Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Anabatala Ụgha Setan Na-agha

Anabatala Ụgha Setan Na-agha

Anabatala Ụgha Setan Na-agha

ISI ihe Rabshake, bụ́ onye ozi Eze Asiria bụ́ Senakerib, nọ na-agwa ndị bi na Jeruselem bụ: ‘Unu ekwela ka e duhie unu. Chineke unu agaghị enyere unu aka. Chịlienụ aka elu ma ọ́ bụghị ya, anyị asụọ unu akwụ!’ Ndị agha eze Asiria amalitelarị ịlụso ala Juda agha. Ihe bụ́ mkpa onye ozi eze ahụ bụ ime ka obi daa ndị bi na Jeruselem mba, ka ha jiri ụjọ chịliere Asiria aka elu.—2 Eze 18:28-35.

Onye ukwu na onye nta ma na obi tara ndị Asiria mmiri. Ha na-eme ka ụjọ jide ndị iro ha site n’ịgwa ha ụzọ ọjọọ niile ha si mesie ndị ha dọọrọ n’agha ike. Ọkọ akụkọ ihe mere eme aha ya bụ Filip Telọ kwuru na “ha na-emenye ndị mmadụ ụjọ ma na-agha ezigbo ụgha nke na-eme ka nnukwu egwu na-atụ ndị ha na-ebuso agha, ha na-agwakwa ndị nwere ike ịbụ ndị iro ha n’ọdịnihu otú ha sirila jiri obi ọjọọ mesie ndị iro ha ike.” Okwu ụgha na-akpa ajọ ike. Talọ kwuru na ọ “na-eduhie ndị mmadụ.”

Ezigbo Ndị Kraịst “nwere mgba, ọ bụghị megide ọbara na anụ ahụ́, kama . . . megide ìgwè ndị mmụọ ọjọọ,” ya bụ, ndị mmụọ ozi ndị nupụụrụ Chineke isi. (Efe. 6:12) Onyeisi ha bụ Setan bụ́ Ekwensu. Yanwa kwa na-eji obi ọjọọ echi ndị mmadụ ọnụ n’ala, ọ na-aghakwara ha ụgha.

Setan na-egosi na ya nwere ike ime ka onye ọ bụla n’ime anyị nupụrụ Chineke isi. Mgbe nna ochie bụ́ Job nọ ndụ, Setan gwara Jehova Chineke, sị: “Ihe ọ bụla mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ mkpụrụ obi ya.” Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ ga-enupụrụ Chineke isi ma ihe siere ya ezigbo ike. (Job 2:4) Ihe a Setan kwuru ọ̀ bụ eziokwu? È nwere ebe ọ ga-abụ ihe meruo anyị ànyị enupụrụ Chineke isi ka anyị wee ghara ịnwụ? Ihe bụ́ mkpa Setan bụ ka anyị chee na e nwere. Ọ bụ ya mere o ji aghagbu onwe ya n’ụgha ka o wee duhie anyị. Iji mara ihe anyị ga-eme ka ọ ghara iduhie anyị, ka anyị tụlee ụzọ ụfọdụ o si eme nke a.

“A Tọrọ Ntọala Ha n’Ájá”

Setan mere ka Elifaz, bụ́ otu n’ime mmadụ atọ bụ́ ndị enyi Job, bụ́ ndị bịara ileta ya, kwuo na ụmụ mmadụ agaghị emerili ọnwụnwa Setan. Ọ gwara Job na ụmụ mmadụ “bi n’ụlọ ájá,” nakwa na “a tọrọ ntọala ha n’ájá! A na-azọpịa ha ọsọ ọsọ karịa nla. Malite n’ụtụtụ ruo n’anyasị, a na-azọpịa ha; ha na-ala n’iyi ruo mgbe ebighị ebi n’enweghị onye ọ na-emetụ n’obi.”—Job 4:19, 20.

Amaokwu ọzọ na Baịbụl ji anyị tụnyere ‘arịa e ji ụrọ kpụọ,’ ya bụ, ite na-akụwa akụwa. (2 Kọr. 4:7) Anyị adịghị ike n’ihi na anyị ketara mmehie na ezughị okè n’aka Adam. (Rom 5:12) Anyị agaghị emerili ọnwụnwa Setan n’ike anyị. Ma, Jehova ga-enyere anyị bụ́ Ndị Kraịst aka imeri ọnwụnwa Setan. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke. (Aịza. 43:4) Ihe ọzọ bụ na Jehova na-ewere mmụọ nsọ enye ndị na-arịọ maka ya. (Luk 11:13) Mmụọ ya na-enye anyị “ike karịrị ike nkịtị,” bụ́ nke na-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla Setan nwere ike iwetara anyị. (2 Kọr. 4:7; Fil. 4:13) Ọ bụrụ na anyị eguzogide Ekwensu, ma ‘sie ike n’okwukwe,’ Chineke ga-eme ka anyị guzosie ike, meekwa ka anyị sie ike. (1 Pita 5:8-10) Ya mere, anyị ekwesịghị ịna-atụ Setan bụ́ Ekwensu ụjọ.

