Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Iji Obi Ụtọ Na-enye Onyinye

Iji Obi Ụtọ Na-enye Onyinye

Iji Obi Ụtọ Na-enye Onyinye

PỌL onyeozi dere banyere inye onyinye, sị: “Ka onye ọ bụla nye dị ka o kpebiri n’obi ya.” O kwukwara, sị: “Ọ bụghị ná mwute ma ọ bụ ná mmanye, n’ihi na Chineke hụrụ onye na-eji obi ụtọ enye ihe n’anya.” (2 Kọr. 9:7) Jehova anaghị amanye onye ọ bụla ka ọ kwado ofufe a na-efe ya. Ọ na-ahapụ ndị ohu ya ka ha jiri obi ụtọ na-enye ya onyinye afọ ofufo iji gosi na ha ji obi ha dum na-ejere ya ozi. Ndị ya ji obi ụtọ eme nke a kemgbe ụwa. Tụlee ugboro atọ ha mere nke a.

Mgbe Jehova kpọpụtara ụmụ Izrel n’Ijipt, ọ gwara ha ka ha wuo ụlọikwuu. Ihe ndị a ga-eji wuo ya adịghị, nke a mere ka Jehova gwa ha ka ha nye onyinye iji nweta ha. “Onye ọ bụla obi ya kwaliri” wee weta ọlaedo na ọlaọcha, ọla dị iche iche na ihe ndị ọzọ. Ha nyekatara onyinye e wee maa ọkwa ka ha kwụsị.—Ọpụ. 35:5, 21; 36:6, 7.

Mgbe a chọrọ iwu ụlọ nsọ ka ọtụtụ narị afọ gafere, ndị Chineke nwekwara ohere ọzọ ha ga-eji gosi na ha na-akwado ofufe a na-efe Chineke. Eze Devid wetara ọtụtụ ihe a ga-eji wuo ụlọ ahụ. Ọ gbakwara ndị ọzọ ume ka ha weta onyinye nke ha. Ha ji ịnụ ọkụ n’obi mee nke a. Naanị ọlaedo na ọlaọcha ha wetara karịrị otu narị ijeri dọla ma e rewe ha ugbu a. Obi dị ndị Izrel ụtọ n’ihi na ha nọ na-enye Jehova onyinye afọ ofufo.—1 Ihe 29:3-9; 2 Ihe 5:1.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’oge ochie jikwa ọṅụ nye onyinye afọ ofufo. Ọtụtụ ndị n’ime ihe dị ka puku mmadụ atọ e mere baptizim n’ụbọchị Pentikọst afọ 33 O.A. ebighị na Jeruselem n’oge ahụ. Ndị Kraịst tụkọtara ego ka ndị na-enweghị ka ọ hà ha si esi bịa nwee ike ịnọ na Jeruselem wee mụtakwuo banyere ozizi Ndị Kraịst. Ndị Kraịst nọ na Jeruselem rere ihe ndị ha nwere wee wetara ndịozi ego ha retara ka e jiri ya nyere ndị nọ ná mkpa aka. Obi dị nnọọ Jehova ụtọ mgbe ọ hụrụ okwukwe ha nakwa otú ha si hụ ibe ha n’anya.—Ọrụ 2:41-47.

Taa, Ndị Kraịst ji obi ụtọ na-akwado ezi ofufe site n’iji oge ha, ike ha, na ego ha na-efe Jehova. Ị ga-agụta ụzọ ụfọdụ ị ga-esi mee nke a n’igbe dị n’isiokwu a.

[Igbe dị na peeji nke 18, 19]

ỤZỌ ỤFỌDỤ NDỊ HỌỌRỌ ISI NA-ENYE ONYINYE

MAKA ỌRỤ ZURU ỤWA ỌNỤ

Ọtụtụ ndị na-ewepụta, ma ọ bụ mawapụta ego iche, bụ́ nke ha na-etinye n’igbe onyinye ndị a mapawara akwụkwọ e dere “Worldwide Work.” (“Ọrụ Zuru Ụwa Ọnụ”)

N’ọnwa ọ bụla, ọgbakọ dị iche iche na-eziga ego ha nwetara n’igbe a n’ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ha. Mmadụ nwekwara ike iji aka ya ziga ego onyinye n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya. (Mmadụ nwekwara ike iziga nke ọ bụla n’ime onyinye e kwuru okwu ha n’igbe a n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba ya.) E kwesịrị ide “Watch Tower” n’akwụkwọ ndọrọ ego ọ bụla a na-ezigara alaka ụlọ ọrụ na-elekọta mba unu. E nwekwara ike inye ọla ma ọ bụ ihe ndị ọzọ e nwere ike irete ego. Onye na-ezite ihe ndị a kwesịrị izitekọta ha na obere akwụkwọ ozi iji kọwaa na ha bụ onyinye.

ATỤMATỤ ỌRỤ EBERE

E wezụga inye onyinye ego, e nwekwara ụzọ ndị ọzọ e nwere ike isi nye ihe maka ozi Alaeze nke a na-eje n’ụwa niile. Ha gụnyere:

Ịnshọransị: E nwere ike idenye aha Watch Tower dị ka ndị a ga-akwụ ụgwọ ma ọ bụrụ na onye dejupụtara akwụkwọ ịnshọransị ahụ anwụọ ma ọ bụkwanụ dị ka ndị ga-eso keta ego a na-erite ma a laa ezumike nká.

Ego E Tinyere n’Ụlọ Akụ̀: Mmadụ nwere ike ime ndokwa ka e nye Watch Tower ego o debere n’ụlọ akụ̀, ego ọ gbazinyere ụlọ akụ̀, ma ọ bụ ego ezumike nká ya ma ọ nwụọ, a ga-eme nke a n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ ụlọ akụ̀ dị ná mba ya na-agbaso.

Aka Òkè na Ihe Ndị Nọchiri Anya Ego: E nwere ike inye Watch Tower aka òkè na ihe ndị nọchiri anya ego n’onyinye.

Ala na Ụlọ: E nwere ike inye ala na ụlọ e nwere ike ire ere, ọ bụrụkwanụ na ọ bụ ụlọ onye nwe ya ka bi na ya, o nwere ike inye ya ma ka biri na ya n’oge niile ọ dị ndụ. Mee ka alaka ụlọ ọrụ dị ná mba unu mara tupu ị na-enye ya ala na ụlọ ọ bụla.

Ike Ekpe na Atụmatụ Ego: E nwere ike idenyere Watch Tower ihe onwunwe ma ọ bụ ego n’akwụkwọ ike ekpe nke e dere n’ụzọ iwu kwadoro, e nwekwara ike ikwu na Watch Tower ga-erite uru n’atụmatụ ego.

Dị ka okwu ahụ bụ́ “atụmatụ ọrụ ebere” na-egosi, onye na-enye ụdị onyinye a kwesịrị ime atụmatụ nke ọma.

Iji matakwuo banyere ụzọ ndị a e si enye onyinye, i nwere ike ịkpọtụrụ Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Nigeria, site n’ịkpọ ha na telefon ma ọ bụ idegara ha akwụkwọ ozi, n’adres e dere n’okpuru ebe a ma ọ bụ kpọtụrụ alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke na-elekọta mba unu.

Jehovah’s Witnesses

P.M.B. 1090,

Benin City 300001,

Edo State, Nigeria.

Telefon: 07080662020