Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’

‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’

‘Na-ekwu Okwu Chineke n’Atụghị Egwu’

“Ha niile wee jupụta na mmụọ nsọ, na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu.”—ỌRỤ 4:31.

1, 2. Olee ihe anyị ji kwesị ịgba mbọ mụta otú anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma?

MGBE ọ fọrọ abalị atọ tupu Jizọs anwụọ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” Tupu Jizọs arịgoo n’eluigwe ka a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa ‘mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, na-ezi ha ka ha debe ihe niile o nyere ha n’iwu.’ O kwere ha nkwa na ya ga-anọnyere ha “ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ usoro ihe a.”—Mat. 24:14; 26:1, 2; 28:19, 20.

2 Anyị bụ́ Ndịàmà Jehova na-arụsi ọrụ a malitere na narị afọ mbụ ike. O nweghị ọrụ ọzọ ka ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke na ime ndị na-eso ụzọ mkpa, bụ́ ọrụ e ji azọpụta ndụ. N’ihi ya, ọ dị oké mkpa na anyị ga na-ekwusa ozi ọma a nke ọma. N’isiokwu a, anyị ga-ahụ otú mmụọ nsọ nke na-eduzi anyị si enyere anyị aka ikwu okwu n’atụghị egwu mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Isiokwu abụọ na-eso nke a ga-egosi otú mmụọ nsọ Jehova nwere ike isi nyere anyị aka ka anyị na-akụzi ihe nke ọma, nakwa otú ọ ga-esi enyere anyị aka ịgachi ozi ọma anya.

Anyị Ekwesịghị Ịtụ Egwu

3. Olee ihe mere anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke?

3 Ọrụ ikwusa ozi ọma Chineke nyere anyị bụ ihe ùgwù na-enweghị atụ. Ma, ọ dịghị mfe ọrụrụ. N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-anabata ozi ọma Alaeze Chineke ozugbo ha nụrụ ya, ọtụtụ ndị na-eme ka ndị dịrị ndụ n’oge Noa. Jizọs kwuru, sị: “Ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile.” (Mat. 24:38, 39) E nwekwara ndị nke na-akwa anyị emo ma ọ bụ na-emegide anyị. (2 Pita 3:3) Ndị ọchịchị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, ma ọ bụ ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ, ma ọ bụkwanụ ndị ezinụlọ anyị, nwere ike imegide anyị. Ihe ọzọ nke na-eme ka o siere ụfọdụ n’ime anyị ike ikwusa ozi ọma bụ ihere na ụjọ na onye ha chọrọ izi ozi ọma nwere ike jụ ige ha ntị. E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ime ka o siere anyị ike iji “nkwuwa okwu” na-ekwu okwu Chineke “n’atụghị egwu.” (Efe. 6:19, 20) Anyị kwesịrị ịtachi obi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ikwusa okwu Chineke n’atụghị egwu. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịtachi obi?

4. (a) Gịnị ka ikwu okwu n’atụghị egwu pụtara? (b) Olee ihe nyeere Pọl onyeozi aka ịgwa ndị Tesalonaịka okwu n’atụghị egwu?

4 Okwu Grik a sụgharịrị ka ọ bụrụ “n’atụghị egwu” pụtara “ikwu eziokwu, nakwa ikwu okwu n’ezoghị ọnụ.” Okwu ahụ pụtakwara ‘inwe obi ike na ịkata obi.’ Ikwu okwu n’atụghị egwu apụtaghị inwe ọnụ ọjọọ ma ọ bụ ịkparị ndị ọzọ. (Kọl. 4:6) N’agbanyeghị na ọ dị mma ka anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na mmadụ niile dị n’udo. (Rom 12:18) Ka anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke, anyị kwesịrị iji akọ na-ekwu okwu ka anyị wee ghara ịkpasu onye anyị na-agwa okwu iwe n’amaghị ụma. N’ezie, e nwere àgwà ndị ọzọ anyị ga-agbalịsi ike nwee tupu anyị enwee ike ikwu okwu n’atụghị egwu. Anyị agaghị enweli ike ikwu okwu n’atụghị egwu n’ike onwe anyị. Mgbe ‘e mechara Pọl onyeozi na ndị enyi ya ihe ihere na Filipaị,’ gịnị nyeere ha aka iji “nkwuwa okwu” gwa ndị Tesalonaịka okwu? Pọl dere na ọ bụ “site n’enyemaka Chineke.” (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 2:2.) Jehova Chineke nwere ike ime ka anyị kwuo okwu n’atụghị egwu.