“Onye Na-aṅụ Ajọ Omume Dị Ka Mmiri”

Elifaz jụrụ, sị: “Gịnị ka mmadụ efu bụ nke mere ọ ga-eji dị ọcha? Ma ọ bụ onye ọ bụla nwaanyị mụrụ nke mere ọ ga-eji bụrụ onye ziri ezi?” Ọ zara ajụjụ ahụ wee sị: “Lee! Ọ tụkwasịghị ndị nsọ ya obi, eluigwe adịghịkwa ọcha n’anya ya, ma ya fọdụzie mgbe mmadụ bụ onye a na-asọ oyi, bụrụkwa onye rụrụ arụ, onye na-aṅụ ajọ omume dị ka mmiri!” (Job 15:14-16) Ihe Elifaz gwara Job bụ na o nweghị mmadụ bụ onye ezi omume n’anya Jehova. Ekwensu na-emekwa ka anyị na-eche otú a. Ọ na-achọ ka anyị na-echegbu onwe anyị banyere mmehie anyị mere n’oge gara aga, na-enwebiga mwute ókè wee na-eche na o nweghị ihe ga-eme ka anyị gbanwee. Ọ na-achọkwa ka anyị na-eche na anyị agaghị emeli ihe Jehova chọrọ nakwa na Jehova anaghị emere anyị ebere, na ọ naghị agbaghara anyị, nakwa na ọ naghị enyere anyị aka ịkwụsị ime mmehie.

Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị niile ‘emehiewo, anyị adịghịkwa eru ebube Chineke.’ O nweghị mmadụ na-ezughị okè nke ga-edebeli iwu niile zuru okè Jehova nyere. (Rom 3:23; 7:21-23) Ma, nke a apụtaghị na o nweghị uru anyị baara ya. Jehova ma na ọ bụ “agwọ mbụ ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan,” na-eduhie anyị n’ihi na anyị ezughị okè. (Mkpu. 12:9, 10) Chineke anaghị emesocha anyị ihe otú ihe anyị mere hà, ya bụ na ọ naghị ‘ahụta mmejọ’ anyị n’ihi na “ọ na-echeta na anyị bụ ájá.”—Ọma 103:8, 9, 14.

Ọ bụrụ na ihe ọjọọ anyị na-eme ewute anyị, anyị echegharịa bịakwute Jehova, ‘ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ụzọ dị ukwuu.’ (Aịza. 55:7; Ọma 51:17) Baịbụl kwuru na ọ bụrụgodị na mmehie anyị “na-acha uhie uhie, [Jehova] ga-eme ka ọ na-acha ezigbo ọcha.” (Aịza. 1:18) Ya mere, ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-agba mbọ ime uche Chineke.

O nweghị ihe anyị ga-eme ka anyị metechaa ihe ga-eme ka anyị na Chineke dị ná mma n’ihi na anyị ezughị okè. Mmehie Adam na Iv mere mere ka ha kwụsị izu okè, meekwa ka ha bụrụ ndị na-enweghị olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Anyị niile ketakwara nke a n’aka ha. (Rom 6:23) Ma, n’ihi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu, o mere ndokwa nke ga-enye aka mee ka ọ gbaghara anyị mmehie ma ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe n’àjà o ji Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst chụọ. (Mat. 20:28; Jọn 3:16) Nke a na-egosi na “obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ” pụtara nnọọ ìhè. (Taị. 2:11) Chineke nwere ike ịgbaghara anyị mmehie anyị! Gịnịzi mere anyị ga-eji hapụ Setan ka o mee ka anyị na-eche na o nweghị ihe ga-eme ka Jehova gbaghara anyị mmehie anyị?

“Matịa Aka Gị Metụ Ọbụna Ọkpụkpụ Ya na Anụ Ahụ́ Ya”

Setan kwuru na Job ga-enupụrụ Chineke isi ma ọrịa rịawa ya. Ekwensu gwara Jehova, sị: “Matịa aka gị metụ ọbụna ọkpụkpụ ya na anụ ahụ́ ya, lee ma ọ́ gaghị akọcha gị n’ihu gị.” (Job 2:5) O doro anya na obi ga-adị Onye iro Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na o mee ka anyị na-eche na o nweghị uru anyị bara n’ihi na ahụ́ adịghị anyị.

