Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?

Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?

Gịnị Mere i ji Kwesị Ịrara Onwe Gị Nye Jehova?

“N’abalị a, otu mmụọ ozi nke Chineke, bụ́ onye m bụ nke ya  . . . guzoro m nso.”—ỌRỤ 27:23.

1. Olee ihe mmadụ na-ebu ụzọ eme tupu e mee ya baptizim, olee ajụjụ ndị anyị ga-ajụ banyere nke a?

OTU n’ime ajụjụ abụọ ndị a chọrọ ime baptizim na-aza mgbe e kwuchara okwu baptizim bụ: “N’ihi àjà Jizọs Kraịst chụrụ, ì chegharịala wee hapụ mmehie gị, rarakwa onwe gị nye Jehova ime uche ya?” Olee ihe mere Ndị Kraịst ji kwesị ịrara onwe ha nye Jehova? Olee otú ịrara onwe anyị nye Chineke si abara anyị uru? Olee ihe mere na Chineke agaghị anabata ofufe mmadụ ma ọ bụrụ na onye ahụ araraghị onwe ya nye ya? Anyị ga-aghọta azịza ajụjụ ndị a ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ tụlee ihe nraranye pụtara.

2. Gịnị ka mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova pụtara?

2 Gịnị ka mmadụ ịrara onwe ya nye Chineke pụtara? Cheta ihe Pọl onyeozi kwuru banyere adịm ná mma ya na Chineke. Ọ nọ n’ihu ndị ọzọ nọ n’otu ụgbọ mmiri nke chọrọ ikpu ekpu kpọọ Jehova “Chineke, bụ́ onye m bụ nke ya.” (Gụọ Ọrụ 27:22-24.) Ọ bụ Jehova nwe ndị niile bụ́ ezigbo Ndị Kraịst. Ma, ụwa “dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ndị Kraịst na-aghọ ndị nke Jehova mgbe ha raara onwe ha nye ya n’ekpere, ya anabatakwa ha. Nraranye ahụ bụ nkwa ha kwere Jehova ná nzuzo. Ka oge na-aga, a na-eme ha baptizim.

3. Gịnị ka baptizim e mere Jizọs pụtara, oleekwa otú ndị na-eso ụzọ ya nwere ike isi ṅomie ya?

3 Jizọs setịpụụrụ anyị ihe nlereanya mgbe o ji aka ya kpebie ime uche Chineke. Jizọs bụ onye a raara nye Chineke, ebe ọ bụ na ọ bụ onye Izrel, bụ́ mba raara onwe ha nye Chineke. N’agbanyeghị nke a, mgbe e mere ya baptizim, o mere ihe karịrị ihe Iwu Mozis kwuru na a ga na-eme. Baịbụl kwuru na ọ sịrị: “Lee! Abịawo m ime uche gị, Chineke.” (Hib. 10:7; Luk 3:21) Ya mere, baptizim e mere Jizọs gosiri na o nyefeela Chineke onwe ya ime uche ya. Ndị na-eso ụzọ ya na-eṅomi ya ma ọ bụrụ na ha ekpebie ka e mee ha baptizim. Ma, mgbe e mere ha baptizim, ha na-egosi n’ihu ọha na ha kpekuru Chineke ekpere wee rara onwe ha nye ya.

Otú Nraranye Si Abara Anyị Uru

4. Olee ihe adịm ná mma Devid na Jọnatan na-akụziri anyị banyere otú ndị bụ́ enyi nwere ike isi hụ na o nweghị ihe ga-etisa ha?

4 Nrara Ndị Kraịst na-arara onwe ha enye Chineke abụghị obere okwu. Ọ karịrị mmadụ ikwe nkwa. Olee otú ịrara onwe anyị nye Chineke si abara anyị uru? Dị ka ihe atụ, ka anyị tụlee otú mmadụ ime ihe o kwere ná nkwa ga-esi mee ka ya na onye ọzọ na-adị ná mma. Nke mbụ anyị ga-ekwu okwu ya bụ mmadụ na ibe ya ịbụ enyi. Ọ bụrụ na ị chọrọ irite uru n’adịm ná mma gị na enyi gị, ị ga na-eme ihe enyi kwesịrị imere enyi ya. Nke a pụtara na ị ga-ahụ na o nweghị ihe ga-etisa unu, ya bụ na unu ga-ahụ ibe unu n’anya. Mmadụ abụọ so ná ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl na ha bụ ezigbo enyi bụ Devid na Jọnatan. Ha gbakwara ndụ na ha ga-anọgide na-adị ná mma. (Gụọ 1 Samuel 17:57; 18:1, 3.) N’agbanyeghị na ọ na-esi ike ịhụ enyi na enyi hụrụ ibe ha n’anya ka Devid na Jọnatan, ọtụtụ ndị enyi na-adị n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na ha agbalịa hụ na o nweghị ihe tisara ha.—Ilu 17:17; 18:24.

