Jiri “Mma Agha Nke Mmụọ Nsọ” Na-arụ Ọrụ Nke Ọma
Jiri “Mma Agha Nke Mmụọ Nsọ” Na-arụ Ọrụ Nke Ọma
“Narakwanụ . . . mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke.”—EFE. 6:17.
1, 2. Olee ihe anyị kwesịrị ime maka na a chọkwuru ndị nkwusa Alaeze?
MGBE Jizọs hụrụ ìgwè mmadụ ndị e kwesịrị ịkụziri okwu Chineke, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” Jizọs mere ihe banyere nke a. Mgbe ọ gwachara ndị na-eso ụzọ ya okwu a, “ọ kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya” ma zipụ ha ka ha gaa kwusaa ozi ọma, ma ọ bụ ka ha gaa ‘wee ihe ubi.’ (Mat. 9:35-38; 10:1, 5) Jizọs mechara ‘họpụta mmadụ iri asaa ọzọ ma zipụ ha abụọ abụọ’ ka ha gaakwa kwusaa ozi ọma.—Luk 10:1, 2.
2 A chọkwukwara ndị nkwusa Alaeze taa. Ndị bịara Ncheta Ọnwụ Jizọs n’afọ 2009 n’ụwa niile dị nde iri na asatọ, otu narị puku na iri isii na asatọ na narị mmadụ atọ na iri abụọ na atọ. O ji ihe karịrị nde iri karịa ọnụ ọgụgụ Ndịàmà Jehova e nwere n’ụwa niile. N’ezie, ihe ubi a ga-ewe hiri nne. (Jọn 4:34, 35) N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpeku Chineke ekpere ka o zitekwuo ndị ọrụ. Ma, olee otú anyị nwere ike isi mee ihe kwekọrọ n’ihe anyị na-ekpe n’ekpere? Anyị ga-eme nke a site n’ịma otú e si ezi ozi ọma nke ọma ka anyị ji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ma na-eme ndị na-eso ụzọ.—Mat. 28:19, 20; Mak 13:10.
3. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si enyere anyị aka ịma otú e si ezi ozi ọma nke ọma?
3 N’isiokwu bu nke a ụzọ, a tụlere otú mmụọ nsọ Chineke si enyere anyị aka ka anyị ‘na-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu.’ (Ọrụ 4:31) Mmụọ nsọ nwekwara ike inyere anyị aka ịma otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma nke ọma. Otu n’ime ihe ndị ga-enyere anyị aka izi ozi ọma nke ọma bụ iji ezigbo ngwá ọrụ Jehova Chineke nyere anyị, ya bụ, Okwu ya e dere ede bụ́ Baịbụl, na-ezi ozi ọma nke ọma. E dere ya n’ike mmụọ nsọ. (2 Tim. 3:16) Ihe dị n’ime ya si n’aka Chineke. N’ihi ya, ọ bụ mmụọ nsọ na-eduzi anyị mgbe anyị na-akọwa eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Tupu anyị atụlewe otú anyị ga-esi eme nke a, ka anyị buru ụzọ tụlee otú Okwu Chineke si akpa ike.
‘Okwu Chineke Na-akpa Ike’
4. Olee otú okwu Chineke nke e dere na Baịbụl nwere ike isi gbanwee mmadụ?
4 Okwu Chineke na-akpa ike n’ezie! (Hib. 4:12) Ihe e dere na Baịbụl dị nkọ karịa mma agha ọ bụla mmadụ kpụrụ, n’ihi na ọ na-aba n’ime ruo n’ikewa ọkpụkpụ na ụmị ha. Eziokwu nke sitere n’Akwụkwọ Nsọ na-abami n’ime mmadụ na n’uche ya wee mee ka a mara ụdị onye onye ahụ bụ. Eziokwu ahụ nwere ike ịkpa ike n’ahụ́ mmadụ ma mee ka onye ahụ gbanwee. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:10.) N’ezie, Okwu Chineke nwere ike ịgbanwe ndụ!
