Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Na-ewere Jehova Ka Nna Gị?

Ị̀ Na-ewere Jehova Ka Nna Gị?

Ị̀ Na-ewere Jehova Ka Nna Gị?

MGBE otu onye n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs rịọrọ ya, sị: “Onyenwe anyị, kụziere anyị otú e si ekpe ekpere,” ọ gwara ha, sị: “Mgbe ọ bụla unu na-ekpe ekpere, sịnụ, ‘Nna, ka e doo aha gị nsọ.’” (Luk 11:1, 2) A sị na Jizọs chọrọ, ọ gaara akpọ Jehova otu n’ime utu aha ndị e ji mara ya, ndị dị ka “Onye Pụrụ Ime Ihe Niile,” “Onye Ozizi Ukwu,” “Onye Okike,” “Onye Ochie,” nakwa “Eze mgbe ebighị ebi.” (Jen. 49:25; Ekli. 12:1; Aịza. 30:20; Dan. 7:9; 1 Tim. 1:17) Kama ịkpọ ya ihe ndị a, Jizọs kpọrọ ya “Nna.” N’ihi gịnị? O nwere ike ịbụ na ọ chọrọ ka mmekọrịta anyị na Onye kacha elu n’eluigwe na ụwa dịrị otú ahụ mmekọrịta nwatakịrị na nke nna ya nke hụrụ ya n’anya na-adị.

Ma, ọ na-esiri ndị ụfọdụ ike ikwere na Chineke bụ Nna ha. Otu Onye Kraịst aha ya bụ Ngọzi * kwuru, sị: “Ruo ọtụtụ afọ ka e mechara m baptizim, ọ nọ na-esiri m ike ịbịaru Jehova nso ma kpekuo ya ekpere ka Nna m.” O kwuru ihe mere nke a ji dị otú a, sị: “M nweghị ike icheta mgbe ọ bụla nna mụrụ m mere ihe gosiri na ọ hụrụ m n’anya.”

N’oge ikpeazụ a dị oké egwu, ọtụtụ ndị bụ́ nna ‘enweghị obi mmadụ.’ (2 Tim. 3:1, 3) Ọ bụ ya mere obi ji adị ọtụtụ ndị otú ahụ ọ dị Ngọzi. Ma, anyị ekwesịghị iche otú ahụ n’ihi na e nwere ọtụtụ ezigbo ihe mere anyị ji kwesị iwere Jehova ka nna hụrụ anyị n’anya.

Jehova Ji Ịhụnanya Enye Anyị Ihe

Anyị kwesịrị ịmara Jehova nke ọma ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iwere ya ka Nna anyị. Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa onye maara Nna m n’ụzọ zuru ezu ma e wezụga Ọkpara ya na onye ọ bụla Ọkpara ya chọrọ ikpughere ya.” (Mat. 11:27) Ụzọ magburu onwe ya anyị kwesịrị isi mara Jehova nke ọma dị ka Nna anyị bụ ichebara ihe niile Jizọs kwuru banyere ezi Chineke echiche. Ya mere, gịnị ka Jizọs kwuru banyere Nna ya?

Jizọs kwuru na ọ bụ Jehova nyere ya ndụ wee sị: ‘M dị ndụ n’ihi Nna m.’ (Jọn 6:57) Ọ bụkwa Nna anyị nyere anyị ndụ. (Ọma 36:9; Ọrụ 17:28) Gịnị mere Jehova ji nye ndị ọzọ ndụ? Ọ́ bụghị ịhụnanya? Anyị kwesịrị ịhụ Nna anyị nke eluigwe n’anya maka onyinye a o nyere anyị.

Ihe kacha ihe niile Chineke meere ụmụ mmadụ iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya bụ na o zitere Jizọs ka o jiri ndụ ya chụọ àjà ka e wee gbapụta ụmụ mmadụ. Àjà ahụ o ji ịhụnanya chụọ mere ka ụmụ mmadụ na Jehova nwee ike ịdị ná mma site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Rom 5:12; 1 Jọn 4:9, 10) Obi siri anyị ike na ndị niile hụrụ Nna anyị nke eluigwe n’anya ma na-erubere ya isi ga-emecha “nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” n’ihi na ọ na-emere ndị ya ihe niile o kwere ha ná nkwa.—Rom 8:21.

