Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Bata n’Ụzọ Ndụ nke Kacha Mma!

Bata n’Ụzọ Ndụ nke Kacha Mma!

Bata n’Ụzọ Ndụ nke Kacha Mma!

“Ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.”—ROM 14:8.

1. Gịnị ka Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya banyere ụzọ ndụ nke kacha mma?

JEHOVA chọrọ ka anyị na-ebi ụdị ndụ nke ga-akacha eme ka anyị nwee obi ụtọ. Ndị mmadụ na-ebi ndụ n’ụzọ dị iche iche, ma, e nwere otu ụzọ kacha ụzọ ndị ahụ niile mma. Ụzọ kacha mma anyị ga-esi na-ebi ndụ bụ irube isi n’ihe Baịbụl kwuru nakwa iṅomi Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-efe Chineke n’ime mmụọ na n’eziokwu, o nyekwara ha iwu ka ha na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. (Mat. 28:19, 20; Jọn 4:24) Obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe Jizọs gwara anyị, Jehova ga-agọzikwa anyị.

2. Olee otú ọtụtụ ndị mmadụ si nabata ozi ọma Alaeze Chineke na narị afọ mbụ, gịnịkwa ka mmadụ iso “n’Ụzọ Ahụ” pụtara?

2 Ọ bụrụ na ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” aghọọ ndị Kraịst, e wee mee ha baptizim, anyị na-eji obi anyị niile asị ha, “Batanụ n’ụzọ ndụ nke kacha mma!” (Ọrụ 13:48) Na narị afọ mbụ nke Oge Anyị, ọtụtụ puku ndị mmadụ ndị si mba dị iche iche ghọrọ ndị Kraịst, e mekwara ha baptizim iji gosi ọha mmadụ na ha amalitela ife Chineke. (Ọrụ 2:41) Nke a mere ka ha soro “n’Ụzọ Ahụ.” (Ọrụ 9:2; 19:23) Ihe a a kpọrọ otú ha si efe Chineke kwesịrị ekwesị n’ihi na ndị ghọrọ ndị na-eso ụzọ Kraịst na-ebi ndụ otú gosiri na ha nwere okwukwe na Jizọs Kraịst nakwa na ha na-eṅomi ya.—1 Pita 2:21.

3. Gịnị mere e ji eme ndị ohu Jehova baptizim, mmadụ olekwa ka e merela baptizim kemgbe afọ iri gara aga?

3 Ọrụ anyị na-arụ iji mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aga n’ihu n’oge ikpeazụ a, a na-arụkwa ya n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. Kemgbe afọ iri gara aga, ihe karịrị nde mmadụ abụọ na narị puku asaa ekpebiela ife Jehova, e meekwa ha baptizim iji gosi na ha ararala onwe ha nye ya. Nke a na-egosi na a na-eme ihe dị ka puku mmadụ ise baptizim kwa izu! Anyị na-ahọrọ ka e mee anyị baptizim n’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya, marakwa ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ, nabatakwa ya. Baptizim dị anyị mkpa n’ihi na ọ bụ ya na-egosi na anyị na Jehova amalitela ịdị ná mma. Ọ na-egosikwa na obi siri anyị ike na ọ ga-eme ka anyị jiri okwukwe na-efe ya, dị ka o mere ka ndị ohu ya n’oge ochie jee ije n’ụzọ ya.—Aịza. 30:21.

Olee Ihe Mere A Ga-eji Mee Gị Baptizim?

4, 5. Kwuo ụfọdụ n’ime ngọzi onye e mere baptizim na-enweta, nakwa uru ndị ọ na-erite.

4 E nwere ike ya abụrụ na ị mụtala banyere Chineke, gbanwee ndụ gị wee bụrụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. Nke a dị nnọọ mma. Ma, ì kpekuola Chineke ekpere wee rara onwe gị nye ya? Ì dị njikere ka e mee gị baptizim? Kemgbe ị na-amụ Baịbụl, o nwere ike ịbụ na ị marala ugbu a na ihe ị ga-eji ndụ gị eme bụ ito Jehova, ọ bụghị ime ihe ị na-achọ ma ọ bụkwanụ ịchụ akụnụba. (Gụọ Abụ Ọma 148:11-13; Luk 12:15) Ya mere, olee ụfọdụ n’ime ngọzi onye e mere baptizim na-enweta, oleekwa uru ndị ọ na-erite?

