Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ihe Na-esiri Gị Ike

Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ihe Na-esiri Gị Ike

Na-enwe Ọṅụ Mgbe Ihe Na-esiri Gị Ike

“Ndị niile na-agbaba n’ime [Jehova] ga-aṅụrị ọṅụ; ha ga na-eti mkpu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.”—ỌMA 5:11.

1, 2. (a) Olee ihe ụfọdụ ndị na-akpata ihe mgbu taa? (b) E wezụga ọdachi ndị na-adakwasị mmadụ niile, gịnị ọzọ ka ezigbo Ndị Kraịst na-edi?

NSOGBU na-abịara Ndịàmà Jehova otú o si abịara mmadụ niile. E nweela ọtụtụ ndị ohu Chineke ndị omempụ kparala aka ọjọọ, nweekwa ndị nke agha mesirila ike nakwa ndị e kpere ikpe na-ezighị ezi. Ọdachi ndị na-emere onwe ha, ịda ogbenye, ọrịa, na ọnwụ, na-akpatakwa nnukwu ihe mgbu. Pọl onyeozi kwutere ya mgbe o dere, sị: “Anyị maara na ihe niile e kere eke na-asụkọ ude ma na-anọkọ n’ihe mgbu ruo ugbu a.” (Rom 8:22) Anyị ezughịkwa okè. Anyị nwere ike ikwu dị ka Eze Devid kwuru n’oge ochie, sị: “Njehie m erikpuwo isi m; dị ka ibu dị arọ, ọ dị arọ nke na agaghị m ebuli ya.”—Ọma 38:4.

2 E wezụga ọdachi ndị na-adakwasị mmadụ niile, ezi Ndị Kraịst nwekwara osisi ịta ahụhụ ha na-ebu. (Luk 14:27) N’ezie, a kpọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs asị ma na-akpagbu ha dị ka e mere Jizọs. (Mat. 10:22, 23; Jọn 15:20; 16:2) N’ihi ya, anyị kwesịrị iji ndidi na-agbalịsi ike iji nwee ike ịna-eso ụzọ Kraịst ka anyị na-echere ngọzi anyị ga-enweta n’ụwa ọhụrụ.—Mat. 7:13, 14; Luk 13:24.

3. Olee otú anyị si mara na ọ bụghị iwu na Ndị Kraịst ga na-ata ahụhụ iji mee uche Chineke?

3 Nke a ọ̀ pụtara na ezigbo Ndị Kraịst agaghị na-enwe ọṅụ na obi ụtọ ná ndụ? Ọ̀ pụtara na anyị ga na-enwe mwute ruo mgbe ọgwụgwụ ga-abịa? O doro anya na Jehova chọrọ ka anyị na-enwe obi ụtọ ka anyị na-eche ka o meere anyị ihe ndị o kwere anyị ná nkwa. E kwuru n’ọtụtụ ebe na Baịbụl na ndị na-efe Chineke bụ ndị obi ụtọ. (Gụọ Aịzaya 65:13, 14.) Abụ Ọma 5:11 kwuru, sị: “Ndị niile na-agbaba n’ime [Jehova] ga-aṅụrị ọṅụ; ha ga na-eti mkpu ọṅụ ruo mgbe ebighị ebi.” N’ezie, ọ dị mfe mmadụ inwe nnọọ ọṅụ na afọ ojuju, obi eruokwa ya ala, n’agbanyeghị nsogbu ndị ọ na-enwe. Ka anyị tụlee otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị na-enwe ma ka na-enwe ọṅụ.