5. Olee otú Baịbụl nwere ike isi duzie anyị, gịnịkwa nwere ike isi na ya pụta?
5 Ihe ọzọkwa bụ na amamihe dị na Baịbụl enweghị atụ. Ihe e dere n’ime ya nwere ike inyere mmadụ aka ịma otú ọ ga-esi na-ebi ndụ n’ime ụwa a siri ike obibi. Ọ bụghị naanị ụkwụ anyị ka Okwu Chineke na-enye ìhè, kama, ọ na-emekwa ka ìhè na-enwu n’okporo ụzọ anyị. (Ọma 119:105) Ọ na-enyere anyị aka nke ukwuu ịma ihe anyị ga-eme mgbe anyị nwere nsogbu ma ọ bụ mgbe anyị chọrọ ịhọrọ ndị anyị na ha ga-abụ enyi, ma ọ bụkwanụ mgbe anyị chọrọ ịma ụdị ihe anyị ga-eji na-atụrụ ndụ, ụdị ọrụ anyị ga-arụ, ụdị uwe anyị ga-eyi, na ihe ndị ọzọ. (Ọma 37:25; Ilu 13:20; Jọn 15:14; 1 Tim. 2:9) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe e dere n’Okwu Chineke, ọ ga-eme ka anyị na ndị ọzọ nwee ike ịdị ná mma. (Mat. 7:12; Fil. 2:3, 4) Ọ bụrụ na anyị ekwere ka okwu Chineke na-enye ìhè n’okporo ụzọ anyị, anyị ga-enwe ike ịma ihe mkpebi ndị anyị na-achọ ime nwere ike ịpụtara anyị. (1 Tim. 6:9) Akwụkwọ Nsọ bukwara amụma ihe Chineke zubere maka ọdịnihu, nke a na-enyekwara anyị aka ime ihe kwekọrọ ná nzube ya. (Mat. 6:33; 1 Jọn 2:17, 18) N’ezie, mmadụ ga-enwe obi ụtọ nke ukwuu ná ndụ ma ọ bụrụ na ọ na-eme ihe Chineke kwuru.
6. Olee otú Baịbụl si bụrụ ngwá agha dị ike anyị ji alụ agha ime mmụọ?
6 Cheekwa otú Baịbụl si bụrụ ngwá agha dị ike nke anyị ji alụ agha ime mmụọ. Pọl kpọrọ okwu Chineke “mma agha nke mmụọ nsọ.” (Gụọ Ndị Efesọs 6:12, 17.) Ọ bụrụ na a kụziere ndị mmadụ ihe e dere na Baịbụl nke ọma, o nwere ike ime ka ha pụọ n’aka Setan. Ọ bụ mma agha nke na-azọpụta ndị mmadụ, ọ bụghị nke na-egbu ha egbu. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịgba mbọ mụta otú anyị ga-esi jiri ya na-arụ ọrụ nke ọma?
Na-ejizi Ya Ejizi
7. Olee ihe mere anyị ji kwesị ịmụta otú e si ejizi “mma agha nke mmụọ nsọ” ejizi?
7 Onye agha nwere ike iji ngwá agha ya na-alụ agha nke ọma naanị ma ọ bụrụ na ọ mụrụ otú e si eji ya alụ agha. Anyị kwesịrị ime nke a ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iji “mma agha nke mmụọ nsọ” na-alụ agha ime mmụọ nke ọma. Pọl dere, sị: “Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere, onye na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—2 Tim. 2:15.
8, 9. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu? Nye ihe atụ.
8 Olee ihe ga-enyere anyị aka ‘ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ mgbe anyị na-ezi ozi ọma? Anyị kwesịrị ibu ụzọ mụta ihe dị na Baịbụl tupu anyị enwee ike ịkụziri ya ndị ọzọ nke ọma. Nke a pụtara na anyị kwesịrị ichebara ihe e kwuru n’amaokwu ndị bu amaokwu anyị gụrụ ụzọ echiche, chebakwara ndị nke na-eso ya.
9 Anyị ga-aghọta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị anyị gụrụ ma ọ bụrụ na anyị echebara amaokwu ndị bu ha ụzọ na ndị na-eso ha echiche. Ihe Pọl kwuru ná Ndị Galeshia 5:13 na-egosi na anyị kwesịrị ime nke a. O dere, sị: “Otú ọ dị, ụmụnna m, a kpọrọ unu ka unu nwere onwe unu; ma unu ejila nnwere onwe a mere ihe na-akpali anụ ahụ́, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu ohu.” Olee nnwere onwe Pọl na-ekwu okwu ya n’ebe a? Ọ̀ na-ekwu banyere mmadụ inwere onwe ya wee kwụsị ime mmehie, kwụsịkwa ịnwụ anwụ, ka ọ̀ bụ hapụ nkwenkwe ụgha, ka ọ̀ bụ ihe ọzọ? Ihe ndị Pọl bu ụzọ kwuo gosiri na ihe ọ na-ekwu okwu ya bụ otú anyị si nwere onwe anyị n’ihi na a tọhapụrụ anyị “n’ọbụbụ ọnụ nke Iwu ahụ.” (Gal. 3:13, 19-24; 4:1-5) Ọ na-ekwu banyere otú Ndị Kraịst si nwere onwe ha. Ndị ụdị nnwere onwe a mere obi ụtọ gbaara ibe ha ohu n’ihi na ha hụrụ ha n’anya. Ndị na-ahụghị ibe ha n’anya gbara ha asịrị, sesakwa ha okwu.—Gal. 5:15.
10. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịghọta Akwụkwọ Nsọ nke ọma, olee ihe ndị anyị kwesịrị iburu n’uche, oleekwa otú anyị ga-esi eme nke a?
10 E nwekwara ihe ọzọ ga-enyere anyị aka ịghọta amaokwu Baịbụl anyị gụrụ. Ha bụ ihe ndị ọzọ metụtara ihe ahụ a na-ekwu nakwa ihe mere e ji kwuo ya. Tupu anyị aghọta ihe amaokwu Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ọma, anyị kwesịrị ibu ụzọ ghọta ihe ndị ọzọ metụtara ihe ahụ a na-ekwu, nke gụnyere ịmata onye dere ya, mgbe e dere ya, na ihe mere mgbe e dere ya. Ọ ga-adịkwa mma ma anyị mata ihe mere e ji dee ya. Ọ bụrụ na ọ dị mfe, ọ ga-adị mma ka a mata otú ndị mmadụ si ebi ndụ mgbe e dere ya, nakwa omume ndị mmadụ na okpukpe ha na-ekpe mgbe ahụ.11. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ime mgbe anyị na-akọwa Akwụkwọ Nsọ?
11 ‘Ijizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi’ karịrị ịkọwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara iji Baịbụl gosi ndị mmadụ na ha amaghị nke a na-akọ. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike iji Baịbụl gosi ndị na-ege anyị ntị na ihe anyị na-ekwusa bụ eziokwu, dị ka Jizọs mere mgbe Ekwensu na-anwa ya ọnwụnwa, anyị ekwesịghị iji ya emenye ha ihere. (Diut. 6:16; 8:3; 10:20; Mat. 4:4, 7, 10) Anyị kwesịrị ime ihe Pita gwara anyị mee. Ọ sịrị: “Doonụ Kraịst nsọ dị ka Onyenwe anyị n’obi unu, dịrịnụ njikere mgbe niile ịzara ọnụ unu n’ihu onye ọ bụla nke na-ajụ unu ihe mere unu ji nwee olileanya ahụ unu nwere, ma jirinụ obi dị nwayọọ na nkwanye ùgwù dị ukwuu na-eme otú ahụ.”—1 Pita 3:15.
12, 13. Olee “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” Okwu Chineke nwere ike ịkụghasị? Nye ihe atụ.
12 Olee ihe eziokwu dị n’Okwu Chineke nwere ike ime ma ọ bụrụ na e kwusaa ya otú kwesịrị ekwesị? (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5.) Eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ nwere ike ịkụghasị “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike,” ya bụ, ọ na-eme ka a mara ozizi ụgha, omume rụrụ arụ, na nkà ihe ọmụma ndị si n’echiche nke mmadụ na-ezughị okè. Anyị nwere ike iji Baịbụl kụtuo “ihe ọ bụla dị elu nke na-emegide ihe ọmụma Chineke.” E nwere ike iji ozizi dị na Baịbụl nyere ndị ọzọ aka ma mee ka ha kwere ihe bụ́ eziokwu.
13 Were ihe banyere otu agadi nwaanyị dị afọ iri itoolu na atọ, onye bi n’India, dị ka ihe atụ. E si mgbe ọ bụ nwata kụziwere ya na mmadụ na-alọ ụwa. Mgbe ọ malitere ịmụ Baịbụl site n’akwụkwọ ozi nwa ya nwoke nọ na mba ọzọ na-edetara ya, o kweere ihe ọ na-amụta banyere Jehova na nkwa ndị o kwere. Ma, o kwenyesiri ike na mmadụ na-alọ ụwa nke na o kweghị ihe nwa ya nwoke kwuru mgbe o detaara ya akwụkwọ ma kọọrọ ya ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. Nwaanyị ahụ sịrị: “Ekweghị m na ihe dị na Baịbụl gị bụ eziokwu. Okpukpe niile na-akụzi na ọ dị ihe dị n’ime anyị nke na-anaghị anwụ anwụ. Ekwere m kemgbe ụwa na ahụ́ na-anwụ anwụ nakwa na e nwere ihe a na-anaghị ahụ anya nke na-alọ ụwa n’ahụ́ ọzọ ugboro ugboro ruo ihe dị ka nde ugboro asatọ na narị puku
anọ. Olee otú ị ga-esi na-agwa m ugbu a na ọ bụghị eziokwu? Ị̀ na-ekwu na okpukpe ndị ọzọ niile na-agha ụgha?” “Mma agha nke mmụọ nsọ” ò nwere ike ịkụghasị ihe a gbanyerela mgbọrọgwụ n’obi nwaanyị a? Mgbe e jichara Akwụkwọ Nsọ kọwaara ya isiokwu a, o mechara dee mgbe izu ole na ole gafere, sị: “Aghọtala m nke bụ́ eziokwu banyere ọnwụ. Ọ na-enye m ọṅụ dị ukwuu ịmara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, na anyị ga-ahụ ndị anyị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ. Ọ dị m ka Alaeze Chineke bịawa ọsọ ọsọ.”Jiri Ya Gwa Ndị Mmadụ Okwu Otú Ọ Ga-eru Ha n’Obi