5. Olee otú Jehova si mee ka Pita na Jọn na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs nwee ike ikwu okwu n’atụghị egwu?

5 Mgbe “ndị na-achị [ndị Juu] na ndị okenye na ndị odeakwụkwọ” gwara Pita na Jọn ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ha gwara ha, sị: “Kpebienụ n’onwe unu ma ò ziri ezi n’anya Chineke ige unu ntị kama ige Chineke ntị. Ma anyị onwe anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.” Kama ikpeku Chineke ekpere ka o mee ka a kwụsị ịkpagbu ha, ha na ụmụnna ha rịọrọ, sị: “Jehova, biko, leba anya n’egwu ha na-eyi anyị, nyekwa ndị ohu gị ike ka anyị nọgide na-ekwu okwu gị n’atụghị egwu ọ bụla.” (Ọrụ 4:5, 19, 20, 29) Olee ihe Jehova meere ha? (Gụọ Ọrụ 4:31.) Jehova nyere ha mmụọ nsọ ya, bụ́ nke nyeere ha aka ikwu okwu n’atụghị egwu. Mmụọ nsọ Chineke nwekwara ike imere anyị otu ihe ahụ taa. Olee otú anyị nwere ike isi nweta mmụọ nsọ Chineke ya ana-eduzi anyị n’ozi ọma anyị na-ekwusa?

Otú I Nwere Ike Isi Na-ekwu Okwu n’Atụghị Egwu

6, 7. Olee otú kacha mfe anyị nwere ike isi nweta mmụọ nsọ Chineke? Nye ihe atụ.

6 Ụzọ kacha mfe e si enweta mmụọ nsọ Chineke bụ ịrịọ maka ya. Jizọs gwara ndị na-ege ya ntị, sị: “Ọ bụrụ na unu maara otú e si enye ụmụ unu ezi onyinye, ọ bụ ezie na unu bụ ndị ajọ omume, lee ka Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-esi nye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ karị!” (Luk 11:13) Anyị kwesịrị ịna-ekpechi ekpere anya ka Chineke nye anyị mmụọ nsọ ya. Ọ bụrụ na ikwusa ozi ọma n’okporo ámá, n’oge ị na-anọghị n’ozi, n’ebe a na-arụ ọrụ, ma ọ bụkwanụ n’ahịa, na-ara gị ahụ́, i nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya nakwa ka o nyere gị aka ikwu okwu n’atụghị egwu.—1 Tesa. 5:17.

7 Ọ bụ nke a ka otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Nkechi mere. * Otu ụbọchị, mgbe Nkechi nọ n’ebe ọ na-arụ ọrụ, otu onye nkụzi nke ya na ya na-arụkọ ọrụ nọ na-agụ akụkọ e dere banyere otú e si na-emekpọ ụmụaka ọnụ n’ụlọ akwụkwọ ọzọ. Nke a wutere onye nkụzi a nke ukwuu nke na o kwuru sị, “Oleedị ihe ụwa a na-achọ ịghọ aghọ?” Nkechi agbaghị nkịtị ka ohere ọma a ọ ga-eji gbaa àmà gafee. Gịnị nyeere ya aka ịkata obi kwuo okwu? Nkechi kwuru, sị: “M kpekuru Jehova ekpere ka o nye m mmụọ ya ka o nyere m aka.” Ọ gbaara nwaanyị ahụ àmà, meekwa ndokwa ka ha nọkọọ n’oge ọzọ. Tụleekwa ihe banyere nwatakịrị nwaanyị dị afọ ise aha ya bụ Milen, onye bi na Niu Yọk Siti. Milen kwuru, sị: “Mụ na mama m na-ekpe ekpere tupu mụ agawa akwụkwọ.” Gịnị ka ha na-ekpe n’ekpere? Ha na-ekpe ekpere ka Milen nwee ike ịkata obi gbaa àmà banyere Chineke ya. Mama Milen kwuru, sị: “Nke a nyeere Milen aka ịkọwa ihe o kweere banyere ememme ncheta ọmụmụ na ememme ndị ọzọ, meekwa ka ọ ghara iso ndị ọzọ na-eme ememme ndị ahụ.” Akụkọ ndị a ọ́ naghị egosi na anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe ike ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu?

8. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka Jeremaya onye amụma banyere otú anyị ga-esi mụta ikwu okwu n’atụghị egwu?

8 Cheekwa banyere ihe nyeere Jeremaya onye amụma aka ikwu okwu n’atụghị egwu. Mgbe Jehova họpụtara ya ka ọ bụrụ onye amụma nke mba dị iche iche, Jeremaya kwuru, sị: “Lee, amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.” (Jere. 1:4-6) Ma, ka oge na-aga, Jeremaya malitere izi ozi e dunyere ya n’atụghị egwu nke na ọtụtụ ndị weere ya ka onye na-ekwusa banyere naanị ọdachi. (Jere. 38:4) Ruo ihe karịrị iri afọ isii na ise, o kwusara ihe Jehova kpere n’ikpe. Ụmụ Izrel maara na Jeremaya ji obi ike ezi ozi e dunyere ya n’atụghị egwu nke na mgbe Jizọs kwuru okwu n’atụghị egwu mgbe ihe dị ka narị afọ isii gachara, ụfọdụ chere na Jeremaya abịala ọzọ. (Mat. 16:13, 14) Olee otú Jeremaya onye amụma obi na-akaghị ná mmalite si kwụsị ime ihere? O kwuru, sị: “N’ime obi m, [okwu Chineke] dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ m; ike wee gwụ m ịgbachi nkịtị, enweghịkwa m ike idi ya.” (Jere. 20:9) N’ezie, okwu Jehova kpara Jeremaya ike n’ahụ́, nke mere ka o kwusaa ya.

9. Olee otú okwu Chineke ga-esi enwe ike iru anyị n’ahụ́ otú o ruru Jeremaya?

9 N’akwụkwọ Pọl onyeozi degaara ndị Hibru, ọ sịrị: “Okwu Chineke dị ndụ ma na-akpa ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ihu abụọ ọ bụla, ọ na-amabakwa ọbụna ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị ha, o nwekwara ike ịchọpụta echiche na ihe mmadụ bu n’obi.” (Hib. 4:12) Okwu Chineke nwere ike ịkpa ike n’ahụ́ anyị otú ahụ o si kpaa ike n’ahụ́ Jeremaya. Cheta na n’agbanyeghị na ọ bụ ụmụ mmadụ ka e ji dee Baịbụl, ọ bụghị amamihe mmadụ dị na ya, kama, o si n’aka Chineke. Anyị na-agụ na 2 Pita 1:21, sị: “Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” Ọ bụrụ na anyị ewepụta oge mụọ Baịbụl nke ọma, ihe ndị dị na ya e dere n’ike mmụọ nsọ ga-aba anyị n’obi. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:10.) Nke a ga-adị “ka ọkụ na-ere ere” n’ime anyị, anyị agaghịkwa enwe ike ịgbachi nkịtị.

10, 11. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi na-amụ ihe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka anyị na-ekwu okwu n’atụghị egwu? (b) Kwuo, ma ọ dịkarịa ala, otu ihe ị chọrọ ime iji nwee ike na-amụ ihe nke ọma.

10 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka ọmụmụ Baịbụl anyị na-enwe kpalie anyị ime ihe, anyị kwesịrị ịmụ ya otú ihe dị n’ime ya ga-eru anyị n’obi. Dị ka ihe atụ, Ezikiel onye amụma hụrụ ọhụụ ebe a gwara ya ka o rie otu akwụkwọ a pịakọtara apịakọta nke e dere ozi ọ ga-ezi ndị na-agaghị enwe mmasị na ya. Ezikiel kwesịrị ibu ụzọ mụta ozi ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na o mee otú a, izisa ya ga-atọ ya ụtọ ka mmanụ aṅụ.—Gụọ Ezikiel 2:8–3:4, 7-9.

