Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Icheta Onye Kere Ha

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Icheta Onye Kere Ha

Ihe Ga-enyere Ndị Na-eto Eto Aka Icheta Onye Kere Ha

IHE dị ka puku afọ atọ gara aga, otu nwoke maara ihe aha ya bụ Sọlọmọn dere, sị: “Cheta Onye Okike Ukwu gị n’oge ị bụ okorobịa.” (Ekli. 12:1) Ndị Kraịst na-eto eto enweela ihe ọzọ ga-enyere ha aka ime nke a. E wepụtara akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2, ná Mgbakọ Distrikti “Ndị Mmụọ Chineke Na-edu” nke Ndịàmà Jehova, bụ́ nke e nwere n’ụwa niile malite n’ọnwa May 2008 ruo January 2009.

E nwere akwụkwọ ozi Òtù Na-achị Isi deere ndị na-eto eto n’ime mkpo akwụkwọ ahụ. Ihe ụfọdụ e dere na ya bụ: “Anyị na-ekpesi ekpere ike ka ihe e kwuru n’akwụkwọ a nyere gị aka imeri nsogbu na ọnwụnwa ndị na-abịara ndị na-eto eto taa, gosikwa gị otú ị ga-esi na-eme mkpebi ndị dabara n’uche Chineke.”

Ndị nne na nna kwesịrị ịzụlite ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Efe. 6:4) Mgbe ndị na-eto eto gafere afọ iri, ha anaghị ama ihe ha ga-eme eme, ha na-achọkwa onye ga na-eduzi ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nwa gị ka na-eto eto, olee otú i nwere ike isi nyere ya aka irite uru n’akwụkwọ a? E dere ihe ụfọdụ ga-enyere unu aka n’ebe a.

Nweta akwụkwọ nke gị ma mara ihe dị n’ime ya nke ọma. Nke a karịrị naanị ịgụ ya agụ. Gbalịa ghọta otú e si kọwaa ihe ndị dị n’ime ya. Ihe akwụkwọ a na-eme abụghị naanị ịgwa ndị na-eto eto ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi, kama ọ na-azụ “ikike nghọta” ha. (Hib. 5:14) Ọ na-agwakwa ha otú ha ga-esi nwee ike ịna-eme ihe ziri ezi. Dị ka ihe atụ, Isi nke iri na ise, (nke isiokwu ya bụ “Olee Otú M Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ M Na-enye M?”) gwara ndị na-eto eto otú ha ga-esi mee ihe karịrị ịjụ ime ihe ndị ọgbọ ha gwara ha. O kwuru ihe dabeere na Baịbụl nke ga-enyere ha aka ịma otú ha ga-esi “azaghachi onye ọ bụla.”—Kọl. 4:6.

Na-atụle ebe ahụ e dere n’ụdị mkparịta ụka n’akwụkwọ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ndị na-eto eto ka e bu n’uche dee ebe a, i nwere ike ide ihe n’ebe kwesịrị ekwesị n’akwụkwọ nke gị. * Dị ka ihe atụ, mgbe ị na-atụle ajụjụ abụọ ahụ a jụrụ banyere mgbe nwoke na nwaanyị kwesịrị ịmalite ịkpa ka ha wee lụọ, bụ́ ndị dị na peeji nke iri na isii, gbalịa ma ị̀ ga-echeta otú ọ dị gị mgbe ị ha ka nwa gị. Ikekwe, ị ga-achọ ide ihe ndị ị gaara aza mgbe ahụ n’ajụjụ ndị a jụrụ ebe ahụ. I nweziri ike ịjụ onwe gị, sị: ‘Oleezi ihe m na-eche banyere nke a ugbu a? Olee ihe ndị m mụtarala kemgbe ahụ, oleekwa otú m nwere ike isi kụziere ya nwa m?’

Etinyela anya n’ihe ndị dịịrị ụmụ gị ndị na-eto eto. Ihe e ji dee ebe ahụ e dere n’ụdị mkparịta ụka bụ iji nyere nwa gị aka ikwu uche ya, ma ò dere ya ede ma ò kwuru ya n’ime obi ya. I kwesịrị ịgbalị ka ị mara ihe dị ya n’obi, ọ bụghị ihe o dere n’akwụkwọ. Na peeji nke atọ nke isiokwu ya bụ “Ihe Ndị Nne na Nna Ga-eburu n’Obi,” a gwara ndị nne na nna, sị: “Ka ụmụ gị nwee ike ide ihe bụ́ eziokwu n’akwụkwọ nke ha, hapụrụ ha nke ha. E mechaa, ha nwere ike ịkọrọ gị ihe ha dere.”