5 Ndụ gị ga-enwe nnọọ isi ma ọ bụrụ na ị rara onwe gị nye Jehova. Ị ga-enwe obi ụtọ n’ihi na ị na-eme uche Chineke. (Rom 12:1, 2) Mmụọ nsọ Jehova ga-eme ka i nwee àgwà dị iche iche ndị na-amasị Chineke, ya bụ, àgwà ndị dị ka udo na okwukwe. (Gal. 5:22, 23) Chineke ga-aza ekpere gị ma gọzie mbọ ị na-agba ime ihe dị n’Okwu ya. Ozi ị na-ejere ya ga na-enye gị ọṅụ, obi ga-esikwa gị ike na ị ga-adị ndụ ebighị ebi ma ọ bụrụ na otú i si ebi ndụ dị Chineke mma. Ihe ọzọkwa bụ na ọ bụrụ na ị rara onwe gị nye Chineke, e meekwa gị baptizim, ị na-egosi na ị chọrọ ịbụ Onyeàmà Jehova n’eziokwu.—Aịza. 43:10-12.

6. Gịnị ka baptizim e mere anyị na-egosi?

6 Anyị na-eme ka onye ọ bụla mara na anyị bụ nke Jehova ma ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye ya, e wee mee anyị baptizim. Pọl onyeozi dere, sị: “N’eziokwu, ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị dị ndụ maka onwe ya naanị, ọ dịghịkwa onye nwụrụ anwụ maka onwe ya naanị; n’ihi na ọ bụrụ na anyị dị ndụ, anyị dị ndụ maka Jehova, ọ bụrụkwa na anyị nwụrụ anwụ, anyị nwụrụ maka Jehova. Ya mere, ma ànyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị bụ nke Jehova.” (Rom 14:7, 8) Chineke gosiri na ya na-akwanyere anyị ùgwù site n’ike anyị otú anyị ga-enwere onwe anyị ịhọrọ ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. N’ihi na anyị hụrụ Chineke n’anya, anyị ga-eme ka obi ya ṅụrịa ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ iso ụzọ ndụ nke kacha mma. (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na e mee anyị baptizim, anyị na-egosi na anyị ararala onwe anyị nye Chineke, gosikwa ọha mmadụ na ọ bụ ya na-achị anyị. Ọ pụtakwara na anyị kwenyesiri ike na ọ bụ ya kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. (Ọrụ 5:29, 32) Jehova ga-anọnyekwara anyị. (Gụọ Abụ Ọma 118:6.) Baptizim na-emekwa ka anyị nwee ike inweta ọtụtụ ngọzi ndị ọzọ n’aka Jehova ugbu a nakwa n’ọdịnihu.

Ụmụnna Ha Hụrụ Ha n’Anya

7-9. (a) Olee otú Jizọs si mesie ndị hapụrụ ihe niile wee soro ya obi ike? (b) Olee otú nkwa Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya nke e dere na Mak 10:29, 30 si na-emezu?

7 Pita onyeozi gwara Jizọs, sị: “Lee! Anyị ahapụwo ihe niile, soro gị; gịnịkwanụ ka anyị ga-enweta?” (Mat. 19:27) Pita chọrọ ịma otú ọdịnihu ya na nke ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ga-adị. Ha hapụrụ ọtụtụ ihe dị ha mkpa ha na-eme ka ha wee jiri ike ha niile na-ekwusa ozi ọma Alaeze. (Mat. 4:18-22) Olee ihe Jizọs gwara ha iji mesie ha obi ike?

8 Mak dere banyere otu ihe a Matiu dere wee sị na Jizọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ga-enwe ọtụtụ ụmụnna. Ọ sịrị: “Ọ dịghị onye hapụrụ ụlọ ma ọ bụ ụmụnne ndị ikom ma ọ bụ ụmụnne ndị inyom ma ọ bụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ ụmụ ma ọ bụ ubi n’ihi m nakwa n’ihi ozi ọma ahụ, nke na-agaghị enweta ugbu a, n’ime oge a, okpukpu otu narị ụlọ na ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne na ụmụ na ubi, tinyere mkpagbu, nwetakwa ndụ ebighị ebi n’usoro ihe na-abịanụ.” (Mak 10:29, 30) Ndị Kraịst oge ochie, ndị dị ka Lidia, Akwịla, Prisila, na Geyọs, so ná ndị mere ka ụmụnna ha nweta “ụlọ,” ha ghọkwaara ha “ụmụnne ndị ikom na ụmụnne ndị inyom na nne,” dị ka Jizọs kwere ndị na-eso ụzọ ya ná nkwa.—Ọrụ 16:14, 15; 18:2-4; 3 Jọn 1, 5-8.

