Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Nwere Ike Ịgafeta Masedonia?

Ì Nwere Ike Ịgafeta Masedonia?

Ì Nwere Ike Ịgafeta Masedonia?

PỌL onyeozi hụrụ ọhụụ mgbe ọ nọ na Troas, bụ́ obodo e nwere ọdụ ụgbọ mmiri, nke dị n’Eshia Maịnọ. Otu nwoke Masedonia rịọsiri ya arịrịọ ike, sị: “Gafeta na Masedonia nyere anyị aka.” Ozugbo Pọl hụrụ ọhụụ ahụ, ya na ndị ya na ha so ‘matara na Chineke akpọwo ha izisara ndị Masedonia ozi ọma.’ Gịnị si n’ozi ọma ha zisaara ha pụta? Na Filipaị, bụ́ obodo bụ́ isi na Masedonia, Lidia na ezinụlọ ya ghọrọ Ndị Kraịst. E nwekwara ndị ọzọ bi n’obodo ahụ Rom na-achị bụ́ ndị ghọrọ Ndị Kraịst.—Ọrụ 16:9-15.

Ndịàmà Jehova jikwa ụdị ịnụ ọkụ n’obi ahụ na-eje ozi taa. Ọtụtụ n’ime ha ejirila aka ha gaa ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Dị ka ihe atụ, Lisa chọrọ ijikwu ozi ọma kpọrọ ihe ná ndụ ya. Nke a mere ka o si Canada kwaga Kenya. Trevor na Emily, bụ́kwa ndị Canada, kwagara Malawi ka ha wee kwusaa ozi ọma ebe ahụ. Mgbe Paul na Maggie, bụ́ ndị England, lara ezumike nká, ha lere ya anya ka ohere magburu onwe ya ha ga-eji jee ozi n’ala ọzọ. Nke a mere ka ha kwaga n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Africa. Ì nwere ike iwepụta onwe gị ka i wee jee ozi n’ebe ọzọ? Ì nwere ike ịkwaga ebe ọzọ? Ọ bụrụ na i nwere ike ime ya, olee otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi nyere gị aka? Oleekwa ihe ndị ọzọ ga-enyere gị aka inwe ihe ịga nke ọma?

Nyochaa Onwe Gị nke Ọma

Otu n’ime ihe i kwesịrị ichebara echiche bụ ihe mere ị ga-eji chọọ ime ya. Jizọs kwuru na iwu kacha iwu niile bụ: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” Ihe mere ị ga-eji chọọ ịkwaga ala ọzọ kwesịrị ịbụ n’ihi na ị hụrụ Chineke n’anya ma chọọ ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Jizọs kwukwara, sị: “Nke abụọ, nke dị ka ya, bụ, ‘Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.’” Ọ na-enu onye hụrụ onye agbata obi ya n’anya enu inyere ya aka. (Mat. 22:36-39; 28:19, 20) Onye chọrọ ije ozi n’ala ọzọ aghaghị ịdị njikere iwepụta onwe ya ịrụ ọrụ dị ukwuu. Ọ bụghị ịga hụ otú ebe ọzọ dị. Ọ bụ ịhụnanya i nwere n’ebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ime ka ị gaa ya. Remco na Suzanne, bụ́ ndị Netherlands na-eje ozi ugbu a na Namibia, kapịrị okwu ọnụ wee sị, “Ọ bụ ịhụnanya dewere anyị ebe a.”

Willie, bụ́ onye nlekọta sekit na Namibia, kwuru, sị: “Ụmụnna anyị ndị na-eje ozi n’ala ọzọ ebughị n’obi mgbe ha bịara na ọ bụ ụmụnna ndị nwe ebe ha bịara ga-elekọtawa ha. Ihe mere ha ji bịa bụ ka ha soro ụmụnna ndị a na-eje ozi, ya bụ, ka ha nyere ha aka ikwusa ozi ọma.”

