Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya

Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya

Na-ahụkwu Ụmụnna Anyị n’Anya

“Na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya.”—EFE. 5:2.

1. Olee ihe dị mkpa Jizọs kwuru a ga-eji amara ndị na-eso ụzọ ya?

E JI ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke site n’ụlọ ruo n’ụlọ mara Ndịàmà Jehova. Ma, Kraịst Jizọs kwuru ihe ọzọ dị iche a ga-eji mara ezigbo ndị na-eso ụzọ ya. Ọ sịrị: “Ana m enye unu iwu ọhụrụ, ka unu na-ahụrịta ibe unu n’anya; dị nnọọ ka m hụrụ unu n’anya, ka unu na-ahụrịtakwa ibe unu n’anya. Mmadụ niile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ma ọ bụrụ na unu enwee ịhụnanya n’etiti onwe unu.”—Jọn 13:34, 35.

2, 3. Olee ihe ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ nwere ike ime n’obi ndị na-abịa ọmụmụ ihe anyị?

2 Ọ dịghị ebe ọzọ n’ụwa e nwere ụdị ịhụnanya e nwere n’etiti Ndị Kraịst. Dị nnọọ ka magnetọ na-adọta ígwè, otú ahụ ka ịhụnanya na-ejikọta ndị ohu Jehova ọnụ ma na-eme ka ndị nwere mmasị bịa soro ha fewe Chineke. Were ihe banyere Marcelino dị ka ihe atụ, bụ́ onye Cameroon nke kpuru ìsì n’ebe ọ na-arụ ọrụ. Mgbe ihe a mere ya, ndị mmadụ nọ na-agba asịrị na ihe mere o ji kpuo ìsì bụ n’ihi na ọ bụ amoosu. Kama ịkasi ya obi, pastọ ha na ndị chọọchị ha chụpụrụ ya na chọọchị ha. Mgbe otu Onyeàmà Jehova gwara ya ka ọ bịa ọmụmụ ihe, obi akaghị Marcelino ịga. Ọ chọghị ebe ọ ga-aga a chụpụ ya ọzọ.

3 Ihe mere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze mgbe Marcelino gara ọmụmụ ihe tụrụ ya n’anya. E ji obi ụtọ nabata ya, ihe ndị e si na Baịbụl kụzie kasikwara ya obi. Ọ malitere ịga ọmụmụ ihe niile, nwee ọganihu n’ọmụmụ ihe ya, e meekwa ya baptizim n’afọ 2006. Ugbu a, ọ na-ezi ndị ezinụlọ ya na ndị agbata obi ya ozi ọma, ọ na-amụkwara ọtụtụ ndị Baịbụl. Marcelino chọrọ ka ndị ọ na-amụrụ Baịbụl hụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ndị Chineke si hụ yanwa.

4. Olee ihe mere anyị ji kwesị ‘ịna-eje ije n’ịhụnanya’ dị ka Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme?

4 Ọ bụ eziokwu na ịhụnanya anyị nwere n’ebe ụmụnna anyị nọ amaka, anyị ekwesịghị iji ya na-egwuri egwu. Cheedị banyere ọkụ a kwanyere n’oge oyi, nke ndị mmadụ na-abịa anyara. Ọkụ ahụ ga-anyụ ma ọ bụrụ na a naghị esonye ya nkụ. N’otu aka ahụ, ọmarịcha ịhụnanya nke dị n’ọgbakọ ga-akwụsị ịdị ma ọ bụrụ na Ndị Kraịst niile agbaghị mbọ hụ na ọ dịgidere. Olee otú anyị nwere ike isi gbaa mbọ hụ na ọ dịgidere? Pọl onyeozi zara, sị: “Na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ nye Chineke.” (Efe. 5:2) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị sị, Olee otú m ga-esi na-eje ije n’ịhụnanya?

“Unu Onwe Unu, Megheenụ Obi Unu”

5, 6. Olee ihe mere Pọl ji gwa Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt ka ha ‘meghee obi ha’?

5 Pọl onyeozi deere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt n’oge ochie akwụkwọ, sị: “Ndị Kọrịnt, anyị ezoroghị unu ọnụ, obi anyị emeghewo. Ohere dịịrị unu n’ime obi anyị, ma unu enweghị ohere maka igosi obi ọmịiko. Ya mere, iji kwụọ anyị ụgwọ—m na-ekwu dị ka m̀ na-agwa ụmụntakịrị—unu onwe unu, megheenụ obi unu.” (2 Kọr. 6:11-13) Gịnị mere Pọl ji gwa ndị Kọrịnt ka ha meghee obi ha hụkwuo ndị ọzọ n’anya?

