Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Erute Madagascar

Baịbụl Erute Madagascar

Baịbụl Erute Madagascar

MADAGASCAR dị ihe dị ka narị kilomita anọ ma e si ebe ndịda Africa gawa ya, ọ bụkwa agwaetiti nke anọ ná ndị kacha buo ibu n’ụwa dum. Ọ dịla anya ndị Madagascar matara aha ahụ bụ́ Jehova n’ihi na kemgbe ihe karịrị otu narị afọ na iri afọ asaa, ha anọwo na-agụ Baịbụl ndị aha Chineke dị na ha, bụ́ ndị a sụgharịrị n’asụsụ ha. Ndị sụgharịrị Baịbụl n’asụsụ Malagasy nwere ndidi, rụsiekwa ọrụ ike mgbe ha na-asụgharị ya.

A malitere ịsụgharị Baịbụl n’asụsụ Malagasy n’agwaetiti dị ya nso bụ́ Mauritius. N’afọ 1813, Sir Robert Farquhar, bụ́ gọvanọ onye Britain nke na-achị Mauritius, mere ka a malite ịsụgharị Oziọma Matiu, Mak Luk, na Jọn n’asụsụ Malagasy. O mechara gbaa Radama nke Mbụ, bụ́ eze Madagascar, ume ka o si na London Missionary Society (LMS) kpọta ndị nkụzi ga-abịa Madagascar.

N’abalị iri na asatọ nke ọnwa August nke afọ 1818, ndị ozi ala ọzọ abụọ, bụ́ ndị Wales, aha ha bụ́ David Jones na Thomas Bevan si Mauritius rute n’obodo ọdụ ụgbọ mmiri dị na ya bụ́, Toamasina. Ha chọpụtara na ndị ala ahụ nwere nnukwu mmasị n’ife ofufe, nakwa na ọtụtụ n’ime ha na-efe ndị nna ha ochie nwụrụ anwụ, nweekwa nkwenkwe ụgha dị iche iche. Ndị Madagascar na-asụ asụsụ na-atọ ụtọ ná ntị bụ́ nke gwara asụsụ ndị Malay na nke ndị Polynesia.

Ka obere oge gafere mgbe Jones na Bevan malitere otu obere ụlọ akwụkwọ n’ebe ahụ, ha gara Mauritius kpọta ndị nwunye ha na ụmụ ha ka ha na ha biri na Toamasina. Ma, ọrịa ịba malitere ịrịa ha niile. Na December afọ 1818, nwunye Jones na nwa ya nwụrụ. N’ọnwa abụọ ya ọzọ, ọrịa ahụ gburu Bevan na ndị ezinụlọ ya. Nke a mere ka ọ bụrụ naanị David Jones fọdụrụ ndụ n’ime ha niile.

Ihe ahụ niile merenụ emeghị ka Jones daa mbà. O kpebisiri ike na ya ga-asụgharịrị ndị Madagascar Okwu Chineke. Mgbe ọ gara Mauritius ịga gwọọ onwe ya, ọ malitere otu ọrụ siri ezigbo ike, ya bụ, ịmụ asụsụ Malagasy. N’oge na-adịghị anya, ọ malitere ịsụgharị ihe ole na ole ga-enyere ya aka ịsụgharị Oziọma Jọn.

Jones gaghachiri Madagascar n’ọnwa October nke afọ 1820. Ọ gara n’isi obodo Madagascar bụ́ Antananarivo wee meghee ụlọ akwụkwọ nke ndị ozi ala ọzọ ga na-akụzi ihe na ya. Ihe siri ike n’oge ahụ. Akwụkwọ ọgụgụ, bọọdụ onye nkụzi na-ede ihe, ma ọ bụ tebụl adịghị. Ma, ha na-akụziri ụmụ akwụkwọ ezigbo ihe, ịgụ akwụkwọ dịkwa ụmụ akwụkwọ ọkụ n’obi.