Mgbe ị tụlechara ihe mere i ji chọọ ime nke a, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe m hụrụla ná ndụ nke nwere ike inyere m aka n’ozi ala ọzọ? M̀ ma ezi ozi ọma nke ọma? Olee asụsụ ndị m na-asụ? M̀ ga-amụli asụsụ ọzọ?’ Gị na ndị ezinụlọ gị kpaa ya akpa. Kọọrọ ndị okenye ọgbakọ unu ihe ị chọrọ ime. Gwakwa ya Jehova n’ekpere. Ọ bụrụ na i jiri obi ọcha nyochaa onwe gị, ị ga-amata ma ije ozi ọma n’ala ọzọ ọ̀ ga-ekwe gị omume.—Gụọ igbe bụ́  “Leruo Onwe Gị Anya.”

Ebe Ị Ga-eje Ozi

N’ọhụụ ahụ Pọl hụrụ, a kpọrọ ya ka ọ bịa Masedonia. Taa, Jehova anaghị eme ka anyị hụ ọhụụ wee gwa anyị ebe anyị ga-eje ozi. Ma, Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị ọzọ na-eme ka ndị Chineke mara ọtụtụ ebe e nwere mkpa ka ndị nkwusa gaa. Burugodị ụzọ depụta ebe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ị gaghị enwe ike ịmụ asụsụ ọzọ ugbu a ma ọ bụkwanụ na ị gaghị enwe ike ịnọte aka n’ala ọzọ, mara ma ị̀ ga-ejewegodị ozi na mba gị, bụ́ ebe ị na-asụ asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ. Ka ọ dịgodị, chọpụta ihe ndị dị ka otú ị ga-esi nweta akwụkwọ ikike ị ga-eji gaa mba ahụ, otú ị ga-esi gbara ụgbọ gaa ya, ma udo ọ̀ dịkwa ebe ị chọrọ ịga, ma ihe ọ̀ na-ada ọnụ ebe ahụ, nakwa ma oyi ọ̀ na-atụkarị ebe ahụ ma ọ bụkwanụ ma ebe ahụ ọ̀ na-ekpokarị ọkụ. Ịkọtatụrụ ya ndị garala ebe e nwere mkpa ka ukwuu nwere ike inyere gị aka. Kpekuo Chineke ekpere ka o nyere gị aka ime mkpebi dị mma. Cheta na ‘mmụọ nsọ machibidoro Pọl na ndị ya na ha so iwu ikwu okwu Chineke n’ógbè Eshia.’ N’agbanyeghị na ha gbalịrị ịbanye Bitinia, “mmụọ Jizọs ekweghị ha.” N’otu aka ahụ, inweta ebe enyemaka gị dị ezigbo mkpa nwere ike igbutụ oge.—Ọrụ 16:6-10.

E nwere ike ya abụrụ na ị chọpụtala ugbu a ihe ole na ole ị ga-ahazi ka i wee nwee ike ije ozi ebe mkpa ka ukwuu. Ọ bụrụ na ị na-eche echiche ije ozi n’ala ọzọ, degara alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na mba i bu n’obi ịga akwụkwọ ozi. Gwa ha ihe ùgwù ọ bụla i nwere n’ọgbakọ, jụọkwa ha ihe ọ bụla ị chọrọ ịma, ndị dị ka ma ihe ọ̀ na-ada oké ọnụ n’ebe ahụ, ụdị ebe obibi dị na ya, ma è nwekwara ụlọ ọgwụ nakwa otú i nwere ike isi nweta ọrụ. I dechaa akwụkwọ ozi gị, nye ya kọmitii ije ozi ọgbakọ unu. Ha ga-eziga ya na akwụkwọ ozi ha dere iji kọwaa ụdị onye ị bụ n’alaka ụlọ ọrụ ahụ i deere akwụkwọ ozi. Ihe alaka ụlọ ọrụ ahụ ga-aza gị ga-enyere gị aka ikpebi ebe enyemaka gị ga-akacha baa uru.