6 Tụlee otú ọgbakọ dị na Kọrịnt n’oge ochie si malite. Pọl bịara na Kọrịnt ná ngwụcha afọ 50 O.A. N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị megidere ya mgbe ọ malitere ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ, ọ daghị mbà. Ọ dịghị anya, ọtụtụ ndị nọ n’obodo ahụ ekwere n’ozi ọma. Pọl nọgidere na-ezi ihe ma na-ewusi ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ ike ruo “otu afọ na ọnwa isii.” O doro anya na ọ hụrụ Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 18:5, 6, 9-11) Ha nwere ọtụtụ ihe mere ha ga-eji hụ ya n’anya otú o si hụ ha ma kwanyere ya ùgwù. Ma, ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ anaghị aga ya nso. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha enweghị mmasị n’otú o si ekwu okwu n’ezoghị ọnụ. (1 Kọr. 5:1-5; 6:1-10) O nwekwara ike ịbụ na ụfọdụ na-ege nkatọ “ndịozi ọkasị mma” na-akatọ ya. (2 Kọr. 11:5, 6) Pọl chọrọ ka ụmụnna ya niile jiri obi ha dum hụ ya n’anya. Nke a mere o ji rịọ ha ka ha ‘meghee obi ha’ site n’ịbịaru ya na ụmụnna ndị ọzọ nso.

7. Olee otú anyị nwere ike isi ‘meghee obi anyị’ hụkwuo ụmụnna anyị n’anya?

7 Oleekwanụ banyere anyị? Olee otú anyị nwere ike isi ‘meghee obi anyị’ hụkwuo ụmụnna anyị n’anya? O nwere ike ịdịrị ndị bụ́ ọgbọ ma ọ bụ ndị si n’otu agbụrụ mfe ịhụ ibe ha n’anya. Ndị otu ụdị ihe e ji atụrụ ndụ na-amasịkwa na-anọkọkarị ọnụ. Ọ bụrụ na ihe na-amasị anyị na ụfọdụ ụmụnna anyị adịrị iche n’ihe na-amasị ndị ọzọ, anyị kwesịrị ‘imeghe obi anyị.’ Ọ ga-adị mma ma onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘Ọ̀ na-esiri m ike iso ụmụnna ndị na-abụghị ndị ọgbọ m ma ọ bụ ndị agbụrụ m aga ozi ọma ma ọ bụkwanụ na-anọkọ? Mgbe a bịara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, àna m asọ ndị ọhụrụ asọ n’ihi na m bu n’obi na mụ na ha nwere ike ịbụ enyi ka oge na-aga ma ọ bụrụ na ha emete ihe anyị ga-eji bụrụ enyi? Àna m ekele ma ndị agadi ma ụmụaka nọ n’ọgbakọ?’

8, 9. Olee otú ndụmọdụ Pọl nke e dere ná Ndị Rom 15:7 nwere ike isi nyere anyị aka ikele ibe anyị otú ga-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya?

8 A bịa n’ihe banyere ikele ụmụnna anyị, ihe Pọl gwara ndị Rom nwere ike inyere anyị aka ile ụmụnna anyị anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị. (Gụọ Ndị Rom 15:7.) Okwu Grik a sụgharịrị “na-anabatanụ” n’ebe ahụ pụtara “iji obiọma nabata mmadụ ka ezigbo enyi gị.” N’oge ochie, mgbe mmadụ ji obiọma lee ndị bịara n’ụlọ ya ọbịa, ọ na-egosi na obi dị ya ụtọ na ha bịara. Otú a ka Kraịst si nabata anyị, a gbakwara anyị ume ka anyị nabata ụmụnna anyị otú ahụ o si nabata anyị.