5. Olee otú ohu nwere ike isi rite uru ma ya chọọ ịnọrọwa na nke nna ya ukwu nke na-emete ya mma?

5 Iwu ahụ Chineke nyere ụmụ Izrel kwuru banyere adịm ná mma ọzọ nke ndị mmadụ ritere uru na ya n’ihi na ha kwụsiri ibe ha ike n’akụkụ. Ọ bụrụ na ohu achọọ ịnọrọwa na nke nna ya ukwu bụ́ onye na-emete ya mma, ya na ya nwere ike ikwekọrịta na ọ ga-anọ n’ụlọ ya n’alaghị ala. Iwu Mozis sịrị: “Ọ bụrụ na ohu ahụ esie ọnwụ, sị, ‘Ahụrụ m nna m ukwu, nwunye m na ụmụ m n’anya; achọghị m ịla dị ka onye nweere onwe ya,’ mgbe ahụ, nna ya ukwu ga-akpọrọ ya bịa nso n’ebe ezi Chineke nọ ma kpọgote ya n’ọnụ ụzọ ma ọ bụ n’awara ụzọ; nna ya ukwu ga-eji ahà hapuo ya ntị, ọ ga-abụkwa ohu ya ruo mgbe a na-akaghị aka.”—Ọpụ. 21:5, 6.

6, 7. (a) Olee uru ndị mmadụ na-erite ma ha kwụsie ike n’ihe ha kwekọrịtara ime? (b) Olee ihe nke a na-egosi banyere adịm ná mma anyị na Jehova?

6 Alụmdi na nwunye bụ ihe ọzọ chọrọ ka di na nwunye hụ na o nweghị ihe ga-etisa ha. Ọ bụ di ma ọ bụ nwunye ha ka ha na-akwụsi ike n’akụkụ ha, ọ bụghị ná nkwa ha kwere. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị bi ma ha abụghị di na nwunye, ihe ha na-eme bụ enyi; otu onye n’ime ha nwekwara ike ịgbahapụ ụmụ ha ma ihe siere ha ike. Ma, nwoke na nwaanyị lụrụ otú o kwesịrị ga na-agba mbọ na-eme ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ma jiri ịhụnanya na-edozi nsogbu ọ bụla ha nwere ike inwe.—Mat. 19:5, 6; 1 Kọr. 13:7, 8; Hib. 13:4.

7 N’oge ochie, ọ na-abara mmadụ abụọ nwere ezigbo nkwekọrịta tupu ha emekọwa ihe ego ma ọ bụ rụkọwa ọrụ uru. (Mat. 20:1, 2, 8) Nke a na-abakwa uru taa. Dị ka ihe atụ, ọ na-abara anyị uru ma ọ bụrụ na anyị edee ihe anyị kwekọrịtara ede tupu anyị na mmadụ emekọwa ihe ego ma ọ bụkwanụ tupu anyị amalite ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ mmadụ. Ya mere, ọ bụrụ na mmadụ ịhụ na e nweghị ihe gbochiri ya ime ihe o kwere nkwa ime ga-eme ka di na nwunye hụkwuo ibe ha n’anya, meekwa ka onye were mmadụ n’ọrụ na onye o were n’ọrụ ghara inwe nsogbu, ịrara ndụ gị nye Jehova ga-eme ka gị na ya dị n’ezigbo mma. Ka anyị tụlee otú ndị mmadụ si rite uru ná nrara ha raara onwe ha nye Jehova Chineke n’oge ochie nakwa otú nke a si karịa mmadụ ịkwụsi ike n’akụkụ ibe ya.

Otú Nrara Ụmụ Izrel Raara Onwe Ha Nye Chineke Si Baara Ha Uru

8. Gịnị ka nrara ụmụ Izrel raara onwe ha nye Chineke pụtara?

8 Mba Izrel dum ghọrọ mba raara onwe ha nye Jehova mgbe ha kwere ya nkwa. Jehova gwara ha ka ha gbakọọ n’akụkụ Ugwu Saịnaị wee sị ha: “Ọ bụrụ na unu ga-erube nnọọ isi n’ihe m kwuru ma debe ọgbụgba ndụ m n’ezie, unu ga-aghọ ihe onwunwe m pụrụ iche n’etiti ndị niile ọzọ.” Ha wee jiri otu olu sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.” (Ọpụ. 19:4-8) Mgbe ụmụ Izrel raara onwe ha nye Jehova, ha mere ihe karịrị naanị ikwe nkwa ime ihe. Ọ pụtara na ha bụ nke Jehova, ọ bụ ya mere Jehova ji meso ha ihe ka ndị bụ́ ‘ihe onwunwe ya pụrụ iche.’

