Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Nwatakịrị Nwaanyị nke Na-emesapụ Aka

Nwatakịrị Nwaanyị nke Na-emesapụ Aka

Nwatakịrị Nwaanyị nke Na-emesapụ Aka

N’OGE na-adịbeghị anya, otu nwatakịrị nwaanyị dị afọ itoolu, onye bi na Brazil, ji aka ya kee ego ya ụzọ abụọ. Otu ụzọ dị dọla iri na asatọ, nke ọzọ dị dọla iri abụọ na ise. O tinyere nke dị dọla iri na asatọ n’igbe onyinye afọ ofufo dị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ka e jiri ya gboo mkpa ọgbakọ. O zigara nke ọzọ ahụ dị iri dọla abụọ na ise nakwa akwụkwọ ozi dị nkenke n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị n’obodo ya. O dere n’akwụkwọ ozi ahụ, sị: “M na-enye unu ego a ka unu jiri ya na-arụ ọrụ a na-arụ n’ụwa niile. Achọrọ m inyere ọtụtụ ụmụnna anyị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa aka ka ha na-ekwusa ozi ọma. M na-enye ego a n’ihi na m hụrụ Jehova n’anya nke ukwuu.”

Ndị mụrụ nwatakịrị nwaanyị a akụzierela ya mkpa ọ dị iso na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ha akụziekwarala ya mkpa ọ dị ‘iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa o nwere sọpụrụ Jehova.’ (Ilu 3:9) Ka anyị niile gbaa mbọ na-eme ka nwatakịrị nwaanyị a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-akwado ozi ọma anyị na-ekwusa, ma n’ebe anyị bi ma n’ụwa niile.