16 Ụmụnna nwaanyị nwere ike na-achọsi ike ka ndị di ha bụrụ ndị ohu na-eje ozi, mechaakwa bụrụ ndị okenye, ma eleghị anya. Ụmụnna nwaanyị ndị a nwere ike ime ihe banyere ihe ahụ ha na-ekpe n’ekpere site n’ịgba mbọ na-esetịpụ ezigbo ihe nlereanya n’ọgbakọ. Ihe mere ha ji kwesị ime nke a bụ n’ihi na otú ndị ezinụlọ mmadụ si ekwu okwu ma ọ bụ na-akpa àgwà na-ekpebi otú a ga-esi na-ele onye ahụ anya n’ọgbakọ.

Otú Anyị Ga-esi Na-edu Ndị Ọzọ n’Ekpere

17. Olee ihe mere o ji dị mma ka anyị nọrọ ebe dị jụụ mgbe anyị chọrọ ikpeku Chineke ekpere naanị anyị?

17 Jizọs hapụrụ ndị mmadụ ọtụtụ mgbe ka o wee nwee ike ịga ebe naanị ya ga-anọ ka o wee kpekuo Nna ya ekpere. (Mat. 14:13; Luk 5:16; 6:12) Anyị kwesịkwara ịna-eme otú a. Mgbe anyị na-ekpe ekpere n’ebe dị jụụ, anyị ga-enwe ike ime mkpebi ndị ga-amasị Jehova ma mee ka anyị na ya dịkwuo ná mma. Jizọs kpekwara ekpere n’ihu ọha, ọ dịkwa mma ka anyị tụlee otú anyị nwere ike isi mee nke a n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

18. Olee ihe ndị ụmụnna ndị nwoke kwesịrị iburu n’uche mgbe ha na-edu ọgbakọ n’ekpere?

18 Ụmụnna nwoke ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-edu ọgbakọ n’ekpere. (1 Tim. 2:8) Ụmụnna ndị ọzọ kwesịrị ịsị “amen,” ya bụ “ka ọ dị otú ahụ,” mgbe ha kpechara. Ma, ha ga-asị amen naanị ma ọ bụrụ na ha kwere n’ihe o kpere n’ekpere. E nweghị ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ekpere ahụ Jizọs kụziiri anyị. (Luk 11:2-4) O kwughịkwa ihe niile banyere mkpa nke onye nke ọ bụla n’ime ndị na-ege ya ntị, ma ọ bụkwanụ ihe niile banyere nsogbu ha. Ihe ndị a bụ ihe mmadụ ga-ekwu mgbe ọ nọ naanị ya na-ekpeku Jehova ekpere ọ bụghị mgbe ọ na-edu ìgwè mmadụ n’ekpere. Anyị ekwesịghịkwa ikwu ihe ndị a na-ezo ezo mgbe anyị na-edu ìgwè mmadụ n’ekpere.

19. Olee otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà mgbe a na-ekpe ekpere n’ihu ọha?

19 Mgbe a na-edu anyị n’ekpere, anyị kwesịrị igosi na anyị na-atụ “egwu Chineke.” (1 Pita 2:17) E nwere ihe ụfọdụ a na-ekwesịghị ime n’ọmụmụ ihe, ma, e nwere ike ime ha n’ebe ọzọ ma ọ bụ n’oge ọzọ. (Ekli. 3:1) Dị ka ihe atụ, ka e were ya na mmadụ chọrọ ka ndị mmadụ niile jide ibe ha aka mgbe a na-ekpe ekpere. Nke a nwere ike ghara ịmasị ndị ụfọdụ, gụnyere ndị ọbịa na-abụghị Ndịàmà Jehova, o nwekwara ike ịdọpụ uche ha. Ụfọdụ di na nwunye nwere ike iji akọ jide ibe ha aka. Ma, ọ bụrụ na ha amakụọ ibe ha, nke a nwere ike ime ka ndị hụrụ ha sụọ ngọngọ. Ha nwere ike iche na di na nwunye ahụ na-eche banyere onwe ha mgbe a na-ekpe ekpere, kama iche banyere Jehova. N’ihi ya, iji kwanyere Jehova ùgwù, ka anyị ‘na-eme ihe niile iji nye Chineke otuto’ ma zere ime ihe ga-adọpụ uche ndị ọzọ, ma ọ bụ ihe ga-awụ ha akpata oyi n’ahụ́, ma ọ bụkwanụ mee ka ha sụọ ngọngọ.—1 Kọr. 10:31, 32; 2 Kọr. 6:3.

Olee Ihe Anyị Kwesịrị Ikpe n’Ekpere?

20. Olee otú ị ga-esi kọwaa Ndị Rom 8:26, 27?

20 Mgbe ụfọdụ, e nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-ekwu mgbe naanị anyị na-ekpe ekpere. Pọl dere, sị: “Anyị amaghị nsogbu nke anyị kwesịrị ikpe ekpere maka ya dị ka ọ dị anyị mkpa ịdị na-ekpe, ma mmụọ nsọ n’onwe ya na-arịọrọ anyị arịrịọ mgbe anyị na-asụ ude n’ekwughị okwu. Ma onye ahụ [ya bụ, Chineke] nke na-enyocha obi maara ihe bụ́ nzube nke mmụọ nsọ.” (Rom 8:26, 27) Jehova mere ka e dee ọtụtụ ekpere n’Akwụkwọ Nsọ. Ọ na-anabata ekpere ndị a dị ka à ga-asị na ọ bụ anyị kpere ha, ma na-emere anyị ha. Chineke ma anyị, marakwa ihe ihe ndị o nyere ndị dere Baịbụl ike mmụọ nsọ ka ha kwuo pụtara. Jehova na-aza ekpere anyị mgbe mmụọ nsọ “na-arịọrọ” anyị arịrịọ. Ma, ka anyị na-amụ Okwu Chineke na-aga, ọ gaghịzi na-ara anyị ahụ́ ịmata ihe anyị ga-ekpe n’ekpere.

21. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

21 Dị ka anyị kwuru, ekpere anyị na-egosi ọtụtụ ihe banyere anyị. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike igosi ma anyị na Jehova ọ̀ dị n’ezigbo mma, gosikwa otú anyị maruru Okwu ya. (Jems 4:8) N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-atụle ekpere ụfọdụ na okwu ndị yiri ekpere, bụ́ ndị e dere na Baịbụl. Olee otú ịtụle ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ ga-esi enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-ekpeku Chineke ekpere?

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Olee ụdị àgwà anyị kwesịrị ịna-akpa mgbe anyị na-ekpeku Jehova ekpere?

• Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-etinye ụmụnna anyị n’ekpere?

• Olee ihe ekpere anyị nwere ike igosi banyere anyị na ihe anyị bu n’obi?

• Olee otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà mgbe a na-ekpe ekpere n’ihu ọha?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 4]

Ị̀ na-eto Jehova ma na-ekele ya mgbe niile?

[Foto dị na peeji nke 6]

Mgbe a na-ekpe ekpere n’ihu ọha, anyị kwesịrị ị na-akpa àgwà otú ga-ewetara Jehova nsọpụrụ