9. Olee otú nrara ụmụ Izrel raara onwe ha nye Chineke si baara ha uru?

9 Ọbụbụ ụmụ Izrel bụ nke Jehova baara ha uru. Ọ hapụghị ha, o lekọtakwara ha dị ka nna hụrụ ụmụ ya n’anya si elekọta ha. Chineke gwara ha, sị: “Nwaanyị ọ̀ pụrụ ichefu nwa ya ka na-aṅụ ara, nke na ọ gaghị emere nwa ọ mụrụ ebere? Ọbụna ndị inyom a nwere ike ichefu, ma mụ onwe m agaghị echefu gị.” (Aịza. 49:15) Jehova nyere ha Iwu ka ọ na-eduzi ha, họpụtakwara ha ndị amụma na-agba ha ume, zitekwara ha ndị mmụọ ozi ka ha na-echebe ha. Otu ọbụ abụ dere, sị: “Ọ na-agwa Jekọb okwu ya, na-agwakwa Izrel ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe ya. Ọ dịghị mba ọ bụla ọzọ o meere otú ahụ.” (Ọma 147:19, 20; gụọ Abụ Ọma 34:7, 19; 48:14.) Otú ahụ Jehova si lekọta mba bụ́ nke ya n’oge ochie ka ọ ga-esi na-elekọta ndị raara onwe ha nye ya taa.

Ihe Mere Anyị Ji Kwesị Ịrara Onwe Anyị Nye Chineke

10, 11. À mụrụ anyị n’ezinụlọ Chineke? Kọwaa.

10 Mgbe ndị ụfọdụ na-eche ma hà ga-arara onwe ha nye Chineke, e meekwa ha baptizim, ha nwere ike ịjụ, sị, ‘Gịnị mere na enweghị m ike ife Chineke n’ebughị ụzọ rara onwe m nye ya?’ Anyị ga-aghọta ihe mere ya ma anyị cheta otú anyị na Chineke dị. Cheta na mmehie Adam mere mere ka a ghara ịmụ anyị n’ezinụlọ Chineke. (Rom 3:23; 5:12) Ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye ya, a ga-anabata anyị n’ezinụlọ ya. Ka anyị tụlee ihe mere o ji dị otú ahụ.

11 Ọ dịghị onye n’ime anyị nwere ike iketa ndụ zuru okè n’aka nna mụrụ ya, dị ka Chineke zubere ya na mbụ. (1 Tim. 6:19) A mụghị anyị ịbụ ụmụ Chineke, n’ihi na mgbe di na nwunye mbụ mehiere, e kewapụrụ ụmụ mmadụ n’ebe Nna ha hụrụ ha n’anya, bụ́ Onye kere ha, nọ. (Tụlee Diuterọnọmi 32:5.) Kemgbe ahụ, ụmụ mmadụ abụghị ndị ezinụlọ Jehova, ha bụ ndị e kewapụrụ n’ebe ọ nọ.

12. (a) Olee otú ụmụ mmadụ na-ezughị okè nwere ike isi ghọọ ndị ezinụlọ Chineke? (b) Olee ihe ndị anyị na-aghaghị ibu ụzọ mee tupu e mee anyị baptizim?

12 Ma, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịrịọ Chineke ka ọ nabata ya n’ezinụlọ ọ na-anabata ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. * Olee otú ọ ga-esi kwe omume ịnabata ndị mmehie dị ka anyị? Pọl onyeozi dere, sị: “Mgbe anyị bụ ndị iro, e mere ka anyị na Chineke dị ná mma site n’ọnwụ Ọkpara ya.” (Rom 5:10) Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-arịọ Chineke ka o mee ka anyị nwee ezi akọnuche ka o wee nwee ike ịnabata anyị. (1 Pita 3:21) Ma, tupu e mee mmadụ baptizim, e nwere ihe ndị ọ ga-ebu ụzọ mee. Anyị aghaghị ịma Chineke, tụkwasị ya obi, chegharịa, gbanweekwa ndụ anyị. (Jọn 17:3; Ọrụ 3:19; Hib. 11:6) O nwere ihe ọzọ anyị ka ga-eme tupu Chineke anabata anyị n’ezinụlọ ya. Ọ̀ bụ gịnị?