9 Mgbe anyị na-ekele ụmụnna anyị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị kwesịrị iwepụtakwu oge maka ndị anyị na-ahụbeghị kemgbe ma ọ bụkwanụ ndị nke anyị na ha na-ekwubeghị okwu kemgbe. Í cheghị na ọ ga-adị mma ma i wepụta nkeji ole na ole ka gị na ha kọrịa? Anyị na ndị ọzọ nwekwara ike ịkọrị mgbe ọzọ anyị bịara ọmụmụ ihe. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, ọ gaghị adị anya anyị na ọtụtụ n’ime ụmụnna anyị niile enwee ike ịkparịta ụka. Enyela onwe gị nsogbu ma ọ bụrụ na gị na mmadụ niile akparịtaghị ụka n’otu ụbọchị. O nweghị ndị kwesịrị iwe iwe ma ọ bụrụ na anyị enwelighị ike ikele ha n’ụbọchị ọ bụla a bịara ọmụmụ ihe.

10. Olee ohere ndị magburu onwe ha onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ nwere, oleekwa ihe anyị nwere ike iji ha mee?

10 Ihe mbụ anyị na-eme mgbe anyị na-anabata ndị ọzọ bụ ikele ha ekele. Nke a nwere ike ime ka anyị na ha malite ịkparịta ụka ma bụrụ ezigbo enyi. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị bịara mgbakọ gwara ibe ha ndị ha bụ wee malite ịkparịta ụka, ha ga na-atụ anya ịhụ ibe ha ọzọ. Ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze nakwa ndị na-arụ ọrụ enyemaka na ibe ha na-aghọkarị enyi n’ihi na mgbe ha na-akparịta ụka ha na-achọpụta àgwà ọma ibe ha nwere. Ndị Jehova nwere ọtụtụ ohere ha ga-eji na-emete ezigbo ndị enyi. Ọ bụrụ na anyị ‘emeghee obi anyị’ hụkwuo ndị ọzọ n’anya, anyị ga-enwekwu ndị enyi, ịhụnanya nke mere ka anyị dịrị n’otu ga-esikwu ike.

Wepụta Oge Ka Gị na Ndị Ọzọ Na-anọrị

11. Olee ihe nlereanya Jizọs setịpụrụ, bụ́ nke e dere na Mak 10:13-16?

11 Ndị Kraịst niile kwesịrị ịgbalị ka ha bụrụ ndị ndị ọzọ nwere ike ịna-erute nso, dị ka Jizọs bụ. Tụlee ihe Jizọs mere mgbe ndị na-eso ụzọ ya nwara igbochi ndị mmadụ ka ha ghara ịkpọtara ya ụmụ ha. Ọ gwara ha, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m; unu anwala igbochi ha, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otú ahụ. . . . O kukwaara ụmụaka ahụ wee malite ịgọzi ha, na-ebikwasị ha aka n’isi.” (Mak 10:13-16) Cheedị otú obi dị ụmụaka ahụ na Onye Ozizi Ukwu ahụ nabatara ha!

12. Gịnị nwere ike igbochi anyị na ndị ọzọ ịkparịta ụka?

12 Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị ịjụ onwe ya sị, ‘Àna m ewepụta ohere ka mụ na ndị ọzọ na-anọrị, ka m̀ na-eji ọrụ n’aka mgbe niile?’ E nwere àgwà ụfọdụ na-adịghị njọ bụ́ ndị nwere ike ime ka anyị na ndị ọzọ ghara ịna-akparịta ụka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-ejikarị ekwe ntị akpọ ndị mmadụ na fon, ma ọ bụkwanụ na-akwụnyekarị ihe e ji ege egwú ná ntị n’ebe ndị ọzọ nọ, ihe anyị na-agwa ha bụ na anyị achọghị ka ha bịa anyị nso. Ọ bụrụkwa na ndị ọzọ na-ahụkarị ka anyị na-apịgharị ekwe ntị anyị, ha nwere ike iche na anyị achọghị ikwunyere ha okwu. Ọ bụ eziokwu na e nwere “oge ịgbachi nkịtị” ma, mgbe anyị na ndị ọzọ nọ na-abụkarị “oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:7) Ụfọdụ nwere ike ịsị, “Ọ na-amasị m ịnọrọ onwe m” ma ọ bụkwanụ, “M naghị achọ ịkparịta ụka n’ụtụtụ.” Ma, ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ ka anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka ọbụna mgbe anyị na-achọchaghị ikwu okwu, anyị na-egosi na anyị hụrụ ha n’anya nakwa na anyị anaghị ‘achọ ọdịmma nke anyị.’—1 Kọr. 13:5.