Akwụkwọ E Ji Enwe Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ

Akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 2, bụ akwụkwọ dị mma e ji enwe Ofufe Ezinụlọ. Olee otú a ga-esi jiri ya na-amụ ihe ebe ọ na-enweghị ajụjụ maka paragraf ndị dị na ya? Leenụ ma ùnu ga-eji akwụkwọ ahụ na-amụ ihe otú ga-aka abara ụmụ unu uru?

Dị ka ihe atụ, ezinụlọ ụfọdụ na-eji oge ha na-atụle “Ihe M Ga-eme Ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu,” nke dị na peeji nke 132-133, amụgharị ihe. Ajụjụ nke mbụ e dere ebe ahụ nwere ike inyere nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị aka ịmata ihe ndị kacha esiri ya ike. Ajụjụ nke abụọ na-egosi mgbe nsogbu ahụ nwere ike ịbịara ya. Mgbe unu tụlechara ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na o kwe ka ndị ọgbọ ya nweta ya ma ọ bụ ghara inweta ya, gwa nwa gị ka o chee ihe ọ ga-aza, dị ka ikweta ihe ha kwuru, ime ka ọ bụghị ya ka a na-agwa, ma ọ bụ ịgwa ha ihe ga-eru ha n’ahụ́. Nyere nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị aka ịkwadebe ihe ọ ga-aza nke ga-eme ya obi ụtọ nakwa nke ọ ga-akata obi zaa.—Ọma 119:46.

Akwụkwọ E Ji Enwe Mkparịta Ụka

Akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 2 na-agba ndị na-eto eto ume ka ha na ndị mụrụ ha na-akparịta ụka. Dị ka ihe atụ, igbe ndị bụ́ “Olee Otú M Ga-esi Agwa Papa M Ma Ọ Bụ Mama M Okwu Gbasara Mmekọahụ?” (peeji nke 63-64) na “Gị na Papa Gị na Mama Gị Kwurịta Ya!” (peeji nke 189) tụrụ aro otú e nwere ike isi kwurịta okwu ndị na-ara ahụ́ okwukwu. Otu nwa agbọghọ nke dị afọ iri na atọ dere, sị, “Akwụkwọ a mere ka m kata obi gwa ndị mụrụ m ihe na-enye m nsogbu n’obi, ọbụna ihe ndị m mere.”

E nwekwara otú ọzọ akwụkwọ a si eme ka unu nwee ike ikwurịta okwu. E nwere igbe nke isiokwu ya bụ “Gịnị Ka I Chere?” ná ngwụcha isiokwu nke ọ bụla. Ọ bụghị naanị ntụleghachi ka a ga-eji ya eme, ezinụlọ nwere ike iji ya amụ ihe. Tupu gị eruo ná ngwụcha nke isiokwu ọ bụla, e nwekwara igbe isiokwu ya bụ “Ihe M Ga-eme!” Igbe a nyere ndị na-eto eto ohere ide otú ụfọdụ ha ga-achọ isi na-eme ihe ha mụtara n’isiokwu igbe ahụ dị na ya. Ihe ikpeazụ nke e dere n’igbe ahụ bụ́ “Ihe M Ga-eme!” kwuru, sị: “Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama banyere okwu a bụ . . . ” Nke a ga-eme ka ndị na-eto eto gakwuru nne ha na nna ha maka nduzi.

Gwa Ha Ihe Ga-eru Ha n’Obi!

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ihe i kwesịrị ibu n’obi bụ ịgwa nwa gị okwu ga na-eru ya n’obi. Akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Nke 2 nwere ike inyere gị aka ime nke a. Tụlee otú akwụkwọ a si mee ka otu nna na nwa ya nwaanyị nwee ike na-akparịta ụka nke ọma.

“Mụ na Ribeka nwere ebe ndị na-amasị anyị ịga. Anyị na-eji ụkwụ, ígwè ma ọ bụ ụgbọala aga ebe ndị ahụ mgbe ụfọdụ. Ọ na-adịrị ya mfe ịgwa m ihe dị ya n’obi n’oge ndị a.

“Ihe mbụ anyị tụlere n’akwụkwọ a bụ akwụkwọ ozi Òtù Na-achị Isi dere na ‘Ihe Ndị Nne na Nna Ga-eburu n’Obi.’ Achọrọ m ka nwa m nwaanyị mara na, dị ka e kwuru na peeji nke atọ, o nweere onwe ya ide ihe ọ bụla masịrị ya n’akwụkwọ ya. M naghị elenye anya n’akwụkwọ ya iji mara ihe o dere.