Jones rụrụ ọrụ naanị ya ihe dị ka ọnwa asaa tupu ya enweta onye ọzọ ga-anọchi Bevan. Ọ bụ onye ozi ala ọzọ aha ya bụ David Griffiths. Ha abụọ rụsiri ọrụ ike wee na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ Malagasy.

Ha Amalite Ịsụgharị Baịbụl

N’agbata afọ 1820 na 1829, ihe a na-akpọ asụsụ Malagasy a na-ede ede bụ sorabe, ya bụ, asụsụ Malagasy e ji mkpụrụ akwụkwọ Arabic ede. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka ọ na-ekwe ọgụgụ. Ya mere, mgbe ndị ozi ala ọzọ ahụ na Eze Radama nke Mbụ kwurịtachara okwu, ọ gwara ha ka ha jiri mkpụrụ akwụkwọ ndị Rom dochie nke sorabe.

Ha malitere ịsụgharị Baịbụl ahụ n’abalị iri nke ọnwa September n’afọ 1823. Jones malitere ịsụgharị Jenesis na Matiu, ebe Griffiths sụgharịwara Ọpụpụ na Luk. Mmadụ abụọ ahụ rụsiri ọrụ ike. Ha abụọ nọ na-asụgharị ọtụtụ n’ime ihe a na-asụgharị na Baịbụl ahụ na-akụzikwa nkụzi n’ụtụtụ nakwa n’ehihie. Ha na-akwadebekwa okwuchukwu ma na-ekwu ya n’asụsụ atọ. N’agbanyeghị nke a, ha butere ọrụ ịsụgharị Baịbụl ahụ ụzọ.

Ụmụ akwụkwọ iri na abụọ nyeere ndị ozi ala ọzọ ahụ aka ha asụgharịchaa Akwụkwọ Nsọ Grik nakwa ọtụtụ n’ime akwụkwọ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru n’ime naanị ọnwa iri na asatọ. N’afọ 1824, ha sụgharịchara Baịbụl ahụ dum. Ma, a ka nwere ihe ụfọdụ a ga-edezigharị na ya. N’ihi ya, ha si England kpọta David Johns na Joseph Freeman, bụ́ mmadụ abụọ bụ́ ndị ọkà mmụta asụsụ, ka ha nyere ha aka.

Nsogbu Ndị Ha Meriri

Mgbe a sụgharịchara Baịbụl ahụ, òtù LMS zigara Charles Hovenden Madagascar ka ọ gaa hazie ígwè a ga-eji na-ebi akwụkwọ, bụ́ nke mbụ a ga-enwe na Madagascar. Hovenden rutere Madagascar n’abalị iri abụọ na otu nke ọnwa November afọ 1826. Ma, ọ malitere ịrịa ọrịa ịba, ọ nwụkwara n’ihe na-akarịghị otu ọnwa ọ bịara Madagascar. Nke a mere ka a ghara inwe onye ji ígwè ahụ arụ ọrụ. N’afọ 1827, otu nwoke anya ruru ala nke si Scotland aha ya bụ James Cameron jisiri ike jiri ihe e dere n’akwụkwọ e tinyere n’ígwè ahụ hazie ya. Mgbe Cameron gbasiri mbọ ike ma mehiekwa ihe ụfọdụ, o mechara bipụta amaokwu ụfọdụ na Jenesis isi mbụ n’abalị anọ nke ọnwa December n’afọ 1827. *

E nwere nsogbu ọzọ n’abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa July n’afọ 1828 mgbe Radama nke Mbụ nwụrụ. Mgbe Eze Radama nọ ndụ, ọ kwadoro nnọọ ọrụ nsụgharị ahụ ha na-arụ. David Jones kwuru oge ahụ, sị: “Eze Radama bụ nnọọ ezigbo mmadụ. Ọ na-akwado agụmakwụkwọ. Ịkụziri ndị ọ na-achị otú ha ga-esi mepee anya dị ya mma karịa Ọlaedo na Ọlaọcha.” Ma, mgbe ọ nwụrụ, nwunye ya, bụ́ Ranavalona, nọchiri ya. N’oge na-adịghị anya, o doro anya na ọ gaghị akwado ọrụ nsụgharị ahụ ka di ya.