Jehova Bụ “Onye Obi Ụtọ”

4. Olee otú ọ na-adị Chineke mgbe e leghaara uche ya anya?

4 Dị ka ihe atụ, tụlee ihe banyere Jehova. Ọ bụ ya nwe eluigwe na ụwa n’ihi na ọ bụ Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile. O nweghị ihe kọrọ ya, o nweghịkwa onye ọ chọrọ enyemaka ya. Ma, n’agbanyeghị na Jehova nwere ike na-enweghị atụ, ọ ghaghị ịbụ na o wutere ya mgbe otu n’ime ụmụ ya ndị bi n’eluigwe nupụụrụ ya isi wee ghọọ Setan. Ọ ghaghịkwa ịbụ na o wutere Chineke ọzọ mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi so Setan nupụ isi. Cheekwa ụdị mwute Chineke nwere mgbe Adam na Iv, bụ́ ndị pụrụ iche n’ihe niile o kere n’ụwa, nupụụrụ ya isi. Kemgbe ahụ, ọtụtụ ijeri n’ime ụmụ ha ekweghị eme uche Jehova.—Rom 3:23.

5. Olee ihe ndị wuterela Jehova nke ukwuu?

5 Nnupụisi Setan malitere ka na-aga n’ihu. Kemgbe ihe dị ka puku afọ isii, Jehova ahụla ka ndị mmadụ na-ekpere arụsị, na-eme ihe ike, na-egbu ibe ha, na-enwekwa mmekọahụ rụrụ arụ. (Jen. 6:5, 6, 11, 12) Ọ nụkwala ka ụfọdụ ji obi ọjọọ na-aghagide ibe ha ụgha, na-ekwulukwa ha. E nwedịrị mgbe ndị na-efe Chineke mere ihe wutere ya. Baịbụl kwuru otu n’ime oge ndị ahụ, sị: “Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa, kpasuokwa ya iwe n’ọzara! Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro, ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel.” (Ọma 78:40, 41) N’ezie, o wutere Jehova nke ukwuu mgbe ndị ohu ya hapụrụ ya. (Jere. 3:1-10) N’ezie, ihe ọjọọ na-eme, ọ na-ewutekwa Jehova nke ukwuu ma ha mee.—Gụọ Aịzaya 63:9, 10.

6. Olee ihe Chineke na-eme mgbe e mere ihe wutere ya?

6 Ma, Jehova anaghị akwụsị ime ihe o kwesịrị ime n’ihi na e mere ihe wutere ya. Mgbe e nwere nsogbu, Jehova na-eme ihe ngwa ngwa ka ihe wee ghara ịka njọ. O mekwaala ihe iji hụ na uche ya ga-emecha mee. N’ihi ihe ndị a Jehova mere, obi dị ya ụtọ, ọ na-atụkwa anya mgbe a ga-egosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị, bụ́ nke ga-ewetara ndị niile na-efe ya ngọzi. (Ọma 104:31) N’ezie, n’agbanyeghị nkọcha a na-akọcha Jehova, ọ ka bụ “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.”—1 Tim. 1:11; Ọma 16:11.

7, 8. Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jehova mgbe ihe na-agazighị otú anyị chere?

7 Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị eji onwe anyị tụnyere Jehova mgbe a bịara n’ịma ihe anyị ga-eme ma anyị nwee nsogbu, ma, mgbe nsogbu bịaara anyị, anyị nwere ike iṅomi ihe ọ na-eme ma e nwee nsogbu. Ọ dịghị njọ ma anyị nwee mwute mgbe ihe na-agazighị agazi, ma, anyị ekwesịghị ịnọgide na-enwe mwute. Anyị na-eche echiche, nweekwa amamihe n’ihi na e kere anyị n’onyinyo Jehova. Nke a na-enyekwara anyị aka ichebara nsogbu anyị echiche ma mara ihe anyị nwere ike ime banyere ya.

8 Otu n’ime ihe ndị dị mkpa ga-enyere anyị aka idi nsogbu anyị bụ ịma na e nwere ihe ụfọdụ ọ na-enweghị ihe anyị ga-emeli banyere ha. Ọ bụrụ na ihe ndị a anọgide na-enye anyị nsogbu n’obi, ọtụtụ ihe ndị na-enye ndị na-efe Jehova ọṅụ agaghị na-enye anyị ọṅụ. Mgbe anyị mechara ihe ndị anyị kwesịrị ime banyere nsogbu ahụ, ọ kacha mma ichefu ya ma lekwasị anya n’ihe ndị bara uru. Akụkọ ndị na-esonụ e dere na Baịbụl na-egosi otú a ga-esi eme nke a.

