Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ọnọdụ Gị n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

Jiri Ọnọdụ Gị n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

Jiri Ọnọdụ Gị n’Ọgbakọ Kpọrọ Ihe

“Chineke edebewo akụkụ ndị ahụ n’ahụ́, nke ọ bụla n’ime ha, dị nnọọ ka o si dị ya mma.”—1 KỌR. 12:18.

1, 2. (a) Gịnị na-egosi na onye ọ bụla nke nọ n’ọgbakọ nwere ọnọdụ o kwesịrị iji kpọrọ ihe? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle n’isiokwu a?

KEMGBE oge Izrel oge ochie, Jehova ji ọgbakọ ya elekọta ndị ya, sikwa na ya na-enye ha ntụziaka. Dị ka ihe atụ, mgbe ụmụ Izrel bibiri obodo E-aị, Jọshụa “gụpụtara iwu ahụ dum n’olu dara ụda, ngọzi na nkọcha, dị ka ihe niile e dere n’akwụkwọ iwu ahụ si dị . . . n’ihu ọgbakọ Izrel dum.”—Jọsh. 8:34, 35.

2 Na narị afọ mbụ nke O.A., Pọl onyeozi gwara otu okenye ọgbakọ aha ya bụ Timoti na ọgbakọ Ndị Kraịst bụ ‘ezinụlọ nke Chineke,’ na “ogidi na ihe nkwado nke eziokwu.” (1 Tim. 3:15) Taa, “ezinụlọ” Chineke bụ ezigbo Ndị Kraịst nọ ebe niile n’ụwa. N’isi iri na abụọ nke akwụkwọ ozi mbụ Pọl ji ike mmụọ nsọ degara Ndị Kọrịnt, o ji ọgbakọ Chineke tụnyere ahụ́ mmadụ. O kwuru na n’agbanyeghị na akụkụ ahụ́ nke ọ bụla na-arụ ọrụ dị iche n’ihe nke ọzọ na-arụ, ha niile dị mkpa. Pọl dere, sị: “Chineke edebewo akụkụ ndị ahụ n’ahụ́, nke ọ bụla n’ime ha, dị nnọọ ka o si dị ya mma.” O kwukwara na “akụkụ ahụ́ ndị anyị chere na ha ekwesịchaghị nsọpụrụ, ọ bụ ha ka anyị na-enye nsọpụrụ ka ukwuu.” (1 Kọr. 12:18, 23) Ya mere, ọrụ otu onye ezi omume nke nọ n’ezinụlọ Chineke na-arụ akaghị ọrụ Onye Kraịst ibe ya ọzọ kwesịrị ntụkwasị na-arụ mma, ọ kaghịkwa ya njọ. Naanị na ọrụ onye nke ọ bụla dị iche n’ọrụ ibe ya na-arụ. Olee otú anyị ga-esi chọpụta ihe bụ́ ọnọdụ anyị n’ọgbakọ ma jiri ya kpọrọ ihe? Olee ihe ndị nwere ike imetụta ọnọdụ anyị n’ọgbakọ? Oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ka ‘ọganihu anyị pụta ìhè n’ebe mmadụ niile nọ’?—1 Tim. 4:15.

Olee Otú Anyị Ga-esi Jiri Ọnọdụ Anyị Kpọrọ Ihe?

3. Olee otu n’ime ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị nwere ọnọdụ n’ọgbakọ nakwa na anyị ji ya kpọrọ ihe?

3 Otu n’ime ụzọ anyị si egosi na anyị nwere ọnọdụ n’ọgbakọ nakwa na anyị ji ya kpọrọ ihe bụ irubere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, na Òtù Na-achị Isi nke na-anọchite anya ya isi n’ihe niile. (Gụọ Matiu 24:45-47.) Anyị kwesịrị ileba anya n’otú anyị si erube isi ná ntụziaka ohu ahụ na-enye anyị. Dị ka ihe atụ, kemgbe ọtụtụ afọ, a nọwo na-enye anyị ntụziaka kpọmkwem banyere uwe na ejiji, ntụrụndụ, nakwa ebe ndị anyị na-ekwesịghị ịga n’Ịntanet. Ànyị na-erube isi ná ndụmọdụ ọma a ka ihe ọ bụla wee ghara imebi adịm ná mma anyị na Chineke? Olee maka ofufe ezinụlọ a na-adụ anyị ọdụ ka anyị na-enwe mgbe niile? Ànyị anabatala ndụmọdụ a wee wepụta otu mgbede anyị ga-eji na-enwe ofufe ezinụlọ? Ọ bụrụ na ị lụbeghị di ma ọ bụ nwunye, ị̀ na-ewepụta oge maka ịmụ Akwụkwọ Nsọ? Jehova ga-agọzi anyị n’otu n’otu, gọziekwa ezinụlọ anyị ma ọ bụrụ na anyị na-erubere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi isi.