14. Gịnị ka ikwu okwu n’ụzọ ga-eru ndị na-ege anyị ntị n’obi pụtara?
14 Mmadụ ịma otú e si eji Baịbụl ezi ozi ọma nke ọma karịrị ịgụpụta ihe dị n’ime ya. Pọl gwara ndị mmadụ okwu “n’ụzọ na-eru n’obi,” anyị kwesịkwara ime otú ahụ. (Gụọ Ọrụ 19:8, 9; 28:23.) Ikwu okwu “n’ụzọ na-eru n’obi” pụtara “ime ka mmadụ kweta ihe.” Ọ bụrụ na ihe a gwara mmadụ eruo ya n’obi ọ “ga-ekweta nnọọ ihe ahụ nke na ọ ga-atụkwasị ya obi.” Ọ bụrụ na anyị emee ka mmadụ kwere ozizi dị na Baịbụl, nke a ga-eme ka ọ tụkwasị ihe ahụ anyị kụziiri ya obi. Ka anyị wee nwee ike ime nke a, anyị kwesịrị ime ka ndị na-ege anyị ntị kweta na ihe anyị na-ekwu bụ eziokwu. Lekwa ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi mee nke a.
15. Olee otú i nwere ike isi jiri Baịbụl kụziere ndị na-ege gị ntị ihe otú ga-eme ka ha kwanyere ya ùgwù?
15 Jiri Okwu Chineke kụziere ndị mmadụ ihe otú ga-eme ka ha kwanyere ya ùgwù. Mgbe i kwuru ka unu gụọ Baịbụl, kwusie okwu ike banyere mkpa ọ dị ịma ihe bụ́ uche Chineke banyere ihe unu na-akparịta. Mgbe ị jụchara onye nwe ụlọ ajụjụ ya azaa ya, i nwere ike ikwu sị, ‘Ka anyị mara ihe bụ́ uche Chineke banyere okwu a.’ Ma ọ bụkwanụ, i nwere ike ịjụ sị, ‘Olee ihe Chineke kwuru banyere ihe a?’ Ọ bụrụ na i si otú a na-eme, ọ ga-edo ya anya na Baịbụl si n’aka Chineke, nyekwa aka mee ka o jiri Baịbụl kpọrọ ihe. Ọ kacha mkpa ime otú a mgbe anyị na-ezi onye kwere na Chineke ma ọ maghị ihe Baịbụl na-akụzi ozi ọma.—Ọma 19:7-10.
16. Gịnị ga-enyere gị aka ịkọwa Akwụkwọ Nsọ nke ọma?
16 Ị gụọ Akwụkwọ Nsọ, kọwaa ihe ị gụrụ. Ọ maara Pọl ahụ́ ‘ịkọwa ihe ọ na-akụzi ma jiri ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ’ gosi na ọ bụ eziokwu. (Ọrụ 17:3) Ihe otu amaokwu Akwụkwọ Nsọ pụtara nwere ike ịkarị otu, ọ dịkwa mkpa ka ị kọwaa ihe ụfọdụ dị na ya nke na-akwado ihe unu na-akparịta. I nwere ike ime nke a site n’ikwughachi okwu ndị ahụ kwadoro ihe ị na-ekwu ma ọ bụkwanụ site n’ịjụ onye nwe ụlọ ajụjụ ga-eme ka ọ mata okwu ndị ahụ kwadoro ihe ị na-ekwu. E mechaa, kọwaa ya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, nyere onye ahụ na-ege gị ntị aka ịhụ otú amaokwu ahụ si gbasa ya.