Mgbe ọ na-adịbeghị anya e mere Ranavalona eze nwaanyị, otu onye nke si England bịa gwara ya ka ya na ya kwuo banyere ọrụ nsụgharị ahụ. O kweghị. O nwere otu ụbọchị ndị ozi ala ọzọ ahụ gwara eze nwaanyị ahụ na ọ ka dị ọtụtụ ihe ha ga-akụziri ndị ala ya, nke gụnyere asụsụ Grik na Hibru. Ọ sịrị: “M chọghị ka unu kụziwere ha asụsụ Grik ma ọ bụkwanụ Hibru, m chọrọ ịma ma ùnu nwere ike ịkụziri ha ihe ga-aka abara ha uru, ihe dị ka otú ha ga-esi na-eme ncha.” Nke a mere ka Cameron chewe na eze nwaanyị nwere ike ịchụpụ ha n’ala ahụ mgbe ha na-ebichabeghị Baịbụl ahụ, o wee gwa ya ka o nye ya otu izu iji chee ihe ahụ ọ gwara ha.

Tupu o ruo otu izu, Cameron nyere ndị na-ejere eze nwaanyị ahụ ozi obere aka ncha abụọ e ji ihe a na-enweta n’ala ahụ mee. Nke a na ọrụ ndị ọzọ ha rụrụ n’ebe ahụ mere ka obi dị eze nwaanyị ahụ mma ruo mgbe ha bipụtachara akwụkwọ Baịbụl niile ma e wezụga akwụkwọ ole na ole dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.

Ihe Ịtụnanya na Nsogbu

N’agbanyeghị na okwu adabaraghị eze nwaanyị na ndị ozi ala ọzọ ahụ na mbụ, o nyere iwu dị ịtụnanya n’ọnwa May nke afọ 1831. O kwere ka a na-eme ka ndị ọ na-achị ghọọ Ndị Kraịst, e meekwa ha baptizim! Ma, e meteghị ihe a o kwuru aka. Akwụkwọ bụ́ A History of Madagascar kwuru na “n’ihi na a na-emezi ọtụtụ ndị baptizim, obi adịghị ndị ụfọdụ nọ n’ọchịchị mma, bụ́ ndị na-achọghị ka e nwee mgbanwe n’ala ahụ. Nke a mere ha ji kwagide eze nwaanyị ya ekweta na inye mmadụ oriri nsọ pụtara inye onye ahụ iyi ka ọ ṅụọ na ya ga-anọ n’okpuru ọchịchị ndị Britain.” N’ihi ya, ná ngwụcha afọ 1831, eze nwaanyị ahụ kagburu iwu ahụ o nyere n’ọnwa isii ya gara aga ka a na-eme ndị obodo ya ka ha ghọọ Ndị Kraịst, e meekwa ha baptizim.

Iwu a eze nwaanyị kagburu nakwa otú ndị nọ n’ọchịchị, bụ́ ndị na-achọghị ka a gbanwee omenala ha, si akwagide ya ime ihe ụfọdụ mere ka ndị ozi ala ọzọ ahụ mee ngwa bipụtachaa Baịbụl ahụ. N’oge ahụ, ha ebipụtala Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, ọtụtụ puku mmadụ enwetakwalanụ ya. Ma, e nwere nsogbu ọzọ n’abalị mbụ nke ọnwa March n’afọ 1835, bụ́ ụbọchị Eze Nwaanyị Ranavalona nke Mbụ machibidoro okpukpe Ndị Kraịst iwu ma nye iwu ka e butere ndị ọchịchị akwụkwọ Ndị Kraịst niile.