4. Gịnị ka anyị kwesịrị ichebara echiche ma anyị chọọ ime mkpebi n’ihe ndị na-enweghị onye ha gbasara?

4 Ndị ụfọdụ nwere ike ịna-eche na ntụrụndụ, otú ha si eyi uwe na otú ha si eji ejiji enweghị onye ọ gbasara. Ma, Onye Kraịst raara onwe ya nye nke ji ọnọdụ ya n’ọgbakọ kpọrọ ihe ekwesịghị iji ihe na-amasị ya na-ekpebi ihe ọ ga-eme n’agbanyeghị ma ihe ahụ ọ̀ dị mma ma ọ̀ dị njọ. Ọ ghaghị ichesi echiche ike banyere ihe Okwu Chineke bụ́ Baịbụl kwuru banyere ihe ahụ, nke bụ́ otú Jehova si ele ya anya. Ihe dị na Baịbụl kwesịrị ‘ịbụrụ anyị oriọna nke na-enye ụkwụ anyị ìhè, bụrụkwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ anyị.’ (Ọma 119:105) Anyị kwesịkwara icheba echiche n’otú ihe ndị anyị chọrọ ime, bụ́ ndị na-enweghị onye ha gbasara, si emetụta ozi ọma anyị na-ezi nakwa otú ha si emetụta ndị ọzọ, ma ndị nọ n’ọgbakọ ma ndị nọ n’èzí.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 6:3, 4.

5. Gịnị mere anyị ga-eji kpachara anya ka anyị wee ghara inwe mmụọ nke ime ihe ọ bụla masịrị anyị?

5 “Mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi” jupụtara ebe niile nke na ọ dị ka ikuku anyị na-ekuru. (Efe. 2:2) Mmụọ ahụ nwere ike ime ka anyị chee na ntụziaka ọgbakọ Jehova na-enye adịghị anyị mkpa. N’ezie, anyị agaghị achọ ka anyị dị ka Dayọtrefis, bụ́ onye na-anaghị ‘eji nkwanye ùgwù anabata ihe ọ bụla nke si n’aka Jọn onyeozi.’ (3 Jọn 9, 10) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị wee ghara ịmalite inwe mmụọ nke ime ihe ọ bụla masịrị anyị. Ma n’okwu ọnụ ma n’omume, ka anyị ghara inupụrụ ndị Jehova ji akụziri anyị ihe n’oge a isi. (Ọnụ Ọgụ. 16:1-3) Kama nke ahụ, ka anyị jiri obi ụtọ na-erubere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi isi. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgbasi mbọ ike ka anyị na-erubere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ anyị isi, nọrọkwa n’okpuru ha?—Gụọ Ndị Hibru 13:7, 17.

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ileru anya n’otú ihe si dịrị anyị?

6 Ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị ji ọnọdụ anyị n’ọgbakọ kpọrọ ihe bụ ileru anya n’otú ihe si dịrị anyị nakwa ime ike anyị niile ka ‘ije ozi anyị wee nwee ùgwù’ wee wetara Jehova otuto. (Rom 11:13) Ụfọdụ n’ime anyị bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ndị ọzọ na-eje ozi oge niile pụrụ iche, ndị dị ka ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, nakwa ndị na-eje ozi na Betel n’ụwa niile. Ọtụtụ ụmụnna na-enye aka n’ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ọtụtụ n’ime ndị Jehova ji ike ha niile enyere ndị ezinụlọ ha aka ka ha nọgide na-efe Jehova, ha na-esokwa agachi ozi ọma anya kwa izu. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:23, 24.) Anyị kwesịrị inwe obi ike na ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị na-ejere Chineke ozi, jirikwa mkpụrụ obi anyị dum na-eje ya, anyị ga na-enwe ọnọdụ mgbe niile n’ọgbakọ ya.

