Anyị Ịbụ Nke Jehova bụ Ihe Ùgwù Na-erughịrị Anyị
Anyị Ịbụ Nke Jehova bụ Ihe Ùgwù Na-erughịrị Anyị
“Anyị bụ nke Jehova.”—ROM 14:8.
1, 2. (a) Olee ihe ùgwù anyị nwere? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
MBA Izrel nwere ihe ùgwù pụrụ iche mgbe Jehova gwara ha, sị: “Unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ.” (Ọpụ. 19:5) Taa, Ndị Kraịst nwekwara ihe ùgwù nke ịbụ ndị nke Jehova. (1 Pita 2:9; Mkpu. 7:9, 14, 15) Ọ bụ ihe ùgwù nke nwere ike ịbara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi.
2 Ọ bụ ezie na ịbụ nke Jehova bụ ihe ùgwù, ọrụ dịkwa na ya. Ụfọdụ nwere ike iche, sị: ‘M̀ ga-emeli ihe Jehova chọrọ n’aka m? Ọ bụrụ na mụ emee mmehie, ọ̀ ga-ahapụ m? M̀ ga na-emegharịkwa ahụ́ ma m bụrụ nke Jehova?’ Iche banyere ihe ndị a adịghị njọ. Ma, e nwere ajụjụ ọzọ kwesịrị ka anyị buru ụzọ chebara echiche. Ọ bụ: Olee uru mmadụ na-erite ma ya bụrụ nke Jehova?
Ndị Bụ nke Jehova Na-enwe Obi Ụtọ
3. Olee otú mkpebi Rehab mere ife Jehova si baara ya uru?
3 Ndị bụ nke Jehova hà na-erite uru n’ihi na ha bụ nke ya? Tụlee ihe banyere Rehab, bụ́ nwaanyị akwụna nke bi na Jeriko n’oge ochie. O doro anya na ọ malitere na nwata fewe arụsị ndị Kenan, bụ́ ndị a na-efe ofufe rụrụ arụ. Ma, mgbe ọ nụrụ otú Jehova si mee ka Izrel merie ọtụtụ mba, ọ ghọtara na Jehova bụ ezigbo Chineke. O tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ ka o wee chebe ndị Chineke, bụ́ nke mere ka o tinye ndụ ya n’aka ha. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na Jems 2:25) Cheedị uru o ritere mgbe o sowere ndị Chineke, bụ́ ndị Iwu Chineke kụziiri ka ha na-ahụ ndị ọzọ n’anya, na-ekpekwa ikpe ziri ezi. Ọ ghaghị ịbụ na o nwere obi ụtọ dị ukwuu na ya kwụsịrị omume ọjọọ ya. Ọ lụrụ onye Izrel, mụta nwa aha ya bụ́ Boaz, bụ́ onye ọ zụlitere ya abụrụ onye na-atụ egwu Chineke.—Jọsh. 6:25; Rut 2:4-12; Mat. 1:5, 6.
e siteghịkwa n’ọrụ kpọọ nwaanyị akwụna ahụ bụ́ Rehab onye ezi omume, mgbe ọ nabatasịrị ndị ozi ahụ nke ọma wee zipụ ha ka ha si ụzọ ọzọ lawa?” (4. Olee otú mkpebi Rut mere ife Jehova si baara ya uru?
4 Rut onye Moab kpebikwara ife Jehova. Mgbe ọ na-eto eto, o nwere ike ịbụ na o fere chi Kimọsh na chi ndị ọzọ ndị Moab na-efe. Ma, ọ matara ezi Chineke bụ́ Jehova, lụọkwa onye Izrel nke bịara n’obodo ha. (Gụọ Rut 1:1-6.) Ka Rut na nwunye nwanne di ya, bụ́ Ọpa, so nne di ha bụ́ Neomi na-ala Betlehem, Neomi gwara ha ka ha laghachi n’ụlọ ha. O mere ka ha mata na ọ ga-esiri ha ike ibi n’Izrel. Ọpa ‘lakwuuru ndị ya na chi ya,’ ma, Rut emeghị otú ahụ. O mere ihe gosiri na ya nwere okwukwe, nakwa na ọ ma onye ọ chọrọ ịbụ nke ya. Ọ gwara Neomi, sị: “Arịọla m ka m hapụ gị, ka m kwụsị iso gị; n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga, ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:15, 16) E nwere ihe e dere n’Iwu Chineke nke baara Rut uru n’ihi na ọ họọrọ ife Jehova. E mere ndokwa pụrụ iche n’Iwu ahụ ka a na-elekọta ndị inyom di ha nwụrụ na ndị ogbenye na ndị na-enweghị ala. Rut nwere obi ụtọ, ahụ́ eruokwa ya ala mgbe ọ malitere ife Jehova.
