Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Ozi Chineke Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

Ndị Ozi Chineke Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

Ndị Ozi Chineke Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

“Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke.”—EFE. 5:1.

1, 2. (a) Gịnị mere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù ji dị mkpa? (b) Gịnị ka anyị ga-amụ n’isiokwu a?

OTU nwoke nke na-ede akwụkwọ onye aha ya bụ Sue Fox dere banyere mmadụ ịkwanyere ibe ya ùgwù, sị: “Anyị kwesịrị ịna-akwanyere ndị mmadụ ùgwù mgbe niile. O nweghị ebe ma ọ bụ oge anyị na-ekwesịghị ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù.” Ọ bụrụ na ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù amara ndị mmadụ ahụ́, o nweghị onye ya na ibe ya ga na-enwe nsogbu ọ bụla. Ọ bụrụgodị na ha na-enwe, ọ ga-adị ole na ole. Ma, ọ bụrụ na ha anaghị akwanyere ibe ha ùgwù, ha na ha ga na-ese okwu. Ịkparị ndị ọzọ na-ebute esemokwu na obi ọjọọ.

2 Ndị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst na-akwanyere ibe ha ùgwù. N’agbanyeghị nke a, anyị aghaghị ịkpachara anya ka anyị ghara ịdị ka ụfọdụ ndị na-anaghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’ụwa. Ka anyị tụlee otú ime ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù ga-esi mee ka anyị ghara ịdị ka ndị ụwa nakwa otú ọ ga-esi mee ka ndị ọzọ bịa fewe Chineke. Iji ghọta otú anyị ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, tụlee otú Jehova Chineke na Ọkpara ya si akwanyere ndị ọzọ ùgwù.

Jehova na Ọkpara Ya Na-akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

3. Olee otú Jehova Chineke si setịpụrụ anyị ihe nlereanya n’otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

3 Jehova Chineke na-esetịpụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya n’otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ na-eji nnọọ obiọma emeso ndị mmadụ ihe ma na-akwanyere ha ùgwù n’agbanyeghị na ọ bụ Ọkaakaa eluigwe na ụwa. Mgbe Jehova gwara ma Ebreham ma Mozis okwu, o ji okwu Hibru a na-asụgharịkarị ka ọ bụrụ “biko” gwa ha okwu. (Jen. 13:14; Ọpụ. 4:6) Ọ bụrụ na ndị ohu Jehova emee mmehie, ọ ‘na-emere ha ebere, na-emere ha amara, ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, obiọma ya na eziokwu ya dịkwa ukwuu.’ (Ọma 86:15) Ọ dịghị ka ndị ụfọdụ, bụ́ ndị na-ewe oké iwe ma ọ bụrụ na ndị ọzọ emeghị ihe ha chọrọ ka ha mee.

4. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka Jehova ma ndị ọzọ na-agwa anyị okwu?

4 Otú Chineke si ege ndị mmadụ ntị na-egosi na ọ na-akwanyere ha ùgwù. Mgbe Ebreham jụrụ Jehova ọtụtụ ajụjụ banyere ndị Sọdọm, o nwere ndidi wee zaa ya ajụjụ niile ọ jụrụ ya. (Jen. 18:23-32) O leghị ajụjụ Ebreham jụrụ ya anya dị ka igbu ya oge. Jehova na-ege ntị n’ekpere ndị ohu ya, na-anụkwa arịrịọ ndị mmehie chegharịrị echegharị ji ákwá arịọ ya. (Gụọ Abụ Ọma 51:11, 17.) Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iṅomi Jehova site n’ige ndị ọzọ ntị ma ha na-agwa anyị okwu?

5. Olee otú iṅomi otú Jizọs si akwanyere ndị ọzọ ùgwù nwere ike isi mee ka anyị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma?