Ihe Ndị Na-emetụta Ọnọdụ Anyị n’Ọgbakọ

7. Kwuo otú otú ihe si dịrị anyị nwere ike isi metụta ọnọdụ anyị n’ọgbakọ.

7 Ileru anya n’otú ihe si dịrị anyị dị mkpa n’ihi na o nwere ike ikpebi ihe anyị nwere ike ime n’ọgbakọ. Dị ka ihe atụ, ọnọdụ nwanna nwoke nwere n’ọgbakọ dịtụ iche na nke nwanna nwaanyị nwere. Afọ ndụ, ahụ́ ike ma ọ bụkwanụ ọrịa, na ihe ndị ọzọ nwere ike ikpebi ihe anyị ga-emeli n’ozi Jehova. Ilu 20:29 sịrị: “Ịma mma nke ụmụ okorobịa bụ ike ha, ịma mma nke ndị agadi bụkwa isi awọ́ ha.” Ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa nọ n’ọgbakọ na-eme ihe ndị e ji ọkpụkpụ aka eme karịa ndị ọzọ n’ihi na ike ka juru ha obi, ma, ọgbakọ na-erite nnukwu uru n’aka ndị katarala ahụ́ n’ihi amamihe ha nwere nakwa n’ihi ihe ha hụrụla ná ndụ. Anyị kwesịkwara iburu n’uche na ihe ọ bụla anyị nwere ike ime n’ọgbakọ Jehova bụ n’ihi obiọma Chineke nke na-erughịrị anyị.—Ọrụ 14:26; Rom 12:6-8.

8. Olee otú ọchịchọ obi anyị nwere ike isi metụta ozi anyị na-eje n’ọgbakọ?

8 Ihe ụmụnna nwaanyị abụọ nne na nna ji mere na-eme ka anyị mara ihe ọzọ na-emetụta ọnọdụ anyị n’ọgbakọ. Ha abụọ gụchara kọleji. Otú ihe si dịrị ha abụọ bụ otu. Nne ha na nna ha mere ihe ha kwesịrị ime, ya bụ, ịgba ha ume ka ha malite ọrụ ịsụ ụzọ ma ha gụchaa akwụkwọ. Mgbe ha gụchara, otu malitere ọrụ ịsụ ụzọ, ebe onye nke ọzọ ji oge ya niile na-arụ ọrụ ego. Gịnị mere ihe otu onye mere ji dị iche n’ihe nwanne ya mere? Ọ bụ ọchịchọ. N’agbanyeghị na a gbara ha ume ime otu ihe, ka oge ruru, onye nke ọ bụla mere ihe bụ́ ọchịchọ obi ya. Ọ́ bụghị otú ahụ ka ọtụtụ n’ime anyị na-eme? Anyị kwesịrị iche echiche nke ọma banyere otú anyị chọrọ isi na-ejere Chineke ozi. Ànyị nwere ike ịna-agachikwu ya anya, ọ bụrụgodị na nke a nwere ike ime ka anyị hapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị?—2 Kọr. 9:7.

9, 10. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ọ bụchaghị ọchịchọ anyị imekwu ihe n’ozi anyị na-ejere Jehova?

9 Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ bụchaghị obi anyị imekwu ihe n’ozi anyị na-ejere Jehova, ndị nke anyị na-eme eme abụrụ ka a ghara ịsị na ọ dịghị nke anyị mere? Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị, sị: “Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu, n’ihi ihe dị ya ụtọ, ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.” N’ezie, Jehova nwere ike ịgbanwe ọchịchọ obi anyị na otú anyị si eche echiche.—Fil. 2:13; 4:13.

10 Nke a ó kwesịghị ime ka anyị rịọ Jehova ka o mee ka anyị na-eme uche ya? Eze Devid nke chịrị Izrel n’oge ochie mere otú ahụ. O kpere ekpere, sị: “Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị; zi m ụzọ gị. Mee ka m jee ije n’eziokwu gị, kụziere m ihe, n’ihi na ị bụ Chineke nke nzọpụta m. Ọ bụ n’ebe ị nọ ka olileanya m dị ogologo ụbọchị dum.” (Ọma 25:4, 5) Anyị nwere ike ime ụdị ihe a Devid mere site n’ịrịọ Jehova ka o mee ka ọchịchọ anyị bụrụ ime ihe ọ na-achọ. Ọ bụrụ na anyị echeta otú obi na-adị Jehova Chineke na Ọkpara ya n’ihi otú anyị si ejere ha ozi, obi ga-adị anyị mma maka ihe ha na-emere anyị. (Mat. 26:6-10; Luk 21:1-4) Obi ahụ nke dị anyị mma maka ihe ha na-emere anyị nwere ike ime ka anyị rịọ Jehova ka o mee ka anyị nwee ọchịchọ ijere ya ozi karịa ka anyị na-eje ugbu a. Aịzaya onye amụma mere ụdị ihe anyị kwesịrị ime. Mgbe ọ nụrụ ka Jehova jụrụ, sị: “Ònye ka m ga-eziga, ònye ga-ejekwara anyị?” ọ zara, sị: “Lee m! Ziga m.”—Aịza. 6:8.