5. Olee ihe ị chọpụtarala banyere ndị nọgidere na-efe Jehova?
5 O nwere ike ịbụ na ị ma ndị raara onwe ha nye Jehova ọtụtụ iri afọ gara aga ma ha ka na-efe ya. Jụọ ha uru ha riterela n’ihi na ha na-efe Jehova. Ọ bụ eziokwu na o nweghị onye na-anaghị enwe nsogbu, ma, ihe ndị na-eme eme na-egosi na ihe otu ọbụ abụ kwuru bụ eziokwu mgbe ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova!”—Ọma 144:15.
Ihe Jehova Na-atụ Anya Ya n’Aka Anyị Bụ Ihe Anyị Ga-emeli
6. Olee ihe mere anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ma ànyị ga-emeli ihe Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị?
6 E nwere ike ya abụrụ na ọ dịtụla mgbe i chere ma ị̀ ga-emelikwa ihe Jehova na-atụ anya ya n’aka gị. Anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị ma ànyị ga-emelikwa ihe a chọrọ ka ndị bụ́ ohu Chineke mee, ya bụ, ka ha mee ihe o nyere n’iwu nakwa ka ha na-anọchite anya ya. Dị ka ihe atụ, Mozis chere na ya erughị eru mgbe Chineke zigara ya ka ọ gaa gwa ndị Izrel na eze Ijipt okwu. Ma, ihe Chineke dunyere Mozis ka ọ gaa mee abụghị ihe na-agaghị ekwe omume. Jehova ‘ziri ya ihe ọ ga-eme.’ (Gụọ Ọpụpụ 3:11; 4:1, 10, 13-15.) Mozis nabatara enyemaka si n’aka Chineke, o nwekwara ọṅụ n’ihi na o mere ihe Chineke gwara ya. Ihe Jehova na-atụ anya ya n’aka anyị bụkwa ihe anyị ga-emeli. Ọ ma na anyị ezughị okè, ọ na-enyekwara anyị aka. (Ọma 103:14) Ọrụ dị n’ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs na ohu Chineke anaghị agwụ ike. Kama nke ahụ, ọ na-eme ka mmadụ nwee ume ọhụrụ n’ihi na ihe ọ na-eme na-abara ndị ọzọ uru ma na-eme ka obi Jehova ṅụrịa. Jizọs sịrị: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nweta ume. Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m, n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.”—Mat. 11:28, 29.
7. Olee ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka ka i mee ihe ọ chọrọ n’aka gị?
7 Jehova ga-enye anyị agbamume dị anyị mkpa ma ọ bụrụhaala na anyị arịọ ya maka enyemaka. Dị ka ihe atụ, Jeremaya bụ onye ihere. N’ihi ya, mgbe Jehova họpụtara ya ka ọ bụrụ onye amụma ya, Jeremaya kwuru, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.” O mechara kwuokwa, sị: “Agakwaghị m ekwu okwu n’aha ya.” (Jere. 1:6; 20:9) N’agbanyeghị nke a, Jehova gbara Jeremaya ume, ruokwa afọ iri anọ, Jeremaya ziri ndị Izrel ozi na-agba ha agba ná ntị. Jehova mesiri ya obi ike ugboro ugboro, sị: “M nọnyeere gị, ịzọpụta gị na ịnapụta gị.”—Jere. 1:8, 19; 15:20.
8. Olee otú anyị si egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi?
8 Jehova nwekwara ike inyere Ndị Kraịst aka ime ihe ọ chọrọ n’aka ha taa otú ahụ o si nyere Mozis na Jeremaya aka. Ihe ga-eme ka nke a kwe omume bụ ma anyị tụkwasị Chineke obi. Baịbụl sịrị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) Anyị na-egosi na anyị tụkwasịrị Jehova obi ma ọ bụrụ na anyị anabata aka ọ na-enyere anyị site n’Okwu ya nakwa site n’ọgbakọ ya. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka Jehova na-eduzi anyị ná ndụ, o nweghị ihe ga-eme ka anyị ghara ịnọgide na-efe ya ofufe.