Anyị Kwesịrị Inwe Ezi Uche

9. Olee otú Hana si gosi na ya nwere ezi uche?

9 Tụlee ihe banyere Hana, bụ́ onye mechara bụrụ nne Samuel onye amụma. Obi adịghị ya mma n’ihi na ọ mụtaghị nwa. A kwara ya emo n’ihi nke a. Mgbe ụfọdụ, nke a na-ewute Hana nke ukwuu nke na ọ na-ebe ákwá ma jụ iri nri. (1 Sam. 1:2-7) Mgbe ha gara n’ụlọikwuu Jehova otu ụbọchị, ọnọdụ Hana ‘wutere ya ná mkpụrụ obi, o wee malite ikpeku Jehova ekpere, na-akwakwa ákwá nke ukwuu.’ (1 Sam. 1:10) Mgbe Hana gwachara Jehova otú obi dị ya, nnukwu onye nchụàjà bụ́ Ilaị bịakwutere ya ma sị ya: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.” (1 Sam. 1:17) Mgbe Hana mechara nke a, obi siri ya ike na ya emeela ihe ya nwere ike ime. Ọ bụghị ya ga-enye onwe ya nwa. Hana gosiri na ya nwere ezi uche “wee laa ma riwe ihe, ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.”—1 Sam. 1:18.

10. Olee ihe kwesịrị ekwesị Pọl mere banyere nsogbu nke na-ekweghị aha ya aka?

10 Pọl onyeozi mekwara ụdị ihe a mgbe o nwere nsogbu. O nwere nsogbu nke mekpara ya ahụ́. Ọ kpọrọ ya “ogwu n’anụ ahụ́.” (2 Kọr. 12:7) N’agbanyeghị ihe nsogbu Pọl bụ, o mere ihe o nwere ike ime ka ọ hapụ ya aka, ọ rịọkwara Jehova ka o nyere ya aka. Ugboro ole ka Pọl rịọrọ Jehova arịrịọ banyere nsogbu ahụ? Ugboro atọ. Mgbe ọ rịọchara nke ugboro atọ, Chineke mere ka Pọl mara na ya agaghị eji ọrụ ebube wepụ ‘ogwu ahụ dị ya n’anụ ahụ́.’ Pọl weere ụwa ya otú o si hụ ya ma tinye uche ya n’ijere Jehova ozi oge niile.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:8-10.

11. Olee otú ekpere si enyere anyị aka idi nsogbu ndị anyị nwere?

11 Akụkọ ndị a anaghị egosi na anyị kwesịrị ịkwụsị ikpeku Jehova ekpere banyere ihe ndị na-enye anyị nsogbu. (Ọma 86:7) Kama nke ahụ, Okwu Chineke gwara anyị, sị: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ.” Olee otú Jehova ga-esi aza ụdị ekpere a? Baịbụl kwuru, sị: “Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche site n’aka Kraịst Jizọs.” (Fil. 4:6, 7) E nwere ike Jehova agaghị ewepụ nsogbu anyị, ma, o nwere ike ịza ekpere anyị site n’iche ikike iche echiche anyị nche. Ọ bụrụ na anyị ekpechaa ekpere banyere nsogbu ahụ anyị nwere, anyị nwere ike ịghọta ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-echegbu onwe anyị.