9 Ihe a Jizọs kwuru kacha emezu taa. “Ubi” ahụ ndị na-eso ụzọ ya na-ahapụ bụ ihe ọ bụla ha ji akpata ihe ha na-eri, bụ́ nke ndị ozi ala ọzọ, ndị Betel, ndị na-eje ozi ná mba ọzọ, na ndị ọzọ, na-eji obi ha niile ahapụ ka ha wee nwee ike ije ozi Alaeze ná mba dị iche iche. Ọtụtụ ụmụnna anyị na-ahapụ ụlọ ha wee malite ibi ndụ dị ala karịa ndụ ha na-ebi n’ụlọ ha. Anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ ma ha kọọrọ anyị otú ozi ha si na-aga, bụ́ nke na-egosi na Jehova ahapụghị ha nakwa na ozi ha na-eme ha obi ụtọ. (Ọrụ 20:35) Ụmụnna bụ́ ndị nọ ebe niile n’ụwa, ya bụ, ndị niile e mere baptizim bụ́ ndị ohu Jehova, ga-enweta ngọzi n’ihi na ha “na-achọ alaeze ahụ na ezi omume Chineke.”—Mat. 6:33.

Ahụ́ Ga-eru Onye Nọ “n’Ebe Nzuzo” nke Chineke Ala

10, 11. Gịnị bụ ‘ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu,’ oleekwa otú anyị nwere ike isi biri na ya?

10 Mmadụ ịrara onwe ya nye Jehova, e meekwa ya baptizim, na-eme ka onye ahụ nweta ngọzi ọzọ magburu onwe ya, ya bụ, ihe ùgwù nke ibi “n’ebe nzuzo nke Onye Kasị Elu.” (Gụọ Abụ Ọma 91:1.) Nke a bụ ebe ihe atụ a na-echebe anyị, obi eruo anyị ala ife Jehova. Ọ bụ ‘ebe nzuzo’ n’ihi na ndị na-anaghị ele ihe anya otú Chineke si ele ihe anya, nakwa ndị na-atụkwasịghị ya obi, amaghị banyere ya. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ otú na-egosi na anyị ararala onwe anyị nye Jehova wee tụkwasị ya obi anyị dum, anyị na-agwa Jehova, sị: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike, Chineke m, onye m ga-atụkwasị obi.” (Ọma 91:2) Jehova Chineke bụụrụ anyị ebe ọ ga-abụ anyị biri ahụ́ eruo anyị ala. (Ọma 91:9) Ò nwere ebe ọzọ ga-aka ya mma?

11 Anyị na Jehova ga-adịkwa n’ezigbo mma ma ọ bụrụ na anyị ebiri “n’ebe nzuzo” ya. Nke a na-amalite mgbe anyị raara onwe anyị nye ya, e meekwa anyị baptizim. Ka oge na-aga, adịm ná mma anyị na Chineke ga-esikwu ike ma anyị na-abịaru ya nso site n’ịmụ Baịbụl, ikpe ekpere si anyị n’ala ala obi, nakwa site n’irubere ya isi n’ihe niile. (Jems 4:8) O nweghị onye ya na Jehova dị ná mma karịa Jizọs, bụ́ onye tụkwasịrị nnọọ Onye Okike obi. (Jọn 8:29) Ya mere, ka anyị tụkwasị Jehova obi, nweekwa obi ike na ọ ga-enyere anyị aka ime ihe anyị kwere ná nkwa mgbe anyị raara onwe anyị nye ya na anyị ga na-eme uche ya. (Ekli. 5:4) Ndokwa dị iche iche Chineke meere ndị ya na-egosi na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu nakwa na ọ chọrọ ka ihe gaziere anyị ná mbọ anyị na-agba ife ya.

Jiri Paradaịs Ime Mmụọ Anyị Kpọrọ Ihe

12, 13. (a) Gịnị bụ paradaịs ime mmụọ? (b) Olee otú anyị ga-esi nyere ndị ọhụrụ aka?

12 Anyị ga-ebikwa na paradaịs ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye Jehova, e meekwa anyị baptizim. Ọ bụ ebe pụrụ iche anyị na ụmụnna anyị bi, bụ́ ndị ha na ibe ha nakwa Jehova Chineke dị ná mma. (Ọma 29:11; Aịza. 54:13) Ọ dịghị ihe dị n’ụwa, bụ́ nke e nwere ike iji tụnyere paradaịs ime mmụọ anyị bi na ya. Nke a na-apụtakarị ìhè ma anyị gaa mgbakọ mba niile, bụ́ ebe ụmụnna anyị ndị si ọtụtụ mba, ndị na-abụghị otu agbụrụ, ndị na-anaghị asụ otu asụsụ, na-anọ n’udo n’enweghị nsogbu n’ihi ịhụnanya ha nwere n’ebe ibe ha nọ.