Jehova Hụrụ Ndị Ohu Ya n’Anya n’Otu n’Otu
9, 10. Olee ụdị nchebe e kwere anyị ná nkwa n’Abụ Ọma nke iri itoolu na otu?
9 Ka ụfọdụ ndị na-eche ma hà ga-arara onwe ha nye Jehova, ha na-atụgharị uche ihe ga-eme ma ọ bụrụ na ha emee mmehie ma ghara iru ihe Jehova chọrọ, bụ́ nke nwere ike ime ka ọ jụ ha. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara ime ka anyị na ya gharazie ịdị ná mma. Ka anyị hụ otú e si gosi nke a n’Abụ Ọma nke iri itoolu na otu.
10 Ọbụ abụ ahụ malitere abụ ya, sị: “Onye ọ bụla nke bi n’ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu ga-enwetara onwe ya ebe obibi na ndò nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile. M ga-asị Jehova: ‘Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.’ N’ihi na ọ ga-anapụta gị n’ọnyà nke onye na-achụ nta nnụnụ siri.” (Ọma 91:1-3) Ebe a gosiri na Chineke kwere nkwa na ya ga-echebe ndị hụrụ ya n’anya ma tụkwasị ya obi. (Gụọ Abụ Ọma 91:9, 14.) Olee otú ọ ga-esi echebe anyị? Jehova chebere ndị ohu ya n’oge ochie ka ihe ọ bụla ghara imerụ ha ahụ́. Ihe mere o ji mee nke a mgbe ụfọdụ bụ ka a ghara ikpochapụ ezinụlọ nke Mesaya ahụ e kwere ná nkwa ga-esi na ya pụta. Ma, a tụrụ ọtụtụ ndị ọzọ mkpọrọ, taa ndị ọzọ ahụhụ, gbuokwa ụfọdụ, ka e wee jiri obi ọjọọ kwụsị ha ife Chineke. (Hib. 11:34-39) Ha nwere obi ike, tachiekwa obi n’ihi na Jehova chebere ha ka ihe ọ bụla ghara ime ka ha kwụsị ife ya. N’ihi ya, o nwere ike ịbụ ụdị nchebe a ka e kwere ná nkwa n’Abụ Ọma nke iri itoolu na otu.
11. Olee ihe bụ ‘ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu,’ oleekwa ndị Chineke na-echebe na ya?
11 N’ihi ya, ‘ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu’ ọbụ abụ ahụ kwuru okwu ya bụ ebe ihe atụ a na-echebe anyị ka anyị wee nọgide na-efe Jehova. E nweghị ihe ga-eme okwukwe na ịhụnanya nke ndị nọ ebe ahụ nwere n’ebe Chineke nọ. (Ọma 15:1, 2; 121:5) Ọ bụ ebe nzuzo n’ihi na ndị na-ekweghị ekwe amaghị banyere ya. Jehova na-echebe ndị nọ n’ebe ahụ, bụ́ ndị na-ekwu, sị: ‘Ị bụ Chineke m onye m ga-atụkwasị obi.’ Ọ bụrụ na anyị anọgide n’ebe mgbaba ahụ, anyị agaghị na-echegbu onwe anyị ma ànyị ga-ama n’ọnyà onye ahụ nke “na-achụ nta nnụnụ” siri, bụ́ nke ga-eme ka Chineke jụ anyị.
12. Olee ihe ndị na-eme ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma?
12 Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị na Ọma 91:5, 6) “Onye na-achụ nta nnụnụ” amatala ọtụtụ ndị n’ọnyà site n’ime ka ha chọọ ịna-eme ihe masịrị ha. (2 Kọr. 11:3) E nwekwara ndị ọzọ ọ matara n’ọnyà site n’ime ka ha dịrị anyaukwu. O meela ka ụfọdụ dịrị mpako, meekwa ka ndị ọzọ na-achụ ihe onwunwe ka à na-anwụ anwụ. O duhiekwala ụfọdụ ndị site n’ime ka ha hụ ala nna ha n’anya, mee ka ụfọdụ kwere na mmadụ si n’enwe pụta, meekwa ka ụfọdụ ndị banye n’okpukpe ụgha. (Kọl. 2:8) Ọtụtụ ndị na-akwakwa iko. Ihe ndị a, bụ́ ndị na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma, emeela ka ụfọdụ kwụsị ịhụ Chineke n’anya.—Gụọ Abụ Ọma 91:7-10; Mat. 24:12.