Ka Ime Uche Chineke Na-atọ Gị Ụtọ

12. Olee ihe mere onye nọgidere na-enwe mwute ji na-etinye onwe ya n’ọnọdụ ka njọ?

12 Ilu 24:10 kwuru, sị: “Ì nwewo obi ịda mbà n’ụbọchị ahụhụ? Ike gị ga-adị ntakịrị.” Ilu ọzọ sịrị: “A na-enwe ịda mbà na mmụọ n’ihi ihe na-ewute obi.” (Ilu 15:13) Ụfọdụ Ndị Kraịst na-enwe mwute dị ukwuu nke na ha na-akwụsị ịgụ Baịbụl na ịtụgharị uche n’ihe dị na ya. Ekpere ha na-ekpe bụzi ka e were mezuo iwu, ha nwekwara ike ịna-agbara ụmụnna ha ọsọ. N’eziokwu, onye nọgidere na-enwe mwute nwere ike itinye onwe ya n’ọnọdụ ka njọ.—Ilu 18:1, 14.

13. Olee ihe ndị nwere ike ịgba anyị ume ma mee ka anyị nwee ọṅụ?

13 Ma, ile ihe ahụ anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ga-eme ka anyị lekwasị anya n’ihe ndị na-enye anyị obi ụtọ ná ndụ. Devid dere, sị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.” (Ọma 40:8) Mgbe anyị nwere nsogbu, anyị ekwesịghị ịkwụsị ife Chineke. N’ezie, ime ihe ndị na-enye anyị obi ụtọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu anyị. Jehova gwara anyị na ịgụchi Okwu ya anya na ịmụ ya mgbe niile ga-eme ka anyị nwee obi ụtọ. (Ọma 1:1, 2; Jems 1:25) Anyị na-anụ “okwu ọma” ndị na-agba anyị ume ma na-enye anyị ọṅụ n’Akwụkwọ Nsọ nakwa n’ọmụmụ ihe.—Ilu 12:25; 16:24.

14. Olee nkwa Jehova kwere anyị nke na-enye anyị ọṅụ ugbu a?

14 Chineke enyela anyị ọtụtụ ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ. N’ezie, nkwa o kwere anyị na ya ga-azọpụta anyị bụ isi ihe kwesịrị ime ka anyị na-enwe obi ụtọ. (Ọma 13:5) Anyị ma na Chineke ga-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ n’agbanyeghị nsogbu anyị na-enwe ugbu a. (Gụọ Ekliziastis 8:12.) Habakọk onye amụma kọwara nnọọ obi ike anyị nwere nke ọma mgbe o dere, sị: “Ọ bụ ezie na osisi fig nwere ike ghara ịma ifuru, osisi vaịn nwekwara ike ghara ịmị mkpụrụ; osisi oliv nwere ike ghara ịmị mkpụrụ, mbara ala nwekwara ike ghara imepụta nri ọ bụla; ìgwè ewu na atụrụ ndị nọ n’ogige nwere ike nwụchaa, e nwekwara ike a gaghị enwe ìgwè ehi n’ogige ha; ma mụ onwe m ga-aṅụrị ọṅụ n’ime Jehova; m ga-enwe aṅụrị n’ime Chineke nke nzọpụta m.”—Hab. 3:17, 18.

“Obi Ụtọ Na-adịrị Ndị Chineke Ha Bụ Jehova!”

15, 16. Olee ihe ndị nwere ike inye anyị ọṅụ ka anyị na-echere ngọzi ndị anyị ga-enweta n’ọdịnihu.

15 Ka anyị na-echere ihe ọma niile anyị ga-enweta n’ọdịnihu, uche Jehova bụ ka ihe ndị ọ na-enye anyị ugbu a na-eme anyị obi ụtọ. Baịbụl kwuru, sị: “Amatawo m na ọ dịghị ihe dịịrị ha mma karịa ịṅụrị ọṅụ na ime ihe ọma n’oge ndụ ha; nakwa ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.” (Ekli. 3:12, 13) “Ime ihe ọma” gụnyere imere ndị ọzọ ihe dị mma. Jizọs kwuru na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe. Anyị na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ma ọ bụrụ na anyị emeere di ma ọ bụ nwunye anyị, ụmụ anyị, nne na nna anyị, ma ọ bụ ndị ikwu anyị ihe ọma. (Ilu 3:27) Iji obiọma emeso ụmụnna anyị ihe, ile ha ọbịa, na ịgbaghara ha mgbe ha mejọrọ anyị, ga-emekwa ka anyị nwee ọṅụ dị ukwuu, ọ na-amasịkwa Jehova. (Gal. 6:10; Kọl. 3:12-14; 1 Pita 4:8, 9) Anyị ga-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị dum na-eje ozi anyị.