5 Otu n’ime ọtụtụ ihe Jizọs Kraịst mụtara n’aka Nna ya bụ ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o ji ndidi na obiọma na-emeso ndị mmadụ ihe mgbe niile n’agbanyeghị na mgbe ụfọdụ ozi ya na-ewerecha oge ya na ike ya. Obi na-adị Jizọs ụtọ inyere ndị ekpenta na ndị kpuru ìsì aka, bụ́ ndị ọ bụ naanị arịrịọ ka ha ji arịọta ihe ha na-eri, tinyekwara ndị ọzọ chọrọ enyemaka. Ọ naghị eleghara ha anya, n’agbanyeghị na ọ bụghị ya na-akpọ ha ka ha bịakwute ya. Ọ na-ahapụkarị ihe ọ bụla ọ na-eme iji nyere ndị nwere nsogbu aka. Jizọs na-eme ihe niile iji gboo mkpa ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ. (Mak 5:30-34; Luk 18:35-41) Anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-eme ka Jizọs site n’iji obiọma na-enyere ndị ọzọ aka. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, ndị ikwu anyị, ndị agbata obi anyị, na ndị ọzọ ga na-ahụ ya. Ihe ọzọ bụ na nke a na-ewetara Jehova otuto ma na-eme ka anyị nwee obi ụtọ.

6. Olee otú Jizọs si setịpụrụ anyị ihe nlereanya n’otú anyị kwesịrị isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma hụ ha n’anya?

6 Jizọs kwanyekwaara ndị mmadụ ùgwù site n’ịkpọ ha aha. Ndị ndú okpukpe ndị Juu hà si otú ahụ kwanyere ndị ọzọ ùgwù? Mba. Ha na-ele ndị na-amaghị Iwu ahụ anya dị ka “ndị a bụrụ ọnụ,” ha na-emesokwa ha ihe dị ka à ga-asị na a bụrụ ha ọnụ. (Jọn 7:49) Ọkpara Chineke emesoghị ndị mmadụ ihe ka ha. Jizọs kpọrọ Mata, Meri, Zakịọs, na ọtụtụ ndị ọzọ aha ha mgbe ọ na-agwa ha okwu. (Luk 10:41, 42; 19:5) Ndị ohu Jehova na-agbalị ka ha na mmadụ niile dịrị n’udo n’agbanyeghị na otú a na-eme n’ebe anyị bi na ọnọdụ anyị nwere ike ịgbanwe otú anyị si agwa ndị mmadụ okwu. * Ha anaghị akpa ókè wee ghara ịkwanyere ụmụnna ha na ndị ọzọ ùgwù ha kwesịrị ịkwanyere ha.—Gụọ Jems 2:1-4.

7. Olee otú ihe dị na Baịbụl si enyere anyị aka ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù, n’agbanyeghị omenala ha?

7 Otú Chineke na Ọkpara ya si emere ndị mba niile na ndị agbụrụ niile amara na-egosi na ha na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù, nke a na-emekwa ka ndị nwere ezi obi bịa fewe Chineke. Ihe bụ́ nkwanye ùgwù n’otu ebe nwere ike ghara ịbụ nkwanye ùgwù n’ebe ọzọ. N’ihi ya, anyị anaghị ekwu kpọmkwem otú e kwesịrị isi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Kama nke ahụ, ihe anyị na-amụta na Baịbụl na-enyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-akwanyere mmadụ niile ùgwù, n’agbanyeghị omenala ha. Ka anyị tụlee otú ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù nwere ike isi mee ka anyị nwekwuo ọtụtụ ndị na-ege ntị n’ozi ọma anyị.

Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ekele ma Na-agwa Ndị Mmadụ Okwu

8, 9. (a) Olee ihe ọ ga-abụ mmadụ na-eme e were ya na ọ naghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (b) Gịnị mere anyị ga-eji kwere ka ihe Jizọs kwuru nke e dere na Matiu 5:47 gbanwee otú anyị si emeso ndị mmadụ ihe?