Chineke kwụsị ịdị ná mma? Ọbụ abụ ahụ kwuru ọtụtụ n’ime ha. Ha gụnyere “ọrịa na-efe efe nke na-agagharị n’ọchịchịrị, . . . [na] ihe na-ebibi ihe n’etiti ehihie.” (Hụ na E Nweghị Ihe Ga-eme Ka Ị Kwụsị Ịhụ Chineke n’Anya
13. Olee otú Jehova si enyere anyị aka ka anyị ghara ime ihe ndị nwere ike ime ka anyị na ya ghara ịdị ná mma?
13 Olee otú Jehova si ahụ na ihe ndị a anaghị eme ka ya na ndị ya ghara ịdị ná mma? Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ọ ga-enye ndị mmụọ ozi ya iwu banyere gị, ka ha chee gị nche n’ụzọ gị niile.” (Ọma 91:11) Ndị mmụọ ozi ndị nọ n’eluigwe na-echebe anyị ma na-eduzi anyị ka anyị wee nwee ike ikwusa ozi ọma. (Mkpu. 14:6) Ọ bụghị naanị ndị mmụọ ozi, ndị okenye ọgbakọ na-echebekwa anyị ka a ghara iduhie anyị. Ha na-eme nke a site n’iji Akwụkwọ Nsọ na-akụziri anyị ihe. Ha na-enyere onye ọ bụla nke na-agbasi mbọ ike ka ọ ghara ime ka ndị ụwa aka. (Taị. 1:9; 1 Pita 5:2) “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enyekwa anyị nri ime mmụọ nke ga-eme ka anyị ghara ikwenye na mmadụ si n’enwe pụta. Ha na-enyekwara anyị aka ka anyị ghara ime omume rụrụ arụ, ka anyị ghara ịchụwa ihe onwunwe ma ọ bụkwanụ chọwa ịghọ ndị a ma ama, nakwa ka anyị ghara ime ọtụtụ ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma. (Mat. 24:45) Gịnị nyeerela gị aka izere ụfọdụ n’ime ihe ndị a?
14. Olee ihe anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke chebe anyị?
14 Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide “n’ebe nzuzo” nke Chineke, bụ́ ebe ọ na-enweghị ihe ga-eme anyị? Dị nnọọ ka anyị kwesịrị ichebe onwe anyị ka ihe ọ bụla ghara imerụ anyị ahụ́, ya bụ, ka anyị ghara inwe ihe ọghọm, ka ndị omekome ghara inweta anyị ma ọ bụkwanụ ka anyị ghara ibute ọrịa, otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịnọgide na-agbasi mbọ ike iji hụ na e nweghị ihe ga-eme ka anyị na Chineke kwụsị ịdị ná mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jehova gwara anyị n’akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl nakwa n’ọmụmụ ihe nakwa ná mgbakọ dị iche iche anyị na-enwe. Anyị kwesịrị ịgakwuru ndị okenye ka ha nyere anyị aka. Anyị ga-amụtakwa ihe n’àgwà ụmụnna anyị na-akpa. N’ezie, anyị ga-ama ihe ma ọ bụrụ na anyị ana-esochi ọgbakọ anya.—Ilu 13:20; gụọ 1 Pita 4:10.
15. Olee ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Jehova ga-egbochili ihe ọ bụla ga-achọ ime ka gị na ya ghara ịdịkwa ná mma?
Rom 8:38, 39) O meela ka ndị okpukpe na ndị ọchịchị ndị na-emegide ọgbakọ ya, bụ́ ndị ihe bụ́ mkpa ha na-abụghị igbu anyị egbu kama ọ bụ ime ka anyị na Chineke anyị dị nsọ ghara ịdị ná mma, ghara inweta anyị. Jehova emeela ihe o kwere ná nkwa. Ọ sịrị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.”—Aịza. 54:17.
15 O nweghị ihe mere anyị ga-eji nwee obi abụọ ma Jehova ọ̀ ga-egbochili ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị na ya ghara ịdịkwa ná mma. (Ònye Na-eme Ka Anyị Nwere Onwe Anyị?