13 Paradaịs ime mmụọ anyị bi na ya dị nnọọ iche n’ọnọdụ jọgburu onwe ya ndị ụwa nọ na ya taa. (Gụọ Aịzaya 65:13, 14.) Anyị nwere ihe ùgwù nke ịkpọ ndị ọzọ òkù ka ha bịa soro anyị biri na paradaịs ime mmụọ ma ọ bụrụ na anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụkwaara anyị ihe ùgwù inyere ndị ka batara ọhụrụ n’ọgbakọ aka ka ha mara otú e si ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na ndị okenye agwa anyị ka anyị nyere ndị ọhụrụ aka, anyị nwere ike inwe ụdị ihe ùgwù Akwịla na Prisila nwere mgbe ha ‘kọwaara Apọlọs ụzọ Chineke n’ụzọ ziri ezi karị.’—Ọrụ 18:24-26.

Na-eṅomi Jizọs

14, 15. Olee ezigbo ihe ndị mere anyị ga-eji na-eṅomi Jizọs?

14 O nwere ọtụtụ ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-eṅomi Jizọs. Jizọs na Nna ya biri n’eluigwe ọtụtụ nde afọ tupu ya abịa n’ụwa. (Ilu 8:22, 30) Mgbe ọ bịara n’ụwa, ọ maara na ụzọ ndụ kacha mma bụ ife Chineke na ịgbara eziokwu àmà. (Jọn 18:37) O doro Jizọs anya na ụzọ ọzọ enweghị isi nakwa na onye ọ bụla na-eso ụzọ ọzọ bụ onye anyaukwu nakwa onye na-amaghị ihe. Jizọs makwa na a ga-ele yanwa ule, gbuokwa ya. (Mat. 20:18, 19; Hib. 4:15) Ọ kụziiri anyị otú anyị ga-esi ṅomie ya wee kwesị ntụkwasị obi.

15 Ka abalị ole na ole gafere mgbe e mere Jizọs baptizim, Setan nwara ya ọnwụnwa ka o wee hapụ ụzọ kacha mma, ma, mbọ ahụ Setan gbara kụrụ afọ n’ala. (Mat. 4:1-11) Nke a na-akụziri anyị na anyị nwere ike iguzosi ike n’ezi ihe n’agbanyeghị ọnwụnwa Setan na-anwa anyị. O nwere ike ịbụ na ndị ọ ka na-anwa ọnwụnwa bụ ndị chọrọ ka e mee ha baptizim ma ọ bụkwanụ ndị nke e mere baptizim ọhụrụ. (1 Pita 5:8) E nwere ike iduhie ndị ezinụlọ anyị, ha amalite imegide anyị wee chee na ha na-emere anyị ihe ọma. Ma, ule dị otú a ga-enyere anyị aka ịmụta àgwà Ndị Kraịst, dị ka ịdị akọ na ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù mgbe anyị na-aza ha ajụjụ ma ọ bụkwanụ na-ezi ha ozi ọma. (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na anyị na-eme otú a, ndị na-ege anyị ntị nwere ike ịghọ Ndị Kraịst.—1 Tim. 4:16.

Nọgide n’Ụzọ Ndụ nke Kacha Mma!

16, 17. (a) Olee ụzọ ihe atọ dị mkpa dị na Diuterọnọmi 30:19, 20, bụ́ ndị anyị kwesịrị ime ka anyị wee dị ndụ? (b) Olee otú Jizọs, Jọn, na Pọl si kwado ihe ahụ Mozis dere?

16 Ihe dị ka otu puku afọ na narị afọ ise tupu Jizọs abịa n’ụwa, Mozis gbara ụmụ Izrel ume ka ha họrọ ụzọ kacha mma n’oge ahụ. Ọ sịrị: “Eluigwe na ụwa bụ ndị akaebe m megide unu taa, na edebewo m ndụ na ọnwụ n’ihu unu, ngọzi na nkọcha; ị ga-ahọrọkwa ndụ ka i wee dịrị ndụ, gị na ụmụ gị, site n’ịhụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya, site n’ige ntị n’olu ya na site n’ịrapara ya n’ahụ́.” (Diut. 30:19, 20) Ụmụ Izrel erubereghị Chineke isi, ma, ụzọ ihe atọ dị mkpa Mozis kwuru na ha kwesịrị ime ka ha wee dị ndụ agbanwebeghị. Jizọs na ndị ọzọ kwughachiri ha.