8 N’ọtụtụ ebe, ọ na-adị ndị mmadụ ngwa ngwa nke na mmadụ abụọ nwere ike ịna-agafe ibe ha mgbe niile n’ekweghị ekele. Anyị anaghị ekwu na mmadụ kwesịrị ikele onye ọ bụla ọ hụrụ n’ụzọ nke na-ekwo ekwo. E wezụga nke a, mmadụ kwesịrị ịna-ekele ndị ọzọ ekele. Ị̀ na-ekele ndị mmadụ ekele? Ka ị̀ na-agafe ha n’amụmụghị ọnụ ọchị ma ọ bụkwanụ n’atụpụrụghị ha ọnụ? Mmadụ nwere ike ịkwụsị ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọjọọ o buru ha n’obi.

9 Jizọs chetaara anyị ezigbo ihe mgbe o kwuru, sị: “Ọ bụrụkwa na ọ bụ naanị ụmụnne unu ka unu na-ekele, olee oké ihe unu na-eme? Ọ̀ bụ na ndị mba ọzọ adịghị emekwa otu ihe ahụ?” (Mat. 5:47) Otu ọkachamara aha ya bụ Donald Weiss dere banyere nke a, sị: “Obi anaghị adị ndị mmadụ mma ma a gafee ha n’ekweghị ha ekele. O nweghị ihe rijuru afọ mmadụ ga-ekwu mere o ji gafee onye ọzọ n’ekweghị ya ekele. Ọ bụghị oké ọrụ: Na-ekele ndị mmadụ ekele. Na-atụpụrụ ha ọnụ.” Ihe bara uru ga-esi na ya pụta ma ọ bụrụ na anyị emeda obi na-ekwe ndị mmadụ ekele ma na-emesapụrụ ha ihu.

10. Olee otú ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù nwere ike isi mee ka ozi anyị na-aga nke ọma? (Gụọ igbe bụ́  “Jiri Ihu Ọchị Malite Izi Ozi Ọma.”)

10 Tụlee banyere Tom na Carol, bụ́ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst bi n’otu obodo ukwuu dị n’Ebe Ugwu America. Ha na-esi n’ezigbo mkparịta ụka amalite izi ndị agbata obi ha ozi ọma. Olee otú ha si eme nke a? Tom kwuru otú Jems 3:18 si enyere ha aka, sị: “Anyị na-agbalị ikwunyere mmadụ niile okwu ka anyị na ha wee dị n’udo. Anyị na-agakwuru ndị nọ n’ihu ụlọ ha na ndị na-arụ ọrụ. Anyị na-eji ihu ọchị ekele ha. Anyị na ha na-ekwu banyere ihe ndị dị ha mkpa, ya bụ, ụmụ ha, nkịta ha, ụlọ ha, na ọrụ ha. Ka oge na-aga, anyị na ha na-abụ enyi.” Carol sịkwara: “Anyị bịa na nke ha ụbọchị ọzọ, anyị na-agwa ha aha anyị, jụọkwa ha nke ha. Anyị na-egbu okwu nkenke wee gwa ha ihe kpatara anyị ji bịa na nke ha. E mechazie, anyị na-ezi ha ozi ọma.” Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi Tom na Carol tụkwasịrị ha obi. Ọtụtụ n’ime ha nwekwara akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Mmadụ ole na ole n’ime ha nwekwara nnọọ mmasị ịmụ Baịbụl.

Ịkwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Mgbe Ha Na-anaghị Akwanyere Anyị

11, 12. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-atụ anya na a ga na-akpagbu anyị n’ihi ozi ọma anyị na-ezi, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ma a kpagbuwe anyị?