16. Olee ihe mere ụwa agaghị emeli ka anyị nwere onwe anyị?
16 Jehova ọ̀ ga-egbochi anyị inwere onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị abụrụ nke ya? Mba, kama nke ahụ, ihe ga-eme ka anyị ghara inwere onwe anyị bụ ma anyị bụrụ nke ụwa. E kewapụrụ ụwa n’ebe Jehova nọ, ọ bụkwa chi nwere obi ọjọọ, nke na-anaghị ekwe ndị mmadụ megharịa ahụ́, na-achị ụwa. (Jọn 14:30) Dị ka ihe atụ, ụwa Setan na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ohu site n’ime ka ha na-achụ ihe onwunwe ọnwụ ọnwụ. (Tụlee Mkpughe 13:16, 17.) Mmehie nwekwara ike ịghọgbu ndị mmadụ ma mee ka ha bụrụ ohu. (Jọn 8:34; Hib. 3:13) N’ihi ya, n’agbanyeghị na ndị na-ekweghị ekwe nwere ike ịgwa anyị na anyị ga-enwere onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị ebiwe ụdị ndụ Jehova kwuru na ọ dịghị mma, onye ọ bụla gere ha ntị ga-achọpụta n’egbughị oge na ya bụzi ohu nke mmehie na nke ndụ rụrụ arụ.—Rom 1:24-32.
17. Olee otú anyị ga-esi enwere onwe anyị ma ọ bụrụ na anyị abụrụ nke Jehova?
17 Ma, Jehova ga-eme ka anyị nwere onwe anyị ka ihe ọ bụla ghara imerụ anyị ahụ́ ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi. Ọnọdụ anyị yiri nke onye kwere ka dọkịta maara nke a na-akọ, bụ́ onye ga-agwọ ya ọrịa chọrọ igbu ya, waa ya ahụ́. Anyị niile bu ọrịa na-achọ igbu anyị. Ọrịa ahụ bụ mmehie anyị ketara n’aka Adam. Ọ bụ naanị mgbe anyị bụ nke Jehova, nweekwa okwukwe n’àjà Kraịst chụrụ, ka anyị nwere ike inwe olileanya na mmehie na ihe ndị ọ na-akpata ga-aha anyị aka, anyị adịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (Jọn 3:36) Otú ahụ anyị ga-atụkwasịkwu dọkịta na-awa ahụ́ obi n’ihi na anyị anụla na ọ bụ aka ochie ka anyị ga-atụkwasịkwukwa Jehova obi ka anyị na-amụtakwu banyere ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-amụ Okwu Chineke nke ọma n’ihi na nke ahụ ga-enyere anyị aka ịhụ ya n’anya otú ga-eme ka egwu ghara ịtụ anyị ịbụ nke ya.—1 Jọn 4:18.
18. Olee uru ndị bụ nke Jehova ga-erite?
18 Jehova nyere onye ọ bụla ohere ịhọrọ ihe ọ chọrọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ, gị na ụmụ gị, site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Diut. 30:19, 20) Ọ chọrọ ka anyị gosi na anyị hụrụ ya n’anya site n’iji obi anyị họrọ ife ya. Ọ bụrụ na anyị abụrụ nke Chineke anyị hụrụ n’anya, nke a agaghị egbochi anyị inwere onwe anyị, kama, ọ ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ.
19. Olee ihe mere o ji bụrụ na Jehova meere anyị obiọma na-erughịrị anyị n’ikwe ka anyị bụrụ nke ya?
19 Anyị bụ́ ndị mmehie erughị eru ịbụ nke Chineke onye zuru okè. Ihe mere anyị ji bụrụ nke ya bụ n’ihi na o meere anyị amara na-erughịrị anyị. (2 Tim. 1:9) Ọ bụ ya mere Pọl ji dee, sị: “Ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dị ndụ maka Jehova, ọ bụrụkwa na anyị nwụrụ anwụ, anyị nwụrụ maka Jehova. Ya mere, ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Rom 14:8) N’ezie, anyị agaghị akwa mmakwaara ma ọ bụrụ na anyị abụrụ nke Jehova.
Olee Ihe Ị Ga-aza?
• Olee uru ndị anyị na-erite ma anyị bụrụ nke Jehova?
• Olee ihe mere anyị ga-eji enwe ike ime ihe Chineke chọrọ n’aka anyị?
• Olee otú Jehova si echebe ndị ohu ya?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Jụọ ndị ọzọ uru ndị ha riterela n’ihi na ha bụ nke Jehova
[Foto dị na peeji nke 10]
Olee ụzọ ụfọdụ Jehova si echebe anyị?