17 Nke mbụ, ‘anyị ga-ahụ Jehova bụ́ Chineke anyị n’anya.’ Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe kwekọrọ n’ụzọ ya nke bụ́ ụzọ ezi omume, anyị na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya. (Mat. 22:37) Nke abụọ, ‘anyị ga-ege Jehova ntị’ site n’ịmụ Baịbụl nakwa site n’irube isi n’iwu ya. (1 Jọn 5:3) Nke a pụtara na anyị ga na-abịachi ọmụmụ ihe anya, bụ́ ebe a na-amụ Baịbụl. (Hib. 10:23-25) Nke atọ, ‘anyị ga-arapara Jehova n’ahụ́.’ Ka anyị nwee okwukwe na Chineke mgbe niile ma na-eso Ọkpara ya n’agbanyeghị ọnwụnwa ọ bụla na-abịara anyị.—2 Kọr. 4:16-18.

18. (a) N’afọ 1914, olee otú Ụlọ Nche si kọwaa eziokwu dị na Baịbụl? (b) Taa, olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ìhè nke eziokwu ahụ anya?

18 Anyị na-enweta ngọzi dị ukwuu ma anyị na-ebi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’eziokwu dị na Baịbụl. N’afọ 1914, e dere okwu a dị mkpa n’Ụlọ Nche Bekee, sị: “Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị a gọziri agọzi, ndị nwere obi ụtọ? Ọ̀ bụ na Chineke anyị abụghị onye kwesịrị ntụkwasị obi? Ọ bụrụ na onye ọ bụla maara ihe dị mma karị nke a, ya nara ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu achọta ihe dị mma karị nke a, anyị nwere olileanya na unu ga-agwa anyị. Anyị amaghị ihe ọ bụla dị mma karị nke a, ma ọ bụ ihe dị mma ruo ọkara nke ihe anyị chọtaworo n’ime Okwu nke Chineke. . . . Ọ dịghị ire ma ọ bụ mkpịsị akwụkwọ nke pụrụ ịkọ ụdị udo, ọṅụ, na ngọzi ndị ihe ọmụma doro anya nke ezi Chineke ahụ webataworo n’ime obi anyị na n’ime ndụ anyị. Akụkọ nke Amamihe, Ikpe Ziri Ezi, Ike, na Ịhụnanya nke Chineke na-enyezu ọchịchọ nile nke ma uche ma obi anyị afọ ojuju. Ọ dịghị ihe ọzọ anyị na-achọ. Ọ dịghị ihe e kwesịrị ịchọ karịa inweta Akụkọ nke a dị ebube n’ụzọ doro anya n’uche anyị.” (Ụlọ Nche, [Bekee] nke December 15, 1914, peeji nke 377-378) Anyị ka na-ekele Chineke ruo taa maka ime ka anyị na-enweta ìhè ime mmụọ, nakwa maka ime ka anyị mara eziokwu ya. N’ezie, anyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-enwekwu ọṅụ ugbu a maka na anyị na-eje “ije n’ìhè Jehova.”—Aịza. 2:5; Ọma 43:3; Ilu 4:18.

19. Gịnị mere ndị ruru eru ka e mee ha baptizim ji kwesị ikpebi ozugbo ka e mee ha baptizim?

19 Ọ bụrụ na ị chọrọ ije “ije n’ìhè Jehova” ma ị rarabeghị onwe gị nye ya, e meekwa gị baptizim, megharịa ahụ́. Mee ihe ọ bụla i kwesịrị ime ka i wee ruo eru ka e mee gị baptizim. Nke a bụ ụzọ pụrụ iche anyị ga-esi kelee Chineke na Kraịst maka ihe ha meere anyị. Nye Jehova ihe kacha ihe niile i nwere mkpa, ya bụ, ndụ gị. Gosi na ị chọrọ ime uche Chineke site n’iso Ọkpara ya. (2 Kọr. 5:14, 15) Obi abụọ adịghị ya na nke a bụ ụzọ ndụ nke kacha mma!

Olee Ihe Ị Ga-aza?

• Gịnị ka baptizim e mere anyị pụtara?

• Olee ngọzi ndị anyị ga-enweta ma ọ bụrụ na anyị arara onwe anyị nye Chineke, e meekwa anyị baptizim?

• Gịnị mere iṅomi Jizọs ji dị oké mkpa?

• Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide n’ụzọ ndụ nke kacha mma?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 25]

Baptizim e mere gị na-egosi na ị họrọla ụzọ ndụ nke kacha mma

[Foto ndị dị na peeji nke 26]

Ahụ́ ò ruru gị ala “n’ebe nzuzo” nke Chineke?