Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Olee mgbe e nwere ike ichewe echiche imegharị mmadụ baptizim?

E nwere ihe ụfọdụ nwere ike ime ka mmadụ chebara baptizim e mere ya echiche ma chewe ma à ga-emegharị ya baptizim. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na onye ahụ ka na-eme mmehie ná nzuzo ruo ụbọchị ahụ e mere ya baptizim, bụ́ nke nwere ike ime ka a chụọ ya n’ọgbakọ. Ò nwere ike ikwe omume na ọ raara onwe ya nye Chineke n’ọnọdụ dị otú a? Nrara onye dị otú ahụ raara onwe ya nye Jehova gaara abụ nke ezigbo ya ma a sị na ọ kwụsịrị àgwà ọjọọ ahụ tupu ya arara onwe ya nye Jehova. N’ihi ya, onye e mere baptizim mgbe ọ ka na-eme mmehie kwesịrị ichewe echiche ma à ga-emegharị ya baptizim.

Oleekwanụ maka onye na-anaghị eme mmehie mgbe e mere ya baptizim ma ya abụrụ na mmehie ndị o mere mgbe e mechara ya baptizim kwesịrị ka e hiwere ya òtù ikpe? Ka e were ya na o kwuru na ya aghọtaghị ihe ọ nọ na-eme mgbe ahụ e mere ya baptizim wee sị na baptizim e mere ya abụghị nke ezigbo ya. Mgbe ndị okenye na-eleba okwu onye mere mmehie anya, ha ekwesịghị ịjụwa ya ajụjụ ma ò chere na nrara ọ raara onwe ya nye Chineke nakwa baptizim e mere ya ka nwere isi. A sị kwuwe, ọ nụrụ okwu dabeere na Baịbụl, bụ́ nke kọwara ihe baptizim pụtara. Ọ zara ee mgbe a jụrụ ajụjụ abụọ ahụ a na-ajụ banyere nraranye na baptizim, gbanwee efe ya, e mikpuokwa ya n’ime mmiri. N’ihi ya, ọ ghaghị ịbụ na ihe o mere doro ya anya. Ya mere, ndị okenye ga-ekpe ya ikpe otú e kwesịrị isi kpee onye e mere baptizim.

Ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ya echeghị na baptizim e mere ya bụ nke ezigbo ya, ndị okenye nwere ike ịgwa ya ka ọ gụọ Ụlọ Nche Bekee nke March 1, 1960, peeji nke 159 na peeji nke 160, nakwa nke February 15, 1964, peeji nke 123 ruo nke 126, bụ́ ebe a kọwara ihe banyere imegharị mmadụ baptizim nke ọma. Ọ bụ mmadụ ga-ekpebi n’onwe ya ka e megharịa ya baptizim n’ihi ihe ụfọdụ (ndị dị ka n’ihi na ọ ghọtaghị Baịbụl nke ọma tupu e mee ya baptizim).

Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị iburu n’uche ma ọ bụrụ na ha chọrọ ka ha na ndị ọzọ biri n’otu ebe?

Onye ọ bụla kwesịrị inwe ebe o bi. Ma taa, ọtụtụ ndị enweghị ụlọ nke ha. Ụkọ ego, ọrịa, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, nwere ike ime ka mmadụ na ndị ikwu ya bikọta ọnụ. N’ebe ụfọdụ n’ụwa, ndị ikwu mmadụ nwere ike iju n’otu ọnụ ụlọ nke na-eme ka ha ghara inwe ebe ha ga na-anọrọ onwe ha.

Ọ bụghị ọrụ dịịrị ọgbakọ Ndịàmà Jehova ịgwa ndị Jehova ihe niile ha ga-eme ma ọ bụ ihe ha na-agaghị eme banyere ebe ha kwesịrị ibi na ebe ha na-ekwesịghị ibi. A gbara Ndị Kraịst ume ka ha chebara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru echiche iji mara ma ebe ha bi, ndị ha na ha bi, na otú ihe si aga ebe ahụ hà kwesịrị ekwesị n’anya Chineke. Olee ụfọdụ ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru bụ́ ndị e kwesịrị ichebara echiche?