Iwu ahụ eze nwaanyị nyere pụtakwara na ndị Madagascar niile na-amụ ọrụ n’ebe ahụ a na-ebi Baịbụl ga-akwụsị ọrụ. Ebe ọ bụ ndị ozi ala ọzọ ole na ole na-arụzi ọrụ ahụ, ha nọ na-arụ ya ehihie na abalị ruo mgbe e wepụtara Baịbụl ahụ dum n’ọnwa June afọ 1835. Otú a ka e si sụgharịa Baịbụl n’asụsụ Malagasy!

N’agbanyeghị na a machibidoro akwụkwọ Ndị Kraịst iwu, e kesara Baịbụl ahụ n’egbughị oge, e zokwara iri asaa n’ime ya a dịghị ama ama e bibie ndị nke ọzọ. Mkpebi a ha mere magburu onwe ya, n’ihi na n’ihe na-erughị otu afọ, ndị ozi ala ọzọ niile nọ n’agwaetiti ahụ lara ma e wezụga mmadụ abụọ. Ma, okwu Chineke nọ na-agbasa na Madagascar.

Ndị Madagascar Hụrụ Baịbụl n’Anya

Ọ na-enye ọṅụ dị ukwuu ịhụ ka ndị Madagascar na-agụ Okwu Chineke n’asụsụ ha. E nwere ihe ndị na-adịchaghị otú ha kwesịrị ịdị na Baịbụl ahụ, asụsụ Malagasy e jikwa dee ya abụchaghị nke a na-asụ ugbu a. N’agbanyeghị nke ahụ, o siri ike inweta ụlọ Baịbụl na-adịghị n’ala ahụ, ndị ala ahụ na-agụchikwa ya anya. Otu n’ime ihe magburu onwe ya na Baịbụl ahụ bụ otú aha Chineke, bụ́ Jehova, si jupụta n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Na Baịbụl mbụ ahụ ndị ozi ala ọzọ sụgharịrị, aha Chineke dịkwa n’Akwụkwọ Nsọ Grik. Nke a mere ọtụtụ ndị Madagascar ji mara aha Chineke.

Mgbe Maazị Baker, bụ́ onye na-ebi akwụkwọ bipụtara Akwụkwọ Nsọ Grik ndị nke mbụ, ọ hụrụ otú ndị Madagascar si na-enwe ọṅụ, nke mere ka o kwuo, sị: “Ọ bụghị amụma ka m na-ebu, ma, echeghị m na a ga-ekpochapụ okwu Chineke n’ala a!” Ihe o kwuru emezuola. Ma ọrịa ịba, ma ịmụ asụsụ siri ike, ma ọ bụkwanụ iwu eze nwaanyị tiri, emeghị ka a ghara inwe Okwu Chineke na Madagascar.

Ihe ka nke a mma emeekwala na Madagascar. Olee ihe ọ bụ? N’afọ 2008, e wepụtara Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ nke zuru ezu n’asụsụ Malagasy. Baịbụl a ga-enyere ndị Madagascar nnukwu aka ịghọta okwu Chineke n’ihi na e dere ya n’asụsụ Malagasy nke na-esighị ike nghọta, nke ndị mmadụ na-asụkwa ugbu a. Ya mere, Okwu Chineke agbanyesiela mgbọrọgwụ ike na Madagascar.—Aịza. 40:8.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 14 Ihe ndị mbụ e bipụtara n’asụsụ Malagasy, bụ́ ndị dị na Baịbụl, bụ Iwu Iri ahụ na Ekpere Onyenwe Anyị, bụ́ nke e biri na Mauritius n’ihe dị ka n’ọnwa April na May nke afọ 1826. Ma, naanị ndị e nyere ya bụ ndị ezinụlọ Eze Radama na ndị ụfọdụ nọ n’ọchịchị.

[Foto dị na peeji nke 31]

“Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ” nke e bipụtara n’asụsụ Malagasy na-ewetara aha Chineke, bụ́ Jehova, nsọpụrụ