17. Olee otú i nwere ike isi jiri Akwụkwọ Nsọ gwa mmadụ okwu ya ekweta ihe ị gwara ya?
17 Kọwaa Akwụkwọ Nsọ otú ga-eme ka onye ị na-agwa okwu kweta ihe ị na-ekwu. Mgbe Pọl na ndị ọzọ nọ na-akparịta ụka, o ji ma arịrịọ ma okwu na-enweghị mgbagha mee ka ha ‘tụgharịa uche n’ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ.’ (Ọrụ 17:2, 4) Gbaa mbọ ka ihe ị na-ekwu ruo n’obi onye na-ege gị ntị dị ka Pọl mere. Jiri ajụjụ dị mma nke ga-egosi na i nwere mmasị n’ebe ọ nọ ‘sepụta’ ihe dị ya n’obi. (Ilu 20:5) Jiri akọ kwuo okwu. Gwa ya okwu doro anya, nke ga-ekwekwa ya nghọta. I kwesịkwara inye ihe àmà ndị na-egosi na ihe ị na-agwa ya bụ eziokwu. Ihe ọ bụla i kwuru kwesịrị ihiwe isi n’Okwu Chineke. Ọ ka mma ma ị gụọ otu ebe n’Akwụkwọ Nsọ ma kọwaa ya nke ọma, nyekwa ihe atụ iji mee ka a ghọta ihe ị na-ekwu karịa ịgụ ebe abụọ ma ọ bụ atọ n’akọwaghị ha nke ọma. Ọ bụrụ na gị enye ihe àmà kwadoro ihe ị na-ekwu, ọ ga-emekwu ka ‘egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu na-eru n’obi.’ (Ilu 16:23) Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka i mekwuo nchọnchọ iji nwetakwuo ihe ị ga-ekwu. Nwaanyị ahụ dị afọ iri itoolu na atọ anyị kwuru okwu ya na mbụ chọrọ ịma ihe mere ọtụtụ ndị ji kwere na mmadụ nwere mkpụrụ obi (ma ọ bụ mmụọ) nke na-anaghị anwụ anwụ. Mgbe ọ ghọtara otú ozizi ahụ si malite na ihe mere ọtụtụ ndị okpukpe ji na-akụzi ya, o kweere ihe Baịbụl na-akụzi banyere okwu ahụ. *
Jiri Ya Na-akụziri Ndị Mmadụ Ihe nke Ọma
18, 19. Olee otú anyị kwesịrị isi jiri “mma agha nke mmụọ nsọ” na-arụ ọrụ nke ọma?
18 Baịbụl kwuru, sị: “Ọnọdụ ụwa a na-agbanwe agbanwe.” Ndị ajọ mmadụ na-ajọwanye njọ. (1 Kọr. 7:31; 2 Tim. 3:13) Ya mere, ọ dị oké mkpa ka anyị jiri “mma agha nke mmụọ nsọ, ya bụ, okwu Chineke” na-akụghasị “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike.”
19 Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ma jiri ihe e dere n’ime ya na-efopụ ozizi ụgha n’obi ndị nwere ezi obi ma mee ka ha mụta eziokwu. O nweghị ihe gbanyesiri mgbọrọgwụ ike nke ihe e dere na Baịbụl na-agaghị efopụli. N’ihi ya, ka anyị gbalịsie ike jiri “mma agha nke mmụọ nsọ” na-arụ ọrụ nkwusa a nke ọma, bụ́ ọrụ Chineke nyere anyị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 10 Ọ bụrụ na anyị agụọ isiokwu bụ́ “Okwu Jehova Dị Ndụ,” bụ́ ndị dị n’Ụlọ Nche, anyị nwere ike ịmata ihe ndị ọzọ metụtara ihe ndị e dere na Baịbụl.
^ par. 17 Gụọ broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ? peeji nke 5-16.
Olee Ihe Ị Mụtara?
• Olee otú Okwu Chineke si akpa ike?
• Olee otú anyị nwere ike isi ‘na-ejizi okwu nke eziokwu ejizi’?
• Olee ihe ihe e dere na Baịbụl nwere ike ime “ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike”?
• Olee ihe ga-eme ka i nwekwuo ike izi ozi ọma n’ụzọ na-eru ndị mmadụ n’obi?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Igbe/Foto dị na peeji nke 12]
Otú Anyị Ga-esi Jiri Okwu Chineke Kụziere Ndị Mmadụ Ihe Ya Eruo Ha n’Obi
▪ Mee ka ha kwanyere Baịbụl ùgwù
▪ Kọwaa ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ
▪ Nyere ha aka ịtụgharị uche na ya ka ihe ị na-ekwu wee ruo ha n’obi
[Foto dị na peeji nke 11]
I kwesịrị ịmụta iji “mma agha nke mmụọ nsọ” na-ezi ozi ọma nke ọma