Ma, Jehova anaghị ajụ anyị n’ihi na ike adịkwaghị anyị ime ụdị ihe anyị na-emebu n’ozi ya. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o nwere ndị kụrụ enyi gị ihe ma merụọ ya ahụ́? Ị̀ ga na-ele ya anya ka onye na-abakwaghị uru n’ihi na ike adịkwaghị ya imere gị ihe ndị ọ na-emere gị n’oge gara aga? Mbanụ! Ị ka ga-ahụ ya n’anya ma na-elekọta ya, karịchaa, n’ihi na e merụrụ ya ahụ́ ahụ mgbe ọ nọ na-arụrụ gị ọrụ. Ànyị chere na Jehova agaghị eme ihe karịrị nke a? Baịbụl sịrị: “Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”—Hib. 6:10.

Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere “otu nwaanyị di ya nwụrụ nke dara ogbenye,” bụ́ onye o nwere ike ịbụ na ọ nọ na-akwado ofufe Chineke kemgbe ọtụtụ afọ. Mgbe Jizọs hụrụ ka ọ tụnyere “obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta” n’igbe a na-atụnye ego, ò lere ya anya ka onye na-abaghị uru, ka ò lere onyinye ahụ anya ka ihe na-abaghị uru? Kama nke ahụ, ọ jara ya mma maka na ọ na-akwado ofufe Chineke ruo otú ike kwere ya n’agbanyeghị ọnọdụ ya.—Luk 21:1-4.

Ọ bụrụ na anyị eguzosie ike n’ezi ihe, anyị na Jehova ga-anọgide na-adị ná mma n’agbanyeghị na anyị akaala nká ma ọ bụkwanụ na anyị na-arịa ọrịa n’ihi na anyị ezughị okè. Chineke agaghị ahapụ ndị ohu ya naanị n’ihi na ihe isi ike emeela ka ha ghara ịna-ejecha ozi otú ha si ejeburu ya.—Ọma 71:9, 17, 18.

Nara “Okpu Agha Bụ́ Nzọpụta”

Olee otú anyị nwere ike isi chebe onwe anyị ka ụgha Setan na-agha ghara iduhie anyị? Pọl onyeozi dere, sị: “Nọgidenụ na-enweta ike n’ime Onyenwe anyị nakwa n’ịdị ike nke ume ya. Yirinụ ekike agha zuru ezu nke si n’aka Chineke, ka unu wee nwee ike iguzosi ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.” Otu n’ime ekike anyị na-eke bụ “okpu agha bụ́ nzọpụta.” (Efe. 6:10, 11, 17) Anyị kwesịrị ịnara okpu ahụ ma kpuru ya ma ọ bụrụ na anyị achọghị ka ụgha Setan na-agha duhie anyị. Okpu onye agha na-echebe isi ya. “Olileanya nke nzọpụta” anyị nwere ga-echebe obi anyị ka ụgha dị iche iche Setan na-agha ghara iduhie anyị. “Olileanya” ahụ bụ obi ike anyị nwere na Chineke ga-emezu nkwa niile o kwere anyị banyere ụwa ọhụrụ ya nke dị ebube. (1 Tesa. 5:8) Ọ bụrụ na anyị na-enwechi ọmụmụ ihe onwe onye anya ma na-amụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma, anyị ga-anọgide na-enwe olileanya ahụ.

Job diri ọnwụnwa niile Setan ji obi ịta mmiri nwaa ya. Job nwere okwukwe siri ike na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ, nke a mere ka ọ ghara ịtụ ọnwụ ụjọ. Kama nke ahụ, ọ gwara Jehova, sị: “Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Job 14:15) Ọ bụrụgodị na Job nwụọ n’ihi na ọ na-eguzosi ike n’akụkụ Jehova, obi siri ya ike na ịhụnanya Chineke nwere n’ebe ndị ohu ya nọ ga-eme ka ọ kpọlite ha n’ọnwụ.

Ka anyị nwee obi ike n’ebe ezi Chineke nọ, dị ka Job nwere. Jehova nwere ike imezi ihe ọ bụla Setan na ndị na-ejere ya ozi mere anyị. Chetakwa na Pọl mesiri anyị obi ike, sị: “Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ idi, kama mgbe ọnwụnwa bịara, ọ ga-emere unu ụzọ mgbapụ, ka unu wee nwee ike idi ya.”—1 Kọr. 10:13.

[Foto dị na peeji nke 20]

Ozi i ji obi gị niile na-ejere Jehova dị ya mma

[Foto dị na peeji nke 21]

Nara okpu agha bụ́ nzọpụta, kpurukwa ya