11 Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ na-akparị anyị ma anyị nọrọ ozi ọma. Nke a anaghị ada anyị mberede n’ihi na Kraịst Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu.” (Jọn 15:20) Ma, ịgwagwara ndị mmadụ okwu ọjọọ ha gwara anyị anaghị arụpụta ezigbo ihe. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma a gwa anyị okwu ọjọọ? Pita onyeozi dere, sị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.” (1 Pita 3:15) Ịkwanyere ndị na-akparị anyị ùgwù, ya bụ, iji nwayọọ na-azaghachi ha okwu n’ụzọ na-egosi na anyị na-asọpụrụ ha, nwere ike ime ka ha gbanwee otú ha si ele ozi anyị anya.—Taị. 2:7, 8.

12 Ànyị nwere ike ịkwadebe onwe anyị ka anyị wee zaghachi onye gwara anyị okwu ọjọọ ihe ga-adị Chineke mma? Ee. Pọl gwara anyị, sị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:6) Ọ bụrụ na anyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ndị ọgbakọ anyị, na ndị agbata obi anyị okwu dị nro ma na-akwanyere ha ùgwù, ọ ga-adịrị anyị mfe idi mkparị wee gosi na anyị bụ Ndị Kraịst.—Gụọ Ndị Rom 12:17-21.

13. Kwuo otú ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù nwere ike isi mee ka ndị na-akpagbu anyị gbanwee otú ha si emeso anyị.

13 Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’agbanyeghị na ha anaghị akwanyere anyị, ezigbo ihe ga-esi na ya pụta. Dị ka ihe atụ, na Japan, otu nwoke na onye ọbịa ya kparịrị otu Onyeàmà bịara izi ha ozi ọma. Nwanna ahụ kwanyeere ha ùgwù wee gawa ebe ọzọ. Ka nwanna nwoke ahụ nọ na-ezi ozi ọma n’ókèala ahụ, ọ hụrụ na onye ọbịa nwoke ahụ nọ ebe na-adịghị anya na-ele ya. Mgbe nwanna ahụ rutere ebe nwoke ahụ nọ, nwoke ahụ asị: “Ewela iwe maka ihe anyị mere gị. N’agbanyeghị na anyị kparịrị gị, m hụrụ na ọnụ bụ gị ọchị ọchị. Olee ihe m ga-eme ka m dị ka gị?” Obi anaghị adị nwoke ahụ ụtọ n’ihi na a chụrụ ya n’ọrụ, nne ya anwụọkwa n’oge ahụ. Nwoke ahụ kwere ka ya na nwanna ahụ mụwa ihe. N’oge na-adịghị anya, ọ na-amụrụ ya ihe ugboro abụọ n’izu.

Ụzọ Kacha Mma Anyị Ga-esi Malite Ịkwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù

14, 15. Olee otú ndị ohu Chineke n’oge ochie si zụọ ụmụ ha?

14 Ndị nne na nna bụ́ ndị na-efe Chineke n’oge ochie na-anọ n’ụlọ ha akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù. Ị gụọ Jenesis 22:7 ị ga-ahụ otú Ebreham na Aịzik nwa ya si eji nkwanye ùgwù agwa ibe ha okwu. Otú Josef si akwanyere ndị ọzọ ùgwù na-egosikwa na ndị mụrụ ya zụrụ ya azụ. Mgbe a tụrụ ya mkpọrọ, ọ kwanyekwaara ndị mkpọrọ ibe ya ùgwù. (Jen. 40:8, 14) Otú o si gwa Fero okwu na-egosi na ọ ma ụzọ dị mma e kwesịrị isi na-agwa onye ọkwa ya dị elu okwu.—Jen. 41:16, 33, 34.

15 Otu n’ime Iwu Iri Chineke nyere ụmụ Izrel sịrị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị ka ụbọchị gị wee dị ogologo n’ala Jehova bụ́ Chineke gị ga-enye gị.” (Ọpụ. 20:12) Otu n’ime ụzọ ụmụaka si asọpụrụ ndị mụrụ ha bụ ịkwanyere ha ùgwù n’ụlọ. Nwa Jefta kwanyeere ya ezigbote ùgwù site n’ime ihe nna ya kwere Chineke ná nkwa n’agbanyeghị na o siri ike omume.—Ikpe 11:35-40.