11 Anyị nọ n’ọnọdụ yiri nke Ezikiel. Taa, ọtụtụ ndị achọghị ịnụ ihe Baịbụl kwuru. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịnọgide na-ekwusa okwu Chineke, anyị kwesịrị ịna-amụ Akwụkwọ Nsọ otú ga-eme ka anyị ghọta ya nke ọma. Anyị kwesịrị ịna-amụchi ya anya, ọ bụghị mgbe ọ dapụtara. O kwesịrị ịdị anyị otú ọ dị Devid, bụ́ onye bụrụ abụ, sị: “Ka ihe ọnụ m na-ekwu na ihe m na-atụgharị n’uche bụrụ ihe na-atọ gị ụtọ, Jehova, Oké Nkume m na Onye Mgbapụta m.” (Ọma 19:14) Ọ dị nnọọ mkpa ka anyị wepụta oge na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ ka eziokwu dị na Baịbụl wee bamie n’ime obi anyị. N’ezie, anyị kwesịrị ịgba mbọ hụ na anyị na-amụ ihe nke ọma. *

12. Olee otú ọmụmụ ihe si enyere anyị aka ịbụ ndị mmụọ nsọ na-eduzi?

12 Ụzọ ọzọ mmụọ nsọ Jehova si enyere anyị aka bụ na ọ na-eme ‘ka anyị na-echebara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ, ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.’ (Hib. 10:24, 25) Ịgbalịsi ike na-abịachi ọmụmụ ihe anya, ige ntị nke ọma, na ime ihe anyị mụtara bụ ụzọ ndị mara mma anyị si ekwe ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị. A sị kwuwe, mmụọ nsọ Jehova ji ọgbakọ eduzi anyị.—Gụọ Mkpughe 3:6.

Uru Ikwu Okwu n’Atụghị Egwu Bara

13. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Ndị Kraịst narị afọ mbụ rụrụ n’ozi ọma?

13 Mmụọ nsọ bụ ike kachanụ e nwere n’eluigwe na n’ụwa, ọ na-enyekwara anyị aka ime uche Jehova. Na narị afọ mbụ, mmụọ nsọ nyere Ndị Kraịst ike ha ji kwusaa ozi ọma ruo ọtụtụ ebe. Ha kwusara ozi ọma “n’etiti ihe niile e kere eke dị n’okpuru eluigwe.” (Kọl. 1:23) Ọ bụrụ na anyị echeta na ọtụtụ n’ime ha bụ “ndị na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” anyị ga-ekweta n’eziokwu na ike karịrị ike mmadụ nyeere ha aka.—Ọrụ 4:13.

14. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ka anyị bụrụ ndị ‘mmụọ Chineke na-eme ka ha na-anụ ọkụ n’obi’?

14 Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ otú ga-eme ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị, anyị ga-enwe ike iji obi ike na-ekwusa ozi ọma. ‘Mmụọ Chineke ga-eme ka anyị na-anụ ọkụ n’obi’ ma ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere mgbe niile ka Chineke nye anyị mmụọ ya, anyị ana-amụchi ihe anya, na-atụgharị uche nke ọma n’ihe anyị na-amụ, na-agachikwa ọmụmụ ihe anya. (Rom 12:11) Baịbụl kwuru banyere “otu onye Juu aha ya bụ Apọlọs, onye ọkà okwu, onye Alegzandria, [nke] bịara n’Efesọs,” sị: “Ebe ọ na-anụ ọkụ na mmụọ, ọ malitekwara na-ekwu okwu ma na-ezi ihe ndị metụtara Jizọs n’ụzọ ziri ezi.” (Ọrụ 18:24, 25) Ọ bụrụ na ‘mmụọ Chineke emee ka anyị na-anụ ọkụ n’obi,’ anyị nwere ike ikwusakwu ozi ọma n’atụghị egwu site n’ụlọ ruo n’ụlọ, nakwa mgbe anyị na-anọghị ozi.—Rom 12:11.