13. Olee otú Pọl gwara Timoti ka o si na-emeso ụmụnna ihe?

13 Pọl gbara nwa okorobịa bụ́ Timoti ume ka ọ kwanyere ndị niile nọ n’ọgbakọ ùgwù. (Gụọ 1 Timoti 5:1, 2.) Anyị kwesịkwara ịna-emeso ndị agadi nọ n’ọgbakọ ihe ka hà bụ nne na nna anyị, na-emesokwa ụmụ okoro na agbọghọ nọ n’ọgbakọ ihe ka hà bụ ụmụnne anyị, ya bụ, ndị otu nne ji anyị na ha. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, ahụ́ ga na-eru ụmụnna anyị ala ma anyị na ha nọrọ.

14. Olee uru ụfọdụ ị ga-erite ma gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka?

14 Ọ bụrụ na anyị na ndị ọzọ na-akparịta ụka nke na-ewusi okwukwe ha ike, anyị ga-eme ka ha na-eme nke ọma n’ọgbakọ, meekwa ka obi na-adị ha mma. Otu nwanna nwoke nke na-arụ na Betel na-enwekarị obi ụtọ mgbe o chetara ọtụtụ ndị agadi na-eje ozi na Betel bụ́ ndị nyere ya ndụmọdụ mgbe ọ bịara Betel ọhụrụ. Agbamume ha nyere ya mere ka ahụ́ ruo ya ala na Betel. Ọ na-agbalị ime ka ha site n’ịgba ndị Betel ibe ya ndị ọzọ ume.

Ọ Na-adịrị Onye Dị Umeala n’Obi Mfe Ime Ka Udo Dị

15. Olee ihe gosiri na anyị na-enwekwa nghọtahie?

15 O yiri ka o siiri Yuodia na Sintiki, bụ́ ụmụnna nwaanyị abụọ nọ na Filipaị n’oge ochie, ike idozi nsogbu ha nwere. (Fil. 4:2, 3) Pọl na Banabas sere ezigbo okwu nke mere ka ha kewaa ma gawara onwe ha ruo nwa oge. (Ọrụ 15:37-39) Akụkọ ndị a na-egosi na ndị na-efe Chineke na-enwekwa nghọtahie. Jehova gwara anyị otú anyị nwere ike isi dozie esemokwu ma ghọghachi ndị enyi. Ma, o nwere ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme.

16, 17. (a) Olee uru ịdị umeala n’obi na-aba n’idozi esemokwu? (b) Olee otú akụkọ banyere ihe mere mgbe Jekọb zutere Ịsọ si gosi na ịdị umeala n’obi bara uru?

16 Ka e were ya na gị na enyi gị chọrọ iji ụgbọala mee njem. Tupu unu amalite njem ahụ, unu ga-agbanyerịrị ụgbọala ahụ. Otú ahụ kwa ka e nwere ihe dị mkpa ndị nwere nghọtahie ga-eme tupu ha edozie nsogbu ha. Ha ga-adịrịrị umeala n’obi. (Gụọ Jems 4:10.) Dị ka akụkọ na-eso, bụ́ nke dị n’Akwụkwọ Nsọ na-egosi, ịdị umeala n’obi na-eme ka ndị na-ese okwu malite ime ihe Baịbụl kwuru.

17 Afọ iri abụọ agafeela kemgbe Ịsọ wesara ejima ya bụ́ Jekọb iwe ma chọọ igbu ya n’ihi na ọ naara ya ọnọdụ diọkpara. Ha abụọ na-aga izute onwe ha, ‘Jekọb tụkwara egwu nke ukwuu ma chegbuwe onwe ya.’ O chere na Ịsọ ga-alụso ya ọgụ. Ma mgbe ha zutere ibe ha, Jekọb mere ihe Ịsọ na-atụghị anya ya. Ọ ‘kpọrọ isiala’ mgbe ọ na-erute nwanne ya nso. Gịnịzi mere? “Isọ wee gbara ọsọ gaa izute ya, o wee makụọ ya ma dakwasị ya n’olu wee susuo ya ọnụ, ha wee malite ibe ákwá.” Ha alụghị ọgụ. Otú Jekọb si dịrị umeala n’obi mere ka Ịsọ kwụsị ịkpọ ya asị.—Jen. 27:41; 32:3-8; 33:3, 4.