Nna anyị nke eluigwe “na-eme ka anyanwụ ya waara” anyị kwa ụbọchị. (Mat. 5:45) O nwere ike ịbụ na ọ dịghị ụbọchị anyị na-ekpe ekpere ka anyanwụ waa. N’agbanyeghị nke ahụ, okpomọkụ nke si na ya dị anyị mkpa, ọ na-atọkwa anyị ụtọ. Ihe ọzọkwa bụ na o nweghị onye nwere ike ịna-enye anyị ihe otú Nna anyị si enye anyị, ọ makwa ihe ọ bụla dị anyị mkpa tupu anyị arịọ ya. Ya mere, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị iwepụta oge anyị ga-eji na-eleru ihe dị iche iche Nna anyị nke eluigwe kere eke anya wee chebara otú o si na-elekọta ha echiche ma nye ya otuto?—Mat. 6:8, 26.

Nna Anyị Bụ “Onye Nchebe nke Na-eme Ebere”

Amụma Aịzaya mesiri ndị Chineke oge ochie obi ike. Ọ sịrị: “Ugwu ukwu ga-esi n’ebe ha dị pụọ, ugwu nta ga-amakwa jijiji, ma adịm ná mma mụ na gị agaghị apụ, ọgbụgba ndụ udo mụ na gị gbara agaghịkwa ama jijiji, ka Jehova onye nchebe nke na-eme ebere kwuru.” (Aịza. 54:10, nsụgharị bụ́ The Bible in Living English) Ekpere Jizọs kpere n’abalị bọtara ụbọchị e gburu ya na-egosi na Jehova bụ n’ezie “onye nchebe nke na-eme ebere.” Jizọs kpere ekpere banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha nọ n’ụwa, m na-abịakwutekwa gị. Nna dị nsọ, chee ha nche n’ihi aha gị.” (Jọn 17:11, 14) Jehova na-eche ndị na-eso ụzọ Jizọs nche ma na-echebe ha.

Otu n’ime ụzọ Chineke si echebe anyị taa ka aghụghọ Setan wee ghara imetụta anyị bụ site n’iji “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-enye anyị nri ime mmụọ n’oge. (Mat. 24:45) Anyị kwesịrị ịna-eri nri ahụ nke na-ewusi okwukwe anyị ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iyiri “ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke.” Dị ka ihe atụ, tụlee banyere “ọta ukwu bụ́ okwukwe,” bụ́ nke anyị ga-eji “nwee ike imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.” (Efe. 6:11, 16) Okwukwe anyị na-echebe anyị ka ihe ọ bụla ghara ime ka anyị na Jehova kwụsị ịdị ná mma, nke a na-egosikwa na Nna anyị na-echebe anyị.

Anyị ga-amụtakwu banyere otú Nna anyị nke eluigwe si eme ebere ma ọ bụrụ na anyị eleba anya nke ọma n’otú Ọkpara Chineke si kpaa àgwà mgbe ọ nọ n’ụwa. Tụlee ihe e dere na Mak 10:13-16. Ebe ahụ kwuru na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m.” Jizọs kuuru ha ma gọzie ha mgbe ha bịakwutere ya. Ọ ga-abụrịrị na nke ahụ mere ka ha nwee ọṅụ nke ukwuu. Anyị ma na ezi Chineke chọrọ ka anyị na-abịakwute ya n’ihi na Jizọs sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”—Jọn 14:9.

Jehova Chineke hụrụ ihe niile o kere eke n’anya nke ukwuu. Ọ dịghị onye na-enye anyị ihe otú o si enye anyị, ọ na-echebe anyị n’ụzọ na-enweghị atụ, chọọkwa ka anyị na-abịaru ya nso. (Jems 4:8) N’ezie, Jehova bụ Nna na-enweghị atụ!