15. Olee otú ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu si abara anyị uru?

15 Ọ bụrụ na anyị na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu, ọ ga-abara anyị uru. Àgwà anyị na-aka mma n’ihi na anyị aghọtakwuola na ọrụ anyị dị ezigbo mkpa, baakwa uru. Ọ bụrụ na anyị amara otú e si ezi ozi ọma nke ọma, ọ ga-eme ka anyị nwekwuo ọṅụ, meekwa ka anyị na-anụkwu ọkụ n’obi. Anyị ga-anụkwukwa ọkụ n’obi n’ihi na anyị amatakwuola na anyị kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma ngwa ngwa.

16. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị anaghịzi eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma?

16 Olee ihe anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị anaghịzi eji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma? Anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma. Pọl dere, sị: “Na-anwalenụ ma ùnu nọ n’okwukwe ahụ, na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.” (2 Kọr. 13:5) Jụọ onwe gị, sị: ‘Mmụọ Chineke ọ̀ ka na-eme ka m na-anụ ọkụ n’obi? M̀ na-arịọ Jehova ka o nye m mmụọ nsọ ya? Otú m si ekpe ekpere, ọ̀ na-egosi na m tụkwasịrị ya obi na ọ ga-enyere m aka ime uche ya? Otú m si ekpe ekpere, ọ̀ na-egosi na obi dị m ụtọ maka ozi ọma ọ gwara m ka m na-ekwusa? Olee otú m si amụ ihe? Olee otú oge m na-ewepụta iji tụgharịa uche hà? M̀ na-agachi ọmụmụ ihe anya?’ Ịtụgharị uche n’ajụjụ ndị a nwere ike inyere gị aka ịmata ebe ndị ị na-anaghị eme nke ọma wee mezie ha.

Ka Mmụọ Chineke Mee Ka Ị Na-ekwusa Ozi Ọma n’Atụghị Egwu

17, 18. (a) Olee ókè a na-ekwusaru ozi ọma taa? (b) Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị ji “oké nkwuwa okwu” na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke?

17 Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu ga-anata ike mgbe mmụọ nsọ ga-adakwasị unu, unu ga-abụkwa ndị àmà m ma na Jeruselem ma na Judia dum nakwa na Sameria, ruokwa n’ebe kasị anya n’ụwa.” (Ọrụ 1:8) Ọrụ ahụ a malitere mgbe ahụ eruola ọtụtụ ebe taa. Kwa afọ, ihe karịrị nde Ndịàmà Jehova asaa na-eji ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ otu ijeri na narị nde awa ise ekwusa ozi ọma n’ihe karịrị narị ala abụọ na iri atọ. Iji ịnụ ọkụ n’obi na-arụ ọrụ a a na-agaghị arụghachi na-enye ọṅụ dị ukwuu.

18 Mmụọ nsọ Chineke na-eduzi ọrụ nkwusa ozi ọma a na-arụ n’ụwa niile dị ka o mere na narị afọ mbụ. Ọ bụrụ na anyị ekwere ka mmụọ nsọ duzie anyị, anyị ga-enwe ike iji “oké nkwuwa okwu” na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 28:31) Ya mere, ka mmụọ nsọ na-eduzi anyị ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

^ par. 7 Aha a a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

^ par. 11 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụta ezigbo ihe mgbe ị na-agụ ma na-amụ Baịbụl n’onwe gị, gụọ isiokwu bụ́ “Tinyesie Mgbalị Ike n’Ịgụ Ihe” nakwa “Ịmụ Ihe Na-enye Ụgwọ Ọrụ,” ndị dị n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, peeji nke 21-32.

Gịnị Ka Ị Mụtara?

• Olee ihe mere anyị ji kwesị ikwusa okwu Chineke n’atụghị egwu?

• Olee ihe nyeere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka na narị afọ mbụ ikwu okwu n’atụghị egwu?

• Olee otú anyị ga-esi nwee ike ịna-ekwu okwu Chineke n’atụghị egwu?

• Olee uru ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu na-abara anyị?

[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]

[Foto dị na peeji nke 7]

Olee otú ndị mụrụ ụmụ nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka ha na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu?

[Foto dị na peeji nke 8]

Ị ga-enwe ike ikwusa ozi ọma n’atụghị egwu ma ọ bụrụ na i kpee ekpere