“M hapụrụ Ribeka ka ọ họrọ isiokwu ndị ọ ga-achọ ka anyị kwurịta na mgbe ọ ga-achọ ka anyị kwurịta nke ọ bụla. Otu n’ime isiokwu ndị mbụ ọ họọrọ bụ ‘M̀ Kwesịrị Igwu Egwuregwu Kọmputa?’ Amaghị m na ọ bụ nke ahụ ka ọ ga-ahọrọ! Ma, e nwere ihe mere o ji họrọ ya. E nwere otu egwuregwu kọmputa jọgburu onwe ya ọtụtụ ndị enyi ya na-egwu. Amaghị m na ime ihe ike na okwu rụrụ arụ juru na ya! Ma, amatara m ihe a niile mgbe anyị tụlere “Ihe M Ga-eme!” nke dị na peeji nke 251. Igbe ahụ nyekwaara Ribeka aka ịkwadebe ihe ọ ga-eme ma mmadụ chọọ ka o gwuo egwuregwu kọmputa.

“Mgbe anyị tụlere nke a, Ribeka malitere ịgwa m ihe o dere n’akwụkwọ ya. Anyị na-akparịta ụka ruo ogologo oge. Anyị na-eme onye gụọ ibe ya agụọ, ka anyị na-akparịta ụka na-aga, ọ na-enu ya enu ikwu banyere ihe niile, gụnyere foto na igbe ndị dị n’akwụkwọ ahụ. Nke a na-enye m ohere ịkọrọ ya otú ọ dị m mgbe m ha ka ya, ya akọziere m ụdị ihe ha na ya na-eje taa. Ọ na-akọrọ m ihe niile!”

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, o doro anya na obi tọrọ gị ụtọ mgbe e wepụtara akwụkwọ a. Ugbu a, i nwere ohere iji ya nyere ụmụ gị aka. Òtù Na-achị Isi chọrọ ka akwụkwọ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2 baara ezinụlọ gị uru. Ka akwụkwọ a nyere unu niile aka, karịchaa, ndị na-eto eto anyị hụrụ n’anya, ‘ije ije site na mmụọ nsọ.’—Gal. 5:16.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 6 Ụfọdụ ebe ndị e dere n’ụdị mkparịta ụka n’akwụkwọ ahụ ga-abara onye ọ bụla uru. Dị ka ihe atụ, igbe bụ́ “Na-achị Iwe Gị,” bụ́ nke dị na peeji nke 221, nwere ike ịbara gị uru otú ọ ga-esi abara nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị. Isiokwu ndị bụ́ “Ihe M Ga-eme Ma Ndị Ọgbọ M Nyewe M Nsogbu” (peeji nke 132-133), “Otú M Ga-esi Na-emefu Ego M Kwa Ọnwa” (peeji nke 163), na “Ihe Mgbaru Ọsọ M” (peeji nke 314) nwekwara ike inye aka.

[Igbe dị na peeji nke 30]

Ihe Ndị Na-eto Eto Ụfọdụ Kwuru

“Ihe a bụ akwụkwọ i kwesịrị iwere mkpịsị akwụkwọ nọdụ ala gụọ nke ọma ma chebara ihe ị na-agụ echiche. Na e mere ya otú mmadụ ga na-ede ihe masịrị ya kwa ụbọchị na-eme ka mmadụ chebara ihe dị na ya echiche iji wee nwee ike ibi ndụ kacha mma.” —Nikọla.

“E nwere ọtụtụ ndị na-enye m nsogbu, gụnyere ndị enyi m, ka m nwee nwoke mụ na ya na-akpa. Nkebi nke mbụ nke akwụkwọ a mere ka o dokwuo mụ anya na n’agbanyeghị ihe onye ọ bụla na-ekwu, adịbeghị m njikere mụ na nwoke ịkpawa.”—Katrina.

“Igbe bụ́ ‘Ị̀ Na-eche Echiche Ka E Mee Gị Baptizim?’ enyerela m aka iji baptizim e mere m kpọrọkwuo ihe. O meela ka m chebakwuoro otú m si  amụ ihe na otú m si ekpe ekpere echiche.”—Ashli.

“N’agbanyeghị na ndị mụrụ m, bụ́ Ndị Kraịst, malitere mgbe m dị obere na-akụziri m ihe, akwụkwọ a enyerela m aka iche ihe m ga-eme ná ndụ m. O meela ka m nwee ike na-akọrọ ndị mụrụ m kpọmkwem ihe ndị mụ na ha na-alụ.”—Zamira.

[Foto dị na peeji nke 31]

Ndị nne na nna, mụọnụ akwụkwọ a nke ọma

[Foto dị na peeji nke 32]

Gbalịa na-agwa nwa gị okwu otú ọ ga-eru ya n’obi