Willie, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Ndị na-emekarị nke ọma n’ebe ndị ha na-eje ozi na-abụkarị ndị bu ụzọ gaa mba ahụ wee chọpụta ebe ọ ga-abụ ha nọrọ na-eje ozi ha enwee obi ụtọ. Otu nwanna nwoke na nwunye ya matara na ịnọ n’ime ime obodo na-eje ozi ga-esiri ha ike. Nke a mere ha ji kwaga n’otu obodo mepetụrụ emepe, bụ́ ebe e nwere mkpa ka ukwuu. Otú ebe ahụ dị mere ka ha nwee obi ụtọ n’ozi ha.”

Ihe Isi Ike Ndị I Nwere Ike Inwe

O doro anya na ihe ga-esitụrụ gị ike ma i si n’ebe maara gị ahụ́ kwaga ebe ọzọ. Lisa, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya na mbụ, sịrị: “Owu na-ama m nke ukwuu. Gịnị na-enyere ya aka? Ọ bụ ịnọ ọgbakọ ebe ahụ ọ gara ọhụrụ nso. O kpebiri na ya ga-amata aha ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ. Nke a mere o ji na-erute n’Ụlọ Nzukọ Alaeze tupu ọmụmụ ihe amalite, a gbasaakwa ọmụmụ ihe ya na ụmụnna anọrọ na-akparịta ụka. Lisa na ndị ọzọ na-esokwa aga ozi ọma, ọ na-akpọkwa ọtụtụ ndị òkù n’ụlọ ya, na-emetekwa ụfọdụ ndị enyi. Ọ sịrị: “M naghị akwa ụta na m na-eje ozi n’ebe mkpa ka ukwuu. Jehova agọziela m nke ukwuu.”

Mgbe Paul na Maggie zụchara ụmụ ha, ha si n’ụlọ ha birila iri afọ atọ kwaga ebe ọzọ. Paul sịrị: “Ire ngwongwo ndị anyị nwere n’ụlọ esirighị anyị ike. Ma, ịhapụ ndị ezinụlọ anyị siiri anyị ike karịa otú anyị tụrụ anya ya. Sọọsọ ákwá ka anyị nọ na-ebe n’ụgbọelu. Ihe obi anyị nọ na-agwasi anyị ike bụ na ije ozi n’ala ọzọ agaghị ekwe anyị omume. Ma, anyị tụkwasịrị Jehova obi. Ndị enyi ọhụrụ anyị metere mekwara ka obi sikwuo anyị ike.”

Greg na Crystal kpebiri isi Canada kwaga Namibia n’ihi na ha na-asụ Bekee, bụ́ asụsụ ọtụtụ ndị na-asụ na Namibia. Ma, ka oge na-aga, ha chọpụtara na ịnụ otu n’ime asụsụ a na-asụ na mba ahụ bara oké uru. Ha sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-agwụ anyị ike. Ma, mgbe anyị mụtara asụsụ ndị anyị na-ezi ozi ọma ka anyị ghọtara omenala ha. Otú anyị na ụmụnna ndị ebe ahụ si na-akpachi anya nyere aka mee ka ịnọ ebe ahụ mara anyị ahụ́.”

Anyị ga-eme ka okwukwe ụmụnna ndị anyị bịara na nke ha sie ike ma ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi ma jiri obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla a gwara anyị mee. Obi na-adị Jenny ụtọ mgbe ọ bụla o chetara ezinụlọ dị iche iche jere ozi na Ireland, bụ́ ebe o toro. Ọ sịrị: “Ha na-eji obi ụtọ anabata ndị ọzọ. Ha bịara ije ozi, ọ bụghị ka e jeere ha ozi. Ha na-anụ nnọọ ọkụ n’obi ma na-enwe obi ụtọ nke mere ka m kpebie ịga ebe mkpa ka ukwuu.” Jenny na di ya na-eje ozi ugbu a na Gambia.

“Ngọzi Jehova Na-eme Mmadụ Ọgaranya”

Ozi Pọl jere na Masedonia mere ya nnọọ obi ụtọ. Nke a mere ka o degara ụmụnna ya nọ na Filipaị akwụkwọ ozi mgbe ihe dị ka afọ iri gafere. Ọ sịrị: “Ana m ekele Chineke m mgbe niile n’oge ọ bụla m chetara unu.”—Fil. 1:3.

Otú a kwa ka obi dị Trevor na Emily, bụ́ ndị jere ozi na Malawi tupu a kpọọ ha ka ha bịa gụọ akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied. “Mgbe ụfọdụ, anyị na-eche ma ihe anyị na-eme ọ̀ bụ ihe anyị kwesịrị ime. N’agbanyeghị nke a, anyị na-enwe obi ụtọ. Anyị hụrụ ibe anyị n’anya karịa otú anyị hụrụ na mbụ, Jehova gọzikwara anyị.” Greg na Crystal, bụ́ ndị anyị kwuru okwu ha na mbụ, kwuru, sị: “O nweghị ihe ọzọ anyị ga-eme nke ga-aka nke a mma.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile ga-enwe ike ije ozi n’ala ọzọ. Ụfọdụ nwere ike ime nke ọma ma ha kwaga ebe mkpa ka ukwuu na mba ha. Ndị ọzọ nwere ike ijewe ozi n’ọgbakọ ndị dị ha nso. Ihe dị mkpa bụ ime ihe ọ bụla i nwere ike ime iji jeere Jehova ozi. (Kọl. 3:23) Ọ bụrụ na i mee nke a, ihe a e ji ike mmụọ nsọ dee ga-emezu n’ahụ́ gị. Ọ sịrị: “Ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”—Ilu 10:22.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 5]

 Leruo Onwe Gị Anya

Iji mara ma ị̀ ga-enwe ike ije ozi n’ala ọzọ, kpee ekpere ka ị na-atụle ajụjụ ndị na-esonụ. Gwa onwe gị eziokwu ka ị na-aza ha. Ihe ndị e bipụtara n’Ụlọ Nche dị iche iche n’oge gara aga ga-enyere gị aka ime nke a.

• M̀ ji ife Jehova kpọrọ ihe?—“Nzọụkwụ Ndị Na-eduga n’Obi Ụtọ” (October 15, 1997, peeji nke 6)

• M̀ ma ezi ozi ọma nke ọma?—“Ụzọ E Si Enwe Ihe Ịga nke Ọma n’Ozi Ọsụ Ụzọ” (May 15, 1989, peeji nke 21)

• M̀ nwere ike ibi ebe ọzọ n’ahụghị ndị ezinụlọ m na ndị enyi m anya?—“Ịnagide Oké Ọchịchọ Ịla Ụlọ n’Ije Ozi Chineke” (May 15, 1994, peeji nke 28)

• M̀ nwere ike ịmụ asụsụ ọhụrụ?—“Ije Ozi n’Ọgbakọ Na-asụ Asụsụ Mba Ọzọ” (March 15, 2006, peeji nke 17)

• M̀ nwere ego ga-ezuru m ịkwaga ebe ahụ?—“Ị̀ Pụrụ Ije Ozi n’Ubi Ala Ọzọ?” (October 15, 1999, peeji nke 23)

[Foto dị na peeji nke 6]

Anyị ga-eme ka okwukwe ụmụnna ndị anyị bịara na nke ha sie ike ma ọ bụrụ na anyị adịrị umeala n’obi ma jiri obi ụtọ na-eme ihe ọ bụla a gwara anyị

[Foto dị na peeji nke 7]

Ndị bịara ije ozi, ọ bụghị ndị bịara ka e jeere ha ozi, na-enwe ihe ịga nke ọma