13. Gịnị mere o ji kwesị ekwesị ka mmadụ kwe Chineke nkwa wee rara onwe ya nye ya ka o wee bụrụ onye ezinụlọ Chineke, bụ́ ndị ọ nabatara ka ha bụrụ ndị na-efe ya?

13 Tupu onye e kewapụrụ n’ebe Chineke nọ aghọọ onye ezinụlọ Chineke, bụ́ ebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ, ọ ghaghị ibu ụzọ jiri obi ya dum kwe Jehova nkwa. Iji ghọta ihe mere nke a ji dị otú a, ka anyị were ya na otu nna a na-akwanyere ùgwù, bụ́ onye hụrụ otu nwatakịrị nne na nna ya na-anọghịzi ndụ n’anya, kwuru na ya chọrọ ịkpọrọ ya ka ọ bụrụ onye ezinụlọ ya. Onye ọ bụla ma na nwoke ahụ bụ ezigbo mmadụ. Ma, tupu ya akpọrọ ya ka ọ bụrụ nwa ya, ọ ga-achọ ka nwatakịrị ahụ buru ụzọ kwe ya nkwa. Nwoke ahụ ewee sị, “Tupu ị bụrụ nwa m, ọ ga-ebu ụzọ doo m anya na ị ga-ahụ m n’anya, na-asọpụkwara m otú nwa si asọpụrụ nna ya.” Nwoke ahụ agaghị anabata ya n’ezinụlọ ya ọ gwụla ma ọ dị njikere ikwe nkwa ime ihe a chọrọ ya n’aka. Ọ́ bụghị otú a ka o kwesịrị ịdị? N’otu aka ahụ, naanị ndị Jehova na-anabata n’ezinụlọ ya bụ ndị dị njikere ikwe ya nkwa wee rara ndụ ha nye ya. Baịbụl sịrị: “Nyefeenụ ya onwe unu: ka unu bụrụ àjà dị ndụ, ndị raara onwe ha nye ya ma kwesị ka a nabata ha.”—Rom 12:1, nsụgharị bụ́ The New English Bible.

Ọ Na-egosi na Anyị Hụrụ Chineke n’Anya ma Nwee Okwukwe n’Ebe Ọ Nọ

14. Olee otú o si bụrụ na onye raara onwe ya nye Chineke na-egosi na ya hụrụ ya n’anya?

14 Anyị na-egosi na anyị ji obi anyị dum hụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na anyị ekwe ya nkwa wee rara onwe anyị nye ya. O yiri nkwa mmadụ kwere di ya ma ọ bụ nwunye ya n’ụbọchị ha gbara akwụkwọ. Nwanna nwoke na-egosi na ya hụrụ onye ọ gaje ịlụ n’anya site n’ikwe ya nkwa na ya agaghị ahapụ ya, ihe ọ sọkwara ya mee. Nke a bụ nkwa mmadụ kwere ibe ya na ya ga-akwụsi ike n’akụkụ ya, ọ bụghị nkwa mmadụ kwere na ya ga-eme ihe. Nwanna ahụ ma na ya na nwaanyị ahụ agaghị ebi ma ọ bụrụ na o kweghị nkwa ahụ. N’otu aka ahụ, e nweghị ike ịnabata anyị n’ezinụlọ Jehova ma ọ bụrụ na anyị ekweghị Jehova nkwa wee rara onwe anyị nye ya. Ya mere, anyị na-arara onwe anyị nye Chineke n’ihi na n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị chọrọ ịbụ nke ya, anyị ekpebiekwala na anyị agaghị ahapụ ya, ihe ọ sọkwara ya mee.—Mat. 22:37.

15. Olee otú o si bụrụ na onye raara onwe ya nye Chineke nwere okwukwe n’ebe ọ nọ?

15 Anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ ma ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye ya. Olee ihe mere anyị ji kwuo otú a? Ọ bụrụ na anyị nwere okwukwe n’ebe Jehova nọ, obi siri anyị ike na ịbịa ya nso ga-abara anyị uru. (Ọma 73:28) Anyị ma na ọ naghị adịcha mfe mmadụ isoro Chineke na-eje ije n’ihi na anyị bi “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ, nke hịgọkwara ahịgọ,” ma, anyị tụkwasịrị Chineke obi na ọ ga-akwado mbọ anyị na-agba, dị ka o kwere anyị ná nkwa. (Fil. 2:15; 4:13) Anyị ma na anyị ezughị okè, ma, obi siri anyị ike na ọ ga-emere anyị ebere mgbe anyị mehiere. (Gụọ Abụ Ọma 103:13, 14; Ndị Rom 7:21-25.) Anyị nwere okwukwe na Jehova ga-akwụ anyị ụgwọ maka na anyị ekpebiela iguzosi ike n’ezi ihe.—Job 27:5.

