Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Dara Ogbi Kpọrọ Ihe

Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Dara Ogbi Kpọrọ Ihe

Jiri Ụmụnna Anyị Ndị Dara Ogbi Kpọrọ Ihe

NDỊ Chineke taa bụ ezinụlọ buru ibu nke ndị malitere ya bụ ndị ikom na ndị inyom dịrị ndụ n’oge ochie, ndị dị ka Samuel, Devid, Samsịn, Rehab, Mozis, Ebreham, Sera, Noa, na Ebel. E nwere ọtụtụ ndị ogbi bụ́ ndị ohu Jehova. Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ mbụ ghọrọ Ndịàmà Jehova na Mongolia bụ di na nwunye dara ogbi. Ọ bụ ụmụnna anyị ndị dara ogbi nọ na Russia mere anyị ji nwee mmeri n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop.

N’oge a, “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” emepụtala ọtụtụ ihe n’asụsụ ndị ogbi, hiwe ọgbakọ ndị e ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe na ha, meekwa ndokwa ka a na-enwe mgbakọ dị iche iche n’asụsụ ndị ogbi. (Mat. 24:45) Ihe ndị a abaarala ndị ogbi uru nke ukwuu. * Ma, ì chetụla otú onye ogbi gaara esi amụta banyere ezi Chineke ma nwee ọganihu n’ọgbakọ ma a sị na e nweghị ihe ndị a? Ì cheela ihe i nwere ike ime iji nyere ndị ogbi nọ n’ebe i bi aka?

Ihe Ndị Na-eme Tupu E Nwee Ihe Ndị Na-enyere Ndị Ogbi Aka

Jụtụgodị ndị agadi bụ́ ndị ogbi otú ha si mụta banyere Chineke. Ha nwere ike ịgwa gị otú ọ dị ha mgbe mbụ ha matara aha Chineke na otú nke ahụ si gbanwee ndụ ha ma mee ka ha nọgide n’eziokwu kemgbe ahụ tupu e mepụta vidio ma ọ bụ DVD n’asụsụ ndị ogbi, bụ́ nke nyeere ha aka ịmụta eziokwu ndị dị omimi dị n’Akwụkwọ Nsọ. Ha nwere ike ịkọrọ gị nsogbu ha na-enwe mgbe a na-anaghị eji asụsụ ndị ogbi atụgharịrị ha ihe a na-amụ n’ọmụmụ ihe ma ọ bụ mgbe a na-anaghị enwe ọmụmụ ihe n’asụsụ ndị ogbi. Ihe a na-eme mgbe ahụ bụ na mmadụ na-anọkete ha ma na-edere ha ihe n’akwụkwọ iji nyere ha aka ịghọta ihe a na-ekwu. Otú a ka otu nwanna nwoke dara ogbi si mụta eziokwu ma nọọ afọ asaa tupu ya e nwee onye na-atụgharịrị ya ihe a na-amụ.

Ndịàmà merela agadi, bụ́ ndị dara ogbi, na-echeta otú o si esiri ha ike izi ndị na-anụ ihe ozi ọma. Ha na-eji otu aka eweliri onye ahụ akwụkwọ e dere ihe dị mkpirikpi ha chọrọ ịgwa ya, jirizie aka nke ọzọ welite Ụlọ Nche na Teta! ndị ọhụrụ. Iji naanị akwụkwọ anyị nke na-esiri ma ha ma onye ha na-amụrụ ihe ike nghọta na-amụrụ onye ahụ Baịbụl na-ara ezigbo ahụ́. Ndị agadi bụ́ ndị ogbi nwere ike icheta otú o si ewute ha mgbe onye ha na-ezi ozi ọma na-aghọtaghị ihe ha na-ekwu, bụ́ nke mere ka ha kwụsị izi onye ahụ ozi ọma. Ha makwa otú o si enye nsogbu n’obi na mmadụ hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu ma o nweghị otú ọ ga-esi egosi otú ọ hụruru ya n’anya. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ha ejighị n’aka na ha ghọtachara ihe a na-ekwu.

N’agbanyeghị ihe a niile, ụmụnna anyị ndị dara ogbi anọgidela na-ekwesị ntụkwasị obi. (Job 2:3) Ha anọwo na-echesi Jehova ike. (Ọma 37:7) O jirikwala ihe ọtụtụ n’ime ha na-atụghị anya ya na-agọzi ha.

Tụlee mbọ otu nwanna nwoke dara ogbi, onye bụ́ di na nna gbara. Tupu e mepụta vidio n’asụsụ ndị ogbi, ọ na-eduziri ndị ezinụlọ ya ọmụmụ ihe mgbe niile. Nwa ya nwoke sịrị: “Ọ na-ara papa m ahụ́ iduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ, ebe ọ bụ na o ji akwụkwọ eduzi ya. Ọtụtụ mgbe, ọ naghị aghọtacha ihe e dere n’akwụkwọ ndị o ji eduzi ọmụmụ ihe. Anyịnwa bụ́ ụmụ ya na-emekwa ka ihe na-esikwuru ya ike. Anyị na-agwa ya ozugbo ebe ọ na-akọwataghị. N’agbanyeghị ihe a niile, ọ na-eduzi ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị mgbe niile. Obi ya bụ na anyị ịmụta banyere Jehova dị ezigbo mkpa n’agbanyeghị ihere ọ na-emenyekarị onwe ya n’ihi na ọ naghị aghọtacha Bekee.”

E nwekwara nwanna Richard, onye dị afọ iri asaa na ụma nke dara ogbi kpuokwa ìsì, onye bi na Brooklyn, New York, U.S.A. Richard na-abịachi ọmụmụ ihe anya. Naanị ya na-abanye ụgbọ okporo ìgwè n’enweghị onye na-enyere ya aka, ọ na-agụkọkwa ugboro ole ụgbọ ahụ na-akwụsị iji mara mgbe ọ ga-apụ. E nwere otu oge nnukwu snoo dara nke mere ka a kagbuo ọmụmụ ihe. A gwara mmadụ niile nọ n’ọgbakọ, ma o nweghị onye chetara gwa Richard. Mgbe ụmụnna chọpụtara ihe merenụ ma chọwa ya, ha hụrụ ya ebe o guzo n’ihu Ụlọ Nzukọ Alaeze na-eche nnọọ ka e meghee ụzọ. Mgbe a jụrụ ya ihe mere o ji bịawa n’oké snoo daranụ, ọ zara sị, “Ahụrụ m Jehova n’anya.”

Olee Ihe I Nwere Ike Ime?

Ndị ogbi hà bi ebe i bi? Ì nwere ike ịmụ asụsụ ndị ogbi ka gị na ha wee nwee ike na-akparịta ụka? Ndị ogbi na-ejikarị obiọma na ndidi akụziri ndị ọzọ asụsụ ha. Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na i zute onye ogbi n’ụzọ ma ọ bụ mgbe ị nọ n’ozi ọma? Gbalịa ka gị na ya kparịta ụka. Jiri imegharị ahụ́ gwa ya okwu, ma ọ bụkwanụ gị edee ihe nye ya, ma ọ bụ see ya esee, ma ọ bụkwanụ gị emee ha niile. Ọ bụrụgodị na onye ahụ agwa gị na ya enweghị mmasị, gwa Onyeàmà bụ onye ogbi, ma ọ bụkwanụ onye ma asụsụ ndị ogbi, banyere onye ahụ. Onye ogbi ahụ nwere ike inwe mmasị ma e jiri asụsụ ndị ogbi zie ya ozi ọma.

Eleghị anya ị na-amụ asụsụ ndị ogbi ma na-aga ọmụmụ ihe n’ọgbakọ ji asụsụ ndị ogbi amụ ihe. Olee otú ị ga-esi nwee ike ịna-asụ ma na-aghọta asụsụ ahụ nke ọma? Ọ bụrụgodị na e nwere ndị na-anụ ihe nọ n’ọgbakọ unu, gbalịa ka i jiri asụsụ ndị ogbi na-agwa ha okwu mgbe ụfọdụ. Ọ bụrụ na ị na-eme otú a, ọ ga-eme ka ị na-eche banyere asụsụ ndị ogbi, ya bụ, asụsụ a na-ahụ anya. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịra gị ahụ́ nke na ị ga-achọ ikwuwe okwu otú i si ekwu. Ma, mgbe ị na-amụ asụsụ ọ bụla, ị ghaghị iji ntachi obi na-amụ ya ruo mgbe ọ gawara gị werewere n’ọnụ.

Ị na-egosi na ị hụrụ ụmụnna anyị ndị dara ogbi n’anya ma na-akwanyere ha ùgwù ma ọ bụrụ na ị gbaa mbọ na-amụ asụsụ ha. Cheedị otú ọ na-adị ndị ogbi kwa ụbọchị n’ihi na ha enweghị ike ịghọta ihe ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ha na ha na-agakọ akwụkwọ na-ekwu. Otu nwanna nwoke dara ogbi kwuru, sị: “Kwa ụbọchị, ndị nọ m nso na-ekwu okwu. Iwe na-ejukarị m obi n’ihi na mụ na ha enweghị ike ịkparịta ụka. Amaghị m otú m ga-esi akọwa otú obi na-ajọru m njọ mgbe ụfọdụ.” Ọmụmụ ihe anyị kwesịrị ịbụ ebe ahụ́ ga-eru ụmụnna anyị ndị dara ogbi ala ha anọrọ mụta eziokwu, ha na ndị ọzọ enweekwa ike ịkparịta ụka otú ga-eme ha obi ụtọ.—Jọn 13:34, 35.

Ndị ọzọ e kwesịkwara ichebara echiche bụ ọtụtụ ndị ogbi na-eso ndị na-anụ ihe amụ ihe. E kwesịrị ịna-atụgharịrị ha ihe a na-amụ. Ndị ogbi na-anọkarị n’ihu oche ma a bịa ọmụmụ ihe ka ha wee nwee ike ịghọta ihe a na-amụ nke ọma. Nke a na-eme ka ha nwee ike ịhụ ma onye na-ekwu okwu ma onye na-atụgharịrị ha ihe a na-ekwu, n’enweghị ihe ga-adọpụ ha uche. A chọpụtala na ọ naghị ara ahụ́ nke a amara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ ahụ́, ọ gaghịzi na-adọpụ uche ha n’ihe a na-amụ. E kwesịkwara ịna-eme otú a ná mgbakọ dị iche iche ebe a na-atụgharịrị ndị ogbi ihe a na-ekwu. Anyị na-aja ndị na-atụgharịrị ndị ogbi ihe a na-amụ n’ọgbakọ mma maka otú ha si na-atụgharịrị ha ihe otú ha ga na-aghọta ya.

Ikekwe ị nọ n’ọgbakọ ebe e nwere ndị ogbi a na-atụgharịrị ihe a na-amụ. Olee ihe i nwere ike ime iji gosi ụmụnna anyị ndị dara ogbi na ị hụrụ ha n’anya? Gwa ha ka ha bịa na nke gị. O kwe mee, mụta otú e si ekwu ihe ụfọdụ n’asụsụ ndị ogbi. Adala mbà n’ihi na ị maghị ọtụtụ ihe ị ga-ekwu. Ị ga-ahụrịrị otú ị ga-esi na-agwa ha okwu, ọ bụrụkwa na i si otú a gosi ha na ị hụrụ ha n’anya, nke a ga-eme ka i nwee obi ụtọ. (1 Jọn 4:8) Anyị nwere ọtụtụ ihe anyị ga-amụta n’aka ụmụnna anyị ndị dara ogbi. Ha ma ka e si akparịta ụka, ha ma ihe, marakwa otú e si eme ihe ọchị. Otu nwanna nwoke mama ya na papa ya dara ogbi kwuru, sị: “Kemgbe a mụrụ m, mụ na ndị ogbi na-anọkarị, amụtakwala m ọtụtụ ihe n’aka ha. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe n’aka ụmụnna anyị ndị dara ogbi.”

Jehova hụrụ ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe n’anya, gụnyere ndị ogbi. Okwukwe ha na ntachi obi ha na-eme ka ọgbakọ Jehova na-eme nke ọma. N’ihi ya, ka anyị jiri ụmụnna anyị ndị dara ogbi kpọrọ ihe.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Emeela Ka Ha Nweta Ihu Ọma Ya,” nke dị n’Ụlọ Nche nke August 15, 2009.

[Foto dị na peeji nke 31]

Onye ogbi ga-enwekwu mmasị n’ozi ọma ma ọ bụrụ na e jiri asụsụ ndị ogbi zie ya

[Foto ndị dị na peeji nke 32]

Ebe anyị na-anọ amụ ihe kwesịrị ịbụ ebe ahụ́ ga-eru ụmụnna anyị ndị dara ogbi ala ha ewee nweta agbamume