16-18. (a) Olee otú a ga-esi na-akụziri ụmụaka ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? (b) Olee ụfọdụ ihe ọma na-esi n’ịkụziri ụmụaka otú ha ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù apụta?

16 Ịzụ ụmụ anyị ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù dị ezigbo mkpa. Ka ụmụ anyị wee bụrụ ndị ezigbo mmadụ mgbe ha toro, ha aghaghị ịma otú ha kwesịrị isi na-ekwe ndị ọzọ ekele, otú ha kwesịrị isi na-aza fon, ma ọ bụkwa otú ha ga-esi na-eri nri ma ha na ndị ọzọ na-eri nri. E kwesịrị inyere ha aka ịghọta ihe mere ha ji kwesị ịna-ejidere ndị mmadụ ụzọ aka ka ha gafee, ihe ha ji kwesị ịna-enyere ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị aka, ma ọ bụkwanụ ndị bu ibu dị arọ. Ha kwesịrị ịghọta na ọ dị mkpa mmadụ isi n’ala ala obi ya sị onye ọzọ “biko,” “i meela,” “ndeewo,” “olee ihe ị chọrọ ka m meere gị?,” nakwa “ewela iwe.”

17 Ịkụziri ụmụaka otú e si akwanyere ndị ọzọ ùgwù esighị ike. Ụzọ kacha mma isi mee nke a bụ isetịpụrụ ha ezigbo ihe nlereanya. Kurt, onye dị iri afọ abụọ na ise kwuru otú ya na ụmụnne ya atọ si mụta ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ọ sịrị: “Anyị na-ahụ otú mama anyị na papa anyị si eji obiọma agwa ibe ha okwu nakwa otú ha si eji ndidi na ịhụnanya emeso ndị ọzọ ihe. N’Ụlọ Nzukọ Alaeze, tupu ọmụmụ ihe amalite nakwa mgbe a gbasara ọmụmụ ihe, papa m na-eduru m agakwuru ụmụnna ndị merela agadi wee na-agwa ha okwu. M na-ahụ otú o si ekele ha nakwa otú o si akwanyere ha ùgwù.” Kurt kwukwara, sị: “Ka oge na-aga, amụtara m ihe ahụ papa m na-eme. Ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù malitere ịdịrị m mfe. Ọ bụghị ihe m ga-eme ma m chọọ, kama, ọ bụ ihe m kwesịrị ịna-eme.”

18 Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ndị nne na nna na-akụziri ụmụ ha otú ha ga-esi na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù? Nke a ga-enyere ụmụ ha aka inwe ndị enyi, ha na ndị ọzọ ga na-adịkwa n’udo. Ọ ga-eme nnọọ ka ha na ndị were ha n’ọrụ nakwa ndị ọrụ ibe ha na-arụ ọrụ n’enweghị nsogbu. Ihe ọzọkwa bụ na ụmụaka ndị na-akpa àgwà ọma, bụ́ ndị na-asọpụrụ ndị ọzọ, ga-eme ka nne ha na nna ha nwee ọṅụ na afọ ojuju.—Gụọ Ilu 23:24, 25.

Ịkwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù Na-egosi na Anyị Dị Iche

19, 20. Olee ihe mere anyị ji kwesi ikpebisi ike iṅomi Chineke anyị bụ́ onye amara, nakwa Ọkpara ya?

19 Pọl dere, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Efe. 5:1) Iṅomi Jehova bụ́ Chineke na Ọkpara ya gụnyere ime ihe dị na Baịbụl, ndị dị ka ndị anyị tụlere n’isiokwu a. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, anyị agaghị na-akwanyere ndị mmadụ ùgwù ka anyị wee zụrụ ụtọ nke onye ọkwa ya dị elu ma ọ bụkwanụ ka anyị wee rite ihe n’aka ndị anyị na-akwanyere ùgwù.—Jud 16.