Anyị Na-erite Uru nke Ukwuu

Anyị ga-erite uru nke ukwuu ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, marakwa na ọ bụ Nna anyị nke eluigwe nke hụrụ anyị n’anya ma na-emere anyị ebere. (Ilu 3:5, 6) Jizọs ritere uru n’ịtụkwasị Nna ya obi kpamkpam. Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Anọghị m naanị m, kama Nna m nke zitere m nọnyeere m.” (Jọn 8:16) Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, obi siri ya ike mgbe niile na Jehova nọnyeere ya. Dị ka ihe atụ, ụbọchị e mere ya baptizim, Nna ya gosiri ya na ya hụrụ ya n’anya wee mesie ya obi ike, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m.” (Mat. 3:15-17) Nkeji ole na ole tupu Jizọs anwụọ, ọ kpọkuru Nna ya, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.” (Luk 23:46) Nke a gosiri na Jizọs ka tụkwasịrị Nna ya obi ọbụna mgbe ọ na-anwụ.

Anyị nwere ike ime ka ya. Ebe Jehova nọnyeere anyị, gịnị ka anyị ga-atụ egwu? (Ọma 118:6) N’oge mbụ, Ngọzi, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mmalite isiokwu a, na-eche na ọ bụ ike ya ka ya ga-eji emeri nsogbu ọ bụla bịaara ya. Ma, ọ malitere ịmụ otú Jizọs si bie ndụ nakwa ozi o jere n’ụwa, o lekwasịrị anya karịchaa n’otú ya na Nna ya si dịrị ná mma. Olee uru nke a baara ya? Ngọzi sịrị: “M malitere ile Jehova anya ka Nna m, malitekwa ịtụkwasị ya obi.” O kwukwara, sị: “M malitere inwe obi ụtọ, ahụ́ amalitekwa iru m ala. N’ezie, o nweghị ihe mere ihe ọ bụla ga-eji na-enye anyị nsogbu n’obi.”

Olee uru ọzọ anyị na-erite ma anyị were Jehova ka Nna anyị? Ụmụaka na-ahụkarị ndị mụrụ ha n’anya ma na-achọ ime ihe dị ha mma. Ọkpara Chineke na-eme ‘ihe dị Nna ya mma mgbe niile’ n’ihi na ọ hụrụ Nna ya n’anya. (Jọn 8:29) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Nna anyị nke eluigwe nọ kwesịkwara ime ka anyị na-eme ihe dị ya mma ma na-enye ya “otuto n’ihu ọha.”—Mat. 11:25; Jọn 5:19.

Nna Anyị ‘Sekpụ Aka Nri Anyị’

Nna anyị nke eluigwe na-enyekwa anyị “ihe inyeaka,” ya bụ, mmụọ nsọ ya. Jizọs kwuru, sị: “Ọ ga-eduzi unu wee nyere unu aka ịghọta eziokwu niile.” (Jọn 14:15-17; 16:12, 13) Mmụọ nsọ Chineke ga-eduzi anyị ka anyị mara Nna anyị nke ọma. Ọ na-enyere anyị aka ịkụghasị “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike,” ya bụ, ozizi ụgha ma ọ bụkwanụ echiche na-ezighị ezi. Nke a na-emekwa ka anyị merie “echiche ọ bụla iji mee ka ọ na-erubere Kraịst isi.” (2 Kọr. 10:4, 5) Ya mere, ka anyị na-arịọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị “ihe inyeaka” ahụ Jizọs kwere anyị ná nkwa. Obi sikwara anyị ike na ‘Nna anyị nke nọ n’eluigwe ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Luk 11:13) Ọ dịkwa mma ka anyị na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ nyere anyị aka ịbịarukwu Jehova nso.

Ụjọ anaghị atụ nwatakịrị ma ya na papa ya soro, ahụ́ na-erukwa ya ala. Ọ bụrụ n’eziokwu na ị na-ewere Jehova ka Nna gị, na-echeta okwu a nke na-akasi obi, nke sịrị: “Mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke gị, sekpụ gị n’aka nri gị. Ọ bụ m bụ Onye na-asị gị, ‘Atụla egwu. Mụ onwe m ga-enyere gị aka.’” (Aịza. 41:13) I nwere ike inwe ihe ùgwù magburu onwe ya, nke bụ́ iso Chineke “na-eje ije” ruo mgbe ebighị ebi. (Maị. 6:8) Na-eme uche Jehova, ọ ga-ahụkwa gị n’anya n’ihi na ọ bụ Nna gị, ị ga na-enwekwa ọṅụ, ahụ́ ga-erukwa gị ala.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 3 Ọ bụghị ezigbo aha ya.