Olee Otú Anyị Ga-esi Nwee Ọganihu?

11. (a) Gịnị mere o ji dị mkpa ka ụmụnna nwoke na-agbalị ka ha ruo eru ịbụ ndị nlekọta n’ọgbakọ? (b) Olee otú nwanna nwoke ga-esi ruo eru ka o wee nwee ihe ùgwù ije ozi n’ọgbakọ?

11 O doro anya na ebe ọ bụ na e mere narị puku mmadụ abụọ, puku iri asatọ na itoolu na narị mmadụ isii na iri asaa na asatọ baptizim n’afọ ije ozi gara aga n’ụwa dum na ọ dị nnọọ mkpa ka e nwekwuo ụmụnna nwoke ga na-edu ndú n’ọgbakọ. Olee ihe nwanna nwoke kwesịrị ime ka e wee gboo mkpa a? E gbuo ya nkenke, ọ bụ site n’ịgba mbọ na-eme ihe ndị ahụ dị n’Akwụkwọ Nsọ, bụ́ ndị ụmụnna nwoke ga-eme ha eruo eru ịbụ ndị ohu na-eje ozi na ndị okenye ọgbakọ. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9) Olee otú nwanna nwoke nwere ike isi gbaa mbọ ruo ihe a Akwụkwọ Nsọ kwuru? Ọ bụ site n’ịgachi ozi ọma anya, jiri ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ e nyere ya n’ọgbakọ, na-arụsi ọrụ ike iji zaa ajụjụ dị mma n’ọmụmụ ihe ma ọ bụkwanụ hụ ụmụnna ya n’anya. Ọ na-egosi na ya ji ọnọdụ ya n’ọgbakọ kpọrọ ihe.

12. Olee otú ndị na-eto eto ga-esi gosi na ha na-anụrụ eziokwu Baịbụl ọkụ n’obi?

12 Gịnị ka ụmụ okorobịa nọ n’ọgbakọ, nke ka nke, ndị nke na-erubeghị iri afọ abụọ, nwere ike ime iji nwee ọganihu n’ọgbakọ? Ha nwere ike ịgba mbọ ka ha too “n’amamihe niile na nghọta ime mmụọ” site n’ịmụ Akwụkwọ Nsọ. (Kọl. 1:9) Ha ga-enwe ọganihu ma ọ bụrụ na ha na-amụsi Okwu Chineke ike, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. Ụmụ okorobịa nwekwara ike iru eru site n’ịgbalị ka ha nwee ike ịmalite ozi oge niile dị iche iche wee banye ‘n’ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.’ (1 Kọr. 16:9) Ha ga-enwe nnọọ afọ ojuju ma ha na-eje ozi oge niile, ọ ga-emekwa ka ha nwee ngọzi dị ukwuu.—Gụọ Ekliziastis 12:1.

13, 14. Olee ụzọ dị iche iche ụmụnna nwaanyị nwere ike isi gosi na ha ji ọnọdụ ha n’ọgbakọ kpọrọ ihe?

13 Ụmụnna nwaanyị kwesịkwara igosi na ha ji ihe ùgwù ha nwere imezu amụma ahụ dị n’Abụ Ọma 68:11 kpọrọ ihe. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụ Jehova kwuru okwu; ndị inyom na-ezisa ozi ọma bụ ìgwè dị ukwuu.” Otu n’ime ụzọ ndị pụtara ìhè ụmụnna nwaanyị nwere ike isi na-egosi na obi dị ha mma maka ọnọdụ ha n’ọgbakọ bụ iso na-eme ndị na-eso ụzọ. (Mat. 28:19, 20) Ya mere, ọ bụrụ na ụmụnna nwaanyị ana-ejechi ozi ọma anya ma na-eleghara ọtụtụ ihe na-amasị ha anya iji mee ndị na-eso ụzọ, ha na-egosi na ha ji ọnọdụ ha n’ọgbakọ kpọrọ ihe.

14 Pọl degaara Taịtọs akwụkwọ ozi, sị: “Ka ndị agadi nwaanyị bụrụ ndị dị nsọ n’omume ha, . . . ndị na-akụzi ihe dị mma; ka ha wee mee ka ndị inyom na-akatabeghị ahụ́ nwee uche ziri ezi iji hụ di ha n’anya, iji hụ ụmụ ha n’anya, ka ha nwee uche zuru okè, bụrụ ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ, ndị ezi mmadụ, ndị na-edo onwe ha n’okpuru di ha, ka e wee ghara ịkatọ okwu Chineke.” (Taị. 2:3-5) Ụmụnna nwaanyị ndị a tozuru okè na-esetịpụ nnọọ ezigbo ihe nlereanya n’ọgbakọ. Ọ bụrụ na ha ana-akwanyere ụmụnna na-edu ndú n’ọgbakọ ùgwù, na-emekwa mkpebi dị mma n’ihe banyere uwe na ejiji nakwa ntụrụndụ, ha na-esetịpụrụ ndị ọzọ ezigbo ihe nlereanya ma na-egosi na ha ji ọnọdụ ha n’ọgbakọ kpọrọ ihe.

15. Gịnị ka nwanna nwaanyị na-alụbeghị di nwere ike ime iji die owu ọmụma?

15 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri nwanna nwaanyị na-alụbeghị di ike ịma na ya nwere ọnọdụ n’ọgbakọ. Otu nwanna nwaanyị nke a merela kwuru, sị: “Owu na-amakarị nwaanyị na-alụbeghị di.” Mgbe a jụrụ ya otú o si edi nke a, ọ sịrị: “Ekpere na ọmụmụ ihe onwe onye na-enyere m aka. Ọmụmụ ihe na-enyere m aka ịmụta otú Jehova si ele m anya. Nke a na-eme ka m na-agba mbọ inyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ anyị aka. Ọ na-emekwa ka m ghara ịna-echegbu onwe m.” N’Abụ Ọma 32:8 Jehova gwara Devid, sị: “M ga-enye gị ndụmọdụ, anya m ga-adị n’ebe ị nọ.” N’ezie, Jehova nwere mmasị ná ndị ohu ya niile, nke a gụnyere ụmụnna nwaanyị na-alụbeghị di. Ọ ga-enyekwara anyị niile aka ịma ọnọdụ anyị n’ọgbakọ.

Ejila Ọnọdụ Gị Egwu Egwu!

16, 17. (a) Gịnị mere ọzịza anyị zara òkù Jehova kpọrọ anyị ka anyị nọrọ n’ọgbakọ ya ji bụrụ mkpebi kacha mkpebi niile anyị merela mma? (b) Olee ihe nwere ike ime ka ihe ọ bụla ghara ime ọnọdụ anyị nwere n’ọgbakọ Jehova?

16 Jehova ji ịhụnanya dọta ndị ohu ya niile ka ha na ya dịrị ná mma. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.” (Jọn 6:44) Jehova si n’ọtụtụ ijeri ụmụ mmadụ nọ n’ụwa kpọpụta anyị ka anyị nọrọ n’ọgbakọ ya. Ọzịza anyị zara òkù a Jehova kpọrọ anyị bụ mkpebi kacha mkpebi niile anyị merela mma. O meela ka ndụ anyị nwee isi. Anyị na-enwe nnukwu ọṅụ na afọ ojuju n’ihi na anyị nwere ọnọdụ n’ọgbakọ.

17 Ọbụ abụ sịrị: “Jehova, ahụrụ m ụlọ gị nke bụ́ ebe obibi gị n’anya.” Ọ bụkwara abụ, sị: “Ụkwụ m ga-eguzo n’ebe dị larịị; m ga-agọzi Jehova n’etiti ìgwè ndị zukọrọ ọnụ.” (Ọma 26:8, 12) Ezi Chineke nyere onye ọ bụla n’ime anyị ọnọdụ n’ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-erube isi ná ntụziaka ọgbakọ Chineke na-enye anyị wee na-ejesi ozi Chineke ike, o nweghị ihe ga-eme ọnọdụ na-enweghị atụ anyị nwere n’ọgbakọ ya.

Ì Chetara?

• Gịnị mere o ji bụrụ eziokwu na Ndị Kraịst niile nwere ọnọdụ n’ọgbakọ?

• Ole otú anyị kwesịrị isi gosi na anyị ji ọnọdụ anyị n’ọgbakọ Chineke kpọrọ ihe?

• Olee ihe ndị nwere ike ikpebi ihe ga-abụ ọnọdụ anyị n’ọgbakọ?

• Olee otú Ndị Kraịst na-eto eto na ndị nke torola eto, nwere ike isi gosi na ha ji ọnọdụ ha n’ọgbakọ Chineke kpọrọ ihe?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Olee otú ụmụnna nwoke nwere ike isi ruo eru inweta ihe ùgwù n’ọgbakọ?

[Foto dị na peeji nke 17]

Olee otú ụmụnna nwaanyị nwere ike isi gosi na ha ji ọnọdụ ha n’ọgbakọ kpọrọ ihe?