20 N’oge a ajọ ọchịchị Setan fọrọ ntakịrị ka ọ gwụ, o kpebisiela ike ime ka ndị mmadụ ghara ịna-akwanyere ibe ha ùgwù otú Jehova si chọọ ya. Ma, o nweghị ihe ga-eme ka Ekwensu mee ka Ndị Kraịst ghara ịna-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ka onye ọ bụla n’ime anyị kpebisie ike iṅomi otú Chineke anyị, bụ́ onye amara, nakwa Ọkpara ya si akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Nke a ga-eme ka otú anyị si ekwu okwu nakwa otú anyị si eme omume dị iche mgbe niile na nke ndị na-anaghị akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Anyị ga-ewetara aha Chineke anyị bụ́ Jehova otuto, bụ́ onye na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Nke a ga-emekwa ka ndị nwere ezi obi bịa fewe ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 N’ebe ụfọdụ, mmadụ ịkpọ onye tọrọ ya aha bụ mkparị ọ gwụla ma ọ̀ bụ onye ahụ gwara ya ka ọ na-akpọ ya. Ndị Kraịst kwesịrị iburu nke a n’uche.

Ì Chetara?

• Gịnị ka anyị mụtara n’aka Jehova na Ọkpara ya banyere ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù?

• Gịnị mere Ndị Kraịst ji kwesị ịna-esi n’ala ala obi ekele ndị mmadụ ekele?

• Olee otú ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù na-esi eme ka anyị na-arụpụta ihe n’ozi anyị?

• Olee otú ndị nne na nna kwesịrị isi na-akụziri ụmụ ha ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Igbe dị na peeji nke 27]

 Jiri Ihu Ọchị Malite Izi Ozi Ọma

Ọtụtụ ndị anaghị enwecha mmasị ka ha na onye ha na-amaghị kwurịtawa okwu. Ma, n’ihi ịhụnanya Ndịàmà Jehova nwere n’ebe Chineke nọ nakwa n’ebe ndị agbata obi ha nọ, ha na-agbasi mbọ ike ka ha mụta otú ha na ndị agbata obi ha ga-esi na-ekwurịta okwu ka ha wee nwee ike ịgwa ha banyere eziokwu dị na Baịbụl. Gịnị nwere ike inyere gị aka ime nke a?

Ihe e dere ná Ndị Filipaị 2:4 ga-enyere gị aka ime nke a. Ọ sịrị: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” Chegodị banyere ihe amaokwu a na-ekwu: Ọ bụrụ na gị na mmadụ ahụtụbeghị mbụ, ọ maghị onye ị bụ. Olee otú ị ga-esi mee ka ahụ́ ruo ya ala? Ihu ọchị na ekele si n’ala ala obi nwere ike ime nke a. E nwekwara ihe ọzọ dị na ya.

I nwere ike ịdọpụ uche mmadụ n’ihe ọ nọ na-eche ma ọ bụrụ na ị malite ịgwa ya okwu. Ọ bụrụ na ị chọọ ka gị na ya kwurịtawa ihe dị gị n’obi n’achọghị ịma ihe dị n’obi nke ya, o nwere ike ọ gaghị ekwe. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị ga-enwe ike ịmata ihe onye ahụ na-eche, jiri ya malite ịgwa ya okwu. Ọ bụ ihe Jizọs mere mgbe ọ hụrụ nwaanyị Sameria n’olulu mmiri. (Jọn 4:7-26) Ihe nwaanyị ahụ na-eche bụ isere mmiri. Jizọs ji ihe ahụ ọ nọ na-eche malite ikwunyere ya okwu, n’oge na-adịghị anya, o chere okwu ahụ ihu n’ihe banyere Chineke.

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Imesapụrụ ndị mmadụ ihu nwere ike inyere anyị aka izi ha ozi ọma

[Foto dị na peeji nke 28]

O nweghị mgbe ịkwanyere ndị mmadụ ùgwù na-anaghị adị mma