16 Ihe ahụ e dere na paragraf nke iri na ise, bụ́ nke si n’akwụkwọ Ekliziastis, gosiri ụmụ ihe ndị na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ. Ha gụnyere iri ihe na ịṅụ ihe. N’ezie, anyị nwere ike inwe obi ụtọ mgbe ihe na-esiri anyị ike n’agbanyeghị ókè ihe onwunwe Jehova nyere anyị hà. Otú anyanwụ na-adị ma ya dawa, ebe ndị mara ezigbo mma, otú ụmụ anụmanụ si akpa àgwà, na ihe ndị ọzọ dị ịtụnanya e kere eke mara mma, enweghị ihe ha na-efu anyị, ma, ha nwere ike ime ka anyị na-enwe ọṅụ. Ka anyị na-echebara ihe ndị a echiche, anyị ga-ahụkwu Jehova n’anya, n’ihi na ọ bụ ya nyere anyị ihe a niile.

17. Gịnị ga-eme ka nsogbu niile anyị na-enwe haa anyị aka, gịnịkwanụ na-akasi anyị obi ka ọ dị ugbu a?

17 N’eziokwu, nsogbu niile juru n’ụwa a na-ezughị okè ga-emecha haa anyị aka ma ọ bụrụ na anyị hụ Chineke n’anya, na-erube isi n’iwu ya, ma nwee okwukwe n’àjà mgbapụta ahụ. Ihe ndị a ga-emekwa ka anyị nọgide na-enwe ọṅụ. (1 Jọn 5:3) Ka ọ dịgodị, ịmara na Jehova ma ihe niile nke na-enye anyị nsogbu n’obi na-akasi anyị obi. Devid dere, sị: “M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma gị, n’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m; ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata.” (Ọma 31:7) Jehova ga-eme ka nsogbu anyị kwụsị n’ihi na ọ hụrụ anyị n’anya.—Ọma 34:19.

18. N’ihi gịnị ka ndị Chineke ji kwesị ịna-enwe ọṅụ?

18 Ka anyị na-echere ka Jehova meere anyị ihe o kwere anyị ná nkwa, ka anyị na-eṅomi ya n’ihi na ọ bụ Chineke nwere obi ụtọ. Ka anyị ghara ikwe ka nsogbu ndị anyị na-enwe mee ka anyị kwụsị ife ya ofufe. Ka ikike iche echiche na amamihe nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe anyị nwere nsogbu. Jehova ga-enyere anyị aka idi ihe na-abịara anyị, ọ ga-emekwa ka nsogbu ndị anyị nwere ghara ime ka anyị daa mba n’obi. Ka ihe ọma ndị ọ na-enye anyị na-eme anyị obi ụtọ, ma ndị nke ọ na-enye anyị n’ọgbakọ ya ma ihe onwunwe ndị ọ na-enye anyị. Ọ bụrụ na anyị anọrọ Chineke nso, anyị ga-enwe ike ịṅụrị ọṅụ n’ihi na “obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”—Ọma 144:15.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jehova mgbe anyị nwere nsogbu?

• Olee otú ezi uche nwere ike isi nyere anyị aka idi ihe isi ike?

• Olee ihe mere anyị ga-eji nwee mmasị ịna-eme uche Chineke n’agbanyeghị nsogbu ndị anyị nwere?

[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]

[Foto ndị dị na peeji nke 16]

Ihe ọjọọ ndị na-eme na-ewute Jehova

[Ebe E Si Nweta Foto]

© G.M.B. Akash/Panos Pictures

[Foto ndị dị na peeji nke 18]

Jehova enyela anyị ihe ndị ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