Ihe bụ́ isi anyị ga-echebara echiche banyere anyị na ndị ọzọ ibi bụ ihe nke a nwere ike ime adịm ná mma anyị na Jehova. Olee ụdị ndị ha bụ? Hà na-efe Jehova? Hà na-eme ihe Baịbụl kwuru? Pọl onyeozi dere, sị: “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Kọr. 15:33.

Akwụkwọ Nsọ kwuru na Jehova katọrọ ịkwa iko, ma nke ndị na-alụbeghị di na nwunye ma nke ndị lụrụ di na nwunye. (Hib. 13:4) N’ihi ya, ihe ọ bụla nke ga-eme ka mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye biri n’otu ụlọ ka di na nwunye dị njọ n’anya Chineke. Onye Kraịst ekwesịghị ibi n’ebe a na-eleghara omume rụrụ arụ anya.

Ihe ọzọ bụ na Baịbụl gwara ndị niile chọrọ ka ha na Chineke dịrị ná mma ka ha ‘gbaara ịkwa iko ọsọ.’ (1 Kọr. 6:18) N’ihi ya, Onye Kraịst ekwesịghị ibi n’ebe ga-eme ka o tinye aka n’omume rụrụ arụ. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe ga-eme ma ọtụtụ Ndị Kraịst hie n’otu ọnụ ụlọ. Nke a ò nwere ike itinye ha n’ọnwụnwa? Olee ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na naanị mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye afọdụ n’ụlọ ahụ n’ihi na ndị ọzọ ha na ha bi n’ụlọ ahụ anọghị ya n’oge ahụ? N’otu aka ahụ, ọ ga-akpatara mmadụ abụọ hụrụ onwe ha n’anya ezigbo nsogbu nke na ha nwere ike ime omume rụrụ arụ ma ọ bụrụ na ha abụọ ebiri n’otu ọnụ ụlọ. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike zere ụdị ọnọdụ a.

Mmadụ abụọ gbarala onwe ha alụkwaghịm ekwesịghịkwa ibi. Ha nwere ike ime omume rụrụ arụ ka ha na-anọkọ ọnụ.—Ilu 22:3.

Ihe ikpeazụ dịkwa mkpa e kwesịrị ichebara echiche bụ otú ndị mmadụ ga-esi na-ele ihe onye ahụ kpebiri ime anya. Ọ bụrụ na ndị mmadụ na-ekwu okwu na-adịghị mma banyere ebe Onye Kraịst bi, o kwesịrị ichebara ya echiche. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-ewetara aha Jehova nkọcha. Pọl si otú a kwuo ya: “Unu abụrụla ndị Juu na ndị Grik na ọgbakọ Chineke ihe ịsụ ngọngọ, ọbụna dị ka m na-eme ihe dị mmadụ niile mma n’ihe niile, n’achọghị uru nke onwe m, kama uru nke ọtụtụ ndị, ka e wee zọpụta ha.”—1 Kọr. 10:32, 33.

O nwere ike isiri ndị chọrọ ime uche Jehova ike ịchọta ebe kwesịrị ekwesị ha ga-ebi. Ma, Ndị Kraịst aghaghị ‘ịna-achọpụta ihe dị Onyenwe anyị mma.’ Ha kwesịrị ịhụ na a naghị eme omume rụrụ arụ n’ebe ha bi. (Efe. 5:5, 10) Ndị Kraịst kwesịrị ikpeku Chineke ekpere ka o nyere ha aka na nke a, ha kwesịkwara ime ihe niile ha nwere ike ime iji hụ na ha emeghị ihe na-adịghị mma nke ga-emebi aha ọma Jehova.