18, 19. (a) Ọ bụrụ na anyị na mmadụ esee okwu, olee ihe mere anyị ji kwesị ibute ụzọ n’ime ihe Akwụkwọ Nsọ dụrụ n’ọdụ? (b) Olee ihe mere anyị ekwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na mgbalị mbụ anyị mere idozi esemokwu ahụ enweghị isi?

18 Baịbụl nyere anyị ndụmọdụ magburu onwe ya banyere otú anyị nwere ike isi dozie esemokwu. (Mat. 5:23, 24; 18:15-17; Efe. 4:26, 27) * Ma, ọ bụrụ na anyị ejighị obi umeala mee ihe a dụrụ anyị n’ọdụ, ọ ga-esiri anyị ike ime udo. Ichewe ka onye nke ọzọ gosi na ya dị umeala n’obi agaghị edozi esemokwu ahụ, anyị aghaghị ịdị umeala n’obi n’onwe anyị.

19 Ọ bụrụ na e nwee ihe mere ka mbọ mbụ anyị gbara ime ka udo dịrị ghara inwe isi, anyị ekwesịghị ịda mbà. O nwere ike ịbụ na ọ ga-ewetụ oge tupu obi onye nke ọzọ adajụọ. Ụmụnne Josef kpasoro ya àgwà ọjọọ. Ọtụtụ afọ gafere tupu ya na ha ahụ ọzọ, bụ́ mgbe ọ bụzi osote eze ndị Ijipt. Ma, obi ha agbanweela, ha rịọkwara ya mgbaghara. Josef gbaghaara ha, ụmụ Jekọb ghọkwara otu mba a kpọkwasịrị aha Jehova. (Jen. 50:15-21) Ọ bụrụ na anyị na ụmụnna anyị adịrị n’udo, anyị ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, meekwa ka onye ọ bụla na-enwe ọṅụ.—Gụọ Kọlọsi 3:12-14.

Ka Anyị Hụ Ndị Ọzọ n’Anya “n’Omume Nakwa n’Eziokwu”

20, 21. Olee ihe anyị na-amụta n’ụkwụ Jizọs sara ndịozi ya?

20 Obere oge tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndịozi ya, sị: “M na-enye unu ihe nlereanya, ka unu meekwa otú ahụ, dị nnọọ ka m meere unu.” (Jọn 13:15) Jizọs kwuru ihe a mgbe ọ sachara ndịozi ya iri na abụọ ụkwụ. O meghị ya iji mezuo iwu ma ọ bụkwanụ iji gosi na ya nwere obiọma. Tupu Jọn akọọ banyere ụkwụ ahụ Jizọs sara ndịozi ya, o dere, sị: “Jizọs . . . hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya, ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.” (Jọn 13:1) Ihe mere Jizọs ji rụọ ọrụ ahụ odibo na-arụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ndị na-eso ụzọ ya n’anya. Nke a gosiri ha na ha kwesịrị ịna-arụrụ ndị ọzọ ọrụ ga-egosi na ha hụrụ ha n’anya. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya n’ezie, anyị ga na-eche banyere ha.

21 Pita onyeozi, bụ́ onye Ọkpara Chineke sara ụkwụ n’oge ahụ, ghọtara ihe ihe ahụ Jizọs mere pụtara. O dere, sị: “Ebe unu meworo ka mkpụrụ obi unu dị ọcha site n’isi unu na-erubere eziokwu ahụ nke mere ka unu nwee ịhụnanya ụmụnna nke na-abụghị nke ihu abụọ, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ site n’obi unu.” (1 Pita 1:22) Jọn onyeozi, bụ́ onye ọzọ Onyenwe anyị sakwara ụkwụ n’oge ahụ, dere, sị: “Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Ka obi anyị kpalie anyị ime ihe ga-egosi na anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 18 Gụọ akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, peeji nke 144-150.

Ì Chetara?

• Olee otú anyị ga-esi ‘meghee obi anyị’ hụkwuo ndị ọzọ n’anya?

• Gịnị ga-eme ka anyị nwee ike iwepụta ohere ka anyị na ndị ọzọ kparịta ụka?

• Olee otú ịdị umeala n’obi si enyere anyị aka ime udo?

• Gịnị kwesịrị ịkpali anyị ịhụ ụmụnna anyị n’anya?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto dị na peeji nke 21]

Jiri obi ụtọ na-anabata ụmụnna gị

[Foto dị na peeji nke 23]

Gbaa mbọ na-ewepụta oge ka gị na ndị ọzọ na-akparịta ụka