Onye Raara Onwe Ya Nye Chineke Na-enwe Obi Ụtọ

16, 17. Gịnị mere ndị raara onwe ha nye Jehova ji enwe obi ụtọ?

16 Ọ bụrụ na anyị raara onwe anyị nye Jehova, anyị ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na anyị ewepụtala onwe anyị ka Chineke jiri anyị rụọ ọrụ. Jizọs kwuru eziokwu gbara ọkpụrụkpụ mgbe ọ sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ 20:35) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa na-eje ozi, o nwere nnọọ obi ụtọ a na-enweta n’inye ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ naghị ezu ike, ọ naghị eri nri ma ọ bụkwanụ tụsara ahụ́, nke a bụ ka o wee nwee ike inyere ndị ọzọ aka ka ha chọta ụzọ nke na-eduga ná ndụ. (Jọn 4:34) Jizọs nwere obi ụtọ ime ka obi Nna ya ṅụrịa. Jizọs sịrị: “M na-eme ihe dị ya mma mgbe niile.”—Jọn 8:29; Ilu 27:11.

17 Ya mere, Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-eme ka ha wee nwee afọ ojuju ná ndụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya.” (Mat. 16:24) Nke a ga-eme ka anyị bịarukwuo Jehova nso. Ò nwere onye ọzọ anyị ga-arara onwe anyị nye nke nwere ike ịhụ anyị n’anya karịa otú Jehova hụrụ anyị?

18. Olee otú o si bụrụ na anyị ga-enwe obi ụtọ ma anyị na-eme ihe kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova karịa ka anyị nwere ike inwe ma a sị na ọ bụ ihe ma ọ bụ onye ọzọ ka anyị raara onwe anyị nye?

18 Ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye Jehova ma na-eme ihe kwakọrọ ná nrara ahụ anyị raara onwe anyị nye ya site n’ime uche ya, anyị ga-enwe obi ụtọ karịa ka anyị nwere ike inwe ma a si na anyị raara onwe anyị nye ihe ma ọ bụkwanụ nye onye ọzọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-ewere ndụ ha tinye n’ịchụ akụnụba nke na-emebeghị ka ha nweta obi ụtọ na ezigbo afọ ojuju. Ma, ndị raara onwe ha nye Jehova na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Mat. 6:24) Ha na-enwe obi ụtọ n’ihi na “ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” ma, ọ bụghị ọrụ ahụ ka ha raara onwe ha nye, kama, ọ bụ Chineke nke nwere mmasị n’ọrụ ahụ ha na-arụrụ ya. (1 Kọr. 3:9) O nweghị onye nwere obi ụtọ maka ozi e ji obi dum na-ejere ya karịa Jehova. Ọ ga-eme ka ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ laghachi otú ha dị n’oge ha bụ okorobịa na agbọghọbịa, ka ha wee nwee ike irite uru ná nlekọta ọ ga-elekọta ha ruo mgbe ebighị ebi.—Job 33:25; gụọ Ndị Hibru 6:10.

19. Olee ihe ùgwù ndị raara onwe ha nye Jehova nwere?

19 Gị na Jehova ga-adịkwu ná mma ma ọ bụrụ na ị rara ndụ gị nye ya. Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.” (Jems 4:8; Ọma 25:14) N’isiokwu na-eso, anyị ga-amụ ihe mere obi ga-eji sie anyị ike ikpebi ịbụ nke Jehova.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 12 Ọ bụ mgbe Jizọs chịchara otu puku afọ ka “atụrụ ọzọ” ga-abụ ụmụ Chineke. Ma, ebe ọ bụ na ha ararala onwe ha nye Chineke, o ziri ezi na ha na-akpọ Chineke “Nna,” o zikwara ezi ịkpọ ha ndị ezinụlọ Jehova, bụ́ ndị na-efe ya.—Jọn 10:16; Aịza. 64:8; Mat. 6:9; Mkpu. 20:5.

Gịnị Ka Ị Ga-aza?

• Gịnị ka mmadụ ịrara ndụ ya nye Chineke pụtara?

• Olee uru nrara anyị raara onwe anyị nye Chineke baara anyị?

• Olee ihe mere Ndị Kraịst ji kwesị ịrara onwe ha nye Jehova?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 6]

Anyị ga-enwe ezigbo obi ụtọ ma ọ bụrụ na ndụ anyị na-ebi kwekọrọ ná nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova